Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

 ISI NKE IRI NA ABỤỌ

Olee Otú Ị Ga-esi Bụrụ Enyi Chineke?

Olee Otú Ị Ga-esi Bụrụ Enyi Chineke?

1, 2. Olee ụfọdụ ndị ha na Jehova bụ enyi n’oge ochie?

OLEE ụdị onye ị chọrọ ka ọ bụrụ enyi gị? Ọ bụ onye ihe ya na-adị gị mma. Onye ihe na-adabara gị na ya, onye nwere obiọma na àgwà ndị na-amasị gị.

2 Jehova Chineke na-ahọrọ ụfọdụ ndị ka ha bụrụ ndị enyi ya. Dị ka ihe atụ, Ebreham bụ otu n’ime ndị enyi Jehova. (Aịzaya 41:8; Jems 2:23) Ihe Devid masịkwara Jehova. Jehova sịrị na ọ bụ ‘nwoke obi ya nabatara.’ (Ọrụ Ndịozi 13:22) Daniel onye amụma bụkwa onye Jehova “hụrụ n’anya nke ukwuu.”—Daniel 9:23.

3. Gịnị mere Ebreham, Devid, na Daniel ji bụrụ enyi Jehova?

3 Olee otú Ebreham, Devid, na Daniel si bụrụ enyi Jehova? Jehova gwara Ebreham, sị: “I gewo ntị n’olu m.” (Jenesis 22:18) Ọ bụ ndị ji obi ha niile na-erubere Jehova isi ka ha na ya na-abụ enyi. Mmadụ niile nọ n’otu mba nwedịrị ike ịbụ enyi ya. Jehova gwara mba Izrel, sị: “Rubenụ isi n’ihe m kwuru, m ga-abụ Chineke unu, unu ga-abụkwa ndị m.” (Jeremaya 7:23) N’ihi ya, ị chọọ ịbụ enyi Jehova, i kwesịrị ịna-erubere ya isi.

JEHOVA NA-ECHEBE NDỊ ENYI YA

4, 5. Olee otú Jehova si echebe ndị enyi ya?

4 Baịbụl kwuru na Jehova na-achọ ụzọ ọ ga-esi “gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.” (2 Ihe E Mere 16:9) N’Abụ Ọma 32:8, Jehova kwere onye  ọ bụla bụ́ enyi ya nkwa, sị: “M ga-eme ka i nwee nghọta, zikwa gị ụzọ ị ga-eso. M ga-enye gị ndụmọdụ, anya m ga-adị n’ebe ị nọ.”

5 E nwere otu ajọ onye iro chọrọ ime ka anyị ghara ịbụ enyi Chineke. Ma, Jehova chọrọ ichebe anyị. (Gụọ Abụ Ọma 55:22.) Ebe anyị bụ ndị enyi Jehova, anyị ji obi anyị niile na-efe ya. Anyị na-eme ihe ọ na-achọ, ma mgbe ihe na-esiri anyị ike. Obi sikwara anyị ike otú ahụ o siri Devid. O kwuru banyere Jehova, sị: “N’ihi na ọ nọ m n’aka nri, a gaghị eme ka m maa jijiji.” (Abụ Ọma 16:8; 63:8) Olee otú Setan si eme ka anyị ghara ịbụ enyi Chineke?

EBUBO SETAN BORO ỤMỤ MMADỤ

6. Gịnị ka Setan kwuru banyere ụmụ mmadụ?

6 N’Isi nke Iri na Otu n’akwụkwọ a, anyị mụtara na Setan boro Jehova ebubo na ọ bụ onye ụgha nakwa na iwu o nyere Adam na Iv adịghị mma n’ihi na ọ hapụghị ha ka ha na-ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Akwụkwọ Job mekwara ka anyị mara na Setan na-ebo ndị chọrọ ịbụ enyi Chineke ebubo. O kwuru na ha na-efe Chineke n’ihi ihe ọma ọ na-emere ha, ọ bụghị n’ihi na ha hụrụ ya n’anya. O kwudịrị na ya ga-emeli ka a ghara inwe onye ọ bụla ga-efe Chineke. Ka anyị leba anya n’ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Job na otú Jehova si chebe ya.

7, 8. (a) Olee otú Jehova si were Job? (b) Gịnị ka Setan kwuru banyere Job?

