Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 35

Ozizi Elu Ugwu Ahụ A Ma Ama

Ozizi Elu Ugwu Ahụ A Ma Ama

Mgbe Jizọs kpechara ekpere abalị dum ma mechaa họrọ mmadụ iri na abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya ka ha bụrụ ndịozi ya, ọ ga-abụrịrị na ike gwụrụ ya. O ruola ehihie ugbu a, mana ike ka dị ya inyere ndị mmadụ aka, ọ chọkwara ime otú ahụ. Ọ nọ ugbu a n’akụkụ ugwu dị na Galili, nke nwere ike ịbụ na ọ dịchaghị anya n’ebe ọ nọ rụọ ọrụ ka ukwuu, ya bụ, na Kapaniọm.

Ìgwè mmadụ si n’ebe dị iche iche dị anya bịakwute ya. Ụfọdụ si n’ebe ndịda, ya bụ, na Jeruselem na obodo ụfọdụ dị na Judia. Ndị ọzọ si n’obodo ndị dị n’ebe ugwu, ya bụ, Taya na Saịdọn ndị dị n’ụsọ osimiri. Gịnị mere ha ji bịakwute Jizọs? Ọ bụ “ka ha nụrụ okwu ya nakwa ka a gwọọ ha ọrịa ha.” Ọ bụkwa nnọọ ihe Jizọs mere, ‘ọ gwọkwara ha niile.’ Chegodị banyere nke ahụ. A gwọrọ ndị niile ahụ́ na-adịghị. Jizọs gwọkwara ndị “ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-enye nsogbu,” ya bụ, ndị ndị mmụọ na-ejere Setan ozi ji.—Luk 6:17-19.

Ihe ọzọ Jizọs mere bụ na ọ gara n’ebe ala dị larịị ebe ahụ, ìgwè mmadụ ahụ gbakọtakwara gburugburu ya. Ọ ga-abụ na ndị na-eso ụzọ ya, karịchaa ndịozi iri na abụọ ahụ, bụ ndị kacha nọrọ ya nso. Onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe onye ozizi a nwere ikike ịrụ ọrụ ebube ga-ekwu. Jizọs kụziiri ndị na-ege ya ntị ihe baara ha ezigbo uru. Kemgbe ọ kụzichara ihe ahụ, ọtụtụ ndị ọzọ eritela uru n’ihe ndị ahụ ọ kụziri. Ha nwekwara ike ịbara anyịnwa uru n’ihi na ọ kụziri eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ otú dị mfe nghọta ma doo anya. Jizọs ji akụkọ gbasara ihe ndị na-eme eme nakwa ihe ndị mmadụ maara nke ọma kụzie ihe. Otú a o si kụzie ihe mere ka ndị niile chọrọ ibi ezigbo ndụ otú Chineke chọrọ ghọta ihe ọ kụziri. Olee ihe ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ Jizọs kụziri nke mere ka ozizi ya baa ezigbo uru?

OLEE NDỊ NWERE OBI ỤTỌ N’EZIOKWU?

Onye ọ bụla chọrọ ịna-enwe obi ụtọ. Jizọs makwa nke a, ọ bụkwa ya mere na ihe o ji malite ihe ọ kụziri bụ ịkọwa ndị nwere obi ụtọ n’eziokwu. Ọ ga-abụrịrị na otú a o si malite mere ka ndị mmadụ nwee mmasị ịnụ ihe ọ chọrọ ịkụzi. Ma, o nwere ụfọdụ ihe o kwuru ga-eju ha anya.

Ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eru uju, n’ihi na a ga-akasi ha obi. . . . Obi ụtọ na-adịrị ndị agụụ na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ maka ezi omume, n’ihi na a ga-eme ka afọ ju ha. . . . Obi ụtọ na-adịrị ndị a kpagbuworo n’ihi ezi omume, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu . . . n’ihi m. Ṅụrịanụ ọṅụ, nweekwanụ obi ụtọ nke ukwuu.”—Matiu 5:3-12.

Gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe o ji okwu ahụ bụ́ “obi ụtọ” malite ihe ndị o kwuru? Ọ naghị ekwu banyere ụdị obi ụtọ mmadụ na-enwe n’ihi na ọ na-ekpori ndụ. Ezigbo obi ụtọ karịrị nke ahụ. Obi ụtọ ọ na-ekwu okwu ya bụ ụdị nke mmadụ na-enwe n’ihi na ihe o nwere juru ya afọ nakwa n’ihi na o ji ndụ ya na-eme ihe bara uru.

