Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 99

Jizọs Agwọọ Ndị Ìsì, Nyerekwa Zakịọs Aka

Jizọs Agwọọ Ndị Ìsì, Nyerekwa Zakịọs Aka

MATIU 20:29-34 MAK 10:46-52 LUK 18:35–19:10

  • JIZỌS AGWỌỌ NDỊ ÌSÌ NA JERIKO

  • ZAKỊỌS ONYE ỌNAỤTỤ ECHEGHARỊA

Jizọs na ndị ha na ya so na-aga abịarutela Jeriko. Isi Jeriko ruo Jeruselem na-ewe ihe dị ka otu ụbọchị. E nwere ike ikwu na e nwere obodo abụọ a na-akpọ Jeriko. Jeriko nke ochie dị ihe dị ka otu kilomita na ọkara ma e si ya gawa Jeriko nke ọhụrụ, nke e wuru mgbe ndị Rom na-achị. Ka Jizọs na ndị ha na ya so si n’otu n’ime obodo ndị a na-aga na nke ọzọ, ndị ìsì abụọ na-arịọ arịrịọ nụrụ ka ndị mmadụ na-eme mkpọtụ. Aha otu n’ime ha bụ Batimiọs.

Mgbe ha nụrụ na Jizọs na-agafe, Batimiọs na onye ìsì nke ọzọ bidoro na-eti mkpu, sị: “Onyenwe anyị, meere anyị ebere, Nwa Devid!” (Matiu 20:30) Ụfọdụ ndị so n’ìgwè mmadụ ahụ gwara ha ka ha mechie ọnụ, ma ha tisiwere mkpu ike. Mgbe Jizọs nụrụ mkpu ha na-eti, ọ kwụsịrị, gwa ndị ha na ya so ka ha kpọọ ndị ahụ na-eti mkpu. Ha gakwuuru ndị ìsì ahụ ma gwa otu n’ime ha, sị: “Nwee obi ike, bilie, ọ na-akpọ gị.” (Mak 10:49) Obi tọrọ ya ụtọ, ya eyipụ uwe elu ya, bilie n’ike, gawa ebe Jizọs nọ.

Jizọs jụrụ ya, sị: “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” Ha abụọ rịọrọ ya, sị: “Onyenwe anyị, ka e meghee anya anyị.” (Matiu 20:32, 33) Jizọs metaara ha ebere ma metụ anya ha aka, gwazie otu n’ime ha, sị: “Lawa, okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma.” (Mak 10:52) Ndị ìsì abụọ ahụ malitere hụwa ụzọ, bidokwa towe Chineke. Mgbe ndị mmadụ hụrụ ihe merenụ, ha malitekwara ito Chineke. Mmadụ abụọ ahụ kpuburu ìsì malitere soro Jizọs na-aga.

Ọtụtụ ìgwè mmadụ gbara Jizọs gburugburu ka o si na Jeriko na-agafe. Onye ọ bụla chọrọ ịhụ onye ahụ gwọrọ ndị ìsì abụọ ahụ. Ha nọ na-adagide Jizọs nke na ụfọdụ ndị enwedịghị ike ịhụ ya anya. Ọ bụ otú a ka ọ dị otu nwoke aha ya bụ Zakịọs. Ọ bụ onyeisi nke ndị ọnaụtụ e nwere na Jeriko nakwa n’ebe ndị dị ya nso. Zakịọs dị mkpụmkpụ. N’ihi ya, o nweghị ike ịhụ Jizọs. Ọ gbaara ọsọ gaa n’ihu, gaa rịgoro n’elu osisi fig ọhịa dị n’ụzọ ebe Jizọs ga-esi agafe. Zakịọs nọzi n’elu ebe ahụ na-ahụ ihe na-emenụ nke ọma. Mgbe Jizọs rutere ebe ahụ hụ Zakịọs n’elu osisi, ọ sịrị ya: “Zakịọs, mee ọsọ ọsọ rịdata, n’ihi na aghaghị m ịnọ n’ụlọ gị taa.” (Luk 19:5) Zakịọs mere ngwa ngwa rịdata, gbara lawa n’ụlọ ka ọ gaa kwadebe maka onye ọbịa a pụrụ iche.

Mgbe ndị mmadụ hụrụ ihe na-emenụ, ha bidoro ịtamu ntamu. Ha chere na o kwesịghị ekwesị ka Jizọs gaa nọrọ n’ụlọ nwoke ha weere ka onye mmehie. Zakịọs bara ọgaranya n’ihi ego ọ na-eji aghụghọ anara ndị mmadụ ma ọ nawa ha ụtụ isi.

Mgbe Jizọs banyere n’ụlọ Zakịọs, ndị mmadụ nọ na-atamu ntamu, na-asị: “Nwoke bụ́ onye mmehie ka ọ gara nọrọ n’ụlọ ya.” Ma, Jizọs  achọpụtala na Zakịọs ga-echegharịli. O chegharịkwara. O biliri ọtọ, gwa Jizọs, sị: “Lee! Onyenwe anyị, ọkara nke ihe m nwere ka m ga-enye ndị ogbenye, ihe ọ bụla m pụnaara onye ọ bụla site n’ebubo ụgha, m ga-enyeghachi ya okpukpu anọ.”—Luk 19:7, 8.

Ihe a Zakịọs kwuru gosiri n’eziokwu na o chegharịala. O nwere ike ịbụ na ọ ga-eji akwụkwọ o ji edekọ ụtụ ndị ọ na-anata gbakọọ ego ole ọ naara ndị mmadụ. O kwekwara nkwa na ọ ga-akwụghachi ha okpukpu anọ. Ọ chọdịrị ime karịa ihe iwu Chineke kwuru. (Ọpụpụ 22:1; Levitikọs 6:2-5) Ihe ọzọ bụkwa na Zakịọs kwere nkwa inye ndị ogbenye ọkara ihe o nwere.

Obi tọrọ Jizọs ụtọ maka otú a Zakịọs si gosi na ya echegharịala. Ọ gwara Zakịọs, sị: “Nzọpụta abịawo n’ụlọ a taa, n’ihi na ya onwe ya bụ nwa Ebreham. N’ihi na Nwa nke mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ihe furu efu.”—Luk 19:9, 10.

Jizọs emebuola ihe atụ banyere nwa furu efu. (Luk 15:11-24) Ugbu a, o gosila ha onye e nwere ike ikwu na o furu efu, ma e mechaa chọta ya. Ndị ndú okpukpe na ndị òtù ha nwere ike ịna-akatọ Jizọs maka inyere ndị dị ka Zakịọs aka. Ma n’agbanyeghị nke a, Jizọs nọgidere na-achọ ma na-akpọghachite ụmụ Ebreham ndị furu efu.