Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 68

Ọkpara Chineke Bụ “Ìhè nke Ụwa”

Ọkpara Chineke Bụ “Ìhè nke Ụwa”

JỌN 8:12-36

  • JIZỌS AKỌWAA ONYE ỌKPARA CHINEKE BỤ

  • OLEE OTÚ NDỊ JUU SI BỤRỤ NDỊ OHU?

N’ụbọchị ikpeazụ nke Ememme Ụlọ Ndò ahụ a na-eme na Jeruselem, Jizọs nọ na-akụzi ihe n’ụlọ nsọ, n’akụkụ ebe “a na-edebe ego.” (Jọn 8:20; Luk 21:1) Ọ ga-abụ na ebe a a na-edebe ego dị n’ebe a na-akpọ Ogige Ụmụ Nwaanyị. Ọ bụ ebe a ka ndị mmadụ na-eweta onyinye ha.

N’abalị ọ bụla n’oge ememme a, a na-amụnye nnukwu oriọna anọ n’ebe a a na-eweta onyinye ka ọ na-enye ìhè. A na-agbajukwa mmanụ ọkụ n’ime efere mmanụ oriọna ndị ahụ. Ọkụ oriọna ndị a na-achasi nnọọ ike nke na ìhè ọ na-enye na-eru ebe niile ma ebe dị anya. Jizọs gwaziri ha, sị: “Abụ m ìhè nke ụwa. Onye na-eso m agaghị eje ije n’ọchịchịrị ma ọlị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.” Ọ ga-abụ na ihe a Jizọs kwuru mere ka uche ndị mmadụ gbaga n’oriọna ndị ahụ na-enye ìhè n’ebe ahụ.—Jọn 8:12.

Ndị Farisii ekwetaghị ihe a Jizọs kwuru. Ha sịrị ya: “Ị na-agba àmà banyere onwe gị; àmà gị abụghị eziokwu.” Jizọs zaziri ha, sị: “Ọ bụrụgodị na m na-agba àmà banyere onwe m, àmà m bụ eziokwu, n’ihi na amaara m ebe m si bịa na ebe m na-aga. Ma unu amaghị ebe m si bịa na ebe m na-aga.” Ọ gwakwara ha, sị: “E dekwara n’Iwu unu, sị, ‘Àmà mmadụ abụọ gbara bụ eziokwu.’ Ọ bụ m na-agba àmà banyere onwe m, Nna m nke zitere m na-agbakwa àmà banyere m.”—Jọn 8:13-18.

Ma, ndị Farisii anabataghị ihe o kwuru. Ha jụrụ ya, sị: “Olee ebe Nna gị nọ?” Jizọs gwara ha hoo haa, sị: “Unu amaghị m, unu amaghịkwa Nna m. Ọ bụrụ na unu maara m, unu gaara amakwa Nna m.” (Jọn 8:19) N’agbanyeghị na ndị Farisii ahụ chọrọ ijide Jizọs, ma ha emetụghị ya aka.

Jizọs kwughachiziri ihe o kwuburu, sị: “Ana m ala, unu ga-achọkwa m, ma unu ga-anwụ n’ime mmehie unu. Unu apụghị ịbịa ebe m na-aga.” Ma, ndị Juu aghọtaghị ihe Jizọs na-ekwu. Kama ọ gbara ha gharịị, ha asị: “Ọ̀ na-aga igbu onwe  ya? N’ihi na ọ na-ekwu, sị, ‘Unu apụghị ịbịa ebe m na-aga.’” Ihe mere ha aghọtaghị ihe Jizọs na-ekwu bụ n’ihi na ha amaghị ebe o si bịa. Jizọs gwaziri ha, sị: “Unu si n’ebe dị n’ala; esi m n’ebe dị n’elu. Unu si n’ụwa a; esighị m n’ụwa a.”—Jọn 8:21-23.

Ihe Jizọs na-ekwu bụ na ya dịbu ndụ n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa, nakwa na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ ma ọ bụ Kraịst ahụ e kwere ná nkwa, onye ndị ndú okpukpe a kwesịrị ịmata. N’agbanyeghị ihe ndị ahụ Jizọs gwara ha, ha jụrụ ya ajụjụ mkparị, sị ya: “Ònye ka ị bụ?”—Jọn 8:25.

Ma Jizọs zara ha, sị: “Gịnịdị mere m ji atụpụrụ unu ọnụ?” Ọ gwaziri ha banyere Nna ya na ihe mere ndị Juu kwesịrị iji gee yanwa bụ́ Ọkpara ya ntị. Ọ sịrị: “Onye zitere m bụ onye eziokwu, ihe m nụrụ n’ọnụ ya ka m na-ekwu n’ụwa.”—Jọn 8:25, 26.

Ndị Juu atụkwasịghị Nna Jizọs obi, ma, Jizọs kwuru ihe gosiri na ọ tụkwasịrị Nna ya obi. Ọ sịrị: “Ozugbo unu buliri Nwa nke mmadụ elu, mgbe ahụ ka unu ga-amara na ọ bụ m bụ ya, na adịghịkwa m eme ihe ọ bụla n’uche nke aka m; kama m na-ekwu ihe ndị a dị nnọọ ka Nna m kụziiri m. Onye zitere m nọnyeere m; ọ hapụghị m ka m nọrọ naanị m, n’ihi na m na-eme ihe dị ya mma mgbe niile.”—Jọn 8:28, 29.

Ma, e nwere ụfọdụ ndị Juu kweere na Jizọs. Jizọs gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m, unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”—Jọn 8:31, 32.

Ma, ụfọdụ n’ime ha nọ na-eche na Jizọs ekwesịghị ikwuwe okwu ha inwere onwe ha. Ha sịrị: “Anyị bụ ụmụ Ebreham, anyị abụtụbeghị ohu onye ọ bụla. Olee ihe mere i ji asị, ‘Unu ga-enwere onwe unu’?” Ndị Juu ma na o nweela mgbe ndị mba ọzọ chịrị ha, ma, ha anaghị ekwe ka a kpọọ ha ndị ohu. Ma, Jizọs mere ka ha mata na ha ka bụkwa ndị ohu. Ọ gwara ha, sị: “N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, Onye ọ bụla nke na-eme mmehie bụ ohu nke mmehie.”—Jọn 8:33, 34.

Ọjụjụ a ndị Juu jụrụ ikweta na ha bụ ndị ohu mmehie mere ka ha nọrọ n’ọnọdụ jọgburu onwe ya. Jizọs gwara ha, sị: “Ohu adịghịkwa anọ n’ezinụlọ ruo mgbe ebighị ebi; nwa na-anọ ruo mgbe ebighị ebi.” (Jọn 8:35) Ohu enweghị ihe nketa ọ bụla n’ụlọ nna ya ukwu, e nwekwara ike ịchụpụ ya mgbe ọ bụla. Ọ bụ naanị nwa nwoke a mụrụ n’ezinụlọ ma ọ bụkwanụ nke e kuchiri ekuchi na-anọgide n’ezinụlọ “ruo mgbe ebighị ebi,” ya bụ, ruo oge niile ọ dị ndụ.

Eziokwu banyere Ọkpara Chineke na-eme ka ndị mmadụ gharazie ịbụ ohu mmehie nke na-eme ka anyị na-anwụ anwụ. Jizọs sịrị: “Ya mere, ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu, unu ga-enwere onwe unu n’ezie.—Jọn 8:36.