Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

 ISI NKE ABỤỌ

Baịbụl Bụ Akwụkwọ Si n’Aka Chineke

Baịbụl Bụ Akwụkwọ Si n’Aka Chineke

1, 2. Gịnị mere Baịbụl ji bụrụ onyinye na-eme obi ụtọ Chineke nyere anyị?

OLEE otú obi na-adị gị ma enyi gị nye gị onyinye ị na-atụghị anya ya? O doro anya na ị ga-emepe ya ozugbo. Obi ga-adịkwa gị ụtọ na enyi gị ahụ chetara gị. Ị ga-ekelekwa ya maka onyinye ahụ o nyere gị.

2 Baịbụl bụ onyinye Chineke nyere anyị. Ọ na-akụziri anyị ihe ndị anyị na-agaghị amụta n’ebe ọ bụla ọzọ. Dị ka ihe atụ, Baịbụl gwara anyị na Chineke kere eluigwe na ụwa, keekwa nwoke na nwaanyị mbụ. Ọ na-agwa anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka ma nsogbu bịara anyị. Ọ bụkwa na Baịbụl ka anyị na-amụta otú Chineke ga-esi mezuo nzube ya maka ụwa, ya bụ, ime ka ọ bụrụ paradaịs. Baịbụl bụ onyinye na-eme anyị obi ụtọ.

3. Gịnị ka ị ga-amụta ma ị na-amụ Baịbụl?

3 Ka ị na-amụ Baịbụl, ị ga-achọpụta na Chineke chọrọ ka ị bụrụ enyi ya. Ka ị na-amụtakwu banyere Chineke, gị na ya ga na-adịkwu ná mma.

4. Olee ihe mere i ji nwee mmasị na Baịbụl?

4 A sụgharịala Baịbụl n’ihe karịrị puku asụsụ abụọ na narị asatọ. E bipụtakwala ọtụtụ ijeri Baịbụl. Ọtụtụ ijeri mmadụ nọ́ n’ụwa nwere Baịbụl n’asụsụ ha. Kwa izu, ihe karịrị otu nde mmadụ na-enweta Baịbụl. N’eziokwu, e nweghị akwụkwọ ọzọ dị́ ka Baịbụl.

5. Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na Baịbụl “si n’ike mmụọ nsọ Chineke”?

 5 Baịbụl “si n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (Gụọ 2 Timoti 3:16.) Ma, ụfọdụ nwere ike iche, sị, ‘Ebe ọ bụ ụmụ mmadụ dere Baịbụl, olee otú o si bụrụ na o si n’aka Chineke?’ Baịbụl zara ajụjụ a. Ọ sịrị: “Ndị mmadụ kwuru ihe Chineke mere ka ha kwuo mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.” (2 Pita 1:21) Ọ dị ka ebe onye ọchụnta ego gwara odeakwụkwọ ya ka o dee akwụkwọ ozi. O dechaa ya, à ga-asị na ọ bụ ònye nwe ya? Ọ bụ onye ọchụnta ego ahụ, ọ bụghị odeakwụkwọ ya. Otú ahụ ka ọ dị Baịbụl, ọ bụ Chineke nwe ya, ọ bụghị ndị ahụ o ji dee ya. Chineke ji mmụọ nsọ ya mee ka ha dee uche ya. N’eziokwu, Baịbụl bụ “okwu Chineke.”—1 Ndị Tesalonaịka 2:13; gụọ ihe nke 2 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

 IHE BAỊBỤL NA-EKWU BỤ EZIOKWU

6, 7. Olee ihe mere anyị ga-eji kwuo na Baịbụl na-ekwu otu ihe?

