Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

 ISI NKE ASATỌ

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

1. Olee ekpere a maara nke ọma anyị na-aga ịmụ gbasara ya?

ỌTỤTỤ nde mmadụ maara ekpere a na-akpọ Ekpere Onyenwe Anyị ma ọ bụkwanụ Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe. Jizọs ji ekpere a kụziere ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere. Gịnị ka o kwuru n’ekpere ahụ? Gịnịkwa mere ekpere ahụ ji dị anyị mkpa taa?

2. Olee ihe atọ dị mkpa Jizọs sị ka anyị na-ekpe n’ekpere?

2 Jizọs sịrị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.’” (Gụọ Matiu 6:9-13.) Gịnị mere Jizọs ji kwuo ka anyị na-arịọ ihe atọ a?—Gụọ ihe nke 20 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

3. Gịnị ka anyị kwesịrị ịma banyere Alaeze Chineke?

3 Anyị amụtala n’akwụkwọ a na aha Chineke bụ Jehova. Anyị amụtakwala ihe bụ́ uche Chineke gbasara ụmụ mmadụ na ụwa. Ma, gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe ọ sịrị: “Ka alaeze gị bịa”? Ugbu a, ka anyị leba anya n’ihe Alaeze Chineke bụ, ihe ọ ga-emere anyị, na otú ọ ga-esi mee ka e doo aha Chineke nsọ.

GỊNỊ BỤ ALAEZE CHINEKE?

4. Gịnị bụ Alaeze Chineke, oleekwa onye bụ́ Eze ya?

4 Jehova hiwere otu ọchịchị n’eluigwe ma mee ka Jizọs bụrụ Eze ya. Baịbụl kpọrọ ọchịchị ahụ Alaeze Chineke. Jizọs bụ “Eze nke ndị na-achị achị dị ka ndị eze, na Onyenwenụ nke ndị na-achị achị dị ka ndị nwenụ.” (1 Timoti 6:15) Jizọs ga-emere anyị ọtụtụ ihe  ọma ọ na-enweghị onye ọchịchị ọ bụla bụ́ mmadụ ga-emeliri anyị ha. Ike ya karịkwara ike ndị ọchịchị niile nọ n’ụwa.

5. Olee ebe ọchịchị Chineke ga-esi na-achị? Oleekwa ebe ọ ga na-achị?

5 Abalị iri anọ a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ọ laghachiri eluigwe. Jehova mechara mee ya Eze Alaeze ya. (Ọrụ Ndịozi 2:33) Ọchịchị Chineke ga-emecha si n’eluigwe na-achị ụwa. (Mkpughe 11:15) Ọ bụ ya mere Baịbụl ji akpọ ya “Alaeze eluigwe.”—2 Timoti 4:18.

6, 7. Gịnị mere Jizọs ji ka onye ọchịchị ọ bụla bụ́ mmadụ mma?

6 Baịbụl kwuru na Jizọs karịrị onye ọchịchị ọ bụla bụ́ mmadụ n’ihi na ọ bụ “onye naanị ya nwere anwụghị anwụ.” (1 Timoti 6:16) Ndị ọchịchị niile bụ́ mmadụ na-emecha nwụọ, ma Jizọs agaghị anwụ anwụ. Ihe ọma niile Jizọs ga-emere anyị ga-adịru mgbe ebighị ebi.

7 Baịbụl buru amụma na Jizọs ga-abụ Eze na-ekpe ikpe ziri ezi ma nwee ọmịiko. Ọ sịrị: “Mmụọ Jehova ga-adakwasị ya, bụ́ mmụọ amamihe na nke nghọta, mmụọ ndụmọdụ na nke ịdị ike, mmụọ ihe ọmụma na nke egwu Jehova. Ihe na-atọ ya ụtọ ga-abụ ịtụ egwu Jehova. Ọ bụghị naanị ihe anya ya hụrụ ka ọ ga-eji na-ekpe ikpe, ọ gaghịkwa adọ aka ná ntị naanị dị ka ihe ntị ya nụrụ si dị. Ọ ga na-ekpe ndị ogbenye ikpe ezi omume.” (Aịzaya 11:2-4) Ị̀ ga-achọ ka ụdị onye a bụrụ eze gị?

