Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

Ihe E Dere ná Ngwụcha Akwụkwọ A

Ihe E Dere ná Ngwụcha Akwụkwọ A

1 JEHOVA

Jehova bụ aha Chineke. Aha ahụ pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Bụrụ.” Ọ pụtara na Jehova ga-emeli ihe ọ bụla ọ chọrọ ime. Ọ bụkwa ya kere ihe niile.

N’asụsụ Hibru, ọ bụ mkpụrụ akwụkwọ anọ ka e ji ede aha Chineke. N’asụsụ Igbo, mkpụrụ akwụkwọ anọ ahụ bụ YHWH ma ọ bụ JHVH. Mgbe e dere Akwụkwọ Nsọ Hibru, aha Chineke pụtara ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ugboro puku asaa. Ndị dị iche iche na-esi otú ha si asụ asụsụ akpọ aha ahụ bụ́ Jehova.

Isi nke 1, para. nke 15

2 BAỊBỤL SI “N’IKE MMỤỌ NSỌ CHINEKE”

Ọ bụ uche Chineke ka e dere na Baịbụl. Ma, o ji ndị mmadụ dee ya. E nwere ike iji otú Chineke si jiri ndị mmadụ dee Baịbụl tụnyere ebe ọchụnta ego gwara odeakwụkwọ ya ka o deere ya akwụkwọ ozi. Ọ bụghị uche odeakwụkwọ ahụ dị n’akwụkwọ ozi ahụ, kama ọ bụ nke ọchụnta ego ahụ. Chineke ji mmụọ nsọ ya duzie ndị dere Baịbụl ka ha nwee ike ide uche ya. E nwere ụzọ dị iche iche o si jiri mmụọ nsọ ya duzie ha. Mgbe ụfọdụ, o mere ka ha hụ ihe ndị ha ga-ede na Baịbụl n’ọhụụ ma ọ bụkwanụ rọọ ha ná nrọ.

Isi nke 2, para. nke 5

3 NDỤMỌDỤ BAỊBỤL

Ndụmọdụ Baịbụl bụ okwu ndị gbara ọkpụrụkpụ na-akụziri anyị ihe ndị na-abara anyị uru ná ndụ. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na “mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.” Ihe a Baịbụl kwuru na-egosi na ụdị ndị anyị na ha na-akpa nwere ike ime ka anyị kpawa àgwà ọma ma ọ bụ àgwà ọjọọ. (1 Ndị Kọrịnt 15:33) Baịbụl kwukwara, sị: ‘Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha ka ọ ga-aghọrọ.’ Ihe a o kwuru pụtara na onye ọ bụla ga-anata ụgwọ ihe o mere.—Ndị Galeshia 6:7.

Isi nke 2, para. nke 12

  4 AMỤMA

Amụma bụ ozi si n’aka Chineke. O nwere ike iji ya gwa ụmụ mmadụ ihe ọ chọrọ ime, kụziere ha ụdị àgwà ọ chọrọ ka ha na-akpa, nye ha iwu, ma ọ bụkwanụ jiri ya kwuo ihe ọ ga-eme ndị na-emebi iwu. O nwekwara ike iji ya kwuo ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ọtụtụ amụma e buru na Baịbụl emezuola.

Isi nke 2, para. nke 13

5 AMỤMA NDỊ E BURU GBASARA MESAYA

Amụma niile e buru gbasara Mesaya ahụ mezuru n’isi Jizọs. Gụọ igbe bụ́ “ Amụma Ndị E Buru Gbasara Mesaya.”

Isi nke 2, para. nke 17, na ihe e dere n’ala ala peeji.

6 OTÚ JEHOVA CHỌRỌ KA ỤWA DỊRỊ

Ná mmalite, Jehova chọrọ ka ụwa bụrụ paradaịs, ebe ụmụ mmadụ hụrụ ya n’anya ga-ebi. Ọ gbanwebeghị ihe ahụ o bu n’obi. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-ewepụ nsogbu niile juru n’ụwa ma mee ka ndị niile na-erubere ya isi dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

Isi nke 3, para. nke 1

7 SETAN BỤ́ EKWENSU

Setan bụ mmụọ ozi mbụ nupụụrụ Chineke isi. Ihe mere e ji akpọ ya Setan, nke pụtara “Onye Mmegide,” bụ n’ihi na ọ na-ama Jehova aka. A na-akpọkwa ya Ekwensu, nke pụtara “Onye Nkwutọ.” Ihe mere e ji akpọ ya aha a bụ maka na ọ na-aghagide Chineke ụgha ma na-eduhie ndị mmadụ.

