Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

 ISI NKE IRI NA ISE

Otú E Kwesịrị Isi Na-efe Chineke

Otú E Kwesịrị Isi Na-efe Chineke

1. Ònye kwesịrị ịgwa anyị otú anyị kwesịrị isi na-efe Chineke?

IHE FỌRỌ OBERE ka ọ bụrụ okpukpe niile na-ekwu na ihe ha na-akụzi banyere Chineke bụ eziokwu. Mana, o nweghị otú ihe a ha na-ekwu ga-esi bụrụ eziokwu ebe okpukpe dị iche iche na-akụzi ihe dị iche iche banyere onye Chineke bụ nakwa otú anyị kwesịrị isi na-efe ya. Olee otú anyị ga-esi amata otú e kwesịrị isi na-efe Chineke? Ọ bụ naanị Jehova ga-agwali anyị otú anyị kwesịrị isi na-efe ya.

2. Olee otú ị ga-esi mata otú i kwesịrị isi na-efe Chineke?

2 Jehova enyela anyị Baịbụl ka anyị nwee ike ịmata otú anyị kwesịrị isi na-efe ya. N’ihi ya, mụọ Baịbụl, Jehova ga-enyekwara gị aka ịmụta ihe ọ na-akụzi, n’ihi na ọ hụrụ gị n’anya n’eziokwu.—Aịzaya 48:17.

3. Gịnị ka Chineke chọrọ ka anyị na-eme?

3 Ụfọdụ ndị na-ekwu na okpukpe niile dị Chineke mma. Ma, ọ bụghị ihe Jizọs kụziiri anyị. Ọ sịrị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme uche Nna m.” Ihe a gosiri na ọ dị mkpa ka anyị mata ihe bụ́ uche Chineke, na-emekwa ya. Ma, ihe a abụghị obere okwu n’ihi na Jizọs sịrị na ndị na-anaghị erubere Chineke isi dị ka ndị omekome. Ọ sịrị na ha bụ “ndị ọrụ mmebi iwu.”—Matiu 7:21-23.

4. Gịnị ka Jizọs kwuru banyere ime uche Chineke?

4 Jizọs eburula ụzọ gwa anyị na ihe ga-esiwere anyị ike ma anyị chọọ ime uche Chineke. Ọ sịrị: “Sinụ n’ọnụ  ụzọ ámá dị warara banye; n’ihi na okporo ụzọ nke na-eduba ná mbibi sara mbara ma dị obosara, ndị na-esikwa na ya abanye dị ọtụtụ; ma ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ dị warara, okporo ụzọ ya dịkwa mkpagide, ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.” (Matiu 7:13, 14) Ụzọ ahụ dị́ mkpagide, ya bụ, otú e kwesịrị isi na-efe Chineke, na-eduga ná ndụ ebighị ebi. Ụzọ ahụ dị́ obosara, ya bụ, otú a na-ekwesịghị isi na-efe Chineke, na-eduga n’ọnwụ. Ma, o nweghị onye Jehova chọrọ ka ọ nwụọ. Ọ na-enye onye ọ bụla ohere ịmụta gbasara ya.—2 Pita 3:9.

OTÚ E KWESỊRỊ ISI NA-EFE CHINEKE

5. Olee otú i nwere ike isi mata ndị na-efe Chineke otú kwesịrị ekwesị?

5 Jizọs sịrị na anyị nwere ike ịmata ndị na-efe Chineke otú kwesịrị ekwesị. Anyị ga-amata ndị a ma ọ bụrụ na anyị eleruo ihe ha kweere nakwa ihe ha na-eme anya. Jizọs sịrị: “Unu ga-amata ha site ná mkpụrụ ha.” O kwukwara, sị: “Osisi ọma ọ bụla na-amị ezi mkpụrụ.” (Matiu 7:16, 17) Nke a apụtaghị na ndị na-efe Chineke zuru okè. Kama, ihe ọ na-ekwu bụ na ndị ohu Chineke na-agba mbọ mgbe niile ịna-eme ihe ziri ezi. Ugbu a, ka anyị lee ihe ndị ga-enyere anyị aka ịmata ndị na-efe Chineke otú kwesịrị ekwesị.

