Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

 ISI NKE IRI NA ASATỌ

Èkwesịrị M Inyefe Chineke Onwe M, E Meekwa M Baptizim?

Èkwesịrị M Inyefe Chineke Onwe M, E Meekwa M Baptizim?

1. Olee ihe i nwere ike ịna-eche ugbu a ọ fọrọ obere ka ị mụchaa akwụkwọ a?

Ị MỤTALA ọtụtụ ihe bụ́ eziokwu kemgbe i ji akwụkwọ a na-amụ Baịbụl. Ị mụtala na Chineke kwere anyị nkwa na anyị ga-adị ndụ ebighị ebi, mụta ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ, mụtakwa na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. (Ekliziastis 9:5; Luk 23:43; Jọn 5:28, 29; Mkpughe 21:3, 4) O nwere ike ịbụ na ị malitela ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, chọpụtakwa na ọ bụ  hanwa na-efe Chineke otú ọ chọrọ. (Jọn 13:35) O nwekwara ike ịbụ na gị na Jehova amalitela ịdị ná mma, gị ekpebiekwa ife ya. I nweziri ike ịna-eche ihe i kwesịrị ime iji na-efe Chineke otú ọ chọrọ.

2. Gịnị mere otu nwoke onye Itiopia ji chọọ ka e mee ya baptizim?

2 Ọ bụ otu ihe ahụ ka otu nwoke onye Itiopia nọ na-eche. Nwoke a dịrị ndụ n’oge Jizọs. Obere oge a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, Filip, onye na-eso ụzọ Jizọs, ziri nwoke a ozi ọma. Filip nyeere ya aka ịghọta na ọ bụ Jizọs bụ Mesaya ahụ. Ihe a Filip kụziiri nwoke a ruru ya n’obi nke na ọ gwara Filip ozugbo, sị: “Lee! Mmiri; gịnị na-egbochi ime m baptizim?”—Ọrụ Ndịozi 8:26-36.

3. (a) Olee iwu Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya? (b) Olee otú e kwesịrị isi mee mmadụ baptizim?

3 Baịbụl kwuru hoo haa na ọ bụrụ na ị chọrọ ife Jehova, i kwesịrị ime baptizim. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim.” (Matiu 28:19) Jizọs n’onwe ya mere baptizim. Otú e si mee ya baptizim bụ imikpu ya n’ime mmiri, ọ bụghị ifesa ya mmiri n’isi. (Matiu 3:16) Otú e si emekwa Onye Kraịst baptizim taa bụ imikpu ya n’ime mmiri.

4. Gịnị ka ndị ọzọ ga-amata ma i mee baptizim?

4 Ọ bụ mgbe i mere baptizim ka ndị ọzọ ga-amata n’eziokwu na ị chọrọ ịbụ enyi Chineke nakwa na ị chọrọ ife ya. (Abụ Ọma 40:7, 8) I nweziri ike ịna-eche gbasara ihe ị ga-eme ka e nwee ike ime gị baptizim.

ỊMATA UCHE CHINEKE NA INWE OKWUKWE

5. (a) Gịnị ka ị ga-eburịrị ụzọ mee tupu e mee gị baptizim? (b) Gịnị mere i kwesịrị iji na-aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova?

5 Tupu e mee gị baptizim, ị ga-amatarịrị onye  Jehova na Jizọs bụ. Baịbụl a ị na-amụ emeekwala ka ị matawa ha. (Gụọ Jọn 17:3.) Ma, ọ bụghị ebe okwu biri. Baịbụl kwuru na i kwesịrị ‘ijupụta n’ezi ihe ọmụma’ nke uche Jehova. (Ndị Kọlọsi 1:9) Ihe ị ga-amụta n’ọmụmụ ihe niile Ndịàmà Jehova na-enwe ga-enyere gị aka ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma. Ọ bụ otu n’ime ihe mere i kwesịrị iji na-agachi ọmụmụ ihe ndị a anya.—Ndị Hibru 10:24, 25.

