Ọ̀ na-adịrị gị mfe irubere papa gị na mama gị isi?— Ọ naghị adịcha mfe. Ị̀ ma na Jizọs rubeere Jehova isi, rubekwara papa ya na mama ya isi?— I nwere ike ịmụta ihe n’aka ya. Ihe ị ga-amụta ga-enyere gị aka ịna-erubere papa gị na mama gị isi, a sịgodị na ọ na-esiri gị ike. Ka anyị mụọ gbasara Jizọs.

Tupu Jizọs abịa n’ụwa, ya na nna ya bụ́ Jehova nọ n’eluigwe. Ma, o nwere papa na mama mgbe ọ bịara n’ụwa. Aha papa ya bụ Josef, aha mama ya abụrụ Meri. Ị̀ ma otú ha si bịa bụrụ papa ya na mama ya?—

Jehova bufere Jizọs n’afọ Meri. Otú Meri si tụrụ ime Jizọs bụ ọrụ ebube. Ma, ọ bụ otú ahụ ụmụaka si ebu n’afọ mama ha ka Jizọs si buo n’afọ Meri. Mgbe ihe dị ka ọnwa itoolu gara, Meri mụrụ Jizọs. Otú ahụ ka Meri na di ya bụ́ Josef si bụrụ mama na papa Jizọs.

Mgbe Jizọs dị naanị afọ iri na abụọ, o mere ihe gosiri na o ji obi ya niile hụ nna ya bụ́ Jehova n’anya. Josef na-adị akpọ ndị ezinụlọ ya aga Jeruselem maka Ememme Ngabiga. Ọ bụ ememme ha ji echeta otú Jehova si napụta ndị Izrel n’aka ndị Ijipt. Mgbe Jizọs dị afọ iri na abụọ, ya na papa ya na mama ya na ụmụnne ya gara Jeruselem maka ememme ahụ. Mgbe ha na-alọta, Josef na Meri ahụghị Jizọs. Ị̀ ma ebe ọ nọ?—

Gịnị mere Jizọs ji nọrọ n’ụlọ nsọ?

Ha chọọrọ ya gaghachi Jeruselem. Obi erughị ha ala maka na ha ahụghị ya. Ma, ka ụbọchị atọ gachara, ha hụrụ ya n’ụlọ nsọ. Ị̀ ma ihe mere Jizọs ji nọrọ n’ụlọ nsọ?— Ọ bụ maka na ọ ga-amụta banyere nna ya bụ́ Jehova n’ebe ahụ. Ọ hụrụ ya n’anya, chọọkwa ịmụta otú ọ ga-esi na-eme ihe dị ya mma. Mgbe Jizọs toro, ọ nọkwa na-erubere Jehova isi. Mgbe Jizọs ma na irubere Jehova isi ga-esiri ya ike nakwa na a ga-ata ya ahụhụ, ọ nọgidekwara na-erubere ya isi. Jizọs ò rubekwuuru Josef na Meri isi?— Ee. Baịbụl kwuru na o rubeere ha isi.

Olee ihe ị mụtara n’aka Jizọs?— I kwesịrị ịna-erubere papa gị na mama gị isi, ọ sọgodị ya ya bụrụ na o siiri gị ike. Ị̀ ga na-erubere ha isi?—

GỤỌ EBE NDỊ A NA BAỊBỤL GỊ