Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 19

Jizọs Akụziere Nwaanyị Sameria Ihe

Jizọs Akụziere Nwaanyị Sameria Ihe

JỌN 4:3-43

  • JIZỌS AKỤZIERE NWAANYỊ SAMERIA NA NDỊ ỌZỌ IHE

  • ỤDỊ OFUFE CHINEKE NA-ANABATA

Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya si Judia na-aga Galili, ha si na Sameria gafere chee ihu n’ebe ugwu. Ike bịara gwụ ha n’ihi ogologo ije ha garala. Mgbe o ruru oge ehihie, ha kwụsịrị n’ebe dị obodo Saịka nso ka ha zurutụ ike n’akụkụ otu olulu mmiri. O nwere ike ịbụ Jekọb gwuru olulu mmiri a ọtụtụ narị afọ tupu oge Jizọs, ma ọ̀ bụkwanụ ya abụrụ na o goro ndị mmadụ ka ha gwuo ya. A ka nwekwara ike ịhụ olulu mmiri ahụ ugbu a n’ebe dị nso n’obodo Nablọs, nke dị na Palestaịn.

Ka Jizọs nọ na-ezurutụ ike n’akụkụ olulu mmiri ahụ, ndị na-eso ụzọ ya gawara n’ime obodo dị nso ebe ahụ ka ha zụta ihe oriri. Mgbe ha pụrụ, otu nwaanyị Sameria bịara isere mmiri. Jizọs sịrị ya: “Nye m mmiri ka m ṅụọ.”—Jọn 4:7.

Ndị Juu na ndị Sameria anaghị emekọ ihe n’ihi ajọ mkpọrọmasị ha kpọrọ onwe ha. N’ihi ya, ihe ahụ Jizọs kwuru juru nwaanyị ahụ anya. Ọ jụrụ Jizọs, sị: “N’agbanyeghị na ị bụ onye Juu, olee otú i si na-arịọ m ka m nye gị mmiri ka ị ṅụọ, ebe m bụ nwaanyị Sameria?” Jizọs zara ya, sị: “A sị na ị maara onyinye Chineke na-enye n’efu na onye na-asị gị, ‘Nye m mmiri ka m ṅụọ,’ ị gaara arịọ ya, ọ gakwaara enye gị mmiri na-enye ndụ.” Nwaanyị ahụ zaghachiri ya, sị: “Nna anyị ukwu, i nwedịghị ihe e ji esere mmiri, olulu mmiri a mikwara emi. Oleezi ebe i si enweta mmiri a na-enye ndụ? Ị kaghị nna nna anyị Jekọb, bụ́ onye nyere anyị olulu mmiri a, onye ya na ụmụ ya na anụ ụlọ ya ṅụkwara mmiri si na ya, ka ị̀ ka ya?”—Jọn 4:9-12.

Jizọs gwara ya, sị: “Onye ọ bụla nke ṅụrụ mmiri a, akpịrị ga-akpọ ya nkụ ọzọ. Onye ọ bụla ṅụrụ mmiri nke m ga-enye ya, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ ma ọlị, kama mmiri nke m ga-enye ya ga-aghọ n’ime ya isi iyi nke mmiri na-asụpụta asụpụta inye ndụ ebighị ebi.” (Jọn 4:13, 14) Ọ bụ eziokwu na ike gwụrụ Jizọs, ma o meghị ka ọ ghara ịgwa nwaanyị Sameria ahụ eziokwu nke na-enye ndụ.

Nwaanyị ahụ gwaziri ya, sị: “Nna anyị ukwu, nye m mmiri a, ka akpịrị ghara ịkpọ m nkụ, ka m gharakwa ịdị na-abịa ebe a isere mmiri.” Jizọs meziri ka ọ̀ gbanwere ihe ha na-ekwu, ma sị ya: “Gaa kpọrọ di gị bịa ebe a.” Ọ sịrị Jizọs: “Enweghị m di.” Mana ahụ́ nwụrụ ya mgbe ọ matara na Jizọs ma ya nke ọma. Jizọs sịrị ya: “I kwutere ya, sị, ‘Enweghị m di.’ N’ihi na i nweela di ise, nwoke gị na ya bi ugbu a abụghị di gị.”—Jọn 4:15-18.