Ị ga-amụrịrị Baịbụl tupu e mee gị baptizim

6. Olee otú ị ga-amataru ihe dị́ na Baịbụl tupu e mee gị baptizim?

6 Ma, Jehova anaghị atụ anya ka ị matachaa ihe niile dị́ na Baịbụl tupu e mee gị baptizim. Ọ tụghị anya ka nwoke Itiopia ahụ matachaa ihe niile tupu e mee ya baptizim. (Ọrụ Ndịozi 8:30, 31) Anyị niile ga na-amụtakwu gbasara Chineke ruo mgbe ebighị ebi. (Ekliziastis 3:11) Ma tupu e mee gị baptizim, i kwesịrị ịma, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ihe ndị dị mfe Baịbụl na-akụzi, kwetakwa na ha bụ eziokwu.—Ndị Hibru 5:12.

7. Olee otú Baịbụl ị na-amụ sirila nyere gị aka?

7 Baịbụl kwuru, sị: ‘Ọ bụrụ na okwukwe adịghị, ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị Chineke ezi mma.’ (Ndị Hibru 11:6) Ọ pụtara na ị ga-enwerịrị okwukwe tupu e mee gị baptizim. Baịbụl kwuru na mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na-ezi ozi ọma na Kọrịnt n’oge ochie, ụfọdụ ndị nụrụ ya “malitere ikwere nakwa ịbụ ndị e mere baptizim.” (Ọrụ Ndịozi 18:8) Baịbụl ị na-amụ enyekwarala gị aka inwe okwukwe na Chineke ga-emezu nkwa ndị o kwere nakwa na àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ ga-eme ka a napụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ.—Jọshụa 23:14; Ọrụ Ndịozi 4:12; 2 Timoti 3:16, 17.

 NA-AKỌRỌ NDỊ ỌZỌ IHE Ị NA-AMỤTA NA BAỊBỤL

8. Gịnị ga-eme ka ọ gụwa gị agụụ ịkọrọ ndị ọzọ ihe ị na-amụta?

8 Ka ị na-amụta ọtụtụ ihe na Baịbụl ma na-ahụ otú o si abara gị uru, okwukwe gị ga-esikwu ike. Ịkọrọ ndị ọzọ ihe ị na-amụta ga-abịa gụwa gị agụụ. (Jeremaya 20:9; 2 Ndị Kọrịnt 4:13) Ma ònye ka i kwesịrị ịkọrọ ya?

Okwukwe i nwere kwesịrị ime ka ọ gụwa gị agụụ ịkọrọ ndị ọzọ ihe ị na-amụta

9, 10. (a) Olee ndị i nwere ike ibido kọwara ihe ị na-amụta na Baịbụl? (b) Gịnị ka i kwesịrị ime ma ị chọọ iso ọgbakọ na-aga ozi ọma?

9 Ụfọdụ ndị i nwere ike ịkọrọ ihe ị na-amụta bụ ndị ezinụlọ unu, ndị enyi gị, ndị agbata obi gị, ma ọ bụ ndị gị na ha na-arụkọ ọrụ. Ma, jiri obiọma na-akọrọ ha ya. Ị ga-emecha ruo eruo iso ọgbakọ na-aga ozi ọma. Mgbe ọ bụla ọ gụwara gị agụụ iso ọgbakọ na-aga ozi ọma, gwa Onyeàmà Jehova na-akụziri gị Baịbụl. Ọ bụrụ na o chere na i ruru eru, ya abụrụkwa na ị na-eme ihe Baịbụl kwuru, gị na ya na ndị okenye abụọ nọ́ n’ọgbakọ ị nọ na ya ga-anọkọ ma kparịta ya.