6 Ide Baịbụl were ihe karịrị otu puku afọ na narị isii. Ndị dere ya biri n’oge dị iche iche. Ụfọdụ n’ime ha gụrụ akwụkwọ, ụfọdụ agụghị. Dị ka ihe atụ, otu onye n’ime ha bụ dọkịta. Ndị ọzọ abụrụ ndị ọrụ ugbo, ndị na-akụ azụ̀, ndị na-azụ atụrụ, ndị amụma, ndị ikpe, na ndị eze. Ma n’agbanyeghị na ndị dere Baịbụl dị iche iche, ihe ha dere bụ otu. Ọ naghị eme Baịbụl kwuo otu ihe n’otu ebe, ya ekwuo ihe ọzọ n’ebe ọzọ. *

7 Akwụkwọ mbụ dị́ na Baịbụl kọwara otú nsogbu ụwa si malite, akwụkwọ nke ikpeazụ agwa anyị na Chineke ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs, si otú ahụ mee ka nsogbu ụwa bie. Baịbụl kọrọ ihe ndị mere kemgbe ọtụtụ puku afọ e kere mmadụ. Ihe ndị ahụ gosiri na nzube Chineke na-emezurịrị.

8. Nye ihe atụ ndị gosiri na ihe Baịbụl kwuru gbasara sayensị bụ eziokwu.

8 E deghị Baịbụl ka e jiri ya kụziwe sayensị ma ọ bụkwanụ ka ọ bụrụ akwụkwọ a ga-eji na-akụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ, ma ihe ndị o kwuru gbasara sayensị bụ eziokwu. Ọ bụ otú akwụkwọ sí n’aka Chineke kwesịrị ịdị. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ Levitikọs kwuru ihe Chineke gwara ndị Izrel ka ha na-eme ka ọrịa ghara ịgbasa. E dere ihe a ọtụtụ afọ tupu ndị mmadụ amata otú nje dị́ iche iche si akpata ọrịa. Baịbụl kwuru na e nweghị ihe e kokwasịrị ụwa n’elu ya. (Job 26:7) Mgbe ọtụtụ ndị nọ na-eche na ụwa dị mbadamba, Baịbụl kwuru na ọ dị okirikiri.—Aịzaya 40:22.

9. Gịnị ka otú ndị dere Baịbụl si kwuo eziokwu na-eme ka anyị ghọta?

 9 Baịbụl kọwa gbasara ihe mere eme, ọ na-akọ kpọmkwem otú o si mee. Ma, ọtụtụ akwụkwọ ndị kọrọ ihe ndị mere eme anaghị ekwucha eziokwu n’ihi na ndị dere ha zochiri ihe ụfọdụ merenụ. Dị ka ihe atụ, ha anaghị edekarị mmeri e meriri obodo ha n’agha. Ma, ndị dere Baịbụl kwuru eziokwu. Mgbe ha na-ede banyere mba Izrel, ha dedịrị mmeri e meriri ya n’agha. Ha dekwara ebe hanwa mejọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ, Mozis gwara anyị na e nwere ezigbo ihe o mejọrọ, Chineke ataakwa ya ahụhụ maka ya. (Ọnụ Ọgụgụ 20:2-12) Otú ndị dere Baịbụl si kwuo eziokwu gosiri na Baịbụl si n’aka Chineke. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịtụkwasị Baịbụl obi.

AKWỤKWỌ EZIGBO NDỤMỌDỤ JURU NA YA

10. Gịnị mere ndụmọdụ Baịbụl ji abara anyị uru taa?

10 Baịbụl “si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie.” (2 Timoti 3:16) N’eziokwu, ndụmọdụ dị́ na Baịbụl na-abara anyị uru taa. Jehova ma otú e si kee anyị, n’ihi ya, ọ na-aghọta ihe anyị na-eche na otú obi na-adị anyị. Ọ ma anyị nke ọma karịa otú anyị ma onwe anyị, ọ chọkwara ka obi na-atọ anyị ụtọ. Ọ ma ihe ga-abara anyị uru, marakwa ihe ga-akpatara anyị nsogbu.

11, 12. (a) Olee ụfọdụ ndụmọdụ bara uru Jizọs nyere na Matiu isi 5 ruo isi 7? (b) Oleekwa ihe ndị ọzọ anyị nwere ike ịmụta na Baịbụl?

11 Na Matiu isi 5 ruo isi 7, Jizọs nyere ezigbo ndụmọdụ banyere otú anyị ga-esi na-enwe obi ụtọ, otú anyị na ndị ọzọ ga-esi na-adị ná mma, otú anyị ga-esi na-ekpe ekpere, nakwa otú anyị ga-esi na-ele ego anya. N’agbanyeghị na o ruola puku afọ abụọ o nyere ndụmọdụ ahụ, ha ka bara ezigbo uru taa.

