Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ?

Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ?

Gịnị ka i chere?

  • Ee. Ha ga-adị ndụ ọzọ.

  • Ee e. Ha agaghị adị.

  • Ha nwere ike ịdị ndụ ọzọ.

 GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU?

“A gaje inwe mbilite n’ọnwụ.”—Ọrụ Ndịozi 24:15.

OLEE URU Ọ GA-ABARA GỊ?

Nkwa a Chineke kwere anyị ga-akasi gị obi ma onye nke gị nwụọ.—2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.

Ọ ga-eme ka ị ghara ịna-atụ ọnwụ ụjọ.—Ndị Hibru 2:15.

Ị ga-enwekwa olileanya na ị ga-ahụ ndị gị nwụrụ anwụ ọzọ.—Jọn 5:28, 29.

 Ì KWESỊRỊ IKWERE IHE A BAỊBỤL KWURU?

Ee. Lee ihe atọ mere anyị ji kwuo otú ahụ:

  • Ọ bụ Chineke kere mmadụ. Baịbụl kwuru na Jehova Chineke bụ “isi iyi nke ndụ.” (Abụ Ọma 36:9; Ọrụ Ndịozi 17:24, 25) Ebe ọ bụ Chineke kere ihe niile, ọ ga-emeli ka onye nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ.

  • N’oge ochie, Chineke kpọlitere ndị ụfọdụ. Baịbụl kwuru banyere mmadụ asatọ a kpọlitere n’ọnwụ n’oge ochie. Ndị ahụ a kpọlitere bụ ma ndị agadi ma ụmụaka ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị. Ụfọdụ bụ n’ụbọchị ha nwụrụ ka a kpọlitere ha, ma e nwere onye nke nọrọ abalị anọ n’ili tupu a kpọlite ya.—Jọn 11:39-44.

  • Chineke chọrọ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ ọzọ. Jehova kpọrọ ọnwụ asị. Baịbụl kwuru na ọnwụ bụ onye iro. (1 Ndị Kọrịnt 15:26) Ọ na-agụsi Chineke agụụ ike ịkwụsị ọnwụ. Ọ ga-akpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ ka ha biri n’ụwa a.—Job 14:14, 15.

 IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

Gịnị mere anyị ji aka nká, na-anwụkwa anwụ?

Ị gụọ JENESIS 3:17-19 na NDỊ ROM 5:12, ị ga-amata azịza ajụjụ a.

GỤKWUO GBASARA YA

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ?

Gịnị na-eme ndị mmadụ ma ha nwụọ? Ànyị ga-ahụ ndị anyị nwụrụ anwụ ọzọ?