Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

 ISI NKE MBỤ

Ònye Bụ Chineke?

Ònye Bụ Chineke?

1, 2. Olee ajụjụ ndị mmadụ na-ajụkarị?

ỤMỤAKA na-ajụkarị ajụjụ. Ị zaa ha ihe ha jụrụ gị, ha ajụọ gị ọzọ. Ka ị na-azapụla nke ahụ, ha nwekwara ike ịjụkwasị gị ọzọ.

2 Ma ànyị bụ ụmụaka ma ànyị bụ ndị dimkpa, anyị niile na-ajụ ajụjụ. Anyị nwere ike ịjụ gbasara ihe anyị ga-eri, uwe anyị ga-eyi, ma ọ bụ ihe anyị ga-azụ. Anyị nwekwara ike ịjụ ajụjụ ndị dị́ ezigbo mkpa gbasara ndụ na ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ma, ọ bụrụ na a zaghị anyị ajụjụ ndị a nke ọma, anyị nwere ike ịkwụsị ịjụ ha.

3. Gịnị mere ọtụtụ ndị ji chee na ha agaghị amatali azịza ajụjụ ndị dị́ mkpa?

3 Baịbụl ọ̀ zara ajụjụ ndị dị́ mkpa anyị na-ajụ? Ụfọdụ ndị nwere ike iche na ọ zara ha. Ma, ha chere na otú Baịbụl si zaa ha siri ike nghọta. Ha nwere ike iche na ọ bụ naanị ndị nkụzi, ndị pastọ, ma ọ bụ ndị ụkọchukwu nwere ike ịza ajụjụ ndị ahụ. E nwekwara ndị na-anaghị ekweta na ha amaghị azịza ajụjụ ndị ahụ ka ha ghara imenye onwe ha ihere. Gịnị ka i chere?

4, 5. Olee ụfọdụ ajụjụ dị́ mkpa anyị na-ajụ? Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-achọ azịza ha?

4 O nwere ike ịbụ na ị chọrọ ka a zaa gị ajụjụ ndị dị ka: Gịnị mere Chineke ji kee anyị? Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ? Olee ụdị onye Chineke bụ? Jizọs Kraịst, bụ́ Onye Ozizi a ma ama, sịrị: “Na-arịọnụ, a ga-enye unu; na-achọnụ, unu ga-achọta; na-akụnụ, a ga-emeghere unu.” (Matiu 7:7) Nọgide na-ajụ ajụjụ ndị ahụ ruo mgbe a zara gị ihe juru gị afọ.

 5 Ọ bụrụ na ị ‘na-achọ’ azịza ajụjụ ndị ahụ, ị ga-ahụ na azịza ha dị na Baịbụl. (Ilu 2:1-5) Ị ga-aghọtali ihe Baịbụl zara. Ihe ndị ị ga-amụta ga-eme ka ị na-enwe obi ụtọ ugbu a, meekwa ka ị na-atụ anya ihe ọma ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ka anyị leba anya n’otu ajụjụ na-agbagwoju ọtụtụ ndị anya.

CHINEKE Ọ̀ NA-ECHE BANYERE ANYỊ, KA Ọ̀ DỊ OBI ỌJỌỌ?

6. Gịnị mere ọtụtụ ndị ji eche na ahụhụ ha na-ata anaghị emetụ Chineke n’obi?

6 Ọtụtụ ndị chere na Chineke anaghị eche banyere anyị. Ha chere na ọ bụrụ na Chineke na-eche banyere anyị, ụwa agaraghị adị otú a ọ dị. Ihe juru n’ụwa taa bụ agha, ịkpọasị, na ahụhụ. Ndị mmadụ na-arịa ọrịa, na-ahụsi anya, na-anwụkwa anwụ. Ụfọdụ ndị na-eche, sị, ‘Ọ bụrụ na ihe banyere anyị na-emetụ Chineke n’obi, gịnị mere na ọ kwụsịbeghị ahụhụ a niile ndị mmadụ na-ata?’

