Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 138

Kraịst Anọrọ n’Aka Nri Chineke

Kraịst Anọrọ n’Aka Nri Chineke

ỌRỤ NDỊOZI 7:56

  • JIZỌS ANỌRỌ N’AKA NRI CHINEKE

  • SỌL AGHỌỌ ONYE NA-ESO ỤZỌ JIZỌS

  • IHE MERE ANYỊ GA-EJI NA-AṄỤRỊ ỌṄỤ

Abalị iri Jizọs laghachichara n’eluigwe, a wụsara ndị na-eso ụzọ ya mmụọ nsọ n’ụbọchị Pentikọst. Nke ahụ gosiri n’eziokwu na Jizọs nọzi n’eluigwe. E nwere ihe ọzọ gosiri na Jizọs nọzi n’eluigwe. Obere oge tupu e jiri nkume tụgbuo Stivin maka na ọ na-ekwusa ozi ọma, Stivin kwuru, sị: “Lee! Ana m ahụ eluigwe ka e meghere ya nakwa Nwa nke mmadụ ka o guzo n’aka nri Chineke.”—Ọrụ Ndịozi 7:56.

Ka Jizọs na Nna ya nọ n’eluigwe, ọ ga-echere ka Nna ya gwa ya otu ihe e buru n’amụma n’Okwu Chineke. Ihe ahụ bụ ihe Chineke nyere Devid mmụọ nsọ, ya edee. Ọ sịrị: “Ihe Jehova gwara Onyenwe m [Jizọs] bụ: ‘Nọdụ ala n’aka nri m ruo mgbe m debere ndị iro gị ka ha bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ gị.’” Mgbe oge Jizọs ga-echere n’aka nri Chineke zuru, ọ ga-aga “na-enwe mmeri n’etiti ndị iro [ya].” (Abụ Ọma 110:1, 2) Ma, olee ihe Jizọs ga na-eme n’eluigwe ka ọ na-eche ka oge zuo ka o nwewe mmeri n’etiti ndị iro ya?

Na Pentikọst nke afọ 33, a malitere inwe ọgbakọ Ndị Kraịst. Si mgbe ahụ gawa, Jizọs si n’eluigwe na-achị ndị na-eso ụzọ ya e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. (Ndị Kọlọsi 1:13) O nyeere ha aka n’ozi ọma ha na-ekwusa, kwadebekwa ha maka ihe ha ga-eme n’ọdịnihu. Olee ihe ha ga-eme n’ọdịnihu? Ọ bụrụ na ha anọgide na-efe Chineke ruo ọnwụ, a ga-akpọlite ha n’ọnwụ, ha esoro Jizọs na-achị n’Alaeze eluigwe.

Otu n’ime ndị ga-emecha soro Jizọs chịa bụ otu nwoke aha ya bụ Sọl. Ma, aha a kacha jiri mara ya bụ aha Rom ya bụ́ Pọl. Ọ bụ onye Juu. O jikwa obi ya niile na-edebe Iwu Chineke ruo ọtụtụ afọ. Ma, ndị ndú okpukpe ndị Juu duhiere ya nke na ọ kwadoro ogbugbu e gburu Stivin. Mgbe ọ ka “na-eyi ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị egwu, na-achọsikwa ike igbu ha,” o tinyere isi n’ụzọ Damaskọs. Nnukwu onye nchụàjà aha ya bụ Keyafas nyere ya ikike ijide ndị na-eso ụzọ Jizọs ma kpụrụ ha laghachi Jeruselem. (Ọrụ Ndịozi 7:58; 9:1) Ma, mgbe Sọl nọ n’ụzọ, ìhè dị ukwuu nwuru gburugburu ya, ya adaa n’ala.

Mgbe ahụ, otu olu si n’eluigwe jụọ ya, sị: “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?” Sọl jụrụ onye nwe olu ahụ, sị: “Ị̀ bụ onye, Onyenwe anyị?” Onye ahụ gwara ya, sị: “Abụ m Jizọs, onye ị na-akpagbu.”—Ọrụ Ndịozi 9:4, 5.