Isi nke 3, para. nke 4

  8 NDỊ MMỤỌ OZI

Jehova kere ndị mmụọ ozi ọtụtụ afọ tupu ya ekee ụwa. O kere ha ka ha biri n’eluigwe. E nwere ihe karịrị otu narị nde ndị mmụọ ozi. (Daniel 7:10) Nke ọ bụla n’ime ha nwere aha. Ha dị umeala n’obi, ha anaghịkwa achọ ka e fee ha ofufe. Ha nwere ọkwá dị iche iche, na-arụkwa ọrụ dị iche iche. Ụfọdụ n’ime ọrụ ndị ha na-arụ bụ ịnọ nso n’ocheeze Chineke na-ejere ya ozi, izi ndị mmadụ ozi si n’aka Chineke, ichebe ndị Chineke n’ụwa, ime ndị nupụụrụ Chineke isi ihe ọ chọrọ ka e mee ha, na ịkwado ozi ọma a na-ekwusa n’ụwa. (Abụ Ọma 34:7; Mkpughe 14:6; 22:8, 9) N’ọdịnihu, ha na Jizọs ga-ebuso ndị iro Chineke agha n’agha Amagedọn.—Mkpughe 16:14, 16; 19:14, 15.

Isi nke 3, para. nke 5; Isi nke 10, para. nke 1

9 MMEHIE

Mmehie bụ ihe ọ bụla anyị nwere ike iche n’echiche ma ọ bụ mee nke megidere uche Chineke. Mmehie na-eme ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma. Ọ bụ ya mere o ji nye anyị iwu na ndụmọdụ ndị na-enyere anyị aka ịghara ịma ụma na-eme mmehie. Ná mmalite, ihe niile Chineke kere zuru okè. Ma, mgbe Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi, ha ghọrọ ndị na-ezughị okè. Ha kara nká ma mechaa nwụọ. Anyịnwa na-akakwa nká ma na-anwụ anwụ n’ihi na anyị ketara mmehie n’aka Adam.

Isi nke 3, para. nke 7; Isi nke 5, para. nke 3

10 AMAGEDỌN

Amagedọn bụ agha Chineke ga-eji bibie ụwa Setan na ndị ọjọọ juru na ya.

Isi nke 3, para. nke 13; Isi nke 8, para. nke 18

 ALAEZE CHINEKE

Alaeze Chineke bụ ọchịchị Jehova hiwere n’eluigwe. Ọ bụ Jizọs Kraịst bụ Eze Alaeze ahụ. Jehova ga-eji Alaeze ahụ wepụ nsogbu niile juru n’ụwa a. Ọ bụ Alaeze a ga-achị ụwa niile.

Isi nke 3, para. nke 14

12 JIZỌS KRAỊST

Chineke bu ụzọ kee Jizọs tupu ya ekee onye ọ bụla ọzọ ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ. Jehova zitere ya n’ụwa ka ọ nwụọ maka mmehie mmadụ niile. Ndị mmadụ mechara gbuo Jizọs ma Jehova kpọlitere ya n’ọnwụ. Ugbu a, ọ bụzi Eze Alaeze Chineke n’eluigwe.

Isi nke 4, para. nke 2

13 AMỤMA GBASARA IZU IRI ASAA

Baịbụl buru amụma gbasara mgbe Mesaya ga-abịa. Ọ ga-abịa mgbe oge Baịbụl kpọrọ izu iri isii na itoolu gwụchara. Oge ahụ bidoro n’afọ 455 T.O.N.K. ma gwụchaa n’afọ 29.