Nwaanyị ahụ ma na ihe Jizọs kwuru bụ eziokwu. O rikwara ya ọnụ. Ọ gwaziri Jizọs, sị: “Nna anyị ukwu, ana m aghọta na ị bụ onye amụma.” O gosiziri na ya nwere mmasị n’ihe gbasara ofufe Chineke. Olee otú o si gosi ya? Ọ gwara Jizọs, sị: “Nna nna anyị hà fere Chineke n’ugwu a; ma unu na-ekwu na ọ bụ na Jeruselem ka ndị mmadụ kwesịrị ịnọ fee Chineke.”—Jọn 4:19, 20.

Ma, Jizọs kọwaara ya na ihe dị mkpa abụghị ebe mmadụ nọ na-efe Chineke. Ọ sịrị ya: “Oge awa na-abịa mgbe ọ na-agaghị abụ n’ugwu a ma ọ bụ na Jeruselem ka unu ga-anọ fee Nna m ofufe.” Ọ gwakwara ya, sị: “Oge awa na-abịa, ọ bụkwa ugbu a, mgbe ndị na-efe ezi ofufe ga-efe Nna m n’ime mmụọ na n’eziokwu, n’ihi na, n’ezie, Nna m na-achọ ka ndị dị otú ahụ fee ya ofufe.”—Jọn 4:21, 23, 24.

 Ihe Chineke chọrọ n’aka ndị na-efe ya ofufe abụghị ebe ha nọ na-efe ya, kama, ọ bụ otú ha si efe ya ofufe. Ihe ahụ o kwuru masịrị nwaanyị ahụ. Nwaanyị ahụ sịrị ya: “Amaara m na Mesaya na-abịa, bụ́ onye a na-akpọ Kraịst. Mgbe ọ bụla ọ bịara, ọ ga-agwa anyị ihe niile hoo haa.”—Jọn 4:25.

Jizọs kpugheziiri ya otu eziokwu dị mkpa. Ọ sịrị ya: “Ọ bụ mụ onwe m nke na-agwa gị okwu bụ ya.” (Jọn 4:26) Chebagodịrị ihe a merenụ echiche. Naanị mmiri ka nwaanyị a bịara isere n’ehihie a, ma Jizọs nyere ya ihe ùgwù pụrụ iche. Ọ gwara ya n’ezoghị ọnụ ihe ọ na-agwabeghị ndị ọzọ, ya bụ, na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ.

ỌTỤTỤ NDỊ SAMERIA EKWERE NA YA

Ndị na-eso ụzọ Jizọs si na Saịka buru ihe oriri lọta. Ha hụrụ ya n’akụkụ olulu mmiri Jekọb ahụ, ebe ọ nọ mgbe ha pụwara. Mana ya na otu nwaanyị Sameria nọzi na-akparịta ụka. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs lọghachiri, nwaanyị ahụ hapụrụ udu mmiri ya ebe ahụ bawa n’ime obodo.

Ozugbo nwaanyị ahụ rutere Saịka, ọ kọọrọ ndị obodo ahụ ihe Jizọs gwara ya. O ji obi ya niile gwa ha, sị: “Bịanụ hụ nwoke gwara m ihe niile m mere.” Ọ jụrụ ha, sị: “Ọ̀ ga-abụ onye a bụ Kraịst?” (Jọn 4:29) Ọ ga-abụ na ihe mere o ji jụọ ha ajụjụ a bụ ka ọ chọpụta ihe ha chere. Ajụjụ a gbasara otu ihe dị ndị mmadụ ezigbo mkpa a nọ na-achọ azịza ya kemgbe ụbọchị Mozis. (Diuterọnọmi 18:18) Ihe a mere ka ndị obodo ahụ pụta ka ha jiri anya ha hụ Jizọs.

