Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 85

Ịṅụrị Ọṅụ n’Ihi Onye Mmehie Chegharịrịnụ

Ịṅụrị Ọṅụ n’Ihi Onye Mmehie Chegharịrịnụ

LUK 15:1-10

  • IHE ATỤ GBASARA ATỤRỤ FURU EFU NA MKPỤRỤ EGO FURU EFU

  • NDỊ MMỤỌ OZI NỌ N’ELUIGWE NA-AṄỤRỊ ỌṄỤ

N’oge Jizọs na-ekwusa ozi ọma, o kwuru ọtụtụ ugboro uru ọ bara mmadụ ịdị umeala n’obi. (Luk 14:8-11) Ọ na-agụsi ya agụụ ike ịhụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị chọrọ iji obi umeala fee Chineke. Ruo ugbu a, ụfọdụ n’ime ndị ga-emecha fewe Chineke ka bụ ndị mmehie a ma ama.

Ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ chọpụtara na ndị dị otú ahụ, bụ́ ndị ha weere ka ndị na-abaghị uru, na-abịakwute Jizọs ma na-ege ya ntị. Ha tamuru ntamu, sị: “Nwoke a na-anabata ndị mmehie, sorokwa ha na-eri ihe.” (Luk 15:2) Ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ chere na ha ka ndị ọzọ mma. Ha wekwaara ndị nkịtị ka unyi dị n’okpuru akpụkpọ ụkwụ ha. Iji gosi otú ha si eleda ndị dị otú ahụ anya, ha na-akpọ ha aha Hibru bụ́ ‛am ha·’aʹrets , nke pụtara “ndị dị ala.”

Ma, Jizọs ewereghị ha otú ahụ. Ọ na-akwanyere mmadụ niile ùgwù, jirikwa obiọma na ọmịiko na-emeso ha ihe. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị ọ na-enweghị ihe e ji ha kpọrọ, tinyere ndị na-aṅụ mmehie ka mmiri, ji na-ege ya ntị. Ma, olee otú obi dị Jizọs ná nkatọ a a na-akatọ ya na ọ na-enyere ndị dị ala aka? Oleekwa ihe o mere gbasara nkatọ ahụ?

Azịza ajụjụ ndị a bịara doo anya mgbe Jizọs mere ihe atụ na-emetụ n’ahụ́. Ihe atụ a yiri nke o mere na Kapaniọm. (Matiu 18:12-14) N’ihe atụ a, Jizọs mere ka o yie ka ndị Farisii hà bụ ndị ezi omume na atụrụ ndị nọ n’ogige atụrụ Chineke. Ma, o mere ka ndị nkịtị yie atụrụ furu efu. Jizọs kwuru, sị:

“Ònye n’ime unu nke nwere otu narị atụrụ, ka ọ ga-abụ, ọ bụrụ na otu n’ime ha efuo, ya aghara ịhapụ iri itoolu na itoolu n’ala ịkpa gaa chọwa nke ahụ furu efu ruo mgbe ọ chọtara ya? Mgbe ọ chọtara ya, ọ na-ekukwasị ya n’ubu ya ma na-aṅụrị ọṅụ. Mgbe ọ laruru ụlọ, ọ na-akpọkọta ndị enyi ya na ndị agbata obi ya, sị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ, n’ihi na achọtawo m atụrụ m nke furu efu.’”—Luk 15:4-6.

Gịnị ka Jizọs ji ihe atụ a kụzie? O kwuru, sị: “Ana m asị unu na otú ahụ ka a ga-enwe ọṅụ dị ukwuu n’eluigwe n’ihi otu onye mmehie nke chegharịrịnụ karịa n’ihi ndị ezi omume iri itoolu na itoolu, ndị nchegharị na-adịghị mkpa.”—Luk 15:7.

Mgbe Jizọs kwuru banyere nchegharị, ọ ga-abụ na ọ fụrụ ndị Farisii ụfụ n’obi. Ha weere onwe ha ka ndị ezi omume, n’ihi ya, na nchegharị adịghị ha mkpa. Mgbe ụfọdụ n’ime ha katọrọ Jizọs afọ ole na ole gara aga maka na ya na ndị ọnaụtụ na ndị mmehie na-erikọ nri, ọ gwara ha, sị: “Ọ bụghị ndị ezi omume ka m bịara ịkpọ, kama ọ bụ ndị mmehie.” (Mak 2:15-17) Ndị Farisii ahụ,  bụ́ ndị chere na ha bụ ndị ezi omume, amaghị na ha kwesịrị ichegharị. Ebe ha na-echegharịghị, ha emeghị ka ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe ṅụrịa ọṅụ. Ma, ọ bụrụ na onye mmehie echegharịa, ndị mmụọ ozi na-aṅụrị ọṅụ.

Jizọs mere ka o dokwuo anya na ọṅụ na-adị n’eluigwe ma onye mmehie chegharịa. O ji ihe na-eme n’ụlọ meere ndị ọ na-agwa okwu ihe atụ ọzọ. Ọ sịrị: “Olee nwaanyị nke nwere mkpụrụ ego drakma iri, nke ọ ga-abụ, ọ bụrụ na otu mkpụrụ ego drakma efunahụ ya, ya aghara ịmụnye oriọna ma zachaa ụlọ ya, chọọkwa ya nke ọma ruo mgbe ọ chọtara ya? Mgbe ọ chọtara ya, ọ na-akpọkọta ndị inyom bụ́ ndị enyi ya na ndị agbata obi ya, sị, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ, n’ihi na achọtawo m mkpụrụ ego drakma funahụrụ m.’”—Luk 15:8, 9.

Ihe Jizọs kwuru mgbe o mechara ihe atụ a yiri ihe o kwuru mgbe o mechara ihe atụ gbasara atụrụ furu efu. Ọ sịrị: “Otú ahụkwa, ana m asị unu, ndị mmụọ ozi Chineke ga-enwe ọṅụ n’ihi otu onye mmehie nke chegharịrịnụ.”—Luk 15:10.

Ị̀ hụrụ na obi na-atọ ndị mmụọ ozi Chineke ụtọ ma ndị mmehie chegharịa? Ihe a ndị mmụọ ozi na-eme dị ezigbo mkpa n’ihi na ọ bụrụ na ndị mmehie echegharịa ma mechaa soro Jizọs chịwa n’Alaeze eluigwe, ọkwá ha ga-aka nke ndị mmụọ ozi. (1 Ndị Kọrịnt 6:2, 3) N’agbanyeghị nke ahụ, ndị mmụọ ozi anaghị emere onye mmehie chegharịrịnụ anyaụfụ. Ebe ọ dị otú ahụ, olee otú obi kwesịrị ịdị anyị ma onye mmehie jiri obi ya niile chegharịa?