Olee otú anyị si mara na oge ahụ gwụchara n’afọ 29? Izu iri isii na itoolu ahụ malitere n’afọ 455 T.O.N.K. Ọ bụ n’afọ ahụ ka Nehemaya laghachiri Jeruselem ma malite iwughachi ya. (Daniel 9:25; Nehemaya 2:1, 5-8) Ọ bụrụ na mmadụ anụ “otu ọnwa,” ihe ga-agbata ya n’obi bụ abalị iri atọ. N’otu aka ahụ, “otu izu” pụtara ụbọchị asaa. Ma izu ndị ahụ e kwuru okwu ha n’amụma ahụ abụghị izu ụbọchị asaa nkịtị. Izu nke ọ bụla bụ afọ asaa ma e jiri ihe Baịbụl kwuru gụọ ya, ya bụ, “otu ụbọchị maka otu afọ.” (Ọnụ Ọgụgụ 14:34; Ezikiel 4:6) Ọ pụtara na izu iri isii na itoolu ahụ bụ narị afọ anọ na iri asatọ na atọ, ya bụ, iri isii na itoolu e ji asaa mụbaa. Ọ bụrụ na anyị amalite n’afọ 455 T.O.N.K. gụọ narị afọ anọ na iri asatọ na atọ, ọ ga-ebute anyị n’afọ 29. Ọ bụ n’afọ ahụ ka e mere Jizọs baptizim, ya aghọọ Mesaya.—Luk 3:1, 2, 21, 22.

 Amụma ahụ kwukwara gbasara otu izu ọzọ, ya bụ, afọ asaa ọzọ. Ọ bụ n’ime afọ asaa ahụ, ya bụ, n’afọ 33, ka a ga-egbu Mesaya ahụ. N’afọ 36, e bidokwara ikwusara ndị niile ọzọ na-abụghị ndị Juu ozi ọma Alaeze Chineke.—Daniel 9:24-27.

Isi nke 4, para. nke 7

 14 OZIZI ATỌ N’IME OTU

Baịbụl kwuru na ọ bụ Jehova kere ihe niile nakwa na o kere Jizọs tupu ya ekee ihe ọ bụla ọzọ ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ. (Ndị Kọlọsi 1:15, 16) Jizọs abụghị Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile. O nweghịkwa mgbe o kwuru na ya na Chineke hà. O kwuru, si: “Nna m ka m ukwuu.” (Jọn 14:28; 1 Ndị Kọrịnt 15:28) Ma, ụfọdụ okpukpe na-akụzi na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu, ya bụ, Chineke Nna, Chineke Ọkpara, na Chineke mmụọ nsọ. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na okwu ahụ bụ́ “Atọ n’Ime Otu” adịghị na Baịbụl. Ọ bụ ozizi ụgha.

Mmụọ nsọ bụ ike Chineke ji arụ ọrụ. A naghị ahụ ya anya, o jikwa ya eme ihe ọ bụla ọ chọrọ ime. Ọ bụghị onye. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na Ndị Kraịst oge mbụ ‘jupụtara na mmụọ nsọ,’ Jehova ekwuokwa, sị: “M ga-awụkwasị mmụọ m n’ahụ́ ụdị anụ ahụ́ ọ bụla.”—Ọrụ Ndịozi 2:1-4, 17.

Isi nke 4, para. nke 12; Isi nke 15, para. nke 17

15 OBE

Gịnị mere ezigbo Ndị Kraịst anaghị eji obe efe Chineke?

  1. Kemgbe ụwa, ndị okpukpe ụgha na-eji obe efe ofufe. N’oge ochie, ndị ọgọ mmụọ ndị na-eme ememme mmekọahụ nakwa ndị na-efe ihe ndị e kere eke na-eji obe efe ofufe. Malite n’oge Kraịst nwụchara ruo ihe dị ka narị afọ atọ, Ndị Kraịst ejighị obe fee ofufe. Ka oge na-aga, otu eze chịrị Rom aha ya bụ Constantine mere ka obe bụrụ ihe bụ́ isi ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst ji efe ofufe. Ihe mere o ji mee ihe a bụ ka ndị ọgọ mmụọ nabata okpukpe ndị ahụ kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị ihe ọ bụla jikọrọ Jizọs Kraịst na obe. Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwuru, sị: “Ma ndị dịrị ndụ tupu oge Ndị Kraịst ma ndị na-abụghị Ndị Kraịst jicha obe fee ofufe.”