 Jizọs gwara Sọl ka ọ banye na Damaskọs na a ga-agwa ya ihe ọ ga-eme. Ma, e du ya edu banye na Damaskọs n’ihi na ìhè ahụ si n’eluigwe mere ka ọ gharazie ịhụ ụzọ. Mgbe ihe ndị a mechara, Jizọs pụtara n’ọhụụ gwa otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya bi na Damaskọs ka ọ chọrọ Sọl gaa na nke onye ọ gwara ya. Aha onye ahụ na-eso ụzọ Jizọs bụ Ananayas. Ozi a Jizọs dunyere Ananayas tụrụ Ananayas ụjọ. N’ihi ya, Jizọs mesiri ya obi ike, sị: “Nwoke a bụ arịa m họọrọ ka o buru aha m gakwuru ndị mba ọzọ, gakwurukwa ndị eze na ụmụ Izrel.” Sọl mechara hụwa ụzọ, ma nọrọ na Damaskọs ebe ahụ ‘malite ikwusa Jizọs, na ọ bụ ya bụ Ọkpara Chineke.’—Ọrụ Ndịozi 9:15, 20.

Jizọs nyeere Pọl na ndị ọzọ aka, ha ana-ekwusa ozi ọma yanwa malitere. Chineke gọziri nnọọ ozi ọma ha na-ekwusa. Mgbe o mere ihe dị ka afọ iri abụọ na ise Jizọs pụtachara n’ihu Pọl, n’oge Pọl na-aga Damaskọs, Pọl dere na e kwusaala ozi ọma “n’etiti ihe niile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.”—Ndị Kọlọsi 1:23.

Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Jizọs mere ka Jọn, bụ́ onyeozi ya ọ hụrụ n’anya, hụ ọhụụ dị iche iche. Ọhụụ ndị ahụ dị n’akwụkwọ Mkpughe. N’ihi ọhụụ ndị ahụ Jọn hụrụ, e nwere ike ikwu na ọ dị ndụ hụ Jizọs mgbe ọ malitere ịchị n’Alaeze eluigwe. (Jọn 21:22) “Site n’ike mmụọ nsọ, [Jọn nọrọ] n’ụbọchị Onyenwe anyị.” (Mkpughe 1:10) Oleekwanụ mgbe ụbọchị Onyenwe anyị malitere?

Ọ bụrụ na mmadụ amụọ amụma dị na Baịbụl nke ọma, ọ ga-achọpụta na ‘ụbọchị Onyenwe anyị’ malitere n’oge anyị a. N’afọ 1914, agha e mechara kpọwa Agha Ụwa Mbụ malitere. Kemgbe ahụ, ihe juru ebe niile n’ụwa bụ agha, ọrịa na-efe efe, agụụ, ala ọma jijiji, na ihe ndị ọzọ. Ihe ndị a niile so ‘n’ihe ịrịba ama’ Jizọs kwuru ndịozi ya ga-eji mara oge “ọnụnọ” ya na “ọgwụgwụ” nke oge anyị a. (Matiu 24:3, 7, 8, 14) A na-ekwusazi ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa, ọ bụghị naanị n’ebe ndị Rom chịrị.

Chineke nyere Jọn mmụọ nsọ, ya edee ihe ihe ndị a pụtara. O dere, sị: “Nzọpụta na ike na alaeze nke Chineke anyị na ikike nke Kraịst ya amalitewo ugbu a.” (Mkpughe 12:10) N’eziokwu, Alaeze Chineke, bụ́ nke dị n’eluigwe, nke Jizọs kwusara ọtụtụ ebe gbasara ya, achịwala!

Ndị niile na-eso ụzọ Jizọs n’oge a na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na Alaeze Chineke achịwala. Ma, ha ga-eburukwa ihe a Jọn kwuru n’obi. Ọ sịrị: “N’ihi nke a, ṅụrịanụ ọṅụ, gị eluigwe na unu ndị bi n’ime ya! Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri, n’ihi na Ekwensu agbadatawo n’ebe unu nọ, ọ na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.”—Mkpughe 12:12.

Ihe ndị a niile gosiri na Jizọs anọghịzi n’aka nri Nna ya na-eche. Ọ bụ Eze ugbu a. N’oge na-adịghịkwa anya, ọ ga-ebibi ndị iro ya niile. (Ndị Hibru 10:12, 13) Olee ihe ndị magburu onwe ha ọ ga-eme ma o bibichaa ha?