Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Kụziere Ụmụ Gị Ihe

 ISI NKE 8

Ndị Enyi Josaya Na-eme Ihe Dị Mma

Ndị Enyi Josaya Na-eme Ihe Dị Mma

Ì chere na ime ihe dị mma siri ike?— Ọtụtụ ndị na-ekwu na o siri ike. O nwere otu nwatakịrị nwoke Baịbụl kọrọ akụkọ ya. Aha ya bụ Josaya. Ime ihe dị mma siiri ya ike. Ma, ndị enyi ya na-eme ihe dị mma. Ha nyeere ya aka, ya amalite ime ihe dị mma. Ka anyị mụọ gbasara Josaya na ndị enyi ya.

Aha papa Josaya bụ Emọn. Ọ bụ eze Juda. Ọ bụghị ezigbo mmadụ. Ọ na-efe arụsị. Mgbe ọ nwụrụ, Josaya ghọrọ eze Juda. Josaya dị naanị afọ asatọ mgbe ahụ. Ì chere na ọ bụ ajọ mmadụ ka papa ya?— Mba.

Zefanaya gwara ndị Juda ka ha kwụsị ife arụsị

Ọ malitere mgbe ọ ka bụ nwata chọwa otú ọ ga-esi mee ihe Jehova chọrọ. Ọ bụ ya mere o ji mete naanị ndị hụrụ Jehova n’anya enyi. Ha nyekwaara ya aka ịna-eme ihe dị mma. Gịnị bụ aha ụfọdụ ndị enyi ya ahụ?

Aha otu n’ime ha bụ Zefanaya. Ọ bụ onye amụma. Ọ bụ ya gwara ndị Juda na Jehova ga-ata ha ahụhụ ma ọ bụrụ  na ha akwụsịghị ife arụsị. Josaya gere ntị n’ihe ahụ Zefanaya gwara ndị Juda. Ọ bụ ya mere na o feghị arụsị, kama o fere Jehova.

Onye ọzọ bụ́ enyi Josaya bụ Jeremaya. Ya na Josaya bụ ọgbọ, ha tokọkwara. Ụlọ ha dịkwa nso n’ụlọ Josaya hà. Ha abụọ bụ ezigbo enyi. Ọ bụ ya mere Jeremaya ji bụọ abụ mgbe Josaya nwụrụ. Ihe ọ bụrụ n’abụ ahụ gosiri na ọnwụ Josaya wutere ya. Ha abụọ nyeere ibe ha aka ime ihe Jehova na-achọ.

Josaya na Jeremaya nyeere ibe ha aka ime ihe dị mma

Gịnị ka ị mụtara n’aka Josaya?— Josaya malitere mgbe ọ bụ nwatakịrị chọwa otú ọ ga-esi na-eme ihe dị Chineke mma. Ọ ma na ndị o kwesịrị imete enyi bụ ndị hụrụ Jehova n’anya. Jisie ike na-emete ndị hụrụ Jehova n’anya enyi ka ha nyere gị aka ịna-eme ihe dị mma.

GỤỌ EBE NDỊ A NA BAỊBỤL GỊ