Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ga-eme Ka Unu Na-enwe Obi Ụtọ n’Ụlọ Unu?

Gịnị Ga-eme Ka Unu Na-enwe Obi Ụtọ n’Ụlọ Unu?

Ì chere na ọ bụ . . .

  • ịhụnanya?

  • ego?

  • ihe ọzọ?

 GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU?

“Obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya!”—Luk 11:28.

OLEE URU Ọ GA-ABARA GỊ?

Onye ọ bụla ga-ahụ ibe ya n’anya.—Ndị Efesọs 5:28, 29.

Onye ọ bụla ga-akwanyere ibe ya ùgwù.—Ndị Efesọs 5:33.

Onye ọ bụla ga-atụkwasị ibe ya obi.—Mak 10:6-9.

 Ì KWESỊRỊ IKWERE IHE A BAỊBỤL KWURU?

Ee. Lee ihe abụọ mere anyị ji kwuo otú ahụ:

  • Ọ bụ Chineke malitere ezinụlọ. Baịbụl kwuru na ezinụlọ ọ bụla sitere n’ebe Jehova nọ nweta aha ya. (Ndị Efesọs 3:14, 15) Ihe ihe a pụtara bụ na e wezụga Chineke, a garaghị enwe ezinụlọ. Olee uru ọ baara anyị ịma na ọ bụ Chineke malitere ezinụlọ?

    Ka e were ya na e bunyere gị nri dị ezigbo ụtọ, gị eriwe riwe richaa, chọwazie ịma ihe e ji sie nri ahụ, ònye ka ị ga-ajụ? Ọ̀ kwa onye siri ya?

    Ọ bụ otú ahụ ka ọ dịkwa n’okwu ezinụlọ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịma ihe ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ n’ụlọ anyị, anyị kwesịrị ịjụ Jehova, Onye Malitere ezinụlọ.—Jenesis 2:18-24.

  • Ihe banyere unu na-emetụ Chineke n’obi. Unu ga na-enwe obi ụtọ n’ụlọ unu ma unu na-eme ihe Jehova kwuru n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. Maka gịnị? Maka na “ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.” (1 Pita 5:6, 7) Jehova chọrọ ka ihe gaziere unu. Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe o kwuru, ihe ga-agaziri unu.—Ilu 3:5, 6; Aịzaya 48:17, 18.

 IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

Gịnị ka ị ga-eme ka i nwee ike ịbụ ezigbo di, ezigbo nwunye, ezigbo nne, ma ọ bụ ezigbo nna?

Ị gụọ NDỊ EFESỌS 5:1, 2 na NDỊ KỌLỌSI 3:18-21, ị ga-amata azịza ya.