Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 123

Ekpere Jizọs Kpere Mgbe Ihe Na-ewute Ya Nke Ukwuu

Ekpere Jizọs Kpere Mgbe Ihe Na-ewute Ya Nke Ukwuu

MATIU 26:30, 36-46 MAK 14:26, 32-42 LUK 22:39-46 JỌN 18:1

  • MGBE JIZỌS NỌ N’OGIGE GETSEMENI

  • ỌSỤSỌ YA DỊ KA ỌBARA NKE NA-ATAPỤSỊ N’ALA

Mgbe Jizọs na ndịozi ya kpechara ekpere, ya na ha bụrụ abụ ma gaa n’Ugwu Oliv. (Mak 14:26) Ha gawara n’ogige a na-akpọ Getsemeni, bụ́ ebe ọ na-agakarị. Ogige a dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Jeruselem.

Ozugbo ha ruru n’ogige a mara mma osisi oliv juru, Jizọs hapụrụ ndịozi ya asatọ ma baa n’ime ogige a. O nwere ike ịbụ na ọ hapụrụ ha ná mbata ogige a n’ihi na ọ sịrị ha: “Nọdụnụ ala n’ebe a ka m gaa ebe nke ọzọ wee kpee ekpere.” Ọ kpọọrọ ndịozi ya atọ aha ha bụ Pita, Jems, na Jọn baa n’ime ogige ahụ. O bidoro ichegbu onwe ya nke ukwuu ma gwa ha, sị: “Ọ na-ewute mkpụrụ obi m nke ukwuu, ọbụna ruo ọnwụ. Nọrọnụ n’ebe a, sorokwanụ m na-eche nche.”—Matiu 26:36-38.

Mgbe Jizọs gatụkwuru n’ihu, “ọ dara n’ala wee malite ikpe ekpere.” Gịnịkwanụ ka ọ na-arịọ Chineke ka o meere ya n’oge a? Ọ sịrị Chineke: “Nna, ihe niile kwere omume n’ebe ị nọ; wepụ iko a n’ebe m nọ. Ma ọ bụghị ihe m chọrọ, kama ihe ị chọrọ.” (Mak 14:35, 36) Olee ihe okwu Jizọs pụtara? Ọ̀ chọrọ ịgbara àjà Chineke chọrọ ka o jiri ndụ ya chụọ ọsọ, bụ́ ihe a ga-eji gbapụta ụmụ mmadụ? Mba.

Jizọs anọrọla n’eluigwe hụ otú ndị Rom si emekpọ ndị ha na-egbu ọnụ. Ugbu a ọ bụ mmadụ, o nwere obi ọmịiko, ihe na-emetụkwa ya n’ahụ́. N’ihi ya, ọ naghị agụsi ya agụụ ike ka mgbe a ga-ata ya ahụhụ ruwe eruwe. Ma, ihe kacha eme ka ọ na-echegbu onwe ya bụ na ọ ma na ọnwụ ọ na-aga ịnwụ ka onye omekome nwere ike ime ka a kọchaa aha Nna ya. N’awa ole na ole, a ga-akpọgide ya n’osisi ka à ga-asị na ọ bụ onye na-ekwulu Chineke.

Mgbe Jizọs kpechara ekpere ruo ogologo oge, ọ laghachiri ebe ndịozi ya atọ ahụ nọ ma hụ na ha na-ehi ụra. Ọ gwara Pita, sị: “Ọ̀ bụ na unu enweghị ike iso m chee nche ruo ọbụna otu awa? Na-echenụ nche ma na-ekpe ekpere mgbe niile, ka unu wee ghara ịbanye n’ọnwụnwa.” Jizọs ghọtara na ike gwụchara ndịozi ya ahụ nakwa na chi ejimiela. N’ihi ya, o kwuru, sị: “N’ezie, mmụọ dị njikere, ma anụ ahụ́ adịghị ike.”—Matiu 26:40, 41.

Jizọs gaghachiri ebe ahụ ọ nọ na-ekpe ekpere ma rịọ Chineke ka o wepụrụ ya “iko a.” Mgbe ọ laghachiri ebe ahụ ndịozi ya atọ nọ, ọ hụrụ ha ọzọ ka ha na-ehi ụra mgbe ha kwesịrị ịna-ekpe ekpere ka ha ghara ịdaba n’ọnwụnwa. Mgbe Jizọs gwara ha okwu, “ha amaghị ihe ha ga-aza ya.” (Mak 14:40) Jizọs gaghachikwara ebe ọ na-ekpe ekpere ma gbuo ikpere n’ala kpee ekpere.

Jizọs na-echegbu onwe ya nke ukwuu otú ọnwụ ọ na-aga ịnwụ ka onye omekome ga-esi mee ka a kọchaa aha Nna ya. Jehova nọ na-anụ ekpere Ọkpara ya. N’ihi ya, o nwere mgbe o ruru, ya ezite mmụọ ozi ya ka o mee ka Jizọs dị ike. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs akwụsịghị ikpegara Nna ya ekpere. Ọ nọ “na-ekpesi ekpere ike karị.” Jizọs na-echegbu onwe ya nke ukwuu. Ihe dị ya n’aka abụghị obere ihe. Ndụ ebighị ebi nke ya na nke ụmụ mmadụ ndị kweere na Chineke dị ya n’aka. Ihe ndị a mere ka ‘ọsụsọ ya dịrị ka ọbara nke na-atapụsị n’ala.’—Luk 22:44.

Mgbe Jizọs gaghachiri na nke ugboro atọ ya n’ebe ahụ ndịozi ya nọ, ọ hụkwara ha ka ha na-ehi ụra. Ọ sịrị ha: “N’ụdị oge dị otú a ka unu na-ehi ụra, na-ezu ike! Lee! Oge awa ahụ eruwo nso ka a rara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmehie. Bilienụ, ka anyị pụọ. Lee! Onye ga-arara m nye abịawo nso.”—Matiu 26:45, 46.

GỤKWUO GBASARA YA

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Gịnị Mere Anyị Ga-eji Na-ekpe Ekpere n’Aha Jizọs?

Lee otú ikpe ekpere n’aha Jizọs si egosi na anyị na-akwanyere Chineke na Jizọs ùgwù.