7. (a) Olee otú ndị isi chọọchị si eme ka ndị mmadụ chee na Chineke dị obi ọjọọ? (b) Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na ọ bụghị Chineke na-akpata ihe ọjọọ ndị na-emenụ?

7 Mgbe ụfọdụ, ndị isi chọọchị na-eme ka ndị mmadụ chee na Chineke dị obi ọjọọ. Ọ na-abụ, ihe ọjọọ mee, ha asị na ọ bụ uche Chineke, na ọ bụ otú Chineke si chọọ ya. Ihe a ha na-ekwu pụtara na ha na-ata Chineke ụta. Ma, Baịbụl na-akụziri anyị na ọ bụghị Chineke na-akpata ihe ọjọọ. Jems 1:13 gwara anyị na Chineke anaghị eji ihe ọjọọ anwa onye ọ bụla. Ọ sịrị: “N’oge ọnwụnwa, ka onye ọ bụla ghara ịsị: ‘Ọ bụ Chineke na-anwa m.’ N’ihi na a pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” Ọ pụtara na n’agbanyeghị na Chineke akwụsịbeghị  ihe ọjọọ ndị na-eme ugbu a, ọ bụghị ya na-akpata ha. (Gụọ Job 34:10-12.) Ka anyị leba anya n’otu ihe atụ.

8, 9. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịtawa Chineke ụta maka nsogbu ndị na-abịara anyị? Nye ihe atụ.

8 Chegodị banyere nwa okorobịa ya na papa ya na mama ya bi n’otu ụlọ. Papa ya ji obi ya niile hụ ya n’anya, na-akụzikwara ya otú ọ ga-esi na-eme ihe dị́ mma. Ma, nwa okorobịa ahụ nọkatara nupụrụ papa ya isi, si n’ụlọ ha kwapụ, mewe ihe ọjọọ ma baa ná nsogbu. Ị̀ ga-asị na ọ bụ papa ya kpataara ya nsogbu ahụ n’ihi na ọ hapụrụ ya ya esi n’ụlọ kwapụ? Mbanụ. (Luk 15:11-13) Chineke mere ụdị ihe ahụ nna ahụ mere. Mgbe ndị mmadụ kpebiri inupụrụ ya isi ma mewe ihe ọjọọ, o gbochighị ha. N’ihi ya, ihe ọjọọ mee, anyị kwesịrị icheta na ọ bụghị Chineke kpatara ya. Anyị ekwesịghị ịtawa Chineke ụta.

9 E nwere ezigbo ihe mere Chineke akwụsịbeghị ihe ọjọọ ndị na-emenụ. N’Isi nke Iri na Otu n’akwụkwọ a, ị ga-amụta ihe Baịbụl kwuru mere na ọ kwụsịbeghị ha. Ma, ka obi sie gị ike na Chineke hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ bụghị ya na-akpata nsogbu ndị na-abịara anyị. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ naanị ya ga-akwụsịli ha.—Aịzaya 33:2.

10. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na Chineke ga-emezi ihe niile ndị ajọ mmadụ mebiri?

10 Chineke dị nsọ. (Aịzaya 6:3) Ihe niile ọ na-eme dị mma ma dị ọcha. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịtụkwasị ya obi. Ụmụ mmadụ adịghị otú ahụ. Ha na-eme ihe ọjọọ mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụgodị na onye ọchịchị na-akwụwa aka ọtọ, ọ gaghị emezili ihe niile ndị na-eme ihe ọjọọ mebiri. Ma, Chineke ka onye ọchịchị ọ bụla ike. Ọ ga-emezili ihe niile ndị ajọ mmadụ mebiri, ọ ga-emekwa  ya. Ọ ga-eme ka ihe ọjọọ gharazie ịdị n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.—Gụọ Abụ Ọma 37:9-11.