 12 Na Baịbụl, Jehova na-akụziri anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ anyị, otú anyị ga-esi na-arụ ọrụ anyị nke ọma, nakwa otú anyị na ndị mmadụ ga-esi na-adị n’udo. Ndụmọdụ ndị dị́ na Baịbụl na-enyere anyị aka mgbe niile n’agbanyeghị ụdị onye anyị bụ, ụdị ebe anyị bi ma ọ bụ ụdị nsogbu anyị nwere.—Gụọ Aịzaya 48:17; gụọ ihe nke 3 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

Ị GA-ATỤKWASỊLI AMỤMA BAỊBỤL OBI

Aịzaya bụ́ onye so dee Baịbụl buru amụma na a ga-ebibi Babịlọn

13. Gịnị ka Aịzaya kwuru ga-eme obodo Babịlọn?

13 Ọtụtụ amụma ndị e buru na Baịbụl emezuola. Dị ka ihe atụ, Aịzaya buru amụma na a ga-ebibi Babịlọn. (Aịzaya 13:19) O kwuru ihe niile gbasara otú a ga-esi bibie ya. Obodo ahụ nwere nnukwu ọnụ ụzọ ámá, osimiri gbakwara ya gburugburu. Ma, Aịzaya buru amụma na osimiri ahụ ga-ata nakwa na a ga-eghewe ọnụ ụzọ ámá ahụ oghe. Ndị ga-ebibi Babịlọn ga-abanye na ya n’alụghị agha ọ bụla. Aịzaya bukwara amụma na ọ bụ otu nwoke a na-akpọ Saịrọs ga-ebibi ya.—Gụọ Aịzaya 44:27–45:2; gụọ ihe nke 4 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

14, 15. Olee otú ihe Aịzaya buru n’amụma gbasara Babịlọn si mezuo?

14 Mgbe narị afọ abụọ e buru amụma ahụ gachara, ndị agha bịara ibibi Babịlọn. Ònye bụ onyeisi ndị agha ahụ? Ọ bụ onye ahụ e buru n’amụma, ya bụ, eze Peshia aha ya bụ Saịrọs. Ugbu a, oge eruola ka ihe ndị ọzọ e buru n’amụma banyere Babịlọn mezuo.

15 N’abalị ụbọchị ahụ e bibiri Babịlọn, ndị Babịlọn nọ na-eme ememme. Obi siri ha ike na e nweghị ndị ga-abatali n’obodo ha n’ihi na nnukwu mgbidi na osimiri gbara ya gburugburu. Saịrọs na ndị agha ya  gwuru ọwa mmiri n’azụ obodo ahụ ka mmiri ahụ nwee ike ịtalata. Mmiri ahụ talatara otú ndị agha Peshia nwere ike iji ukwu gafee ya. Ma, olee otú ndị agha a ga-esi gafee mgbidi Babịlọn? Ihe ahụ e buru n’amụma mezuru. Ndị Babịlọn ghewere ọnụ ụzọ ámá obodo ha oghe, ndị agha ahụ abanye na ya ma weghara ya n’alụghị agha ọ bụla.

16. (a) Gịnị ka Aịzaya kwuru ga-emecha mee Babịlọn? (b) Olee otú anyị si mara na ihe ahụ Aịzaya buru n’amụma mezuru?

 16 Aịzaya bukwara amụma na e nweghịzi onye ga-ebi na Babịlọn. O dere, sị: “A gakwaghị ebi n’ime ya ebi, ọ gaghịkwa enwe ebe obibi malite n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.” (Aịzaya 13:20) Ihe a Aịzaya kwuru, ò mechara mezuo? Ee, o mezuru. Ebe Babịlọn oge ochie dịbu dị ihe dị ka kilomita iri asatọ ma e si n’ebe ndịda Bagdad dị́ n’Ịrak gawa ya. Ihe dịzi ebe ahụ ugbu a bụ naanị ikpo nkume. O nweghịkwa otu mkpụrụ mmadụ bi na ya. Jehova ji “ázị́zà nke ịla n’iyi zaa [ma ọ bụ bibie]” Babịlọn.—Aịzaya 14:22, 23. *