8. Olee otú anyị si mara na e nwere ndị ga-eso Jizọs chịa?

8 Chineke họpụtara ụfọdụ ndị ka ha soro Jizọs chịa n’eluigwe. Pọl gwara Timoti, sị: “Ọ bụrụ na anyị anọgide na-atachi obi, anyị na ya ga-achịkwa achị  dị ka ndị eze.” (2 Timoti 2:12) Ole ka ndị ahụ ga-eso Jizọs chia ga-adị?

9. Mmadụ ole ga-eso Jizọs chịa? Olee mgbe Chineke bidoro ịhọrọ ha?

9 N’Isi nke Asaa, anyị kwuru na Jọn onyeozi hụrụ ọhụụ ebe Eze Jizọs na ndị eze ndị ọzọ dị́ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ nọ n’eluigwe. Ole ndị ka ndị eze ndị ọzọ a bụ? Jọn kwuru na “e dere aha [Jizọs] na aha Nna ya n’egedege ihu ha.” O kwukwara na “ndị a bụ ndị na-eso Nwa Atụrụ ahụ n’agbanyeghị ebe ọ na-eje,” nakwa na “e si n’etiti ụmụ mmadụ zụta ha.” (Gụọ Mkpughe 14:1, 4.) Ndị a bụ ezigbo Ndị Kraịst Chineke họpụtara ka ha na Jizọs ‘chịa ụwa dị ka ndị eze.’ Ha nwụọ, a na-akpọlite ha n’ọnwụ, ha agazie dịrị ndụ n’eluigwe. (Mkpughe 5:10) Kemgbe oge ndịozi Jizọs, Jehova na-ahọta ezigbo Ndị Kraịst ga-eso ná ndị eze ahụ dị́ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ.

10. Jehova haziri ka Jizọs na ụmụ mmadụ ụfọdụ soro chịa. Olee otú ihe a o mere si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya?

10 Jehova hụrụ anyị n’anya. Ọ bụ ya mere o ji hazie ka ụmụ mmadụ soro Jizọs chịa. Jizọs ga-achị anyị nke ọma n’ihi na ọnọdụ anyị doro ya anya. O nwere mgbe yanwa bụ mmadụ, ọ makwa ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata. Pọl sịrị na ihe banyere anyị na-emetụ Jizọs n’obi, na ọ ga-emere anyị ebere n’adịghị ike anyị, nakwa na “ọ bụ onye a nwalere n’ụzọ niile dị ka anyị onwe anyị.” (Ndị Hibru 4:15; 5:8) Ndị ahụ ga-eso Jizọs chịa makwa ọnọdụ anyị nke ọma. O nwere mgbe ezughị okè na ọrịa nyekwara ha nsogbu. Ihe ndị a na-eme ka obi sie anyị ike na Jizọs na ndị ya na ha ga-eso chịa ga-aghọta otú obi dị anyị, nakwa nsogbu ndị anyị na-enwe.

 GỊNỊ KA ALAEZE CHINEKE GA-EMERE ANYỊ?

11. Gini mere Jizọs ji kụziere ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere ka uche Chineke mee n’ụwa dị ka ọ na-eme n’eluigwe?

11 Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere ka uche Chineke mee n’ụwa dị ka ọ na-eme n’eluigwe. Chineke bi n’eluigwe, ndị mmụọ ozi na-erubere ya isi, na-emekwa uche ya mgbe niile. Ma, anyị mụtara n’Isi nke Atọ na otu mmụọ ozi kwụsịrị ime uche Chineke ma mee ka Adam na Iv mehie. N’Isi nke Iri, anyị ga-amatakwu gbasara mmụọ ozi ahụ, bụ́ onye a na-akpọ Setan na Ekwensu. Mgbe Setan na ụfọdụ ndị mmụọ ozi nupụụrụ Jehova isi, ọ chụpụghị ha n’eluigwe ozugbo ahụ. N’ihi ya, ọ bụghị onye ọ bụla nọ n’eluigwe mgbe ahụ na-eme uche Chineke. Ma, ihe ga-agbanwe ma Alaeze Chineke malite ịchị n’eluigwe.