Jizọs sịrị na ndị ọ na-agụsi agụụ ike ka ha na Chineke dịrị ná mma, ndị ọ na-ewute n’ihi na ha bụ ndị mmehie, nakwa ndị bịara mara Chineke ma na-efe ya ofufe, bụ ndị nwere obi ụtọ n’eziokwu. Ọ bụrụgodị na a kpọrọ ha asị ma ọ bụ na-akpagbu ha n’ihi na ha na-eme uche Chineke, ha nwere obi ụtọ n’ihi na ha ma na ha na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ, marakwa na ọ ga-enye ha ndụ ebighị ebi.

Ọtụtụ ndị na-eche na mmadụ ịchụso ihe ụtọ na ịba ọgaranya bụ ihe na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Ma, Jizọs sịrị na ọ bụghị ihe ndị a na-eme  ka mmadụ na-enwe obi ụtọ. O kwuziri ihe ga-eme ka ndị na-ege ya ntị chee echiche. Ihe o kwuru dị iche n’ihe ndị mmadụ chere na ọ bụ ha na-enye obi ụtọ. Ọ sịrị: “Ma ahụhụ ga-adịrị unu ndị bara ọgaranya, n’ihi na unu enwetazuwo ngụgụ obi unu. Ahụhụ ga-adịrị unu ndị afọ juru ugbu a, n’ihi na unu ga-anọ agụụ. Ahụhụ ga-adịrị unu ndị na-achị ọchị ugbu a, n’ihi na unu ga-eru uju ma kwaa ákwá. Ahụhụ ga-adịrị unu mgbe mmadụ niile na-ekwu okwu ọma banyere unu, n’ihi na ụdị ihe ndị a ka ndị nna nna ha mere ndị amụma ụgha.”—Luk 6:24-26.

Gịnị mere ịba ọgaranya, ịchị ọchị ka onye afọ juru, na ịbụ onye ndị mmadụ na-eto ji ewetara mmadụ ahụhụ? Ọ bụ n’ihi na mgbe ihe ndị a meere mmadụ, onye ahụ ejirikwa ha kpọrọ ihe, ọ ga-eme ka o chefuo Chineke, ọ gaghịzi na-enwe ezigbo obi ụtọ. Jizọs anaghị ekwu na naanị mmadụ ịbụ ogbenye ma ọ bụ ịbụ onye agụụ na-agụ ga-eme ka ọ na-enwe obi ụtọ. Kama, ọ na-abụkarị onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na-ege ntị n’ihe Jizọs na-akụzi, bụrụkwa onye na-enweta ezigbo obi ụtọ.

Jizọs bu ndị na-eso ụzọ ya n’obi mgbe ọ sịrị: “Unu bụ nnu nke ụwa.” (Matiu 5:13) Ọ naghị ekwu na ha bụ nnu nkịtị. Kama, ihe o ji kwute okwu nnu bụ n’ihi na e ji nnu echebe ihe ka ọ ghara ire ure ma ọ bụ imebi. A na-edowe nnu buru ibu n’ebe dị nso n’ebe ịchụ àjà dị n’ụlọ nsọ Chineke. A na-etinyekwa ya n’àjà ndị a na-achụ. Ọ na-anọchikwa anya ihe na-enweghị ntụpọ ma ọ bụ ihe na-emebighị emebi. (Levitikọs 2:13; Ezikiel 43:23, 24) Ndị na-eso ụzọ Jizọs bụ “nnu nke ụwa” n’ihi na ha ga-enye aka chebe ndụ ndị mmadụ, na-enyere ha aka ka adịm ná mma ha na Jehova na omume ọma ha ghara imebi. N’eziokwu, ozi ha na-ezi ga-echebe ndụ ndị niile gere ha ntị ma mee ihe ha nụrụ.

Jizọs gwakwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu bụ ìhè nke ụwa.” A naghị amụnye oriọna dọwa ya n’okpuru nkata, kama a na-edowe ya n’elu ihe e ji adọwa oriọna, ka o nwee ike ịna-enye ìhè. N’ihi ya, Jizọs sịrị ha: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ka ha wee hụ ọrụ ọma unu wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.”—Matiu 5:14-16.