Tupu ha erute, ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na-arịọ ya ka o rie nri ha wetere. Ma, ọ zara ha, sị: “M nwere ihe oriri m ga-eri nke unu na-amaghị.” Ihe ahụ o kwuru juru ndị na-eso ụzọ ya anya, nke mere ha ji jụwa ibe ha, sị: “Ọ̀ dị onye ọ bụla wetaara ya ihe ọ bụla ka o rie?” Jizọs weturu obi kọwaara ha ihe ọ na-ekwu. Ihe ọ gwara ha rukwara ha n’ahụ́. Ọ sịrị ha: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche onye zitere m, ka m rụchaa ọrụ ya.”—Jọn 4:32-34.

 Ọrụ Jizọs na-ekwu okwu ya abụghị ọrụ isi n’ubi were ọka wit, bụ́ nke fọrọ ihe dị ka ọnwa anọ tupu a malite ya. Kama, ihe Jizọs na-ekwu okwu ya bụ ọrụ iwere ndị mmadụ otú e si ewere ihe ubi. Ihe o kwuru gosiri na ọ bụ ya ka o bu n’obi. Ọ sịrị: “Welienụ anya unu lee ubi, na ihe a kụrụ na ha achaala maka owuwe ihe ubi. Onye na-ewe ihe ubi anatawalarị ụgwọ ọrụ ma na-ekpokọta mkpụrụ maka ndụ ebighị ebi, ka onye na-agha mkpụrụ na onye na-ewe ihe ubi wee ṅụrịkọọ ọṅụ.”—Jọn 4:35, 36.

O nwere ike ịbụ na Jizọs aghọtala ihe ụka ahụ ya na nwaanyị Sameria ahụ kparịtara rụpụtara. Ọtụtụ ndị Saịka nwere okwukwe na Jizọs n’ihi àmà nwaanyị ahụ gbaara ha. Ọ nọ na-agwa ha, sị: “Ọ gwara m ihe niile m mere.” (Jọn 4:39) N’ihi ya, mgbe ha si Saịka rute n’olulu mmiri ahụ, ha rịọrọ Jizọs ka ọ nọrọ gwakwuo ha okwu Chineke. Jizọs kwetara. Ihe a mekwara ka ọ nọkwuo ụbọchị abụọ na Sameria.

Ka ndị Sameria nọ na-ege ihe Jizọs na-ekwu, ọtụtụ ndị ọzọ kwerekwara na ya. Ha gwara nwaanyị ahụ, sị: “Ọ bụkwaghị n’ihi okwu gị ka anyị ji kwere; n’ihi na anyị anụwo n’onwe anyị, anyị makwaara na nwoke a bụ n’ezie onye nzọpụta nke ụwa.” (Jọn 4:42) N’eziokwu, nwaanyị Sameria ahụ gosiri nnọọ otú anyị nwere ike isi na-agba àmà banyere Kraịst. Anyị kwesịrị ịgwa ndị anyị na-ezi ozi ọma okwu otú ga-eme ka ha chọọ ịmụtakwu ihe.

Cheta na ọ fọrọ ọnwa anọ tupu a malite iwe ihe ubi ọka bali, bụ́ nke a na-ewe n’ebe ahụ n’oge opupu ihe ubi. Mgbe ahụ Jizọs nọ na-agwa ha okwu nwere ike ịbụ n’ihe dị ka n’ọnwa Nọvemba ma ọ bụ Disemba. Ihe ọ pụtara bụ na kemgbe oge Ememme Ngabiga nke afọ 30 gachara, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ejirila ihe dị ka ọnwa asatọ kụziere ndị mmadụ ihe na Judia, meekwa ha baptizim. Ha sizi ebe ahụ gawa ebe ugwu ha ga-esi ruo obodo ha bụ́ Galili. Gịnị ka ha ga-ahụ ebe ahụ?

GỤKWUO GBASARA YA

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Olee Otú Ị Ga-esi Ama Ndị Na-efe Chineke Otú Ọ Chọrọ?

Ọ̀ bụ naanị otu ezigbo okpukpe ka e nwere taa? Gụọ ihe ise eji ama ezigbo Ndị Kraịst.