Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!

 ISI NKE 8

Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ihe Ọjọọ na Ahụhụ Dịrị?

Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ihe Ọjọọ na Ahụhụ Dịrị?

1. Olee otú ihe ọjọọ si malite?

Oge Chineke nyere ụmụ mmadụ ohere ka ha chịa ibe ha ezuola iji mara na ọchịchị mmadụ agaghị egboli mkpa ụmụ mmadụ

Ihe ọjọọ malitere n’ụwa mgbe Setan ghara ụgha mbụ. Mgbe Chineke kere ya, ọ bụ mmụọ ozi zuru okè, ma o ‘guzosighị ike n’eziokwu.’ (Jọn 8:44) Ọ chọwara ka e fewe ya ofufe otú ahụ a na-efe Chineke. Ị manụ na ọ bụ naanị Chineke ka e kwesịrị ife ofufe. Setan ghaara Iv ụgha, mee ka o rubere ya isi kama irubere Chineke isi. Adam mechakwara nupụrụ Chineke isi. Ihe a Adam mere kpatara ụmụ mmadụ ji na-ata ahụhụ ma na-anwụ anwụ.Gụọ Jenesis 3:1-6, 19.

Mgbe Setan gwara Iv ka o nupụrụ Chineke isi, ihe o mere bụ ịgba ọchịchị Chineke mgba okpuru. Ọtụtụ ndị esorola Setan, ha achọghịkwa ka Chineke chịwa ha. Ọ bụ otú a ka Setan si ghọọ “onye na-achị ụwa.”Gụọ Jọn 14:30; 1 Jọn 5:19.

2. Ihe ndị Chineke kere hà nwere ntụpọ?

Ihe niile Chineke kere dị mma. Ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi chọọ, ha ga-erubere Chineke isi. (Diuterọnọmi 32:4, 5) Chineke kere anyị, hapụ anyị ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ma ànyị ga-eme ihe ọma ka ọ̀ bụ ihe ọjọọ. Otú ahụ Chineke si kee anyị ga-eme ka anyị nwee ike igosi ya na anyị hụrụ ya n’anya.Gụọ Jems 1:13-15; 1 Jọn 5:3.

3. Gịnị mere Chineke ji gbachi nkịtị ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ ruo ugbu a?

Kemgbe e nupụchaara Jehova isi n’Iden, ọ gbachiri ndị na-enupụrụ ọchịchị ya isi nkịtị. Maka gịnị? Ọ bụ iji gosi na mbọ ọ bụla ụmụ mmadụ gbara ịchị onwe ha agaghị enwe isi. (Ekliziastis 7:29; 8:9) Ugbu a ọ gaferela puku afọ isii ụmụ mmadụ dịwara ndụ, o doola ewu na ọkụkọ anya na ụmụ mmadụ agaghị achịli onwe ha. Ndị ọchịchị  enwebeghị ike ịkwụsị agha, ime mpụ, ikpe na-ezighị ezi, na ọrịa.Gụọ Jeremaya 10:23; Ndị Rom 9:17.

Ma, ọchịchị Chineke adịghị ka ọchịchị ụmụ mmadụ. Ndị niile kwere ka ọ na-achị ha na-erite ezigbo uru. (Aịzaya 48:17, 18) N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ewepụ ọchịchị ụmụ mmadụ. Ọ bụ naanị ndị kwere ka Chineke chịwa ha ga-ebizi n’ụwa a. —Aịzaya 11:9.Gụọ Daniel 2:44.

4. Olee uru ndidi Chineke nwere baara anyị?

Setan kwuru na o nweghị onye ọ bụla ga-eji obi ya niile fee Jehova. Ị̀ ga-achọ ime Setan onye ụgha? Ị ga-emeli ya. Chineke na-enwere anyị ndidi. Ọ chọrọ ka anyị gosi ma ànyị chọrọ ka yanwa chịwa anyị ka ọ̀ bụ ka ụmụ mmadụ ibe anyị chịwa anyị. Ọ bụ otú anyị si ebi ndụ ugbu a ga-egosi nke anyị chọrọ.Gụọ Job 1:8-12; Ilu 27:11.

5. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị chọrọ ka Chineke chịwa anyị?

Ihe anyị kpebiri ime ná ndụ ga-egosi ma ànyị chọrọ ka Chineke chịa anyị ka ọ̀ bụ na anyị achọghị

Otú anyị ga-esi egosi na anyị chọrọ ka Chineke chịwa anyị bụ ịmata otú ọ chọrọ ka anyị si na-efe ya ma fewe ya otú ahụ. Ọ bụkwanụ Baịbụl ga-akọrọ anyị nke ahụ. (Jọn 4:23) Ọ bụrụ na anyị achọghị ka Setan chịwa anyị, anyị agaghị na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’agha otú ahụ Jizọs na-etinyeghị aka na ha.Gụọ Jọn 17:14.

Setan na-eme ka ụmụ mmadụ na-eche na omume rụrụ arụ abụghị ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na anyị ajụ ime omume ọjọọ, ụfọdụ ndị enyi anyị ma ọ bụ ndị ikwu anyị nwere ike na-akwa anyị emo. Ha nwekwara ike na-ewesara anyị iwe. (1 Pita 4:3, 4) N’ihi ya, ọ dị anyị n’aka ikpebi ihe anyị ga-eme. Anyị nwere ike kpebie na anyị na ndị hụrụ Chineke n’anya ga na-akpa. Anyị nwekwara ike kpebie na anyị ga na-eme ihe ndị ọ gwara anyị mee. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị na-egosi na ihe ahụ Setan kwuru bụ ụgha. Ị manụ na ọ sị na ọ bụrụ na ihe esiwere mmadụ ike, onye ahụ agaghịzi na-eme ihe Chineke kwuru.Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10; 15:33.

Otú Chineke si hụ ụmụ mmadụ n’anya mere obi ji sie anyị ike na ọ ga-emerịrị ka ihe ọjọọ na ahụhụ kwụsị n’ụwa anyị a. Ndị niile kwetara n’ihe a anyị kwuru ma na-eme omume gosiri na ha kwetara ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa.Gụọ Jọn 3:16.