OTÚ KA MMA NDỊ NA-ESO ỤZỌ YA GA-ESI NA-EME IHE

Ndị ndú okpukpe ndị Juu weere ya na Jizọs na-emebi Iwu Chineke. Ọ dịbeghịkwa anya ha gbara izu igbu ya. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo n’ihu ọha, sị:  “Unu echela na m bịara ibibi Iwu ahụ ma ọ bụ ihe ndị amụma kụziri. M bịara, ọ bụghị ibibi ya, kama imezu ya.”—Matiu 5:17.

Ee, Jizọs ji Iwu Chineke kpọrọ ihe karịa onye ọ bụla ọzọ, ọ gbakwara ndị ọzọ ume ka ha jiri ya kpọrọ ihe otú ahụ. Ọ sịrị: “Ya mere, onye ọ bụla nke na-emebi otu n’ime ihe ndị a kasị nta e nyere n’iwu ma na-akụziri ndị mmadụ ka ha na-eme otú ahụ, a ga-akpọ ya ‘onye kasị nta’ n’ihe banyere alaeze eluigwe.” Ihe ihe a o kwuru pụtara bụ na o nweghị ihe ga-eme ka onye ahụ baa n’Alaeze Chineke. Ọ sịkwara: “Ma onye ọ bụla nke na-eme ha ma na-akụzi ha, a ga-akpọ onye a ‘onye ukwu’ n’ihe banyere alaeze eluigwe.”—Matiu 5:19.

Jizọs katọdịrị omume ndị nwere ike ime ka mmadụ mebie Iwu Chineke. Mgbe Jizọs kwuchara na Iwu ahụ sịrị “Egbula ọchụ,” ọ gwakwara ha, sị: “Onye ọ bụla nke na-eweso nwanne ya iwe ga-aza ajụjụ n’ụlọikpe.” (Matiu 5:21, 22) Mmadụ ịnọgide na-eweso ibe ya iwe dị njọ, o nwedịrị ike ime ka onye ahụ gbuo mmadụ. N’ihi ya, Jizọs kọwara otú mmadụ kwesịrị ịgbaru mbọ iji mee udo. Ọ sịrị: “Ya mere, ọ bụrụ na i ji onyinye gị gaa n’ebe ịchụàjà, i wee nọrọ n’ebe ahụ cheta na obi adịghị nwanne gị mma n’ebe ị nọ, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà gawa; buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ị bịaghachikwara, nye onyinye gị.”—Matiu 5:23, 24.

Iwu ọzọ nke dị n’Iwu ahụ megidere ịkwa iko. Jizọs sịrị: “Unu nụrụ na a sịrị, ‘Akwala iko.’ Ma ana m asị unu na onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.” (Matiu 5:27, 28) Ihe Jizọs na-ekwu ebe a abụghị echiche ime omume rụrụ arụ nke nwere ike ịbatatụ mmadụ n’obi ma pụọkwa. Kama, ihe ọ na-eme ka o doo anya bụ otú ọ dịruru ná njọ mmadụ ‘ịnọgịde na-ele nwaanyị anya.’ Ịnọgide na-ele mmadụ anya na-emekarị ka agụụ ịkwa iko gụwa onye ahụ. Ọ bụrụzie na ohere ya adapụta, o nwere ike ime ka onye ahụ kwaa iko. Olee otú mmadụ nwere ike isi gbochie ihe a ime? O nwere ike ịdị mkpa ka anyị mee ihe mmadụ na-agaghị echetụ n’echiche ime. Jizọs sịrị: “Ọ bụrụkwa na anya aka nri gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, ghụpụ ya tụfuo. . . . Ọ bụrụkwa na aka nri gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, gbubipụ ya tụfuo.”—Matiu 5:29, 30.

Ụfọdụ ndị ekwela ka e gbubie ha aka ma ọ bụ ụkwụ iji zọọ ha ndụ. N’ihi ya, anyị nwere ike ịghọta ihe Jizọs kwuru mgbe ọ sịrị na ọ ka mma ‘ịtụfu’ ihe ọ bụla, ọ bụrụgodị ihe dị mkpa dị ka anya ma ọ bụ aka, iji zere ihe ga-eme ka anyị chewe echiche ime ihe na-adịghị mma, si otú a zere nsogbu ndị o nwere ike ịkpata. Jizọs sịrị: “N’ihi na ọ baara gị uru ka otu akụkụ ahụ́ gị laa n’iyi karịa na a tụbara ahụ́ gị dum na Gehena” (ya bụ, ebe a na-akpọ ihe e kpofuru ekpofu ọkụ n’azụ mgbidi Jeruselem), bụ́ nke pụtara mbibi ebighị ebi.