  2.  Jizọs anwụghị n’elu obe. Okwu Grik a sụgharịrị “obe” pụtara “osisi kwụ ọtọ.” Akwụkwọ a na-akpọ The Companion Bible kwuru na o nweghị ihe ọ bụla gosiri na okwu Grik ahụ  dị́ n’Agba Ọhụrụ pụtara ogwe osisi abụọ a kụkọtara ọnụ. Jizọs nwụrụ n’elu otu osisi kwụ ọtọ.

  3. Jehova achọghị ka anyị jiri obe ma ọ bụ ihe ọ bụla yiri obe na-efe ya ofufe.—Ọpụpụ 20:4, 5; 1 Ndị Kọrịnt 10:14.

Isi nke 5, para. nke 12

NCHETA ỌNWỤ JIZỌS

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-echeta ọnwụ ya. Ha na-echeta ọnwụ ya kwa afọ n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan. Ọ bụ ụbọchị ahụ ka ụmụ Izrel jibu eme Ememme Ngabiga. Ndị Kraịst mewe Ncheta Ọnwụ Jizọs, ha na-ebugharị achịcha bụ́ ihe na-anọchi anya ahụ́ Jizọs. Ha na-ebugharịkwa mmanya bụ́ ihe na-anọchi anya ọbara ya. Ọ bụ ndị ga-eso Jizọs chịa n’eluigwe na-ata achịcha ma na-aṅụ mmanya ahụ. Ndị nwere olileanya iketa ndụ ebighị ebi n’ụwa na-anọkwa ya ma a na-echeta ọnwụ Jizọs. Ma ha anaghị eso ata achịcha ma ọ bụ ṅụọ mmanya ahụ.

Isi nke 5, para. nke 21

17 MKPỤRỤ OBI

Na Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ, okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” pụtara (1) mmadụ, (2) anụmanụ, ma ọ bụkwanụ (3) ndụ mmadụ ma ọ bụ ndụ anụmanụ. Ka anyị lee ebe ụfọdụ gosiri na ọ pụtara ihe ndị ahụ:

  • Mmadụ. ‘N’ụbọchị Noa, mmadụ ole na ole, ya bụ, mkpụrụ obi asatọ, gafere mmiri ahụ n’enweghị ihe mere ha.’ (1 Pita 3:20) N’amaokwu Baịbụl a, “mkpụrụ obi” bụ ndị mmadụ, ya bụ, Noa na nwunye ya, ụmụ ha atọ, na ndị nwunye ha.

  • Anụmanụ. “Chineke wee sị: ‘Ka mmiri nupụta ìgwè mkpụrụ obi dị ndụ, ka anụ ufe na-efegharịkwa n’elu ụwa n’ihu mbara eluigwe.’ Chineke wee sị: ‘Ka ala wepụta mkpụrụ obi dị ndụ n’ụdị ha dị iche iche, anụ ụlọ na anụ ndị ọzọ na-agagharị agagharị na anụ ọhịa nke ụwa n’ụdị ya dị iche iche.’ O wee dị otú ahụ.”—Jenesis 1:20, 24.

  •  Ndụ mmadụ ma ọ bụ ndụ anụmanụ. Jehova gwara Mozis, sị: “Ndị niile na-achụ nta mkpụrụ obi gị anwụwo.” (Ọpụpụ 4:19) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o kwuru, sị: “Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma; onye ọzụzụ atụrụ ọma na-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi atụrụ ya.”—Jọn 10:11.

    Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na a sị na mmadụ ji ‘mkpụrụ obi ya dum’ mee ihe, ọ pụtara na onye ahụ ji obi ya niile na ike ya niile mee ihe ahụ. (Matiu 22:37; Diuterọnọmi 6:5) E nwekwara ike ikwu na ihe na-agụ mmadụ ma ọ bụ anụmanụ agụụ bụ “mkpụrụ obi” ya ka ọ na-agụ. E nwedịrị ike ịkpọ onye nwụrụ anwụ ma ọ bụ anụmanụ nwụrụ anwụ mkpụrụ obi nwụrụ anwụ.—Ọnụ Ọgụgụ 6:6; Ilu 23:2; Aịzaya 56:11; Hagaị 2:13.