OLEE OTÚ OBI NA-ADỊ CHINEKE MA ỤMỤ MMADỤ NA-ATA AHỤHỤ?

11. Olee otú obi na-adị Chineke mgbe ị na-ata ahụhụ?

11 Olee otú obi na-adị Chineke ma ọ hụ ihe ndị na-eme n’ụwa na ahụhụ ị na-ata? Baịbụl na-akụziri anyị na Chineke “hụrụ ikpe ziri ezi n’anya.” (Abụ Ọma 37:28) N’ihi ya, o ji ihe ziri ezi kpọrọ ihe, ọ naghịkwa elefuru ihe na-ezighị ezi anya. Ọ na-ewute ya ma ndị mmadụ na-ata ahụhụ. Baịbụl kwuru na o ‘wutere Chineke n’obi’ mgbe ihe ọjọọ jụrụ n’ụwa n’oge ochie. (Jenesis 6:5, 6) Chineke agbanwebeghị. (Malakaị 3:6) Baịbụl kwuru na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.—Gụọ 1 Pita 5:7.

Baịbụl kwuru na ọ bụ Jehova kere eluigwe na ala. Ọ hụkwara anyị n’anya

12, 13. (a) Gịnị mere anyị ji ahụ ndị ọzọ n’anya, oleekwa otú obi na-adị anyị maka ahụhụ ndị mmadụ na-ata n’ụwa a? (b) Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na Chineke ga-eme ka mmegbu na ahụhụ juru n’ụwa a kwụsị?

12 Baịbụl kwukwara na Chineke kere anyị n’oyiyi ya. (Jenesis 1:26) Ihe ọ pụtara bụ na Chineke kere anyị ka anyị nwee àgwà ọma ndị o nwere. N’ihi ya, ọ bụrụ na ọ na-ewute gị ma ị hụ ebe ndị aka ha dị ọcha na-ata ahụhụ, mara na ọ kadị ewute Chineke. Olee otú anyị si mara?

13 Baịbụl na-akụziri anyị na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ọ bụ ịhụnanya na-eme ka Chineke mee ihe niile ọ na-eme. N’ihi ya, ihe mere anyị ji ahụ ndị ọzọ n’anya bụ na Chineke hụrụ anyị n’anya. Chegodị echiche: Ọ bụrụ na i nwere ikike ịkwụsị ahụhụ ndị mmadụ na-ata na mmegbu juru n’ụwa, ọ̀ bụ na ị gaghị eme ya? O doro anya na ị ga-eme ya n’ihi na ị hụrụ ndị mmadụ n’anya. Oleekwanụ banyere Chineke? Ebe ọ bụ na ọ hụrụ  anyị n’anya, nweekwa ike ọ ga-eji kwụsị mmegbu na ahụhụ juru n’ụwa a, ọ ga-akwụsị ha. Ka obi sie gị ike na nkwa niile ahụ Chineke kwere e dere ná mmalite akwụkwọ a ga-emezu. Ma, ihe ga-eme ka obi sie gị ike na ọ ga-emezu nkwa ndị ahụ bụ ịmatakwu banyere Chineke.

CHINEKE CHỌRỌ KA Ị MARA YA

Ị chọọ ka gị na mmadụ bụrụ enyi, ị ga-agwa ya aha gị. Chineke gwara anyị aha ya na Baịbụl

14. Gịnị bụ aha Chineke? Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-akpọ ya aha ya?

14 Ị chọọ ka gị na mmadụ bụrụ enyi, olee ihe mbụ ị na-agwa ya? Ọ bụ aha gị. Chineke ò nwere aha? Ọtụtụ okpukpe na-ekwu na aha ya bụ Chineke ma ọ bụ Onyenwe anyị. Ma, ihe ndị ahụ abụghị aha. Ha bụ utu aha, otú ahụ “eze” na “onyeisi ala” bụ utu aha. Baịbụl gwara anyị na aha Chineke bụ Jehova. Abụ Ọma 83:18 sịrị: “Ka ndị mmadụ wee mara na gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.” Ndị dere Baịbụl dere aha Chineke ọtụtụ puku ugboro na Baịbụl. Jehova chọrọ ka ị mata aha ya, na-akpọkwa ya aha ya. O mere ka ị mata aha ya ka i nwee ike ịbụ enyi ya.

