Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Kụziere Ụmụ Gị Ihe

 ISI NKE 1

Ihe A Na-amabughị Chineke Mere Ka Anyị Mara

Ihe A Na-amabughị Chineke Mere Ka Anyị Mara

Ò nwetụla ihe mmadụ gwara gị, sị gị agwakwala ya onye ọzọ?— * E nwere ike ikwu na ihe ahụ bụ ihe nzuzo. E nwere ihe Baịbụl kpọrọ “ihe nzuzo dị nsọ.” Ihe mere o ji kpọọ ya ihe dị nsọ bụ na o si n’aka Chineke. Ihe mere o ji kpọọkwa ya ihe nzuzo bụ na ndị mmadụ amabughị ya. Ndị mmụọ ozi chọkwara ịma ihe ahụ. Ị̀ chọrọ ịma ihe ihe ahụ bụ?—

Gịnị ka ì chere ndị mmụọ ozi a chọrọ ịma?

N’oge ochie mgbe Chineke kere ụwa, o kere nwoke mbụ na nwaanyị mbụ. Aha ha bụ Adam na Iv. Chineke nyere ha ebe mara mma ha bi. Ebe ahụ bụ ogige Iden. A sị na Adam na Iv mere ihe Chineke gwara ha, ha na ụmụ ha gaara eme ka ụwa niile maa mma ka ogige Iden. Ha gakwaara ebi na Paradaịs ruo mgbe ebighị ebi. Ma, ì chetara ihe Adam na Iv mere?—

Adam na Iv mere ihe Chineke sị ha emela. Ọ bụ ya mere na anyị ebighị na paradaịs ugbu a. Ma, Chineke sịrị na ya ga-eme ka ụwa niile maa mma. Ndị ga-ebi na ya ga na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Olee otú Chineke ga-esi eme ihe a niile? Ruo ọtụtụ afọ, ndị mmadụ amaghị otú ọ ga-esi eme ihe a. Chineke agwaghị ya onye ọ bụla.

Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, ọ kụzikwuuru ndị mmadụ banyere ihe ahụ ha na-amabughị. Ọ gwara ha na ọ gbasara Alaeze Chineke. Jizọs gwara ndị mmadụ ka ha na-ekpe ekpere ka Alaeze ahụ bịa. Ọ ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs.

Obi ọ̀ dị gị ụtọ maka ihe a Chineke mere ka anyị mara?— Cheta na ọ bụ naanị ndị na-eme ihe Jehova gwara anyị mee ga-ebi na Paradaịs. Baịbụl kwuru na e nwere ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị rubeere Jehova isi. Ị̀ chọrọ ịma banyere ha?— Ka anyị mụọ banyere ụfọdụ n’ime ha. Anyị ga-amụtakwa otú anyị ga-esi na-eme ka ha.

^ para. 3 N’ọtụtụ ebe n’akwụkwọ a, ị ga-ahụ ebe a kara akara a (—) n’ebe a jụrụ ajụjụ. I ruo ebe ahụ, cheretụ ka nwatakịrị ị na-akụziri ihe zaa ajụjụ ahụ.