Isi nke 6, para. nke 5; Isi nke 15, para. nke 17

18 MMỤỌ

Na Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ, okwu Hibru na okwu Grik a sụgharịrị “mmụọ” nwere ike ịpụta ihe dị iche iche. Ma, ha niile pụtara ihe a na-anaghị ahụ anya, dị ka ikuku ma ọ bụ ume ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ na-eku. Okwu Hibru na okwu Grik ahụ nwekwara ike ịpụta ndị bụ́ mmụọ ma ọ bụkwanụ mmụọ nsọ, nke bụ́ ike Chineke ji arụ ọrụ. Baịbụl ekwughị na e nwere ihe dị́ mmadụ n’ahụ́ nke na-esi n’ahụ́ ya pụọ ma gaa dịrị ndụ ebe ọzọ ma onye ahụ nwụọ.—Ọpụpụ 35:21; Abụ Ọma 104:29; Matiu 12:43; Luk 11:13.

Isi nke 6, para. nke 5; Isi nke 15, para. nke 17

19 GEHENA

Gehena bụ aha otu ndagwurugwu dị́ na Jeruselem ebe a na-akpọ ihe e kpofuru ekpofu ọkụ. N’oge Jizọs, o nweghị ihe gosiri na a na-atụba mmadụ ma ọ bụ anụmanụ n’ebe ahụ iji taa ya ahụhụ. N’ihi ya, Gehena abụghị ebe a na-anaghị ahụ anya a kwanyere ọkụ nke a na-atụba ndị nwụrụ anwụ ka ha nọrọ na-ata ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi.  Mgbe Jizọs kwuru na e nwere ndị a ga-atụba na Gehena, ihe ọ na-ekwu bụ na a ga-ebibi ndị ahụ kpamkpam, ha agharazie ịnọ ndụ.—Matiu 5:22; 10:28.

Isi nke 7, para. nke 20

20 EKPERE ONYENWE ANYỊ

Ekpere Onyenwe Anyị bụ ekpere Jizọs ji kụziere ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-ekpe ekpere. A na-akpọkwa ya ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe. N’ekpere ahụ, Jizọs gwara anyị ka anyị na-ekpe ekpere, sị:

  • “Ka e doo aha gị nsọ”

    Ihe ọ pụtara bụ na anyị chọrọ ka e mee ihe ga-egosi na ebubo niile a na-ebo Jehova abụghị eziokwu. O bụrụ na e doo aha Chineke nsọ, ndị niile bí n’eluigwe na ndị niile bí n’ụwa ga na-asọpụrụ aha ya.

  • “Ka alaeze gị bịa”

    Ihe ọ pụtara bụ na anyị chọrọ ka Alaeze Chineke bibie ụwa ọjọọ Setan, chịwa ụwa, meekwa ka ụwa ghọọ paradaịs.

  • “Ka uche gị meekwa n’ụwa”

    Ihe ọ pụtara bụ na anyị chọrọ ka ihe Chineke bu n’obi kee ụwa a mezuo, ka ndị na-erubere ya isi zuo okè, birikwa na paradaịs ruo mgbe ebighị ebi. Ị manụ na ọ bụ ihe Chineke bu n’obi maka ụmụ mmadụ mgbe o kere ha.

Isi nke 8, para. nke 2

21 IHE MGBAPỤTA

Jehova ji Ọkpara ya napụta ụmụ mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ. Ihe mgbapụta ahụ bụ ụgwọ a ga-akwụ iji mee ka anyị zuo okè otú Adam zuru tupu ya enupụrụ Chineke isi. Ọ bụkwa ya ga-eme ka anyị na Jehova dịghachi ná mma. Chineke zitere Jizọs n’ụwa ka ọ nwụọ maka mmehie anyị. N’ihi ọnwụ ahụ Jizọs nwụrụ, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịdị ndụ ebighị ebi ma zuo okè.