15. Gịnị ka aha ahụ bụ́ Jehova pụtara?

15 E nwere ezigbo ihe aha Chineke, bụ́ Jehova, pụtara. Ọ pụtara na Chineke ga-emezu nkwa ọ bụla o kwere nakwa na ọ ga-eme ihe ọ bụla  o bu n’obi. O nweghị ihe ga-egbochili ya. Ọ bụ naanị Jehova ga-azali aha a. *

16, 17. Gịnị ka utu aha ndị a pụtara (a) “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile”? (b) “Eze mgbe ebighị ebi”? (ch) “Onye Okike”?

16 I chetaranụ na Abụ Ọma 83:18 kwuru banyere Jehova, sị: “Ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu.” Mkpughe 15:3 sịrị: “Ọrụ gị dị ukwuu ma dị ebube, Jehova Chineke,  Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Ụzọ gị ziri ezi, bụrụkwa eziokwu, Eze mgbe ebighị ebi.” Gịnị ka utu aha ahụ bụ́ “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile” pụtara? Ọ pụtara na ọ bụ Jehova kacha ike ma n’eluigwe ma n’ụwa. Utu aha ahụ bụ́ “Eze mgbe ebighị ebi,” pụtara na o nweghị mmalite, o nweghịkwa ọgwụgwụ. Abụ Ọma 90:2 kwuru na ọ dị malite na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi. Ihe a Baịbụl kwuru ọ̀ naghị eme ka ị ghọta na Chineke dị egwu?

17 Ọ bụ naanị Jehova bụ Onye Okike. Mkpughe 4:11 sịrị: “I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile, ọ bụkwa n’ihi uche gị ka ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere e ji kee ha.” N’eziokwu, ọ bụ Jehova kere ihe niile ma ndị mmụọ ozi nọ́ n’eluigwe ma kpakpando juru  na mbara igwe ma mkpụrụ osisi dị iche iche ma azụ̀ ndị nọ n’oké osimiri.

Ị̀ GA-ABỤLI ENYI JEHOVA?

18. Gịnị mere ụfọdụ nwere ike iji chee na ha agaghị abụli enyi Chineke? Ma, gịnị ka Baịbụl kwuru?

18 Ọ na-abụ ụfọdụ gụọ banyere àgwà ndị dị ịtụnanya Jehova nwere, ụjọ abịa ha, ha echewe na ebe ọ bụ na Chineke dị ike, kara ihe niile, nọrọkwa n’eluigwe, na ọ gaghị na-eche banyere ha. Ma, Chineke ọ̀ chọrọ ka anyị chewe ụdị ihe a? Mba. Jehova chọrọ ka anyị na ya bụrụ enyi. Baịbụl kwuru na Chineke ‘anọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.’ (Ọrụ 17:27) Chineke chọrọ ka ị bịaruo ya nso. O kwekwara nkwa na ‘ọ ga-abịaru gị nso.’—Jems 4:8.

19. (a) Olee otú ị ga-esi bụrụ enyi Chineke? (b) Olee àgwà Chineke nke kacha amasị gị?