Jizọs kwukwara ihe mmadụ kwesịrị ime ma e nwee onye chọrọ ya okwu ma ọ bụ merụọ ya ahụ́. Ọ sịrị: “Emegwarala onye bụ́ ajọ mmadụ ihe o mere gị; kama onye ọ bụla nke mara gị ụra na ntì aka nri, tụgharịkwaara ya nke ọzọ.” (Matiu 5:39) Ihe  a na-ekwu ebe a abụghị na mmadụ agaghị eme ihe iji chebe onwe ya ma ọ bụ ndị ezinụlọ ya ma mmadụ chọwa ime ha ihe. Jizọs kwuru banyere ịma mmadụ ụra, bụ́ nke na-anaghị emerụ mmadụ ezigbo ahụ́ ma ọ bụ gbuo ya. Kama, a na-ama mmadụ ụra iji menye ya ihere. Ihe Jizọs na-ekwu bụ na ọ bụrụ na mmadụ amaa gị ụra ma ọ bụ gwa gị okwu mkparị iji mee ka gị na ya lụwa ọgụ ma ọ bụ rụwa ụka, emegwarala.

Ihe ahụ Jizọs kwuru dabara adaba n’iwu Chineke nyere ka mmadụ hụ onye agbata obi ya n’anya. N’ihi ya, Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu.” O kwuru ihe mere ha ji kwesị ime otú ahụ. Ọ sịrị: “Ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe, n’ihi na ọ na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma.”—Matiu 5:44, 45.

Iji chịkọtazie ihe niile o kwuru n’ebe a, Jizọs sịrị: “Unu aghaghị izu okè, dị ka Nna unu nke eluigwe zuru okè.” (Matiu 5:48) Ihe ọ na-ekwu abụghị na mmadụ ga-ezucha nnọọ okè. Kama, ọ bụrụ na anyị ana-eṅomi Chineke, anyị ga-ahụ mmadụ niile n’anya, ma ndị iro anyị. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ sịrị: “Na-emenụ ebere, dị nnọọ ka Nna unu na-eme ebere.”—Luk 6:36.

EKPERE NA ỊTỤKWASỊ CHINEKE OBI

Ka Jizọs gara n’ihu n’ozizi ya, ọ gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “Lezienụ anya nke ọma ka unu ghara ịdị na-eme ezi omume unu n’ihu ndị mmadụ ka ha wee hụ unu.” Jizọs katọrọ mmadụ ime omume ihu abụọ. Ọ sịrị: “Mgbe ị na-enye onyinye ebere, afụla opi na-aga, dị nnọọ ka ndị ihu abụọ na-eme.” (Matiu 6:1, 2) Ọ ka mma inye onyinye ebere na nzuzo.

Ihe ọzọ Jizọs kwuru bụ: “Mgbe unu na-ekpekwa ekpere, unu adịla ka ndị ihu abụọ; n’ihi na ọ na-atọ ha ụtọ iguzo n’ụlọ nzukọ, na ebe ụzọ nwere ngalaba na-ekpe ekpere ka ndị mmadụ wee na-ahụ ha.” Kama isi otú a ekpe ekpere, Jizọs sịrị: “Mgbe ị na-ekpe ekpere, banye n’ọnụ ụlọ gị, mgbe i mechisịrị ọnụ ụzọ gị, kpekuo Nna gị nke nọ na nzuzo ekpere.” (Matiu 6:5, 6) Jizọs anaghị ekwu na ekpere niile a na-ekpe n’ihu ọha dị njọ. Ihe mere na ọ bụghị ihe ọ na-ekwu bụ na yanwa kpekwara ekpere n’ihu ọha. Kama, ọ na-akatọ ekpere ndị a na-ekpe ka ọ tọọ ndị nụrụ ya ụtọ nakwa ndị a na-ekpe ka ndị mmadụ jawa onye kpere ya mma.