7 Ònye bụ Job? Ọ bụ ezigbo mmadụ. Ọ dịrị ndụ ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ isii gara aga. Jehova sịrị na e nweghị onye dị ka Job n’ụwa n’oge ahụ. Ọ na-akwanyere Chineke ùgwù, kpọọkwa ihe ọjọọ asị. (Job 1:8) N’eziokwu, Job bụ ezigbo enyi Jehova.

 8 Setan boro Job ebubo na ọ na-efe Chineke n’ihi ihe Chineke na-emere ya. Setan gwara Jehova, sị: “Ọ̀ bụ na ị gbaghị ya ogige gburugburu, gbaakwa ụlọ ya na ihe niile o nwere ogige gburugburu? Ị gọziwo ọrụ aka ya, anụ ụlọ ya agbasawokwa ebe niile n’ụwa. Ma, iji nwee ihe dị iche, biko, matịa aka gị, metụ ihe niile o nwere, lee ma ọ́ gaghị akọcha gị n’ihu gị.”—Job 1:10, 11.

9. Gịnị ka Jehova kwere ka Setan mee?

9 Setan kwuru na Job na-efe Jehova n’ihi ihe ọma Jehova na-emere ya. O kwukwara na ya ga-emeli ka Job kwụsị ife Jehova. Jehova ma na ihe ahụ Setan kwuru bụ ụgha. Ma, o kwere ka Setan nwaa Job ka a mata ma ihe mere Job ji bụrụ enyi ya ọ̀ bụ maka na Job hụrụ ya n’anya.

SETAN ANWAA JOB

10. Olee otú Setan si nwaa Job? Oleekwanụ ihe Job mere?

10 N’ọnwụnwa nke mbụ Setan nwara Job, o mere ka e zuru anụmanụ ya, gbuokwa ndị nke fọrọ afọ. Setan mekwara ka e gbuo ọtụtụ ndị na-ejere Job ozi. Ihe niile Job nwere gwụrụ. N’ikpeazụ, Setan ji oké ifufe gbuo ụmụ iri Job. N’agbanyeghị ihe ndị a, Job akwụsịghị ife Jehova. Baịbụl kwuru, sị: “N’ihe a niile, Job emehieghị, o kwujọghịkwa Chineke.”—Job 1:12-19, 22.

Jehova gọziri Job maka na ọ nọgidere bụrụ enyi ya

11. (a) Gịnị ọzọ ka Setan mere Job? (b) Gịnịkwa ka Job mere?

11 Ike agwụghị Setan. Ọ gwara Chineke, sị: “Matịa aka gị metụ ọbụna ọkpụkpụ ya na anụ ahụ́ ya, lee ma ọ́ gaghị akọcha gị n’ihu gị.” Setan kụrụ Job ajọ ọrịa. (Job 2:5, 7) Ma, Job akwụsịghị ife Jehova. Ọ sịrị: “Ruo mgbe m kubiri ume, m gaghị akwụsị iguzosi ike n’ezi ihe!”—Job 27:5.

12. Olee otú Job si gosi na Setan bụ onye ụgha?

 12 Job amaghị ihe ọ bụla banyere ebubo Setan boro ya ma ọ bụ ihe mere o ji na-atagbu onwe ya n’ahụhụ. O chere na ọ bụ Jehova ka o si n’aka. (Job 6:4; 16:11-14) N’agbanyeghị nke ahụ, Job akwụsịghị ife Jehova. Ugbu a, o doola anya na ihe mere Job ji bụrụ enyi Jehova abụghị n’ihi ihe ọma Jehova na-emere ya. Kama, ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ Jehova n’anya. Nke a gosiri na ihe niile ahụ Setan kwuru bụ ụgha.

13. Gịnị ka Jehova meere Job maka na ọ nọgidere na-efe ya?

13 N’agbanyeghị na Job amaghị ihe na-aga n’eluigwe, ọ nọgidere na-efe Chineke ma gosi na Setan bụ onye ọjọọ. Jehova gọziri Job n’ihi na ọ nọgidere na-atụkwasị ya obi, bụrụkwa enyi ya.—Job 42:12-17.

EBUBO SETAN NA-EBO GỊ

14, 15. Olee ebubo Setan boro ndị niile na-efe Chineke?