17. Gịnị mere anyị ji kwesị ịtụkwasị nkwa ndị Chineke kwere obi?

17 Obi kwesịrị isi anyị ike na ihe ndị Baịbụl kwuru na ha ga-eme n’ọdịnihu ga-emezu n’ihi na ọtụtụ amụma ndị Baịbụl buru emezuola. Obi kwesịkwara isi anyị ike na nkwa Jehova kwere ime ka ụwa ghọọ paradaịs ga-emezu. (Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 23:19.) N’eziokwu, anyị  nwere olileanya inweta “ndụ ebighị ebi, nke Chineke, onye na-apụghị ịgha ụgha, kwere nkwa ya tupu mgbe dị anya gara aga.”—Taịtọs  1:2. *

Otú obodo Babịlọn dị ugbu a

BAỊBỤL GA-AGBANWELI NDỤ GỊ

18. Olee ihe Pọl kwuru gbasara “okwu Chineke”?

18 Anyị amụtala na e nweghị akwụkwọ ọ bụla dị́ ka Baịbụl. Ihe niile o kwuru bụ otu. Ihe ndị o kwuru gbasara sayensị na akụkọ ihe mere eme bụcha eziokwu. Ọ na-enyekwa anyị ndụmọdụ ndị bara uru. Ọtụtụ amụma ndị dị na ya emezuokwala. Ma, e nwere ihe ọzọ mere Baịbụl ji pụọ iche. Pọl onyeozi dere, sị: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.” Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?—Gụọ Ndị Hibru 4:12.

19, 20. (a) Olee otú Baịbụl ga-esi enyere gị aka ịmata ụdị onye ị bụ? (b) Oleekwa otú ị ga-esi gosi na obi dị gị ụtọ maka onyinye a Chineke nyere gị?

19 Baịbụl ga-agbanweli ndụ gị. O nwere ike inyere gị aka ịmata ụdị mmadụ ị bụ. O nwekwara ike inyere gị aka ịchọpụta ihe dị́ gị n’obi na otú i si ele ihe anya. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịna-eche na anyị hụrụ Chineke n’anya. Ma, otú anyị ga-esi egosi na anyị hụrụ ya n’anya n’eziokwu bụ ịna-eme ihe Baịbụl kwuru.

20 N’eziokwu, Baịbụl bụ akwụkwọ sí n’aka Chineke. Chineke chọrọ ka ị na-agụ ya, na-amụ ya, jirikwa ihe dị́ na ya kpọrọ ihe. Gosi na i ji onyinye a kpọrọ ihe, akwụsịkwala ịna-amụ ya. Ọ bụrụ na ị na-amụ ya, ị ga-aghọta ihe Chineke bu n’obi kee ụmụ mmadụ. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-amụtakwu ihe ahụ Chineke bu n’obi kee ụmụ mmadụ.

^ para. 6 Ụfọdụ ndị na-ekwu na Baịbụl anaghị ekwu otu ihe, ma ihe ahụ ha na-ekwu abụghị eziokwu. Gụọ Ụlọ Nche Jun 1, 2012 peeji nke 7. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ para. 16 Ị chọọ ịmụtakwu gbasara amụma ndị ọzọ dị́ na Baịbụl, gụọ peeji nke 27-29 na broshọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ para. 17 Mbibi e bibiri Babịlọn bụ naanị otu n’ime ọtụtụ amụma Baịbụl ndị mezurulanụ. I nwekwara ike ịgụ amụma ndị e buru banyere Jizọs Kraịst n’ihe nke 5 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

GỤKWUO GBASARA YA

Baịbụl Ọ̀ Na-ekwu Eziokwu?

Ọ bụrụ na Baịbụl bụ okwu Chineke, ọ ga-adị iche n’akwụkwọ ọ bụla ọzọ e detụrụla.

Olee Otú E Si Maliteghachi Ịkụzi Eziokwu Dị na Baịbụl?

Olee otú anyị si mara na ihe anyị na-akụzi taa bụ eziokwu dị na Baịbụl?