Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 ISI NKE 77

Jizọs Enye Ndụmọdụ Gbasara Ịba Ọgaranya

Jizọs Enye Ndụmọdụ Gbasara Ịba Ọgaranya

LUK 12:1-34

  • JIZỌS EMEE IHE ATỤ GBASARA NWOKE BARA ỌGARANYA

  • JIZỌS EKWUO GBASARA UGOLOỌMA NA OKOOKO LILI

  • A “ÌGWÈ ATỤRỤ NTA” GA-EKETA ALAEZE ELUIGWE

Mgbe Jizọs na-eri ihe n’ụlọ onye Farisii ahụ, ọtụtụ puku mmadụ gbakọtara n’èzí na-eche ya. Ụdị ihe a mere ugboro ugboro n’oge ọ nọ na Galili. (Mak 1:33; 2:2; 3:9) Ugbu a ọ nọ na Judia, ọtụtụ ndị chọrọ ịhụ ya na ịnụ ihe ọ na-ekwu. Ihe a ha mere dị iche n’ihe ndị Farisii mere mgbe ha na Jizọs na-eri nri.

Mgbe Jizọs malitere okwu ya, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Lezienụ anya maka ihe iko achịcha ndị Farisii, ya bụ, ihu abụọ.” Jizọs ekwubuola ihe a, ma ihe ọ hụrụ mgbe ahụ ya na ndị Farisii na-eri nri gosiri na ha kwesịrị ibido ozugbo ahụ leziwe anya. (Luk 12:1; Mak 8:15) Ndị Farisii nwere ike ịna-eme nsọ nsọ n’ihu ndị mmadụ ka a ghara ịmata ihe ọjọọ ha na-eme. Ma, e kwesịrị ịgba omume ọjọọ ha n’anwụ. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo, sị: “Ọ dịghị ihe ọ bụla e zochiri nke ọma nke a na-agaghị ekpughe, ọ dịghịkwa ihe nzuzo nke a na-agaghị amata.”—Luk 12:2.

O nwere ike ịbụ na ọtụtụ n’ime ndị gbakọtara ịnụ okwu Jizọs bụ ndị Judia na-ahụtụbeghị ya mgbe ọ na-akụzi ihe na Galili. N’ihi ya, o kwughachiri ihe ndị bụ́ isi o kwuburu. Ọ gwara ndị niile gbakọtaranụ, sị: “Unu atụla egwu ndị na-egbu ahụ́, mgbe ha mesịrị nke a, ha enweghị ike ime ihe ọ bụla ọzọ.” (Luk 12:4) Ọ gwasiri ndị na-eso ụzọ ya ike, dị ka o mere na mbụ, na ha kwesịrị ịtụkwasị Chineke obi na ọ ga-egboro ha mkpa ha. O mekwara ka ha ghọta na ha kwesịrị ikwupụta Nwa nke mmadụ n’ihu ndị mmadụ, obi esiekwa ha ike na Chineke ga-enyere ha aka.—Matiu 10:19, 20, 26-33; 12:31, 32.

Ka Jizọs na-ekwu ihe ndị a, otu nwoke n’ime ndị nọ ebe ahụ kpesaara ya, sị: “Onye Ozizi, gwa nwanne m nwoke ka mụ na ya kee ihe nketa anyị.” (Luk 12:13) Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel kwuru na a ga-enye onye bụ́ ọkpara òkè abụọ n’ihe niile nna ya nwere. N’ihi ya, o kwesịghị isewere ha okwu. (Diuterọnọmi 21:17) O yiri ka nwoke ahụ ọ̀ chọrọ ka e kenye ya ihe karịrị ihe o kwesịrị iketa. Jizọs etinyeghị ọnụ n’okwu ahụ. Ọ jụrụ nwoke ahụ, sị: “Nwoke m, ònye mere m ọkàikpe ma ọ bụ onye na-ekere unu ihe?”—Luk 12:14.