O nyere ndị na-ege ya ntị ndụmọdụ ga-abara onye ọ bụla n’ime ha uru. Ọ sịrị: “Mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwughachila otu ihe ugboro ugboro, dị ka ndị mba ọzọ na-eme.” (Matiu 6:7) Ihe Jizọs na-ekwu abụghị na mmadụ ịrịọghachi ihe ọ riọrọla n’ekpere dị njọ. Kama, ihe ọ na-ekwu bụ na ọ dịghị mma ịna-ekwughachi “ugboro ugboro” okwu a mụgharịrị amụgharị buru n’isi, mgbe anyị na-ekpe ekpere. Ọ kụziiri ha otu ekpere iji nyere ha aka ịma otú ha ga-esi na-ekpe ekpere. N’ekpere ahụ, e nwere ihe asaa anyị kwesịrị ịna-etinye n’ekpere anyị. Arịrịọ atọ mbụ gosiri na ọ bụ Chineke ka o ruuru ịchị achị, kwuokwa banyere nzube Chineke, ya bụ, ka e doo aha Chineke nsọ, ka Alaeze ya bịa nakwa ka e mee uche ya. Ọ bụ mgbe anyị rịọchara gbasara ihe ndị a ka anyị kwesịrị ịrịọ banyere ihe ndị gbasara anyịnwa, dị ka ihe atụ, ịrịọ  ka e nye anyị nri ụbọchị, ka a gbaghara anyị mmehie, ka a ghara ịnwa anyị ọnwụnwa anyị na-agaghị edili nakwa ka a napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.

Olee otú ihe onwunwe anyị kwesịrị ịdịru anyị mkpa? Jizọs gwara ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Kwụsịnụ ịkpakọbara onwe unu akụ̀ n’ụwa, ebe nla na nchara na-erichapụ ihe, ebe ndị ohi na-awabakwa zuo ohi.” Ihe a Jizọs kwuru magburu onwe ya. Akụnụba na-ala n’iyi. Inwe ya anaghịkwa eme ka anyị na Chineke dị ná mma karị. N’ihi ya, Jizọs kwuru sị: “Na-akpakọbaranụ onwe unu akụ̀ n’eluigwe.” Otú anyị nwere ike isi mee ihe a o kwuru bụ ịna-ebute ihe ndị gbasara ofufe Chineke ụzọ ná ndụ anyị. O nweghị mmadụ nwere ike ịnapụ anyị adịm ná mma anyị na Chineke ma ọ bụ mee ka anyị ghara inweta ndụ ebighị ebi. Ọ bụ ya mere ihe a Jizọs kwuru ji bụrụ eziokwu. Ọ sịrị: “N’ebe akụ̀ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa.”—Matiu 6:19-21.

Iji mesie ihe a o kwuru ike, Jizọs mere otu ihe atụ. Ọ sịrị: “Oriọna nke ahụ́ bụ anya. Ya mere, ọ bụrụ na anya gị na-elegide otu ebe, ahụ́ gị dum ga-ejupụta n’ìhè; ma ọ bụrụ na anya gị dị njọ, ahụ́ gị dum ga-agba ọchịchịrị.” (Matiu 6:22, 23) Ọ bụrụ na anya anyị na-ahụ ụzọ nke ọma, ọ na-adị ka oriọna nke na-enye ahụ́ anyị ìhè. Ma, ka anya anyị nwee ike ịna-enye ahụ́ anyị ìhè, o kwesịrị ịna-elegide otu ebe, ma ọ́ bụghị ya, anyị nwere ike ilewe ndụ anya n’ụzọ na-ezighị ezi. Ọ bụrụ na anyị ewere ịchụso ihe onwunwe ka ihe mbụ ná ndụ anyị kama ofufe Chineke, ọ ga-eme ka ‘ahụ́ anyị dum gbaa ọchịchịrị.’ O nwere ike ime ka anyị bido ịna-eme ihe a na-enyo enyo.

Jizọs mere otu ihe atụ na-enweghị mgbagha. Ọ sịrị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ; n’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya. Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.”—Matiu 6:24.

Ụfọdụ ndị nụrụ ihe Jizọs kwuru nwere ike ịna-eche ihe ha kwesịrị ime gbasara ihe ndị na-akpa ha. N’ihi ya, o mesiri ha obi ike na ha ekwesịghị ịna-echegbu onwe ha ma ọ bụrụhaala na ha ebute ozi Chineke ụzọ. Ọ sịrị ha: “Leruonụ anụ ufe nke eluigwe  anya, n’ihi na ha adịghị akụ mkpụrụ, ha adịghị aghọrọ mkpụrụ, ha adịghịkwa ekpokọta mkpụrụ n’ụlọ nkwakọba ihe; ma Nna unu nke eluigwe na-enye ha nri.”—Matiu 6:26.