10 Gịnị ka unu ga-akparịta ná nnọkọ ahụ? Ndị okenye abụọ ahụ ga-ajụ gị ihe ụfọdụ iji chọpụta ma ị̀ ghọtala ihe ndị dị mfe Baịbụl na-akụzi nakwa ma ì kweere na ha. Ha ga-achọpụtakwa ma ị̀ na-ebi ndụ otú Baịbụl kwuru kwa ụbọchị nakwa ma ị̀ chọrọ n’eziokwu ịbụ Onyeàmà Jehova. Gị na ha kparịtawa ihe ndị a, atụla ụjọ n’ihi na ọrụ ha bụ ịna-elekọta gị na ndị niile nọ n’ọgbakọ. (Ọrụ Ndịozi 20:28; 1 Pita 5:2, 3) Unu kparịtachaa, ndị okenye ahụ ga-agwa gị ma ì ruru eru ibido iso ọgbakọ na-aga ozi ọma.

11. Gịnị mere i kwesịrị iji mee mgbanwe ụfọdụ tupu i bido iso ọgbakọ na-aga ozi ọma?

 11 Ndị okenye ahụ nwekwara ike ịgwa gị mgbanwe ụfọdụ i kwesịrị ime tupu i bido iso ọgbakọ na-aga ozi ọma. Gịnị mere i kwesịrị iji mee mgbanwe ndị ahụ? Ọ bụ n’ihi na anyị na-anọchite anya Jehova mgbe anyị na-agwa ndị ọzọ gbasara ya, anyị kwesịkwara ịna-akpa àgwà ga-eme ka ndị ọzọ na-akwanyere ya ùgwù.—1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10; Ndị Galeshia 5:19-21.

CHEGHARỊA MA CHIGHARỊA

12. Gịnị mere mmadụ niile kwesịrị iji chegharịa?

12 E nwekwara ihe ọzọ i kwesịrị ime tupu e mee gị baptizim. Pita onyeozi sịrị: “Chegharịanụ, chigharịakwanụ ka e wee hichapụ mmehie unu.” (Ọrụ Ndịozi 3:19) Gịnị ka ọ pụtara ma a sị na mmadụ echegharịala? Ọ pụtara na onye ahụ akwaala ụta maka ihe ọjọọ ọ bụla o mere. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị na-akwabu iko, i kwesịrị ichegharị. Ọ bụrụgodị na kemgbe a mụrụ gị, ị na-agbasi mbọ ike na-eme ihe dị mma, ị ka kwesịkwara ichegharị, n’ihi na anyị niile na-eme mmehie, kwesịkwa ịna-arịọ Chineke ka ọ gbaghara anyị.—Ndị Rom 3:23; 5:12.

13. Gịnị ka mmadụ ga-eme ya abụrụ na o ‘chigharịala’?

13 Ọ̀ bụ ị kwaa ụta maka ihe ọjọọ i mere, okwu ebie? Mba. Pita kwuru na i kwesịkwara ‘ichigharị.’ Ọ pụtara na ị ga-akwụsị àgwà ọjọọ ọ bụla ị na-akpabu ma bido kpawa àgwà ọma. Ka e were ya na ị na-aga otu ebe ị na-agatụbeghị mbụ. Ka ị na-aga, gị achọpụta na ụzọ i si abụghị ụzọ e si aga ebe ahụ. Gịnị ka ị ga-eme? O doro anya na ị ga-akwụsị, tụgharịa, ma gawa n’ụzọ e si aga ebe ahụ ị chọrọ ịga.  Otú ahụkwa ka ọ dị na Baịbụl ị na-amụ. Ka ị na-amụ ya, i nwere ike ịchọpụta na o nwere àgwà ụfọdụ ma ọ bụ ihe ụfọdụ ị na-eme i kwesịrị ịkwụsị ime. Jiri obi gị niile ‘chigharịa,’ ya bụ, kwụsị ihe ndị ahụ na-adịghị mma ị na-eme ma bido mewe ihe ndị dị mma.