Isi nke 8, para. nke 21; Isi nke 9, para. nke 13

 22 GỊNỊ MERE AFỌ 1914 JI BỤRỤ AFỌ PỤRỤ ICHE?

Amụma dị́ na Daniel isi anọ mere ka anyị ghọta na Chineke ga-eme ka Alaeze ya malite ịchị n’afọ 1914.

Amụma ahụ: Jehova mere ka Nebukadneza rọọ otu nnukwu osisi e gbuturu egbutu ná nrọ. Mgbe e gbutuchara ya, e kere úkwù ya agbụ ígwè na agbụ ọla kọpa ka ọ ghara ipu ome ruo “oge asaa.” Oge asaa ahụ gachaa, osisi ahụ ga-amalite ito ọzọ.—Daniel 4:1, 10-16.

Ihe amụma ahụ pụtara: Osisi ahụ nọchiri anya ọchịchị Chineke. Jehova ji ndị eze nọ́ na Jeruselem chịa ụmụ Izrel ọtụtụ afọ. (1 Ihe E Mere 29:23) Ma, Chineke mere ka ndị eze ahụ kwụsị ịchị ndị ya mgbe ha malitere inupụrụ ya isi. E bibiri Jeruselem n’afọ 607 T.O.N.K. Ọ bụkwa n’afọ ahụ ka “oge asaa” ahụ malitere. (2 Ndị Eze 25:1, 8-10; Ezikiel 21:25-27) Ọ bụkwa “oge asaa” ahụ ka Jizọs na-ekwu okwu ya mgbe o kwuru na “ndị mba ọzọ ga-azọ Jeruselem ụkwụ, ruo mgbe oge a kara aka nke ndị mba ọzọ ga-ezu.” (Luk 21:24) Ihe ahụ Jizọs kwuru gosiri na “oge asaa” ahụ agwụghị mgbe ahụ ọ nọ n’ụwa. Jehova kwukwara na ya ga-ahọpụta eze ọzọ ná ngwụcha “oge asaa” ahụ. Ọ bụ Jizọs bụ eze ọhụrụ ahụ. Ọ bụkwa ọchịchị ya ka a ga-eji gọzie ụmụ mmadụ ruo mgbe ebighị ebi.—Luk 1:30-33.

Otú “oge asaa” ahụ hà: “Oge asaa” ahụ bụ puku afọ abụọ, narị afọ ise na iri abụọ. Ọ bụrụ na anyị amalite n’afọ 607 T.O.N.K. gụọ puku afọ abụọ, narị afọ ise na iri abụọ, ọ ga-ebute anyị n’afọ 1914. Ọ bụ n’afọ ahụ ka Jehova mere Jizọs eze n’eluigwe ka ọ malite ịchị Alaeze ya.

 Olee otú anyị si nweta puku afọ abụọ, narị afọ ise na iri abụọ? Baịbụl kwuru na oge atọ na ọkara bụ otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri isii. (Mkpughe 12:6, 14) N’ihi ya, “oge asaa” ga-abụ oge atọ na ọkara ahụ ụzọ abụọ, ya bụ, puku ụbọchị abụọ na narị ụbọchị ise na iri abụọ. Puku ụbọchị abụọ na narị ụbọchị ise na iri abụọ ahụ pụtara puku afọ abụọ na narị afọ ise na iri abụọ ma e jiri ihe Baịbụl kwuru gụọ ya, ya bụ, “otu ụbọchị maka otu afọ.”—Ọnụ Ọgụgụ 14:34; Ezikiel 4:6.

Isi nke 8, para. nke 23

23 MAỊKEL ONYEISI NDỊ MMỤỌ OZI

Baịbụl kwuru na e nwere naanị otu onye bụ́ onyeisi ndị mmụọ ozi. Aha ya bụ Maịkel.—Daniel 12:1; Jud 9.

