Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 101

Jizọs Agaa Betani Rie Nri n’Ụlọ Saịmọn

Jizọs Agaa Betani Rie Nri n’Ụlọ Saịmọn

MATIU 26:6-13 MAK 14:3-9 JỌN 11:55–12:11

  • JIZỌS ALAGHACHI BETANI, BỤ́ OBODO DỊ NSO NA JERUSELEM

  • MERI AWỤSA JIZỌS MMANỤ NA-ESI ÍSÌ ỌMA

Jizọs hapụrụ Jeriko gawa Betani. Isi Jeriko gaa Betani dị ihe dị ka kilomita iri abụọ. Ụzọ ya adịghị mfe ọgịga n’ihi na ọ bụ ugwu ugwu. Lazarọs na ụmụnne ya nwaanyị abụọ bi n’obere obodo a a na-akpọ Betani. Obodo a dị ná mkpọda Ugwu Oliv. Isi Jeruselem gawa ya dị ihe dị ka kilomita atọ.

Ọtụtụ ndị Juu erutela Jeruselem maka Ememme Ngabiga. Ihe mere ha ji bịa ngwa ngwa bụ ka ha “mee onwe ha ka ha dị ọcha dị ka iwu kwuru” maka a dịghị ama ama ya abụrụ na ha metụrụ ozu aka ma ọ bụ mee ihe ọzọ mere ka ha ghara ịdị ọcha. (Jọn 11:55; Ọnụ Ọgụgụ 9:6-10) Ụfọdụ n’ime ndị a ruterela Jeruselem zukọtara n’ụlọ nsọ. Ha nọ na-ekwurịta ma Jizọs ọ̀ ga-abịa Ememme Ngabiga ahụ ka ọ̀ bụ na ọ gaghị abịa.—Jọn 11:56.

Ọtụtụ ndị mmadụ nọ na-arụrịta ụka banyere Jizọs. Ụfọdụ ndị isi okpukpe ndị Juu chọrọ ijide ya gbuo ya. Ha nyedịrị iwu na e nwee onye ma ebe Jizọs nọ, ya bịa kọọrọ ha, “ka ha wee jide ya.” (Jọn 11:57) Ndị isi okpukpe ahụ anwaadịla igbu Jizọs mgbe ahụ Jizọs kpọlitechara Lazarọs n’ọnwụ. (Jọn 11:49-53) N’ihi ya, ụfọdụ ndị nwere ike iche na Jizọs agaghị anwa anwa pụta ebe ndị mmadụ ga-ahụ ya ọzọ.

Jizọs rutere Betani na Fraịdee, “mgbe ọ fọrọ ụbọchị isii ka ememme ngabiga malite.” (Jọn 12:1) Ụbọchị na-esonụ (ya bụ, Ụbọchị Izu Ike, nke bụ́ abalị asatọ n’ọnwa Naịsan) ga-amalite mgbe anyanwụ dachara, nke pụtara na Jizọs rutere Betani tupu Ụbọchị Izu Ike amalite. Ọ gaghị esili Jeriko gaa Betani n’Ụbọchị Izu Ike, ya bụ, malite mgbe anyanwụ dachara na Fraịdee ruo mgbe anyanwụ dachara na Satọdee, n’ihi na o megidere Iwu ndị Juu. Mgbe Jizọs rutere Betani, ọ ga-abụ na ọ gawara n’ụlọ Lazarọs otú ọ na-emebu.

Saịmọn, onye bikwa na Betani, kpọrọ Jizọs na ndị ha na ya so nakwa Lazarọs ka ha bịa rie nri n’ụlọ ya ná mgbede Satọdee. A na-akpọ Saịmọn a “onye ekpenta.” O nwere ike ịbụ na ihe mere e ji akpọ ya onye ekpenta bụ n’ihi na ọ bụbu onye ekpenta tupu Jizọs agwọọ ya. Mgbe ahụ ha nọ n’ụlọ Saịmọn, Mata gosiri na ọ dị ike ọrụ n’ihi na ọ nọ na-ejere ha ozi. Ma, Meri meere Jizọs otu ihe pụrụ iche, nke kpatara nsogbu.

Meri mepere mkpọ̀ alabasta nke “mmanụ na-esi ísì ụtọ nke dị otu paụnd n’ịdị arọ, bụ́ ezigbo mmanụ nad.” (Jọn 12:3) Mmanụ a dị ezigbote oké ọnụ. A na-ere nke ha ka nke ahụ nwaanyị ahụ wetara narị dinarịọs atọ. Ọ ga-ewe onye ọrụ ihe dị ka otu afọ iji rụta ego ha otú a. Meri wụsara mmanụ a n’isi Jizọs nakwa n’ụkwụ ya ma jiri ntụtụ isi ya hichaa ya. Ísì mmanụ a bịara jupụta n’ụlọ ahụ dum.

Iwe bịara ndị na-eso ụzọ Jizọs, ha ajụwa, sị: “Gịnị mere e ji laa mmanụ a na-esi ísì ụtọ n’iyi otú a?” (Mak 14:4) Judas Iskarịọt jụkwara, sị: “Gịnị mere na e reghị mmanụ a na-esi ísì ụtọ narị mkpụrụ ego dinarịọs atọ ma nye ya ndị ogbenye?” (Jọn 12:5) Ihe mere Judas ji kwuo ihe ahụ abụghị n’ihi na ọ na-emetere ndị ogbenye ebere. O teela o zuwere ego dị n’igbe ego ọ na-ejidere ndị na-eso ụzọ.

Ma, Jizọs gbachiteere Meri. Ọ sịrị: “Gịnị mere unu ji na-enye nwaanyị a nsogbu? N’ihi na o meere m ihe ọma. N’ihi na unu na ndị ogbenye nọ mgbe niile, ma mụ na unu anọghị mgbe niile. N’ihi na mgbe nwaanyị a tere m mmanụ a na-esi ísì ụtọ n’ahụ́, o tere m ya iji kwadebe m maka olili. N’ezie, ana m asị unu, N’ebe ọ bụla a na-ekwusa ozi ọma a n’ụwa dum, a ga na-akọ ihe nwaanyị a mere ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-echeta ya.”—Matiu 26:10-13.

Jizọs anọbọọla chi na Betani, ọtụtụ ndị amatakwala na ọ nọ na Betani. Ọtụtụ ndị Juu bịara n’ụlọ Saịmọn ka ha hụ Jizọs, hụkwa Lazarọs “onye [Jizọs] si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite.” (Jọn 12:9) Ndị isi nchụàjà gbaziri izu igbu Jizọs na Lazarọs. Ha chere na ọ bụ mkpọlite a a kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ mere ọtụtụ ndị ji na-enwe okwukwe na Jizọs. Ihe a gosiri na obi fere ndị ndú okpukpe a azụ.