Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 17

Jizọs Akụziere Nikọdimọs Ihe n’Abalị

Jizọs Akụziere Nikọdimọs Ihe n’Abalị

JỌN 2:23–3:21

  • JIZỌS NA NIKỌDIMỌS AKPARỊTA ỤKA

  • IHE ‘ỊMỤ MMADỤ ỌZỌ’ PỤTARA

Ka Jizọs nọ na Jeruselem maka Ememme Ngabiga nke afọ 30, ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube. N’ihi ya, ọtụtụ ndị kweere na ya. Ihe Jizọs na-eme tọkwara otu nwoke aha ya bụ Nikọdimọs ụtọ. Ọ bụ onye Farisii, sorokwa n’òtù ụlọikpe ka elu nke ndị Juu a na-akpọ Sanhedrin. Nwoke a chọrọ ịmụtakwu ihe n’ọnụ Jizọs. N’ihi ya, ọ gakwuuru Jizọs n’abalị. Ọ ga-abụ na ihe mere o ji gakwuru ya n’abalị bụ n’ihi na ọ na-atụ ụjọ na ọ bụrụ na ndị ndú okpukpe ndị Juu ndị ọzọ ahụ ya, ha ga-akwụsị ịkwanyere ya ùgwù.

Ọ sịrị Jizọs: “Rabaị, anyị maara na ị bụ onye ozizi nke si n’ebe Chineke nọ bịa; n’ihi na ọ dịghị onye pụrụ ime ihe ịrịba ama ndị a ị na-eme ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.” Jizọs gwara ya na ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịba n’Alaeze Chineke, ‘a ga-amụrịrị onye ahụ ọzọ.’—Jọn 3:2, 3.

Oleekwanụ otú a ga-esi mụọ mmadụ ọzọ? Nikọdimọs jụrụ ya, sị: “Ọ̀ pụrụ ịbanye n’afọ nne ya nke ugboro abụọ ka a mụọ ya?”—Jọn 3:4.

Mba, ọ bụghị ihe ịmụ mmadụ ọzọ pụtara. Jizọs kọwaara ya ihe ọ pụtara. Ọ sịrị ya: “Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ site na mmiri na mmụọ nsọ, ọ pụghị ịbanye n’alaeze Chineke.” (Jọn 3:5) Ọ bụ mgbe e mechara Jizọs baptizim, mmụọ nsọ adakwasịkwa ya, ka a mụrụ ya “site na mmiri na mmụọ nsọ.” Mgbe ihe a mere, e nwere olu si n’eluigwe kwuo, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.” (Matiu 3:16, 17) Chineke si otú a mee ka a mara na ya ezitela Jizọs dị ka nwa ime mmụọ nke nwere olileanya ịba n’Alaeze eluigwe. Ka oge na-aga, na Pentikọst afọ 33, a ga-awụsa ndị ọzọ e mere baptizim mmụọ nsọ, si otú ahụ mụọ ha ọzọ, ha aghọzie ụmụ ime mmụọ Chineke.—Ọrụ Ndịozi 2:1-4.

O siiri Nikọdimọs ike ịghọta ihe Jizọs na-akụziri ya banyere Alaeze Chineke. N’ihi ya, Jizọs kọwakwuuru ya gbasara ọrụ pụrụ iche ya na-arụ dị ka nwa Chineke. Jizọs sịrị: “Dịkwa nnọọ ka Mozis weliri agwọ elu n’ala ịkpa, otú ahụ ka a na-aghaghị iweli Nwa nke mmadụ elu, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:14, 15.

Ndị Izrel ahụ agwọ ọjọọ tara ogologo oge gara aga lere agwọ ọla kọpa ahụ anya ka ha nwee ike ịdị ndụ. (Ọnụ Ọgụgụ 21:9) Otú ahụkwa ka ụmụ mmadụ niile kwesịrị inwe okwukwe n’Ọkpara Chineke ka ha ghara ịnọgide na-anwụ anwụ, nwezie ike ịdị ndụ ebighị ebi. Jizọs gwaziri ya ihe Jehova mere iji mee ka ihe a kwe omume. Ọ sịrị ya: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ọ bụ ya mere na n’ọnwa isii Jizọs bidochara ozi ya, ọ gwara Nikọdimọs na ọ bụ ya ka Jehova ga-esi n’aka ya zọpụta ụmụ mmadụ.

Jizọs gwara Nikọdimọs, sị: “Chineke zitere Ọkpara ya n’ụwa, ọ bụghị ka o kpee ụwa ikpe.” Ihe nke a pụtara bụ na e ziteghị ya ka ọ maa ụwa niile ikpe mbibi. Kama, dị ka Jizọs kwuru, e zitere ya ka ‘e si n’aka ya zọpụta ụwa.’—Jọn 3:17.

Ọ bụ ụjọ mere Nikọdimọs ji gakwuru Jizọs n’abalị. N’ihi ya, ọ dị mma na ihe Jizọs ji mechie mkparịta ụka ahụ bụ: “Nke a bụ ihe a ga-eji kpee ikpe, na ìhè ahụ abịawo n’ụwa ma ụmụ mmadụ hụrụ ọchịchịrị n’anya kama ìhè, n’ihi na ọrụ ha dị njọ. N’ihi na onye na-eme ihe ọjọọ kpọrọ ìhè ahụ asị, ọ dịghịkwa abịa n’ìhè ahụ, ka e wee ghara ịkatọ ọrụ ya. Ma onye na-eme ezi ihe na-abịa n’ìhè ahụ, ka e wee mee ka ọrụ ya pụta ìhè na a rụrụ ha dị ka uche Chineke si dị.”—Jọn 3:19-21.

Ugbu a, ọ bụzi Nikọdimọs, bụ́ onye Farisii na onye nkụzi Izrel, ka ọ dịịrị icheba echiche n’ihe ndị ọ nụrụ banyere ihe Jizọs ga-eme iji mezuo nzube Chineke.

GỤKWUO GBASARA YA

Ihe Chineke Meere Gị

Iwu Chineke nke bụ́ “mkpụrụ obi laara mkpụrụ obi” na-enyere anyị aka ịghọta ihe mere Chineke ji ‘nye naanị otu Ọkpara ya’ n’ihi anyị.

Olee Uru Ọnwụ Jizọs na Mbilite n’Ọnwụ Ya Ga-abara Gị?

Gụọ ihe isii Baịbụl kwuru gosiri na ọnwụ otu onye ga-emeli ka ọtụtụ ndị mmadụ dị ndụ ebighị ebi.