Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!

 ISI NKE 15

Gịnị Mere I Ji Kwesị Ịna-amụkwu Gbasara Jehova?

Gịnị Mere I Ji Kwesị Ịna-amụkwu Gbasara Jehova?

1. Olee uru ịna-amụ Baịbụl ga-abara gị?

E nwere ọtụtụ ihe Baịbụl na-akụzi. Ma, ihe anyị kwuru n’akwụkwọ a bụ naanị ole na ole n’ime ha. Anyị ma na ha emeela ka i kpebie ịhụkwu Jehova n’anya. I kwesịrị ịgba mbọ ka ịhụnanya a na-esikwu ike. (1 Pita 2:2) Ị ga-abịaru Chineke nso ma ị na-amụ Okwu ya. Nke a ga-emekwa ka i nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.Gụọ Jọn 17:3; Jud 21.

Ị matakwuo ụdị onye Chineke bụ, okwukwe gị ga-esikwu ike. Okwukwe gị sikwuo ike, ya enyere gị aka ịna-eme uche Chineke. (Ndị Hibru 11:1, 6) Nke a ga-emezi ka i chegharịa, hapụ ihe ọjọọ ndị ị na-emebu.Gụọ Ọrụ Ndịozi 3:19.

2. Ọ bụrụ na ị na-amụ Okwu Chineke, olee uru ọ ga-abara ndị ọzọ?

Gị na Jehova nwere ike ịdị n’ezigbo mma

Izi ndị ọzọ ozi ọma na-atọ anyị niile ụtọ. Anyị makwa na ị ga-achọ ịkọrọ ndị ọzọ ihe ị mụtara n’Okwu Chineke. Ọ bụrụ na ị na-amụ Baịbụl, ị ga-amụta otú ị ga-esi jiri Baịbụl gwa ndị ọzọ ihe ndị ị na-amụta banyere Jehova na ihe ọma ndị ọ ga-emere anyị.Gụọ Ndị Rom 10:13-15.

Ọ na-abụ ụfọdụ ndị chọọ ịmalite ikwusawa ozi ọma, ha ebido ná ndị ikwu na ibe ha. Ma, ọ ga-adị mma ka i jiri akọ na-ekwu okwu. Kama ịgwa ha na ha nọ n’okpukpe ụgha, gwa ha ihe ọma Chineke kwere anyị ná nkwa. Ihe ọzọ ị ga-echeta bụ na ọ bụ àgwà ọma gị ga-eme ka ndị mmadụ kweta na ihe ị na-ekwu bụ eziokwu, ọ bụchaghị ihe ị gwara ha.Gụọ 2 Timoti 2:24, 25.

3. Olee ihe ùgwù ị ga-enwe ma ị na-amụ Okwu Chineke?

Ị na-amụ Okwu Chineke, gị na Chineke ga-adịkwu ná mma. Gị na ya ga-emecha bụrụ ezigbo enyi, gị esorokwa n’ezinụlọ ya.Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 6:18.

 4. Gịnị ka ị ga na-eme ka gị na Chineke dịkwuo ná mma?

Ịmụ Okwu Chineke ga-eme ka ị mụtakwuo otú ị ga-esi na-eme ihe Baịbụl kwuru. (Ndị Hibru 5:13, 14) Ị hụ Onyeàmà Jehova, gwa ya na ị chọrọ ịmụ Baịbụl. Ọ ga-eji akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? mụọrọ gị ihe. Ka ị na-amụ Baịbụl, ị ga na-emekwu nke ọma ná ndụ.Gụọ Abụ Ọma 1:1-3; 73:27, 28.

Ozi ọma niile anyị kwuru okwu ha n’akwụkwọ a si n’aka Chineke, onye obi ụtọ. Ị ga-abịarukwu ya nso ma gị na Ndịàmà Jehova na-akpa. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ọ bụrụ na ị gbalịa na-eme uche Jehova, ị ga-enweta ndụ ebighị ebi. O nweghị ihe karịrị mmadụ na Chineke ịdị n’ezigbo mma.Gụọ 1 Timoti 1:11; 6:19.

 

GỤKWUO GBASARA YA

ỌMỤMỤ IHE

Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?

Lee vidio a ka ị hụ ihe a na-eme na ya.

Gwa Anyị Ka Anyị na Gị Mụwa Baịbụl

Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?

Baịbụl na-enyere ọtụtụ ndị aka ịmata azịza ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa. Ị̀ ga-achọ ka Baịbụl nyere gị aka?

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere