Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 122

Ekpere Mmechi Jizọs Kpere n’Ọnụ Ụlọ Dị n’Elu

Ekpere Mmechi Jizọs Kpere n’Ọnụ Ụlọ Dị n’Elu

JỌN 17:1-26

  • URU ỊMATA CHINEKE NA ỌKPARA YA BARA

  • OTÚ JEHOVA, JIZỌS, NA NDỊ NA-ESO ỤZỌ YA SI BỤRỤ OTU

Jizọs hụrụ ndịozi ya n’anya nke ukwuu. Ọ bụ ya mere o ji mee ka ha mara ihe ndị na-aga ime ha maka na ọ ma na oge ọ ga-ahapụ ha dị nso. Mgbe o mechara ka ha mara ihe ndị ahụ, o leliri anya n’eluigwe kpegara Nna ya ekpere, sị: “Mee ka ọkpara gị dị ebube, ka ọkpara gị wee mee ka ị dị ebube, ebe i nyere ya ikike n’ebe anụ ahụ́ niile dị, ka o wee nye ndị ahụ niile i nyere ya ndụ ebighị ebi.”—Jọn 17:1, 2.

N’eziokwu, Jizọs ghọtara na ihe kacha mkpa bụ ime ka Chineke dị ebube. Ma ndụ ebighị ebi ahụ Jizọs kwuru okwu ya bụ ihe na-akasi ndịozi ya obi. Ebe ọ bụ na e nyela Jizọs “ikike n’ebe anụ ahụ́ niile dị,” o nwere ike ime ka àjà ahụ ọ ga-eji ndụ ya chụọ baara mmadụ niile uru. Ma, ọ bụghị mmadụ niile ka ọ ga-abara uru. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ndị Jizọs ga-eme ka àjà ọ chụrụ baara uru bụ ndị ga-eme ihe ọzọ ọ na-aga ikwu. Jizọs sịrị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

Mmadụ ga-amatarịrị Chineke na Ọkpara ya nke ọma, ya na ha adịrị n’ezigbo mma. Ọ ga na-ele ihe anya otú ha si ele ihe anya. Ọ ga na-akpaso ndị ọzọ àgwà otú ha si akpaso ha àgwà. Ọ ga-aghọtakwa na ụmụ mmadụ ime ka Chineke nwee ebube dị mkpa karịa inweta ndụ ebighị ebi. Mgbe Jizọs kwuchara otú mmadụ ga-esi enweta ndụ ebighị ebi, ọ laghachiziri n’ihe ka mkpa ọ na-ekwu. Ọ sịrị:

“Emewo m ka ị dị ebube n’ụwa, ebe ọ bụ na arụchaala m ọrụ i nyere m ka m rụọ. Ya mere, ugbu a, Nna, mee ka m nwee ebube n’akụkụ gị, bụ́ ebube m nwere n’akụkụ gị mgbe ụwa na-adịbeghị.” (Jọn 17:4, 5) N’eziokwu, Jizọs chọrọ ka Chineke kpọlite ya n’ọnwụ, ya alaghachi n’eluigwe nwee ebube ahụ o nweburu.

Ma, Jizọs echefubeghị ihe ndị ọ rụrụ n’ozi o jere n’ụwa. O kpere ekpere, sị: “Emewo m ka aha gị pụta ìhè nye ndị i si n’ụwa nye m. Ha bụ nke gị, i nyekwara m ha, ha edebewokwa okwu gị.” (Jọn 17:6) Ihe Jizọs mere n’ozi ọma ya abụghị naanị ịkpọ Chineke aha ya bụ́ Jehova, o nyekwaara ndịozi ya aka ka ha mara ihe mere o ji aza aha ahụ. Aha Chineke na-eme ka anyị mata ụdị onye Chineke bụ na otú o si emeso ụmụ mmadụ ihe.

Ndịozi Jizọs amarala onye Jehova bụ, mara ihe Ọkpara ya na-arụ, marakwa ihe ndị Jizọs kụziiri ha. Jizọs medaziri obi gwa Chineke, sị: “Enyewo m ha okwu i nyere m, ha anatawokwa ya, ha amarawokwa n’ezie na m bịara dị ka onye nnọchiteanya gị, ha ekwerewokwa na ọ bụ gị zitere m.”—Jọn 17:8.