Jizọs gwaziri mmadụ niile nọ ebe ahụ, sị: “Ghewenụ anya unu oghe, lezienụ anya ka unu ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla, n’ihi na ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.” (Luk 12:15) N’agbanyeghị otú mmadụ si baruo ọgaranya, otu ụbọchị, ọ ga-ahapụ ihe niile o nwere nwụọ. Jizọs meziri ihe atụ gosiri na ihe a o kwuru bụ eziokwu. Ihe atụ a gosikwara na anyị na Chineke kwesịrị ịdị ná mma.

Jizọs sịrị: “Ala nke otu onye bara ọgaranya mepụtara ihe nke ọma. N’ihi ya, ọ malitere iche n’obi ya, sị, ‘Gịnị ka m ga-eme, ebe ọ bụ na mụ enweghị ebe ọ bụla m ga-achịkọta ihe ubi m?’ Ya mere, ọ sịrị: ‘Ihe m ga-eme bụ: M ga-etidasị ụlọ nkwakọba ihe m ma wuo ndị ka ibu, n’ebe ahụ ka m ga-achịkọta mkpụrụ m niile na ezi ihe m niile; m ga-asịkwa mkpụrụ obi m: “Mkpụrụ obi, i nwere ọtụtụ ezi ihe m kpakọbara maka ọtụtụ afọ; tụsara ahụ́, na-eri, na-aṅụ, mee onwe gị obi ụtọ.”’ Ma Chineke sịrị ya: ‘Onye na-enweghị uche, n’abalị a ka a na-achọ mkpụrụ obi gị n’aka gị. Ònye ga-enwezi ihe ndị ị kwakọbara?’ Otú ahụ ka ọ ga-adịrị onye na-akpakọbara onwe ya akụ̀ ma ghara ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ.”—Luk 12:16-21.

Ndị na-eso ụzọ Jizọs na ndị ọzọ, bụ́ ndị nụrụ ihe Jizọs kwuru, nwere ike ịchọ ịna-akpakọba akụ̀ ma ọ bụkwanụ na-eme otú ahụ. Nchegbu nke ndụ nwekwara ike ime ka ha kwụsị ife Jehova. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwughachi ihe o kwuru otu afọ na ọnwa isii gara aga mgbe ọ na-ezi ihe n’elu ugwu.

 Jizọs kwuru, sị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere mkpụrụ obi unu maka ihe unu ga-eri ma ọ bụ banyere ahụ́ unu maka ihe unu ga-eyi. . . . Rịbanụ ama nke ọma na ugoloọma adịghị akụ mkpụrụ, ha adịghịkwa ewe ihe ubi, ha enweghịkwa ọba ma ọ bụ ụlọ nkwakọba ihe, ma Chineke na-enye ha nri. Ọ̀ bụ na unu adịghị oké ọnụ ahịa karịa nnụnụ? . . . Rịbanụ ama nke ọma otú okooko lili si eto, ha adịghị adọgbu onwe ha n’ọrụ, ha adịghịkwa atụ ogho; ma ana m asị unu, ọbụna Sọlọmọn, n’ebube ya niile, eyighị uwe mara mma dị ka otu n’ime ha. . . . Ya mere, kwụsịnụ ịnọ na-achọ ihe unu ga-eri na ihe unu ga-aṅụ, kwụsịkwanụ ịnọ na-echegbu onwe unu . . . Nna unu maara na ihe ndị a dị unu mkpa. . . . Na-achọnụ alaeze ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a.”—Luk 12:22-31; Matiu 6:25-33.

Ole ndị ga na-achọ Alaeze Chineke? Jizọs kwuru na ọ bụ ụmụ mmadụ ole na ole kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ kpọrọ ha “ìgwè atụrụ nta.” Ka oge na-aga, e mere ka a mata na ha dị naanị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. Olee ihe Chineke ga-emere ha? Jizọs gwara ha, sị: “Ọ dị Nna unu mma inye unu alaeze.” Mkpa ha agaghị abụ ịkpakọbara onwe ha akụ̀ n’ụwa, bụ́ ihe ndị ohi nwere ike izu. Kama, obi ha niile ga-adị ‘n’akụ̀ nke na-adịghị agwụ agwụ n’eluigwe,’ bụ́ ebe ha na Kraịst ga-anọ na-achị ụwa.—Luk 12:32-34.