6, 7. Gịnị mere o ji bụrụ Baịbụl ga-ekwu otú e kwesịrị isi efe Chineke? Gịnị ka ihe Jizọs mere na-akụziri anyị?

6 Anyị kwesịrị ịna-efe Chineke otú Baịbụl kwuru ka e si na-efe ya. Baịbụl sịrị: “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie, na iji ya nye ọzụzụ n’ezi omume, ka onye nke Chineke wee ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.” (2 Timoti 3:16, 17) Pọl onyeozi degaara  Ndị Kraịst akwụkwọ ozi, sị ha: “Mgbe unu natara okwu Chineke, bụ́ nke unu nụrụ n’ọnụ anyị, unu nabatara ya, ọ bụghị dị ka okwu ụmụ mmadụ, kama, dị nnọọ ka ọ bụ n’eziokwu, dị ka okwu Chineke.” (1 Ndị Tesalonaịka 2:13) Ihe niile ezigbo ndị na-efe Chineke na-eme si n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl. Ha esighị n’echiche ụmụ mmadụ, n’omenala, ma ọ bụ n’ihe ọ bụla ọzọ.

7 Ihe niile Jizọs kụziri si n’Okwu Chineke. (Gụọ Jọn 17:17.) Ọtụtụ ugboro, o kwughachiri ihe dị́ n’Akwụkwọ Nsọ. (Matiu 4:4, 7, 10) Ezigbo ndị ohu Chineke na-eṅomi Jizọs. Ihe niile ha na-akụzi sikwa na Baịbụl.

8. Gịnị ka Jizọs kụziiri anyị banyere ife Jehova?

8 Ọ bụ naanị Jehova ka anyị kwesịrị ịna-efe. Abụ Ọma 83:18 kwuru, sị: “Gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.” Jizọs chọrọ ka ndị mmadụ mara kpọmkwem onye ezi Chineke ahụ bụ, ọ kụzikwaara ndị mmadụ aha Chineke. (Gụọ Jọn 17:6.) Jizọs sịrị: “Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.” (Matiu 4:10) N’ihi ya, anyị bụ́ ndị ohu Chineke na-eme ka Jizọs. Ọ bụ naanị Jehova ka anyị na-efe ofufe. Anyị na-akpọ ya aha ya, na-akụziri ya ndị ọzọ, na-agwakwa ha ihe Chineke ga-emere anyị.

9, 10. Olee otú anyị si egosi ibe anyị na anyị hụrụ ha n’anya?

9 Anyị kwesịrị iji obi anyị niile hụ ndị ọzọ n’anya. Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha hụ ibe ha n’anya. (Gụọ Jọn 13:35.) Anyị na-eme otú a n’agbanyeghị ebe onye nke ọ bụla si, omenala ndị ebe ha, nakwa ma onye ahụ ọ̀ bụ ogbenye ma ọ̀ bụ ọgaranya. Ịhụnanya anyị nwere n’ebe ibe anyị nọ na-eme ka anyị dịrị n’otu ka ndị otu nne ji. (Ndị Kọlọsi 3:14) Ọ bụ ya mere anyị  anaghị aga agha, anyị anaghịkwa egbu mmadụ ibe anyị. Baịbụl sịrị: “Ụmụ Chineke na ụmụ Ekwensu pụtara ìhè site n’ihe a: Onye ọ bụla nke na-adịghị eme ezi omume esiteghị na Chineke, onye na-ahụghị nwanna ya n’anya esiteghịkwa na Ya.” O kwukwara, sị: “Anyị kwesịrị ịhụ ibe anyị n’anya; ọ bụghị dị ka Ken, onye sitere n’ajọ onye ahụ wee gbuo nwanne ya.”—1 Jọn 3:10-12; 4:20, 21.

10 Anyị na-eji oge anyị, ike anyị, na ihe ndị anyị nwere enyere ibe anyị aka, na-agbakwa ha ume. (Ndị Hibru 10:24, 25) Anyị “na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ niile nọ.”—Ndị Galeshia 6:10.