12. Olee ihe abụọ dị mkpa e kwuru n’akwụkwọ Mkpughe 12:10?

12 Baịbụl kwuru na ozugbo e chichara Jizọs Eze nke Alaeze Chineke, ọ ga-ebuso Setan agha. (Gụọ Mkpughe 12:7-10.) Mkpughe 12:10 kwuru ihe abụọ dị oké mkpa ga-emenụ. Nke mbụ bụ na a ga-ehiwe Alaeze Chineke, Jizọs abụrụkwa Eze ya, nke abụọ abụrụ na a ga-achụdata Setan n’ụwa. Ka anyị na-amụ akwụkwọ a na-aga, anyị ga-ahụ na ihe abụọ a emechaala.

13. Gịnị mere n’eluigwe mgbe a chụpụrụ Setan?

13 Baịbụl kwuru ihe gosiri na obi tọrọ ndị mmụọ ozi ụtọ mgbe a chụpụrụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe. Ọ sịrị: “Ṅụrịanụ ọṅụ, gị eluigwe na unu ndị bi n’ime ya!” (Mkpughe 12:12) Ugbu a, ndị niile nọ n’eluigwe dị n’udo, dịrịkwa n’otu n’ihi na ha niile na-eme uche Chineke.

Kemgbe a chụdatara Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa, ahụhụ ejuziela ebe niile. Ma, ọ ga-emecha kwụsị

14. Olee ihe na-eme n’ụwa n’ihi na a chụdatala Ekwensu?

 14 Ma, otú ahụ ọ dị n’eluigwe abụghị otú ọ dị n’ụwa. Ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata bịara karịa akarịa ‘n’ihi na Ekwensu agbadatawo n’ebe ha nọ, na-ewekwa oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.’ (Mkpughe 12:12) Ọnụma juru Setan obi. A chụpụla ya n’eluigwe. Ọ makwa na a na-aga ịla ya n’iyi n’oge na-adịghị anya. Ọ na-agbalịzi ike ya niile ịhụ na nsogbu na ahụhụ juru n’ụwa.

15. Olee ihe bụ́ uche Chineke maka ụwa?

15 Ma, uche Chineke maka ụwa agbanwebeghị. Ọ ka chọrọ ka ụmụ mmadụ zuru oké biri na paradaịs ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:29) Oleezi otú Alaeze Chineke ga-esi emezu ihe a bụ́ uche Chineke?

16, 17. Olee ihe Daniel 2:44 gwara anyị gbasara Alaeze Chineke?

16 Na Daniel 2:44, e buru amụma, sị: “Ma n’ụbọchị ndị eze ahụ, Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.” Gịnị ka amụma a na-akụziri anyị banyere Alaeze Chineke?

17 Ihe mbụ ọ na-akụziri anyị bụ na Alaeze Chineke ga-amalite ịchị “n’ụbọchị ndị eze ahụ,” ya bụ, n’oge ụmụ mmadụ ka na-achị. Ihe nke abụọ ọ na-akụziri anyị bụ na Alaeze Chineke ga-adịru ebighị ebi, na o nweghị ọchịchị ọzọ ga-anọchi ya. Ihe nke atọ ọ na-akụziri anyị bụ na Alaeze Chineke na ọchịchị ụmụ mmadụ ga-alụ agha. Alaeze Chineke ga-emeri n’agha ahụ, naanị ya achịwazie ụwa niile. Mgbe ahụ, ụmụ mmadụ ga-enwe ọchịchị kacha mma.

18. Gịnị ka a kpọrọ agha ikpeazụ Alaeze Chineke na ọchịchị ụmụ mmadụ ga-alụ?

 18 Olee ihe ga-emenụ tupu Alaeze Chineke ebido chịwa ụwa? Tupu a lụọ agha ikpeazụ a na-akpọ agha Amagedọn, ndị mmụọ ọjọọ ga-eduhie “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi, ka ha kpọkọta ha maka ibu agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” Nke a pụtara na ọchịchị ụmụ mmadụ ga-ebuso Alaeze Chineke agha.—Mkpughe 16:14, 16; gụọ ihe nke 10 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

19, 20. Olee ihe mere Alaeze Chineke ji dị anyị mkpa?

