Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 8

Ha Gbapụrụ Ka Eze Obi Tara Mmiri Ghara Igbu Nwa Ha

Ha Gbapụrụ Ka Eze Obi Tara Mmiri Ghara Igbu Nwa Ha

MATIU 2:13-23

  • EZINỤLỌ JIZỌS AGBAGA IJIPT

  • JOSEF AKPỌRỌ EZINỤLỌ YA KWAGA NAZARET

E nwere otu ozi dị oké mkpa Josef kpọtere Meri n’ụra zie ya. Mmụọ ozi Jehova ka gwapụrụ ya ná nrọ, sị: “Bilie, kpọrọ nwatakịrị a na nne ya gbaga n’Ijipt, nọrọkwa n’ebe ahụ ruo mgbe m ga-enye gị iwu; n’ihi na Herọd ga-achọ nwatakịrị a ka o gbuo ya.”—Matiu 2:13.

Josef egbughị oge kpọrọ Meri na nwa ha gbapụ n’abalị ahụ. Ọ dị mma na ha egbughị oge gbapụ, n’ihi na ozugbo ha pụrụ, Herọd matara na ndị ahụ na-agụ kpakpando aghọgbuola ya. Ọ gwaburu ha na ha hụ Jizọs, ha laghachi bịa kọọrọ ya. Kama ịgaghachi kọọrọ ya, ha si ụzọ ọzọ laa. Ihe a ha mere were Herọd ezigbo iwe. Ọ ka chọsiri ike igbu Jizọs. N’ihi ya, o nyere iwu ka e gbuo ụmụaka nwoke niile dị afọ abụọ gbadaa, bụ́ ndị a mụrụ na Betlehem na n’ógbè niile dị ya nso. Ihe mere o ji sị ka e gbuo ndị dị afọ abụọ gbadaa bụ n’ihi na ihe ahụ ndị na-agụ kpakpando gwara ya mere ka o were ya na nwa ahụ ga-adị ihe dị ka afọ abụọ.

Ogbugbu ahụ e gburu ụmụntakịrị nwoke niile jọgburu onwe ya. Anyị amaghị ụmụntakịrị ole e gburu. Mana, mkpu ákwá ụmụ nwaanyị ndị e gburu ụmụ ha nọ na-eti mezuru otu amụma Baịbụl onye amụma Chineke, bụ́ Jeremaya, buru.—Jeremaya 31:15.

Ma, Josef akpọrọla ndị ezinụlọ ya gbaga Ijipt, ha ebirizie ebe ahụ. N’otu abalị, mmụọ ozi Jehova bịakwutere Josef ọzọ ná nrọ, sị ya: “Bilie, kpọrọ nwatakịrị a na nne ya lawa n’ala Izrel, n’ihi na ndị na-achọ mkpụrụ obi nwatakịrị a anwụwo.” (Matiu 2:20) Josef kpọziiri ezinụlọ ya laghachi n’obodo ha. Amụma ọzọ dị na Baịbụl sizi otú a mezuo. Amụma ahụ kwuru na e si n’Ijipt kpọpụta Ọkpara Chineke.—Hosia 11:1.

O nwere ike ịbụ na Josef chọrọ ka ezinụlọ ya biriwezie na Judia, nke o nwere ike ịbụ na ọ dị Betlehem nso, bụ́ ebe ha bibu tupu ha agbaga Ijipt. Ma, Josef nụrụ na ọ bụ Akeleyọs, nwa Herọd, na-achịzi Judia. Akeleyọs a bụkwa eze ọjọọ. N’ihi ya, Chineke dọrọ Josef aka ná ntị ná nrọ na nsogbu dị. Josef kpọziiri ezinụlọ ya gawa n’ebe ugwu, birizie n’obodo Nazaret nke dị na Galili. Obodo a dịtụ anya na Jeruselem, bụ́ ebe a kacha ekpe okpukpe ndị Juu. Ọ bụzi n’obodo a ka Jizọs nọ tolite. E sikwa otú a mezuo amụma ọzọ nke sịrị: “A ga-akpọ ya onye Nazaret.”—Matiu 2:23.

GỤKWUO GBASARA YA

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ)

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ—Disemba 2014

Jeremaya kwuru na Rechel na-akwara ụmụ ya ákwá. Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

ṄOMIE OKWUKWE HA

Josef Chebere Ezinụlọ Ya, Gbooro Ha Mkpa Ha ma Rubere Chineke Isi Ruo Ọnwụ

Olee otú Josef si chebe ndị ezinụlọ ya? Gịnị mere o ji kpọrọ Meri na Jizọs gaa Ijipt?