11. Gịnị mere anyị ji kweta na Jizọs bụ ụzọ e si agakwuru Chineke?

11 Anyị kwesịrị ịna-erubere Jizọs isi n’ihi na ọ bụ ya bụ ụzọ e si agakwuru Chineke. Baịbụl sịrị: “Nzọpụta adịghịkwa n’onye ọ bụla ọzọ, n’ihi na aha ọzọ adịghị n’okpuru eluigwe nke e nyere ụmụ mmadụ, nke a ga-eji zọpụta anyị.” (Ọrụ Ndịozi 4:12) N’Isi nke Ise n’akwụkwọ a, a gwara anyị na Jehova zitere Jizọs ka o nye ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka ụmụ mmadụ ndị na-erubere Chineke isi. (Matiu 20:28) Jehova ahọpụtala Jizọs ka ọ bụrụ Eze ga-achị ụwa. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji na-agwa anyị na anyị kwesịrị irubere Jizọs isi ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi.—Gụọ Jọn 3:36.

12. Gịnị mere na anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?

12 Anyị ekwesịghị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Jizọs etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mgbe a na-ekpe ya ikpe, ọ gwara onye ọchịchị ndị Rom bụ́ Paịlet, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.” (Gụọ Jọn 18:36.) Anyị na-eme ka Jizọs. Ọ bụ Alaeze Chineke nke dị n’eluigwe ka anyị na-akwado. Ọ bụ ya mere na n’agbanyeghị obodo anyị bi, anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma, Baịbụl nyere anyị iwu ka  anyị na-erubere “ndị ọchịchị” isi. (Ndị Rom 13:1) Anyị na-erube isi n’iwu na-achị mba anyị bi na ya. Mana, ọ bụrụ na iwu ndị ọchịchị emegide iwu Chineke, anyị na-eme ka ndịozi Jizọs, bụ́ ndị sịrị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ Ndịozi 5:29; Mak 12:17.

13. Gịnị ka anyị na-ekwusa gbasara Alaeze Chineke?

13 Anyị kweere na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-akwụsị nsogbu niile juru n’ụwa. Jizọs sịrị na a ga-ekwusa ‘ozi ọma Alaeze Chineke’ n’ụwa niile. (Gụọ Matiu 24:14.) E nweghị ọchịchị mmadụ nwere ike imere anyị ihe Alaeze Chineke ga-emere anyị. (Abụ Ọma 146:3) Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-ekpe ekpere maka Alaeze Chineke mgbe ọ sịrị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) Baịbụl gwara anyị na Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị niile nke ụmụ mmadụ, nakwa na naanị ‘ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.’—Daniel 2:44.

14. Olee ndị i kweere na ọ bụ ha na-efe Chineke otú kwesịrị ekwesị?

14 Ị mụchaa ihe ndị a anyị kwurula gbasara ha, jụọ onwe gị, sị: ‘Ole ndị ka ihe ha na-akụzi si na Baịbụl? Olee ndị na-agwa ndị ọzọ banyere aha Chineke? Olee ndị hụrụ ibe ha n’anya n’eziokwu, kwetakwa na Chineke zitere Jizọs ka ọ zọpụta anyị? Olee ndị na-anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị? Olee ndị na-ekwusa na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-akwụsịli nsogbu anyị?’ Ọ bụ naanị Ndịàmà Jehova.—Aịzaya 43:10-12.

GỊNỊ KA Ị GA-EME?

15. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ife Chineke otú dị ya mma?

15 Mmadụ ikwere na Chineke dị ezughị. Ndị mmụọ ọjọọ kwedịrị na Chineke dị, mana ha anaghị erubere  ya isi. (Jems 2:19) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ife Chineke otú dị ya mma, anyị ga-ekwere na ọ dị, na-emekwa ihe o kwuru.

16. Gịnị mere anyị ji kwesị ịjụ okpukpe ụgha?

16 Anyị kwesịrị ịjụ okpukpe ụgha ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ife Chineke otú dị ya mma. Aịzaya onye amụma dere, sị: “Sinụ n’etiti ya pụọ, debenụ onwe unu ọcha.” (Aịzaya 52:11; 2 Ndị Kọrịnt 6:17) Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịjụ ihe ọ bụla nwere ihe jikọrọ ya na okpukpe ụgha.