NYEFEE JEHOVA ONWE GỊ

Ì kwela Jehova nkwa na ị ga-efe ya?

14. Olee otú ị ga-esi enyefe Chineke onwe gị?

14 Ihe ọzọ dị mkpa ị ga-eme tupu e mee gị baptizim bụ inyefe Jehova onwe gị. Otú ị ga-esi eme ya bụ ikpe ekpere kwe ya nkwa na ị ga na-efe naanị ya, nakwa na ị ga na-eme uche ya mgbe niile.—Diuterọnọmi 6:15.

15, 16. Gịnị ga-eme ka mmadụ chọọ inyefe Chineke onwe ya?

15 E nwere ike iji mmadụ ikwe Jehova nkwa na ya ga-efe naanị ya tụnyere mmadụ ikwe onye ọ hụrụ n’anya nkwa ọlụlụ. Were ya na nwoke na nwaanyị na-akpa maka ọlụlụ. Ka ha abụọ nọ na-akpa, nke nwoke amatakwuo nke nwaanyị, hụ ya n’anya ma chọọ ịlụ ya. N’agbanyeghị na mmadụ ịbụ nwoke ji nwaanyị abụghị obere ihe, nwoke ahụ ga-eji obi ya niile kweta ịlụ ya n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya.

16 Ka ị na-amụtakwu gbasara Jehova, ị bịara na-ahụkwu ya n’anya, chọọkwa iji ike gị niile na-ejere ya ozi. Ọ bụ ya mere ị ga-eji kpee ekpere kwe Jehova nkwa na ị ga na-ejere ya ozi. Baịbụl kwuru na onye ọ bụla chọrọ iso ụzọ Jizọs ‘ga-ajụrịrị onwe ya.’ (Mak 8:34) Gịnị ka mmadụ ịjụ onwe ya pụtara? Ọ pụtara na ihe ga-akacha onye ahụ mkpa ná ndụ bụ irubere Jehova isi. Ime uche Jehova kwesịrị ịdị gị mkpa karịa ime uche gị.—Gụọ 1 Pita 4:2.

 KA OBI SIE GỊ IKE NA Ị GA-EMEZULI NKWA I KWERE

17. Gịnị mere ụfọdụ ndị achọghị inyefe Jehova onwe ha?

17 Ụfọdụ ndị achọghị inyefe Jehova onwe ha n’ihi na obi esighị ha ike na ha kwe ya nkwa ijere ya ozi, na ha ga-emezuli nkwa ha. Ha na-asị na ha achọghị imechu Jehova ihu. Ha nwekwara ike ịna-eche na ọ bụrụ na ha enyefeghị Jehova onwe ha, ha agaghị aza ya ajụjụ ihe ọjọọ ha mere.

18. Gịnị ga-enyere gị aka ka ị ghara ịtụwa ụjọ na ị ga-emechu Jehova ihu?

18 Ebe ọ bụ na ị hụrụ Jehova n’anya, i kwesịghị ịtụwa ụjọ na ị ga-emechu ya ihu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ị ga-eme ihe niile i nwere ike ime iji mezuo nkwa i kwere ya. (Ekliziastis 5:4; Ndị Kọlọsi 1:10) Ị gaghị na-eche na ime uche Jehova siri ezigbo ike. Jọn onyeozi dere, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu; ma ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.”—1 Jọn 5:3.

19. Olee ihe mere obi ga-eji sie gị ike inyefe Jehova onwe gị?

19 Ọ bụghị iwu na ị ga-ezu okè tupu i nyefee Jehova onwe gị. Ọ naghị atụ anya ka i mee ihe ị na-agaghị emeli. (Abụ Ọma 103:14) Ọ ga-enyere gị aka ime ihe dị mma. (Aịzaya 41:10) Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, ọ “ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.”—Ilu 3:5, 6.

