Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!

 ISI NKE 9

Gịnị Ga-eme Ka Obi Na-adị Ezinụlọ Gị Ụtọ?

Gịnị Ga-eme Ka Obi Na-adị Ezinụlọ Gị Ụtọ?

1. Gịnị mere nwoke na nwaanyị ịlụ alụ tupu ha ebiri ji eme ka obi ụtọ dịrị n’ezinụlọ ha?

Ọ bụ Jehova, onye obi ụtọ, ka ozi ọma ahụ si n’aka. (1 Timoti 1:11) Ọ bụ yanwa malitere alụmdi na nwunye. Nwoke na nwaanyị lụọ alụọ tupu ha ebiri, ọ ga-eme ka obi ụtọ dịrị n’ezinụlọ ha. Ha ga-agbakọ aka zụọ ụmụ ha otú obi ga-eru ha ala.

Olee otú Chineke si ele alụmdi na nwunye anya? Ọ chọghị ka di na nwunye hapụ ibe ha. Ndị Kraịst kwesịrị ime ihe iwu obodo kwuru gbasara alụmdi na nwunye. (Luk 2:1, 4, 5) Jehova achọghị ka di ma ọ bụ nwunye na-agba n’èzí. (Ndị Hibru 13:4) Ọ kpọrọ ịgba alụkwaghịm asị. (Malakaị 2:16) Ma, o kwuru na ọ bụrụ na di Onye Kraịst ma ọ bụ nwunye ya akwaa iko, onye nke aka ya dị ọcha nwere ike gbaa ibe ya alụkwaghịm, lụrụ onye ọzọ.Gụọ Matiu 19:3-6, 9.

2. Olee otú di na nwunye kwesịrị isi na-emeso ibe ha?

Jehova kere nwoke na nwaanyị ka ha na-enyere ibe ha aka ma ha lụọ. (Jenesis 2:18) Ebe ọ bụ na di bụ onyeisi ezinụlọ, ọ bụ yanwa kwesịrị ịna-akpa afọ ezinụlọ ya. Ọ bụkwa yanwa kwesịrị ịna-akụziri ha Okwu Chineke. O kwesịrị ịna-achọ ọdịmma nwunye ya, ọ bụghị naanị nke ya. Di na nwunye kwesịrị ịhụ ibe ha n’anya ma na-akwanyere ibe ha ùgwù. Ebe ọ bụ na ma di ma nwunye enweghị nke zuru okè, ha abụọ kwesịrị ịna-agbaghara ibe ha ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka udo na-adị n’ezinụlọ ha.Gụọ Ndị Efesọs 4:31, 32; 5:22-25, 33; 1 Pita 3:7.

3. Ì kwesịrị ịhapụ di gị ma ọ bụ nwunye gị ma ọ bụrụ na unu anaghị ebi n’udo?

Ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị enwee nsogbu, gbalịanụ dozie ya. Na-emesokwanụ ibe unu ihe n’obiọma. (1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5) Chineke achọghị ka di na nwunye hapụ ibe ha ma ha nwee nsogbu.Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:10-13.

 4. Ụmụaka, gịnị ka Chineke buuru unu n’obi?

Jehova chọrọ ka obi na-adị unu ụtọ. O nyere unu ndụmọdụ kacha mma nke ga-eme ka obi na-atọ unu ụtọ n’oge a unu ka na-eto eto. Ọ chọrọ ka unu gee ndị mụrụ unu ntị, ka unu wee rite uru n’amamihe ha nwerela ná ndụ. (Ndị Kọlọsi 3:20) Jehova chọkwara ka unu jiri oge a unu na-eto eto jeere ya na Ọkpara ya ozi. Unu manụ na ọ bụ yanwa kere unu. Ọ bụrụ na unu ejeere ya ozi, unu ga-enwe ezigbo obi ụtọ.Gụọ Ekliziastis 11:9–12:1; Matiu 19:13-15; 21:15, 16.

5. Ndị nne na nna, gịnị ka unu ga-eme ka obi na-atọ ụmụ unu ụtọ?

Unu kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-akpa afọ ụmụ unu, na-azụrụ ha uwe ma hụ na e nwere ebe ha bi. (1 Timoti 5:8) Ma, ọ bụrụ na unu chọrọ ka obi na-adị ụmụ unu ụtọ, unu kwesịkwara ịkụziri ha ka ha hụ Chineke n’anya ma na-ege ya ntị. (Ndị Efesọs 6:4) Ọ bụrụ na unu hụrụ Chineke n’anya, o nwere ike mee ka ụmụ unu hụkwa ya n’anya. Ụmụ unu ga-amụta iche echiche nke ọma na ịkpa ezigbo àgwà ma ọ bụrụ na unu ejiri Okwu Chineke na-akụziri ha ihe.Gụọ Diuterọnọmi 6:4-7; Ilu 22:6.

Ịja ụmụaka mma na ịgba ha ume na-eme ka ha na-agbakwu mbọ. Ọ dịkwa mkpa ka a na-abara ha mba ma gbazie ha ma ha mee ihe ọjọọ. Isi otú a na-azụ ha ga-eme ka ha ghara ime ihe ha ga-emecha kwaa mmakwaara ná ndụ. (Ilu 22:15) Ma, unu ekwesịghị ịna-eji obi ọjọọ ma ọ bụ aka ike na-adọ ha aka ná ntị.Gụọ Ndị Kọlọsi 3:21.

Ndịàmà Jehova na-ebipụta akwụkwọ dị iche iche ndị na-enyere ndị nne na nna na ụmụ ha aka. Ihe a na-ede na ha na-esikwa na Baịbụl.Gụọ Abụ Ọma 19:7, 11.

 

GỤKWUO GBASARA YA

UNU GA-ENWELI OBI ỤTỌ N’EZINỤLỌ UNU

Chineke Ga-enyere Unu Aka Ịna-ebi n’Udo

Naanị ichebara ajụjụ abụọ dị mkpa echiche ga-enyere gị aka ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-ebi n’udo.

UNU GA-ENWELI OBI ỤTỌ N’EZINỤLỌ UNU

Otú Unu Ga-esi Na-edozi Esemokwu

Otú di na nwunye si edozi ihe na-esere ha ga-eme ka ezinụlọ ha sie ike, ha ana-ebikwa n’udo.

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

Ụzọ Isi Mee Ka Ndụ Ezinụlọ Gị Na-enye Obi Ụtọ