Maịkel bụ ọchịagha ndị mmụọ ozi Chineke. Mkpughe 12:7 kwuru, sị: ‘Maịkel na ndị mmụọ ozi ya busoro dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya agha.’ Ihe akwụkwọ Mkpughe kwuru gosiri na ọ bụ Jizọs bụ ọchịagha ndị mmụọ ozi. N’ihi ya, Maịkel bụ aha ọzọ a na-akpọ Jizọs.—Mkpughe 19:14-16.

Isi nke 9, para. nke 4

24 OGE IKPEAZỤ

Oge ikpeazụ bụ oge ọtụtụ ihe dị́ egwu ga na-eme n’ụwa tupu Alaeze Chineke ebibie ụwa Setan. Ihe ọzọ Baịbụl kpọrọ oge a bụ “ọgwụgwụ usoro ihe a” nakwa “ọnụnọ nke Nwa nke mmadụ.” (Matiu 24:3, 27, 37) Mgbe “oge ikpeazụ” a malitere bụ mgbe Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914. Ọ ga-agwụkwa mgbe a ga-ebibi ụwa Setan n’agha Amagedọn.—2 Timoti 3:1; 2 Pita 3:3.

Isi nke 9, para. nke 5

 25 MBILITE N’ỌNWỤ

Chineke nwere ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. O nwere mmadụ itoolu Baịbụl gwara anyị na a kpọlitere n’ọnwụ. Ịlaịja, Ịlaịsha, Jizọs, Pita, na Pọl kpọlitechara ndị mmadụ n’ọnwụ. Ọ bụ Chineke nyere ha ike ha ji rụọ ọrụ ebube ahụ. Jehova kwere nkwa na ya ga-akpọlite “ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume” ka ha biri n’ụwa. (Ọrụ Ndịozi 24:15) Baịbụl kwukwara na o nwere ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ, ha agaa eluigwe. Ndị a bụ ndị Chineke họọrọ ka ha soro Jizọs chịa n’Alaeze ya.—Jọn 5:28, 29; 11:25; Ndị Filipaị 3:11; Mkpughe 20:5, 6.

Isi nke 9, para. nke 13

26 IME MGBAASỊ MA Ọ BỤ IFE NDỊ MMỤỌ ỌJỌỌ OFUFE

Onye ọ bụla na-aga ajụ dibịa afa ase ma ọ bụ sí n’ụzọ ọ bụla ọzọ na-ajụ ndị mmụọ ase na-eme mgbaasị. Omume a jọgburu onwe ya. Ihe mere ndị mmadụ na-eji aga ajụ ndị dibịa afa ase bụ na ha kweere na mmadụ nwụọ ya aghọọ mmụọ malite kpawa ike. Ndị mmụọ ọjọọ na-emekwa ka ndị mmadụ nupụwara Chineke isi. Ndị na-eji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu, ndị na-eme majik, ndị na-eme anwansi, ndị na-ata amusu, na ndị kweere nkwenkwe ụgha dị iche iche socha ná ndị na-eme mgbaasị. Ọtụtụ akwụkwọ, fim, na egwú dị iche iche na-eme ka ime mgbaasị na anwansi yie ihe na-eme obi ụtọ na ihe ọ na-enweghị ihe o mere. Ihe ọtụtụ ndị na-eme ma ndị mmadụ nwụọ na-egosi na ha na-efe ndị mmụọ ọjọọ. Ha na-achụrụ ndị nwụrụ anwụ àjà, na-eme oké oriri n’olili ozu, na-akwa ozu ugboro abụọ, na-agba mkpe, na-amụkwara ozu anya abalị. Ndị mmadụ na-aṅụkarị ọgwụ ọjọọ mgbe ọ bụla ha chọrọ ka ha na ndị mmụọ ọjọọ mekọọ ihe.—Ndị Galeshia 5:20; Mkpughe 21:8.

