Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Olee Otú Anyị Ga-esi Amata Azịza Ajụjụ Ndị Na-echu Anyị Ụra?

Olee Otú Anyị Ga-esi Amata Azịza Ajụjụ Ndị Na-echu Anyị Ụra?

Ì chere na ọ bụ . . .

  • ịjụ ndị nkụzi?

  • ịjụ ndị agadi?

  • ka ọ̀ bụ ịgụ Baịbụl?

 OTU ONYE SO DEE BAỊBỤL GWARA CHINEKE, SỊ:

“Mee m ka m nwee nghọta . . . Okwu gị dum bụ eziokwu.”​—Abụ Ọma 119:144, 160, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

Baịbụl na-aza ọtụtụ nde mmadụ ajụjụ ndị ha nwere.

Ị̀ ga-achọ iso ná ndị Baịbụl na-aza ajụjụ ndị na-echu ha ụra?

Adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org/ig ga-enyere gị aka.

GỤỌ ihe ndị a na jw.org/ig

KIRIE vidio ndị kọrọ ihe si na Baịbụl

DANLODUO akwụkwọ dị iche iche

 OLEE NKE Ị GA-ACHỌ ỊMATA AZỊZA YA N’IME AJỤJỤ NDỊ A?

  • Gịnị mere anyị ji dịrị ndụ?

  • Ọ̀ bụ Chineke na-akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata?

  • Olee ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ?

Gaa na jw.org/ig ka ị hụ otú Baịbụl si zaa ajụjụ ndị a.

(Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI pịa ebe e dere › AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA)

GỤKWUO GBASARA YA

OLE NDỊ NA-EME UCHE JEHOVA TAA?

Gịnị Ka Ị Ga-ahụ ma Ị Gaa Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet?

Ị ga-amata eziokwu banyere anyị na ihe anyị kweere, hụkwa otú e si jiri Baịbụl zaa ajụjụ ndị i nwere.