14 I nwere ike ịmụta ezigbo ihe n’ihe mere Job. Taa, Setan na-ebo anyị ebubo na anyị na-efe Jehova n’ihi ihe ndị ọ na-emere anyị. Na Job 2:4, Setan kwuru, sị: Ihe ọ bụla mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ mkpụrụ obi ya.” Ọ pụtara na Setan na-ebo mmadụ niile na-efe Jehova ebubo na ha na-efe Jehova n’ihi ihe ndị ọ na-emere ha. Ọ bụghị naanị Job ka o boro ebubo a. Ọtụtụ narị afọ Job nwụchara, Setan ka nọ na-akparị Jehova ma na-ebo ndị ohu ya ebubo. Ọ bụ ya mere Jehova ji kwuo n’Ilu 27:11, sị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaa onye na-akwa m emo [ma ọ bụ onye na-akparị m] okwu.”

15 I nwere ike ịhọrọ irubere Jehova isi ma bụrụ ezigbo enyi ya, si otú ahụ mee Setan onye ụgha. Ọ bụrụgodị na ị ga-agbanwe àgwà gị ka ị bụrụ enyi Chineke,  gbanwee ya n’ihi na ọ bụ ihe kacha mma ị ga-eme. Ọ bụghị ihe e ji egwu egwu. Setan kwuru na nsogbu bịara gị, ị ga-akwụsị ife Chineke. Ọ na-emegharị anyị anya ka anyị kwụsị ife Chineke. Olee otú o si eme ya?

16. (a) Olee ụzọ dị iche iche Setan si eme ka ndị mmadụ ghara ife Jehova? (b) Olee otú Ekwensu nwere ike isi mee ka gịnwa ghara ife Jehova?

16 Setan na-esi n’ụzọ dị iche iche eme ka anyị ghara ịbụ enyi Chineke. Ọ na-agbọ ụja “dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.” (1 Pita 5:8) Ya ejula gị anya ma ndị enyi gị, ndị ezinụlọ unu, ma ọ bụ ndị ọzọ chọọ ka ị kwụsị ịmụ Baịbụl na ime ihe dị mma. O nwere ike ịdị gị ka ọ̀ bụ Ekwensu na-alụso gị ọgụ. * (Jọn 15:19, 20) Setan na-emekwa onwe ya ka o yie “mmụọ ozi nke ìhè.” O nwere ike chọọ ịghọgbu anyị ka anyị nupụrụ Jehova isi. (2 Ndị Kọrịnt 11:14) Ụzọ ọzọ Setan si eme ka anyị kwụsị ife Jehova bụ ime ka anyị chee na anyị agaghị efeli Jehova.—Ilu 24:10.

RUBERE JEHOVA ISI

17. Gịnị mere anyị ji erubere Jehova isi?

17 Mgbe ọ bụla anyị rubeere Jehova isi, anyị na-eme Setan onye ụgha. Gịnị ga-enyere anyị aka irubere Jehova isi? Baịbụl kwuru, sị: “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Diuterọnọmi 6:5) Ihe mere anyị ji erubere Jehova isi bụ na anyị hụrụ ya n’anya. Ka anyị na-ahụkwu Jehova n’anya, anyị ga-achọ ime ihe niile  ọ gwara anyị mee. Jọn onyeozi dere, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu; ma ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.”—1 Jọn 5:3.

18, 19. (a) Olee ihe ụfọdụ Jehova gwara anyị na ha adịghị mma? (b) Olee otú anyị si mara na Jehova anaghị agwa anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli?

18 Ma, gịnị bụ ihe ụfọdụ Jehova gwara anyị na ha adịghị mma? E depụtara ụfọdụ n’ime ha n’igbe isiokwu ya bụ “ Kpọọ Ihe Jehova Kpọrọ Asị Asị.” I lee ha anya elu elu, i nwere ike iche na ụfọdụ n’ime ha adịchaghị njọ. Ma, mgbe ị gụrụ amaokwu Baịbụl ndị dị n’okpuru ha ma chebara ha echiche, ị ga-ahụ na irube isi n’iwu ndị ahụ Jehova nyere dị mma. I nwekwara ike ịchọpụta na i kwesịrị ịgbanwe otú i si ebi ndụ. N’agbanyeghị na ime otú ahụ anaghị adịcha mfe, ọ bụrụ na i jisie ike gbanwee ya, obi ga-eru gị ala, obi atọọkwa gị ụtọ n’ihi na ị bụ ezigbo enyi Chineke.  (Aịzaya 48:17, 18) Olee otú anyị si mara na anyị ga-agbanweli otú anyị si ebi ndụ?