Jizọs kwuziri ihe dị iche n’etiti ndị na-eso ụzọ ya na ndị ụwa. Ọ sịrị: “M na-arịọ arịrịọ banyere ha; m na-arịọ, ọ bụghị banyere ụwa, kama banyere ndị i nyere m; n’ihi na ha bụ nke gị . . . Nna dị nsọ, chee ha nche n’ihi aha gị nke i nyere m, ka ha wee bụrụ otu, dị ka anyị bụ otu. . . . M na-eche ha nche n’ihi aha gị nke i nyere m; edebewokwa m ha, ọ dịghịkwa otu n’ime ha e bibiri ma e wezụga nwa mbibi ahụ.” Nwa mbibi ahụ bụ Judas Iskarịọt, onye pụrụla ịga kpọta ndị ga-ejide Jizọs.—Jọn 17:9-12.

Jizọs kwuru na ụwa kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya asị. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ gwara Chineke, sị: “Ihe m na-arịọ gị abụghị ka ị kpọpụ ha n’ụwa, kama ka i chee ha nche n’ihi ajọ onye ahụ. Ha abụghị nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị nke ụwa.” (Jọn 17:14-16) Ndịozi Jizọs na ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs nọ n’ụwa. Ụwa Jizọs kwuru okwu ya ebe a bụ ụmụ mmadụ Setan na-achị. Ma, ndị na-eso ụzọ Jizọs agaghị na-eme ka ndị ụwa ma ọ bụ soro ha na-akpa àgwà ọjọọ ha na-akpa. Olee otú ha ga-esi ghara ịna-eme ka ndị ụwa?

Ha ga-adịrịrị nsọ, bụrụ ndị e wepụtara iche ijere Chineke ozi. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịna-eme ihe ndị ha mụtara n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nakwa ihe Jizọs kụziiri ha. Jizọs kpere ekpere, sị: “Jiri eziokwu doo ha nsọ; okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Ka oge na-aga, Chineke ga-enye ụfọdụ n’ime ndịozi Jizọs mmụọ nsọ ka ha dee akwụkwọ ndị ga-eso ‘n’eziokwu’ ahụ ga-enyere mmadụ aka ya adị nsọ.

Ma, ndị ọzọ ga-emecha mụta “eziokwu” ahụ. N’ihi ya, Jizọs kpere ekpere, sị: “Ọ bụghị naanị banyere ndị a, [ya bụ, ndịozi iri na otu ahụ ha na ya nọ] kamakwa banyere ndị nwere okwukwe n’ebe m nọ site n’okwu ha.” Gịnị ka Jizọs kpegaara Chineke ekpere banyere ndị niile na-eso ụzọ ya? Jizọs sịrị: “Ka ha niile wee bụrụ otu, dị ka gị onwe gị, Nna, na mụ onwe m dị n’otu, mụ onwe m na gị adịrịkwa n’otu, ka anyị na ha wee dị n’otu.” (Jọn 17:20, 21) Jizọs na Nna ya abụghị otu onye. Otú ha si bụrụ otu bụ na ha anaghị eme ihe iche iche. Ekpere Jizọs bụ ka ndị na-eso ụzọ ya bụrụ otu, ya bụ, ka ha na-emekọ ihe ọnụ.

Obere oge tupu Jizọs ekpewe ekpere a, ọ gwara Pita na ndịozi ya ndị ọzọ na ọ na-aga ịkwadebere ha ebe n’eluigwe. (Jọn 14:2, 3) Jizọs kwughachiri banyere ya n’ekpere, sị: “Nna, banyere ihe i nyere m, ọ dị m ka ya bụrụ na ha onwe ha ga-eso m nọrọ n’ebe m nọ, ka ha wee hụ ebube i nyere m, n’ihi na ị hụrụ m n’anya tupu a tọọ ntọala ụwa.” (Jọn 17:24) Jizọs ji ihe a o kwuru gosi na ogologo oge gara aga, tupudị Adam na Iv amụta ụmụ, Chineke hụrụ Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’anya. Ọkpara ya a mechara bụrụ Jizọs Kraịst.

Mgbe Jizọs na-emechi ekpere ya, o kwuru okwu ọzọ banyere aha Nna ya na otú Chineke si hụ ndịozi ya na ndị ọzọ ga-amụta “eziokwu” ahụ n’anya. Ọ sịrị: “Emewokwa m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya, ka ịhụnanya i nwere n’ebe m nọ wee dịrị n’ime ha, mụ na ha adịkwa n’otu.”—Jọn 17:26.