19 Gịnị mere Alaeze Chineke ji dị anyị mkpa? Ọ dịkarịa ala, e nwere ihe atọ mere o ji dị anyị mkpa. Nke mbụ bụ na anyị bụ ndị mmehie. Ọ bụ ya mere anyị ji na-arịa ọrịa ma na-anwụ anwụ. Ma, Baịbụl kwuru na mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa, anyị ga-adị ndụ ebighị ebi. Jọn 3:16 kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”

20 Ihe nke abụọ mere Alaeze Chineke ji dị anyị mkpa bụ na ndị ọjọọ ka nọ n’ụwa a. Ọtụtụ ndị na-agha ụgha, na-aghọ aghụghọ, ma na-ebi ndụ rụrụ arụ. Anyị agaghị ewepụli ụdị ndị a n’ụwa. Ma, Chineke ga-ewepụ ha. A ga-ebibi ndị kpọrọ ekwe nkụ na-eme ihe ọjọọ n’Amagedọn. (Gụọ Abụ Ọma 37:10.) Ihe nke atọ mere Alaeze Chineke ji dị anyị mkpa bụ na ọchịchị ụmụ mmadụ enweghị ike iwepụ nsogbu ụmụ mmadụ. Ha na-achị anyị ọchịchị nchịgbu, na-arụrụkwa aka. Ha anaghị akụziri ndị mmadụ otú ha ga-esi na-erubere Chineke isi. Baịbụl kwuru na ‘mmadụ achịwo mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.’—Ekliziastis 8:9.

21. Olee otú Alaeze Chineke ga-esi mee ka uche Chineke mee n’ụwa?

 21 A lụchaa agha Amagedọn, Alaeze Chineke ga-eme ka uche Chineke mee n’ụwa. Dị ka ihe atụ, ọ ga-ewepụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. (Mkpughe 20:1-3) O nweghịzi onye ga na-arịa ọrịa ma ọ bụ na-anwụ anwụ. N’ihi àjà mgbapụta Jizọs, ndị ezi omume niile ga-enwezi ike ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs. (Mkpughe 22:1-3) Alaeze Chineke ga-emekwa ka e doo aha Chineke nsọ. Ọ pụtara na mgbe ọ ga-achịwa, mmadụ niile nọ n’ụwa ga na-edo aha Jehova nsọ.—Gụọ ihe nke 21 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

OLEE MGBE JIZỌS GHỌRỌ EZE?

22. Olee otú anyị si mara na e meghị Jizọs Eze mgbe ọ ka nọ n’ụwa ma ọ bụkwanụ ozugbo a kpọlitechara ya n’ọnwụ?

22 Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere ‘ka Alaeze Chineke bia.’ Ihe a o kwuru gosiri na Alaeze Chineke ka ga-abịa n’ọdịnihu. Jehova ga-ebu ụzọ hiwe ọchịchị ya ma mee Jizọs Eze ga-achị ọchịchị a. Ma, è mere Jizọs eze ozugbo ọ laghachiri n’eluigwe? Mba. O cheretụụrụ. Obere oge a kpọlitechara  Jizọs n’ọnwụ, Pita na Pọl kwuru ihe gosiri na Jizọs cheretụụrụ. Ha mere ka a mata na amụma ahụ e buru n’Abụ Ọma 110:1 ga-emezu n’isi Jizọs. N’amụma ahụ, Jehova kwuru, sị: “Nọdụ ala n’aka nri m, ruo mgbe m debere ndị iro gị ka ha bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ gị.” (Ọrụ Ndịozi 2:32-35; Ndị Hibru 10:12, 13) Jizọs ò cheere ruo ole mgbe tupu Jehova e mee ya Eze?

Alaeze Chineke ga-eme ka uche Chineke mee n’ụwa

23. (a) Olee mgbe Jizọs ghọrọ Eze Alaeze Chineke? (b) Olee ihe anyị ga-amụ n’isiokwu na-esonụ?

23 Ọtụtụ afọ tupu afọ 1914, mmadụ ole na ole bụ́ ezigbo Ndị Kraịst ghọtara na afọ 1914 ga-abụ afọ dị ezigbo mkpa n’amụma Baịbụl. Ihe ndị mere n’afọ ahụ gosiri na ihe ha ghọtara bụ eziokwu. Ọ bụ n’afọ ahụ ka Jizọs ghọrọ Eze. (Abụ Ọma 110:2) Obere oge ọ ghọchara Eze, a chụdatara Setan n’ụwa, ‘o nwekwara oge dị mkpirikpi.’ (Mkpughe 12:12) N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-ahụ ihe ndị gosiri na anyị bizi n’oge ikpeazụ. Anyị ga-amụtakwa na n’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-eme ka uche Chineke mee n’ụwa.—Gụọ ihe nke 22 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.