Gịnịkwanụ banyere okooko lili ndị ahụ dị n’ugwu ebe ahụ? Jizọs gwara ha na “ọbụna Sọlọmọn, n’ebube ya niile, eyighị uwe mara mma dị ka otu n’ime ha.” Olee ihe nke a na-egosi? Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na Chineke na-eyiwe ahịhịa ndụ dị n’ubi uwe, nke dị ebe a taa, ma echi, a tụba ya n’ekwú, ọ̀ bụ na ọ gaghị eyiwe unu uwe karị?” (Matiu 6:29, 30) Jizọs gwara ha, sị: “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla, sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyi?’ . . . Nna unu nke eluigwe maara na ihe a niile dị unu mkpa. Ya mere, burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị ọzọ a niile.”—Matiu 6:31-33.

OTÚ MMADỤ GA-ESI ENWETA NDỤ

Ndịozi Jizọs na ndị ọzọ obi ha ziri ezi chọrọ ibi ndụ otú na-amasị Chineke, mana, ọ dịrịghị ha mfe n’ihi otú ihe si dịrị ha. Dị ka ihe atụ, ndị Farisii na-akatọkarị ihe ndị mmadụ na-eme, na-ekpekwa ha ikpe mkpegbu. Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ndị na-ege ya ntị, sị: “Kwụsịnụ ikpe ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe; n’ihi na otú unu si ekpe ikpe ka a ga-esi kpee unu ikpe.”—Matiu 7:1, 2.

Ọ bụrụ na mmadụ esoro ihe ndị Farisii ahụ na-akatọkarị ndị mmadụ na-ekwu, o nwere ike iduba onye ahụ ná nsogbu. Jizọs gosiri nke a n’otu ihe atụ o mere. Ọ sịrị: “Onye ìsì apụghị idu onye ìsì, ka ọ̀ pụrụ? Ha abụọ ga-adaba n’ime olulu, ka ọ̀ bụ na ha agaghị adaba?” Oleezi otú ndị na-ege Jizọs ntị kwesịrị isi na-ele ndị ọzọ anya? Ọ bụghị ile ha ka ha chọta ihe ha ga-eji katọọ ha, n’ihi na nke ahụ ga-abụ ime mmehie jọrọ oké njọ. Ọ jụrụ ha, sị: “Olee otú ị pụrụ isi gwa nwanna gị, sị, ‘Nwanna m, chere ka m wepụ irighiri ahịhịa nke dị n’anya gị,’ ma gị onwe gị adịghị ele ntụhie nke dị n’anya nke gị? Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ ntụhie ahụ dị n’anya nke gị, mgbe ahụ ka ị ga-ahụ nke ọma otú ị ga-esi wepụ irighiri ahịhịa nke dị n’anya nwanna gị.”—Luk 6:39-42.

Ihe Jizọs na-ekwu ebe a abụghị na ndị na-eso ụzọ ya agaghị anwa anwa were mmadụ ka onye na-eme ihe na-adịghị mma. Jizọs gwara ha, sị: “Unu enyela nkịta ihe dị nsọ, unu atụpụkwarala ézì nkume pel unu.” (Matiu 7:6) Eziokwu dị n’Okwu Chineke dị oké ọnụ ahịa dị ka nkume pel. Ọ bụrụ na ụfọdụ ana-akpa àgwà ka anụmanụ, na-egosi na ha ejighị eziokwu ahụ dị oké ọnụ ahịa kpọrọ ihe, ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ịhapụ ha chọwa ndị ga-anabata eziokwu ahụ.

Mgbe Jizọs kwuwere ihe gbasara ekpere ọzọ, o kwusiri okwu ike banyere ihe mere o ji dị mkpa ka anyị nọgide na-ekpe ekpere. Jizọs sịrị: “Na-arịọnụ, a ga-enye unu.” Jizọs mere ka o doo anya na Chineke dị njikere ịza ekpere anyị. Ọ jụrụ, sị: “Ònye n’etiti unu ka nwa ya nwoke ga-arịọ achịcha—ọ gaghị enye ya nkume, ka ọ̀ ga-enye ya? . . . Ya mere, ọ bụrụ na unu maara otú e si enye ụmụ unu ezi onyinye, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya ihe ọma karị!”—Matiu 7:7-11.