19 Jehova anaghị agwa anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. (Diuterọnọmi 30:11-14) Ebe ọ bụ ezigbo enyi anyị, ọ ma anyị karịa otú anyị ma onwe anyị. Ọ ma ebe anyị na-eme nke ọma na ebe anyị na-anaghị emecha nke ọma. (Abụ Ọma 103:14) Pọl onyeozi gwara anyị, sị: “Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu gabiga ihe unu pụrụ idi, kama mgbe ọnwụnwa bịara, ọ ga-emere unu ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike idi ya.” (1 Ndị Kọrịnt 10:13) Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-enye anyị ike anyị ga-eji na-eme ihe dị mma. Ọ ga-enye gị “ike karịrị ike nkịtị” ka i nwee ike idi nsogbu ndị nwere ike ịbịara gị. (2 Ndị Kọrịnt 4:7) Mgbe Jehova nyechaara Pọl aka n’oge ọ nọ ná nsogbu, Pọl kwuru, sị: “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.”—Ndị Filipaị 4:13.

 MỤTA ỊNA-EME IHE DỊ CHINEKE MMA

20. Olee àgwà ndị i kwesịrị ịna-akpa? Gịnị mere i ji kwesị ịna-akpa ha?

20 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ enyi Jehova, anyị ga-akwụsị ime ihe Jehova sịrị na ha adịghị mma. Ma, e nwere ihe ndị ọzọ anyị ga-eme. (Ndị Rom 12:9) Ndị enyi Chineke na-eme ihe dị Chineke mma. E kwuru ụfọdụ n’ime ha n’Abụ Ọma 15:1-5. (Gụọ ya.) Ndị enyi Jehova na-akpa àgwà ka ya. Ihe e ji mara ha bụ ‘ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, na njide onwe onye.’—Ndị Galeshia 5:22, 23.

21. Olee otú ị ga-esi mụta ịkpa àgwà ndị dị Chineke mma?

21 Olee otú ị ga-esi mụta ịkpa àgwà ọma ndị ahụ? Ihe ga-enyere gị aka bụ ịna-amụ Baịbụl kwa ụbọchị, si otú ahụ mata ihe ndị dị Jehova mma. (Aịzaya 30:20, 21) Ka ị na-amụ Baịbụl, ị ga-ahụkwu Jehova n’anya, ịhụnanya ahụ ga-emekwa ka ị chọọ irubere ya isi.

22. Gịnị ka Jehova ga-emere gị ma i rubere ya isi?

22 Ịgbanwe àgwà gị dị ka iyipụ efe ochie ma yiri nke ọhụrụ. Baịbụl kwuru na i kwesịrị ‘iyipụ mmadụ ochie’ ma yiri “mmadụ ọhụrụ.” (Ndị Kọlọsi 3:9, 10) N’agbanyeghị na o nwere ike isiri anyị ike, ma ọ bụrụ na anyị agbanwee àgwà anyị ma na-erubere Jehova isi, o kwere anyị nkwa na ọ ga-akwụ anyị “ụgwọ ọrụ dị ukwuu.” (Abụ Ọma 19:11) N’ihi ya, na-erubere Jehova isi ma mee Setan onye ụgha. Na-efe Jehova, ọ bụghị n’ihi ihe ọ ga-emere gị n’ọdịnihu, kama, n’ihi na i ji obi gị niile hụ ya n’anya. I mee otú ahụ, ị ga-abụ ezigbo enyi Chineke.

^ para. 16 Ọ pụtaghị na ọ bụ Setan dunyere ndị ahụ chọrọ ime ka ị kwụsị ịmụ Baịbụl. Ma, Baịbụl kwuru na Setan bụ “chi nke usoro ihe a,” nakwa na ‘ụwa dum dị n’aka ya.’ N’ihi ya, o kwesịghị iju gị anya ma ndị mmadụ chọọ ka ị ghara ife Jehova.—2 Ndị Kọrịnt 4:4; 1 Jọn 5:19.

GỤKWUO GBASARA YA

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ)

Olee Otú Anyị Ga-esi Gosi na Anyị Hụrụ Jehova n’Anya?

Ọ gbasaghị naanị otú ọ dị anyị n’obi.