19 Olee otú ị ga-esi bụrụ enyi Chineke? Jizọs kwuru, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Nọgide na-amụ Baịbụl. Ọ ga-eme ka ị mata Jehova na Jizọs. Ịmata ha ga-emezi ka i nweta ndụ ebighị ebi. Dị ka ihe atụ, anyị amụtala na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:16) Ma, o nwekwara ọtụtụ àgwà ndị ọzọ mara mma. Baịbụl gwara anyị na Jehova bụ “Chineke nke na-eme ebere, na-emekwa amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye obiọma ya na eziokwu ya dị ukwuu.” (Ọpụpụ 34:6) Jehova “dị mma, dịkwa njikere ịgbaghara mmehie.” (Abụ Ọma 86:5) Chineke na-enwere anyị ndidi, ọ naghịkwa ahapụ ndị na-efe ya. (2 Pita 3:9; Mkpughe 15:4) Ka ị na-agụ banyere Jehova na Baịbụl, ị ga-amụtakwu ọtụtụ àgwà ọma ndị ọzọ o nwere.

20-22. (a) Olee otú anyị ga-esi bụrụ enyi Chineke ebe ọ bụ na anyị anaghị ahụ ya anya? (b) Gịnị ka i kwesịrị ime ma ndị ọzọ chọọ ka ị kwụsị ịmụ Baịbụl?

 20 Ma ebe ọ bụ na ị gaghị ahụli Chineke anya, olee otú ị ga-esi bụrụ enyi ya? (Jọn 1:18; 4:24; 1 Timoti 1:17) Ị na-agụ banyere Jehova na Baịbụl, ị ga-amata na ọ dị adị. (Abụ Ọma 27:4; Ndị Rom 1:20) Ka ị na-amụtakwu banyere Jehova, ị ga-ahụkwu ya n’anya, gị na ya adịkwuokwa ná mma.

Ezigbo nna na-ahụ ụmụ ya n’anya, ma Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya karịa

21 Ị ga-aghọta na Jehova bụ Nna anyị. (Matiu 6:9) Ọ bụ ya kere anyị, ọ chọkwara ka anyị bie ndụ bara uru. Ọ bụ ụdị echiche ezigbo nna na-echere ụmụ ya. (Abụ Ọma 36:9) N’eziokwu, Baịbụl kwuru na ị ga-abụli enyi Jehova. (Jems 2:23) Chegodị ya: Jehova, Onye kere eluigwe na ala, chọrọ ka ị bụrụ enyi ya.

22 Ụfọdụ nwere ike chọọ ka ị kwụsị ịmụ Baịbụl. Ụjọ ha nwere ike ịbụ na ị ga-agbanwe okpukpe ị na-ekpe. Ma, ekwela ka onye ọ bụla mee ka ị ghara ịbụ enyi Jehova. E nweghị enyi dị ka ya.

23, 24. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ajụ ajụjụ? (b) Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu na-esonụ?

23 Ka ị na-amụ Baịbụl, a ga-enwe ihe ụfọdụ ị na-agaghị aghọta. Ihere emela gị ịjụ ajụjụ. Jizọs sịrị na anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ka ụmụaka. (Matiu 18:2-4) Ị manụ na ụmụaka na-ajụkarị ajụjụ. Chineke chọrọ ka ị mata azịza ajụjụ ndị na-echu gị ụra. N’ihi ya, saa anya ná mmiri mụọ Baịbụl ka i nwee ike jide n’aka na ihe ị mụtara na ya bụ eziokwu.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 17:11.

24 Ụzọ kacha mma anyị ga-esi mata banyere Jehova bụ ịmụ Baịbụl. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-amụta ihe mere Baịbụl ji dị́ iche n’akwụkwọ ọ bụla ọzọ.

^ para. 15 Ọ bụrụ na aha ahụ bụ́ Jehova adịghị na Baịbụl gị ma ọ bụ ị chọọ ịmatakwu ihe ọ pụtara na otú e si akpọ ya, gụọ ihe nke 1 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

GỤKWUO GBASARA YA

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Chineke Ò Nwere Aha?

A na-etu Chineke ọtụtụ aha ndị dị ka, Nna, Onye Okike, na Onyenwe anyị. Vidio a gosiri na aha Chineke gbara ihe karịrị ugboro puku asaa na Baịbụl.