Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 56

Gịnị n’Eziokwu Na-emerụ Mmadụ?

Gịnị n’Eziokwu Na-emerụ Mmadụ?

MATIU 15:1-20 MAK 7:1-23 JỌN 7:1

  • JIZỌS EMEE KA A MATA IHE ỌJỌỌ DỊ N’ỌDỊNALA NDỊ FARISII

Ka Ememme Ngabiga nke afọ 32 na-eru, Jizọs nọ na Galili na-akụzi ihe. Ọ ga-abụ na o mechara gawa Jeruselem maka Ememme Ngabiga ahụ n’ihi na ọ bụ ihe Chineke kwuru n’Iwu ya ka a na-eme. Ma, Jizọs kpachapụrụ anya na Jeruselem a ọ gawara n’ihi na ndị Juu na-achọ igbu ya. (Jọn 7:1) Mgbe e mechara ememme ahụ, ọ laghachiri Galili.

Ọ ga-abụ na Jizọs nọ na Kapaniọm mgbe ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ si Jeruselem bịakwute ya. Gịnị mere ha ji bịakwute ya? Ha na-achọ ihe ha ga-akụdo aka bo Jizọs ebubo na o mebiela iwu Chineke. Ha jụrụ ya, sị: “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị ji emebi ọdịnala ndị oge gboo? Dị ka ihe atụ, ha anaghị akwọ aka mgbe ha chọrọ iri nri.” (Matiu 15:2) Ọ dịghị mgbe Chineke gwara ndị ya ka ha ‘na-akwọ aka ha ruo n’ikpere aka’ tupu ha eriwe nri. (Mak 7:3) Ma, ndị Farisii na-ewere ya na onye na-anaghị eme ya na-ada ezigbo iwu.

Kama ịza ha ajụjụ a ha jụrụ, Jizọs kwuru otú ha si mara ụma na-emebi Iwu Chineke. Ọ jụrụ ha, sị: “Gịnị mere unu onwe unu ji emebi iwu Chineke n’ihi ọdịnala unu? Dị ka ihe atụ, Chineke sịrị, ‘Sọpụrụ nna gị na nne gị’; ọ sịkwara, ‘Ka e gbuo onye kwujọrọ nna ya ma ọ bụ nne ya.’ Ma unu sịrị, ‘Onye ọ bụla nke na-agwa nna ya ma ọ bụ nne ya, sị: “Ihe ọ bụla m nwere nke i nwere ike isi na ya rite uru bụ onyinye a raara nye Chineke,” ọ gaghị asọpụrụ nna ya ma ọlị.’”—Matiu 15:3-6; Ọpụpụ 20:12; 21:17.

Ndị Farisii sịrị na ego ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ mmadụ wepụtara iji nye Chineke onyinye bụ ihe dịịrị ụlọ nsọ, n’ihi ya, na e kwesịghị iji ya eme ihe ọ bụla ọzọ. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ndị na-ekwu na ha wepụtara ụdị onyinye a maka ụlọ nsọ ka na-ejidekwa onyinye ahụ. Dị ka ihe atụ, nwoke nwere ike ịsị na ego ya ma ọ bụ ihe ọzọ o nwere bụ “kọban,” ya bụ, onyinye a raara nye Chineke ma ọ bụ ụlọ nsọ. Ihe a o kwuru ga-eme ka ọ dị ka onyinye ahụ ọ̀ pụọla ya n’aka, bụrụzie nke ụlọ nsọ, ya agbagidezie ụkwụ ebe ahụ sị na ya agaghị ejili ya lekọta nne ya na nna ya mere agadi. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ahụ ọ sị na ya ji nye onyinye ka dịkwa ya n’aka. O sila otú ahụ mara ụma hapụ imere ndị mụrụ ya ihe o kwesịrị imere ha.—Mak 7:11.

Otú a Jizọs si gwa ndị Farisii okwu n’ihi otú ha si agbagọ Iwu Chineke kwesịrị ekwesị. Ọ gwakwara ha, sị: “Unu emewo ka okwu Chineke ghara ịdị irè n’ihi ọdịnala unu. Unu ndị ihu abụọ, Aịzaya buru amụma n’ụzọ kwesịrị ekwesị banyere unu, mgbe ọ sịrị, ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị nnọọ anya n’ebe m nọ. Ọ bụ n’efu ka ha na-efe m ofufe, n’ihi na ozizi ha na-ezi bụ ihe mmadụ nyere n’iwu.’” Ndị Farisii enweghị ihe ha nwere ịza Jizọs ná nkatọ a ọ katọrọ omume ọjọọ ha. Jizọs kpọziri ìgwè mmadụ ahụ ka ha bịa nso. Ọ sịrị ha: “Geenụ ntị ma ghọta ihe ọ pụtara. Ọ bụghị ihe na-abanye n’ọnụ mmadụ na-emerụ ya; kama ọ bụ ihe na-esi n’ọnụ mmadụ apụta na-emerụ ya.”—Matiu 15:6-11; Aịzaya 29:13.

Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ime ụlọ ka ihe a mechara, ha jụrụ ya, sị: “Ị̀ maara na ndị Farisii sụrụ ngọngọ mgbe ha nụrụ ihe i kwuru?” Ọ zara ha, sị: “A ga-efopụ ihe ọkụkụ ọ bụla nke Nna m nke eluigwe na-akụghị. Hapụnụ ha. Ha bụ ndị ndú kpuru ìsì. Ọ bụrụkwa na onye ìsì eduo onye ìsì, ha abụọ ga-adaba n’olulu.”—Matiu 15:12-14.

Ọ ga-abụ na o juru Jizọs anya mgbe Pita rịọrọ ya ka ọ kọwakwuoro ha gbasara ihe ahụ na-emerụ mmadụ. Jizọs sịrị ha: “Ọ̀ bụ na unu amaghị na ihe ọ bụla nke na-abanye n’ọnụ na-agafere wee banye n’eriri afọ, e wee nyụpụ ya n’olulu nsị? Otú ọ dị, ihe ndị na-esi n’ọnụ apụta na-esi n’obi, ọ bụ ihe ndị ahụ na-emerụ mmadụ. Dị ka ihe atụ, n’obi ka echiche ọjọọ, igbu ọchụ, ịkwa iko nke di  ma ọ bụ nwunye, ịkwa iko, izu ohi, ịgba akaebe ụgha, nkwulu, si apụta. Ọ bụ ihe ndị a na-emerụ mmadụ; ma iji aka a na-akwọghị akwọ rie nri adịghị emerụ mmadụ.”—Matiu 15:17-20.

Ihe Jizọs na-ekwu ebe a abụghị na ime ọcha dị njọ, ọ naghịkwanụ ekwu na mmadụ ịkwọ aka ya tupu ya esiwe nri ma ọ bụ tupu ya eriwe nri dị njọ. Kama, ọ na-akatọ omume ihu abụọ nke ndị ndú okpukpe ahụ, bụ́ ndị na-eleghara iwu Chineke anya ma na-edebe ọdịnala mmadụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe na-emerụ mmadụ bụ omume ọjọọ ndị si onye ahụ n’obi pụta.