Isi nke 10, para. nke 10; Isi nke 16, para. nke 4

 27 Ọ BỤ JEHOVA KWESỊRỊ ỊCHỊ ELUIGWE NA ỤWA

Jehova bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile. Ọ bụkwa ya kere ihe niile. (Mkpughe 15:3) N’ihi ya, ọ bụ ya nwe ihe niile. O nweghịkwa onye ọzọ kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa ma e wezụga ya. (Abụ Ọma 24:1; Aịzaya 40:21-23; Mkpughe 4:11) Jehova meere ihe niile o kere iwu na-achị ha. Ọ bụkwa ya ka ọ dịịrị ịhọrọ onye ọ chọrọ ka ọ chịwa. Anyị na-egosi na anyị na-akwado ọchịchị Chineke ma ọ bụrụ na anyị hụrụ ya n’anya ma na-erubere ya isi.—1 Ihe E Mere 29:11.

Isi nke 11, para. nke 10

28 ITE IME

Ite ime bụ mmadụ ịkpachara anya gbuo nwa e bu n’afọ. Ọ naghị abụ ihe e mere n’amaghị ama, ọ bụghịkwa ihe na-eme n’ahụ́ nwaanyị dị́ ime na-akpata ya. Nwaanyị tụrụ ime, nwa ọ dị ime ya abụghị akụkụ ahụ́ ya. Nwa ahụ nọ́ n’akpa nwa bụ mmadụ ọzọ nọọrọ onwe ya.

Isi nke 13, para. nke 5

29 MMỊNYE ỌBARA

Mmịnye ọbara pụtara ịmịnye mmadụ ọbara onye ọzọ ma ọ bụkwanụ ịmịnye mmadụ ọbara ya a mịpụtara dowe na friji ma ọ bụ n’ebe ọzọ. Ọ pụtakwara ịmịnye mmadụ ihe anọ bụ́ isi dị́ n’ọbara. Ihe anọ ndị ahụ bụ mmiri dị́ n’ọbara, mkpụrụ ndụ na-acha uhie uhie, mkpụrụ ndụ na-acha ọcha, na mkpụrụ ndụ nke na-eme ka ọbara kwụsị ịgba.

Isi nke 13, para. nke 13

 30 ỊDỌ AKA NÁ NTỊ

Na Baịbụl, ịdọ aka ná ntị apụtaghị naanị ịta mmadụ ahụhụ. Kama, ọ pụtakwara ịkụziri mmadụ ihe, inye ya ntụziaka, nakwa ịgbazi ya. Jehova anaghị eji iwe na obi ọjọọ adọ mmadụ aka ná ntị. (Ilu 4:1, 2) Ndị nne na nna kwesịrị ịmụta ihe n’otú Jehova si adọ mmadụ aka ná ntị. Ọ na-adọ mmadụ aka ná ntị otú ga-eru onye ahụ n’obi, nke ga-eme ka ọ na-agụ onye ahụ agụụ ka ọ na-adọ ya aka ná ntị. (Ilu 12:1) Jehova hụrụ ndị ya n’anya, na-akụzikwara ha ihe. Ọ na-enye ha ndụmọdụ ndị na-enyere ha aka ịjụ ozizi ụgha. Ihe ndị ọ na-akụziri ha na-enyekwara ha aka irubere ya isi. Mgbe ndị nne na nna na-adọ ụmụ ha aka ná ntị, ha kwesịrị ime ka ha ghọta ihe mere ha ji kwesị ịna-erube isi. Ha kwesịkwara iji oge ahụ na-akụziri ha otú ha ga-esi hụ Jehova n’anya nakwa otú ha ga-esi na-eme ihe Baịbụl kwuru.

Isi nke 14, para. nke 13

31 NDỊ MMỤỌ ỌJỌỌ

A naghị ahụ ndị mmụọ ọjọọ anya. Ha nwere ike karịrị nke mmadụ. Ndị mmụọ ọjọọ bụbu ndị mmụọ ozi Chineke. Ma, ha ghọrọ ndị mmụọ ọjọọ na ndị iro Chineke mgbe ha nupụụrụ ya isi. (Jenesis 6:2; Jud 6) Ha si otú ahụ soro Ekwensu na-enupụrụ Jehova isi.—Diuterọnọmi 32:17; Luk 8:30; Ọrụ Ndịozi 16:16; Jems 2:19.

Isi nke 16, para. nke 4

Ihe T.O.N.K. pụtara bụ Tupu Oge Ndị Kraịst

Ihe O.N.K. pụtara bụ Oge Ndị Kraịst