Jizọs kwuziri ihe mmadụ niile bịara nabata na ọ bụ otú mmadụ kwesịrị isi na-akpa àgwà. Ọ sịrị: “Ya mere, ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” Ọ̀ bụ  na anyị niile ekwesịghị ịna-echeta ezigbo ndụmọdụ ahụ Jizọs nyere anyị ma na-eme ya eme mgbe anyị na-emeso ndị ọzọ ihe? Ihe ọzọ Jizọs kwuru gosiri na ime ihe a nwere ike ọ gaghị adịchara anyị mfe. Ọ sịrị: “Sinụ n’ọnụ ụzọ ámá dị warara banye; n’ihi na okporo ụzọ nke na-eduba ná mbibi sara mbara ma dị obosara, ndị na-esikwa na ya abanye dị ọtụtụ; ma ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ dị warara, okporo ụzọ ya dịkwa mkpagide, ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.”—Matiu 7:12-14.

E nwere ndị ga-achọ ime ka ndị na-eso ụzọ Jizọs hapụ ọnụ ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ. N’ihi ya, Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya maka ndị amụma ụgha ndị na-abịakwute unu n’oyiyi atụrụ, ma n’ime ha, ha bụ anụ ọhịa wolf agụụ ji.” (Matiu 7:15) Jizọs kwuru na a na-eji mkpụrụ osisi amata nke bụ́ osisi ọma na nke bụ́ osisi ọjọọ. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ndị mmadụ. Anyị ga-eji ihe ndị amụma ụgha na-eme na ihe ha na-akụzi amata ndị ha bụ. Jizọs mere ka o doo anya na ọ bụghị naanị ihe mmadụ na-ekwu, kamakwa ihe onye ahụ na-eme, ka a ga-eji amata na ọ bụ onye na-eso ụzọ ya. Ụfọdụ ndị na-asị na Jizọs bụ Onyenwe ha, ma gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ha anaghị eme uche Chineke? Jizọs sịrị: “M ga-ekwupụtara ha, sị: Ọ dịghị mgbe m maara unu! Sinụ n’ebe m nọ pụọ, unu ndị ọrụ mmebi iwu.”—Matiu 7:23.

Ná mmechi okwu ya, Jizọs sịrị: “Onye ọ bụla nke na-anụ okwu m ndị a ma na-eme ha, a ga-eji ya tụnyere nwoke nwere uche, onye wuru ụlọ ya n’elu oké nkume. Mmiri wee zosie ike, idei mmiri abịakwa, ifufe efekwasịkwa ụlọ ahụ, ma ọ daghị, n’ihi na a tọrọ ntọala ya n’elu oké nkume.” (Matiu 7:24, 25) Gịnị mere na ụlọ ahụ adaghị? Ọ bụ n’ihi na nwoke ahụ “gwuru ala gwumie ya egwumi, tọọkwa ntọala n’elu oké nkume.” (Luk 6:48) N’ihi ya, naanị ịnụ ihe Jizọs kwuru ezughị, kama, anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ‘na-eme ya eme.’

Gịnịkwanụ banyere onye ‘na-anụ okwu ndị a’ ma “ọ dịghị eme ha”? Onye ahụ ga-adị ka “nwoke nzuzu, onye wuru ụlọ ya n’elu ájá.” (Matiu 7:26) Mmiri ozuzo, idei mmiri na ifufe ga-eme ka ụlọ ahụ daa.

Otú Jizọs si kụziere ndị mmadụ ihe juru ìgwè mmadụ ahụ anya. Ọ kụziri ihe ka onye nwere ikike, ọ bụghị dị ka ndị ndú okpukpe si akụzi. O nwere ike ịbụ na ọtụtụ ndị gere ya ntị ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya.

GỤKWUO GBASARA YA

ỤLỌ NCHE

Jizọs Kụziiri Anyị Otú Ndụ Anyị Ga-esi Baa Uru

Ihe ndị merela ụfọdụ ndị mmadụ na-egosi na ime ihe ahụ Jizọs kụziri n’elu ugwu na-eme ka ndụ mmadụ baa ezigbo uru.