IKWUPỤTA OKWUKWE GỊ N’IHU ỌHA MAKA NZỌPỤTA

20. Gịnị ọzọ ka i kwesịrị ime ma i nyefechaa Chineke onwe gị?

20 Ì chere na i jikerela inyefe Jehova onwe gị? O nwere ihe ọzọ i kwesịrị ime ma i nyefechaa Jehova onwe gị. I kwesịrị ime baptizim.

21, 22. Olee otú ị ga-esi ‘kwupụta okwukwe gị n’ihu ọha’?

 21 Gwa onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ n’ọgbakọ unu na i nyefeela Jehova onwe gị nakwa na ị chọrọ ka e mee gị baptizim. Ọ ga-ahọpụtazi ndị okenye gị na ha ga-atụleghachi ihe ndị dị mfe Baịbụl na-akụzi. Ha chọpụta na i ruru eru ime baptizim, ha ga-agwa gị ka i jikere ime baptizim ná mgbakọ ọzọ unu ga-aga.  Ná mgbakọ ahụ, a ga-ekwu okwu a ga-eji akọwa ihe baptizim pụtara. Onye ga-ekwu okwu ahụ ga-ajụzi ndị chọrọ ime baptizim ajụjụ abụọ. Ị zaa “Ee” n’ajụjụ ndị ahụ, i ‘kwupụtala okwukwe gị n’ihu ọha.’—Ndị Rom 10:10.

22 A ga-emezi gị baptizim. A ga-emikpu gị n’ime mmiri. Baptizim a ga-eme gị ga-egosi onye ọ bụla na  i nyefeela Jehova onwe gị nakwa na ị bụzi Onyeàmà Jehova.

IHE BAPTIZIM A GA-EME GỊ PỤTARA

23. Gịnị ka ime mmadụ baptizim “n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ” pụtara?

23 Jizọs kwuru na a ga-eme ndị na-eso ụzọ ya baptizim “n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.” (Gụọ Matiu 28:19.) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? Ọ pụtara na onye a ga-eme baptizim ghọtara na Jehova bụ Ọkaakaa eluigwe na ụwa, ghọta ọrụ Jizọs na-arụ iji mezuo nzube Chineke, ghọtakwa otú Chineke si eji mmụọ nsọ ya emezu uche ya.—Abụ Ọma 83:18; Matiu 28:18; Ndị Galeshia 5:22, 23; 2 Pita 1:21.

I mee baptizim, i gosila ndị ọzọ na ị chọrọ ime uche Chineke

24, 25. (a) Gịnị ka baptizim nọchiri anya ya? (b) Gịnị ka anyị ga-amụta n’isiokwu ikpeazụ n’akwụkwọ a?

24 O nwere ihe dị ezigbo mkpa baptizim nọchiri anya ya. E mikpuo gị n’ime mmiri, ọ pụtara na ị nwụọla n’otú i sibu ebi ndụ ma ọ bụ na ị hapụla ndụ ị na-ebibu. Í si ná mmiri pụta, ọ pụtara na ị ga-ebidozi biwe ndụ ọhụrụ, na-emezi uche Chineke. Si mgbe ahụ gawa, ị ga na-efezi Jehova. Chetakwa na ọ bụghị mmadụ, ma ọ bụ òtù, ma ọ bụkwanụ ihe ọ bụla ọzọ ka i nyefere onwe gị. Ọ bụ Jehova ka i nyefere onwe gị.

25 Ugbu a i nyefere Chineke onwe gị, gị na ya ga-adịzi n’ezigbo mma. (Abụ Ọma 25:14) Ma, ọ pụtaghị na a ga-azọpụta gị naanị n’ihi na i meela baptizim. Pọl onyeozi dere, sị: “Jirinụ egwu na ịma jijiji na-eme ihe ga-ewetara unu nzọpụta.” (Ndị Filipaị 2:12) Baptizim bụ naanị mbido. Ma, olee otú ị ga-esi nọrọ Jehova nso? A zara ajụjụ a n’isiokwu ikpeazụ n’akwụkwọ a.