17, 18. Gịnị bụ “Babịlọn Ukwu ahụ,” gịnịkwa mere anyị ji kwesị ịjụ ya ozugbo?

17 Gịnị bụ okpukpe ụgha? Ọ bụ okpukpe ọ bụla na-akụziri ndị mmadụ ife Chineke otú Okwu ya na-akwadoghị ka e si na-efe ya. Baịbụl kpọrọ okpukpe ụgha niile “Babịlọn Ukwu ahụ.” (Mkpughe 17:5) Gịnị mere o ji kpọọ ya aha ahụ? Mgbe Iju Mmiri nke oge Noa gachara, ọtụtụ ihe okpukpe ụgha na-akụzi malitere n’obodo Babịlọn. Ozizi ụgha ndị ahụ gazuru ụwa niile. Dị ka ihe atụ, ndị biri na Babịlọn fere ọtụtụ chi atọ n’ime otu. Taa kwa, ọtụtụ okpukpe na-akụzi na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu. Ma, Baịbụl mere ka o doo anya na e nwere naanị otu ezi Chineke, bụ́ Jehova, nakwa na Jizọs bụ Ọkpara ya. (Jọn 17:3) Ndị biri na Babịlọn kwekwaara na e nwere ihe dị n’ime mmadụ na-adịrị ndụ na-aga ma onye ahụ nwụọ, nakwa na ihe ahụ nwere ike ịta ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ. Mana, ihe a abụghị eziokwu.—Gụọ ihe nke 14, nke 17, na nke 18, e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

18 Chineke ebuola amụma na a ga-ebibi okpukpe ụgha niile n’oge na-adịghị anya. (Mkpughe 18:8) Ị̀ hụlanụ ihe mere mmadụ ji kwesị ịgbapụ n’okpukpe ụgha n’egbughị oge? Jehova Chineke chọrọ ka ị gbapụ ozugbo, mgbe oge ka dị.—Mkpughe 18:4.

Ị ga-eso n’otu ezinụlọ zuru ụwa ọnụ ma ọ bụrụ na i soro ndị Jehova na-efe ya

19. Ọ bụrụ na i kpebie ife Jehova, olee otú ọ ga-esi elekọta gị?

 19 Ọ bụrụ na i kpebie ịhapụ okpukpe ụgha bịa fewe Jehova, ụfọdụ n’ime ndị enyi gị ma ọ bụ ndị ezinụlọ gị nwere ike ha agaghị aghọta ihe mere i ji mee ụdị mkpebi ahụ. Ha nwedịrị ike ime ka ihe siwere gị ike. Mana, Jehova agaghị ahapụ gị. Ị ga-abịazi soro n’otu ezinụlọ zuru ụwa ọnụ, ebe e nwere ọtụtụ nde mmadụ hụrụ ibe ha n’anya n’eziokwu. Ị ga-enwekwa olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ Chineke. (Mak 10:28-30) Ikekwe, ụfọdụ ndị enyi gị ahụ nakwa ndị ezinụlọ gị na-emegide gị n’ihi na i kpebiri ife Jehova ga-emecha kpebiekwa ịmụ Baịbụl.

20. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị fewe Chineke otú kwesịrị ekwesị?

20 N’oge na-adịghị anya ugbu a, Chineke ga-ekpochapụ ihe ọjọọ niile, Alaeze ya ga-achịwakwa ụwa. (2 Pita 3:9, 13) Oge ahụ ga-amagbu onwe ya. Onye ọ bụla ga na-efe Jehova otú Jehova si chọọ ka anyị si na-efe ya. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka i mee ihe ugbu a ma fewe Chineke otú kwesịrị ekwesị.

GỤKWUO GBASARA YA

OLE NDỊ NA-EME UCHE JEHOVA TAA?

Gịnị Mere Anyị Ji Na-aza Ndịàmà Jehova?

Gụọ banyere ihe atọ mere anyị ji aza Ndịàmà Jehova.