Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 43

Ihe Atụ Ndị Gbasara Alaeze Chineke

Ihe Atụ Ndị Gbasara Alaeze Chineke

MATIU 13:1-53 MAK 4:1-34 LUK 8:4-18

  • JIZỌS EMEE IHE ATỤ NDỊ GBASARA ALAEZE CHINEKE

Ọ ga-abụ na Jizọs nọ na Kapaniọm ụbọchị ahụ ọ baara ndị Farisii mba. Ná mgbede ụbọchị ahụ, o si n’ụlọ ebe ọ nọ gawa n’Oké Osimiri Galili dị nso ebe ahụ, bụ́ ebe ìgwè mmadụ gbakọrọ. Mgbe Jizọs ruru ebe ahụ, ọ bara n’ụgbọ mmiri, a kwọrọ ụgbọ ahụ banyetụ n’osimiri ahụ. Ọ nọzi ebe ahụ malite ịkụziri ndị gbakọtaranụ ihe gbasara Alaeze eluigwe. O ji ọtụtụ ihe atụ kụziere ha ihe. Ndị na-ege ya ntị makwa ọtụtụ ihe ndị Jizọs kọọrọ ha gbasara ha n’ihe atụ ndị ahụ. Ihe a mere ka ọ dịrị ha mfe ịghọta ihe dị iche iche ọ kụziiri ha gbasara Alaeze ahụ.

Ihe atụ mbụ Jizọs mere bụ gbasara ọgha mkpụrụ nọ na-agha mkpụrụ ya. Ụfọdụ mkpụrụ ọ chị dara n’akụkụ ụzọ, ụmụ nnụnụ erie ha. Mkpụrụ ndị ọzọ dara n’ala okwute ebe ájá na-adịchaghị. Ha agbanyesighị mgbọrọgwụ ike n’ala. Anwụ chakpọkwara mkpụrụ ndị ahụ mgbe ha topụtara, ha akpọnwụọ. Ma, e nwekwara ndị nke dara n’etiti ogwu, ogwu ndị ahụ akpagbuokwa ha mgbe ha tolitere. N’ikpeazụ, ụfọdụ mkpụrụ dara n’ala dị mma ma mịa mkpụrụ. Otu mịrị ‘okpukpu otu narị, nke ọzọ iri isii, nke ọzọkwa iri atọ.’—Matiu 13:8.

N’ihe atụ ọzọ, Jizọs ji Alaeze Chineke tụnyere mgbe mmadụ ghara mkpụrụ. Na nke ugbu a, mkpụrụ ahụ na-eto, ma onye ahụ ọ̀ na-ehi ụra ma ọ̀ mụ anya. Mana, ọ́ dị otú o si too, “ọ maghị.” (Mak 4:27) Ha tooro onwe ha ma mịa mkpụrụ nwoke ahụ nwere ike ịga n’ubi were.

Jizọs mekwara ihe atụ nke atọ gbasara ịgha mkpụrụ. O kwuru na e nwere nwoke ghara mkpụrụ ndị dị mma. Mana, “mgbe ndị mmadụ nọ na-ehi ụra,” onye iro gara kụọ ata n’ebe ahụ ọ kụrụ ọka wit. Ndị ohu nwoke ahụ jụrụ ya ma  ọ̀ bụ ha gaa fopụsịa ata ndị ahụ. Mana ọ zara ha, sị: “Ee e; ka ọ ghara ịbụ na mgbe unu na-efopụ ata ahụ, unu efopụkọta ha na ọka wit ahụ. Hapụnụ ha abụọ ka ha tokọọ ruo n’oge owuwe ihe ubi; n’oge owuwe ihe ubi, m ga-agwa ndị na-ewe ihe ubi, sị, ‘Burunụ ụzọ chịkọta ata ahụ ma kee ha n’ùkwù n’ùkwù ka e suo ha ọkụ, e mesịa, unu agaa chịkọta ọka wit ahụ chịba n’ụlọ nkwakọba ihe m.’”—Matiu 13:24-30.

Ọtụtụ ndị nọ́ na-ege Jizọs ntị ma ihe gbasara ọrụ ugbo. E nwekwara ihe ọzọ ọ kpọtụrụ aha ndị na-ege ya ntị ma nke ọma, ya bụ, mkpụrụ mọstad. Ọ na-eto ghọọ nnukwu osisi ụmụ nnụnụ na-ebi n’alaka ya. Jizọs ji mkpụrụ ahụ mee ihe atụ banyere Alaeze Chineke. Ọ sịrị: “Alaeze eluigwe dị ka mkpụrụ osisi mọstad, nke mmadụ weere kụọ n’ubi ya.” (Matiu 13:31) Ihe Jizọs na-eme ebe a abụghị ịkụzi otú e si agha mkpụrụ. Kama, ọ na-akọwa otú obere ihe nwere ike isi too uto dị egwu.

Jizọs jikwa ihe ọzọ ndị na-ege ya ntị maara nke ọma mee ihe atụ. O ji Alaeze eluigwe tụnyere “ihe iko achịcha, nke nwaanyị weere tinye n’ime ntụ ọka nke juru arịa atọ buru ibu.” (Matiu 13:33) Ọ bụ eziokwu na a naghị ahụ ihe iko achịcha ahụ anya, ọ na-agazu ná ntụ ọka ahụ niile ma mee ka o koo. Ntụ ọka ahụ na-eko buo ibu. E nwekwara ihe ndị ọzọ na-agbanwe ná ntụ ọka ahụ a na-anaghị achọpụta ozugbo ma ha gbanwewe.

Mgbe Jizọs mechara ihe atụ ndị a, ọ gwara ìgwè mmadụ ahụ ka ha lawa, yanwa alaghachiwe n’ụlọ ebe o bi. Ozugbo ha lọtara, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya ka ọ gwa ha ihe ihe atụ ndị ahụ pụtara.

ỊMỤTA IHE N’IHE ATỤ NDỊ AHỤ JIZỌS MERE

Ọ bụ eziokwu na ndị na-eso ụzọ Jizọs anụtụla ka o ji ihe atụ kụzie ihe, ma ha ahụbeghị ka o ji ihe atụ hiri nne otú a kụzie ihe. Ha jụrụ ya, sị: “Gịnị mere i ji jiri ihe atụ na-agwa ha okwu?”—Matiu 13:10.

Otu ihe mere o ji mee ya bụ ka o mezuo ihe e kwuru na Baịbụl. E kwuru n’akwụkwọ Matiu, sị: “Ọ dịghị agwa ha okwu ma ọ bụrụ na o jighị ihe atụ; ka e wee mezuo ihe e kwuru site n’ọnụ onye amụma, bụ́ onye sịrị: ‘M ga-emeghe ọnụ m jiri ihe atụ kwuo okwu. M ga-ekwusa ihe ndị zoro ezo kemgbe a tọrọ ntọala ụwa.’”—Matiu 13:34, 35; Abụ Ọma 78:2.

Ma, e nwekwara ihe ọzọ mere Jizọs ji were ihe atụ kụzie ihe. Ọ na-eme ka a mata ihe ndị mmadụ ga-eme ma ha nụ ihe ọ kụziri. Ihe mere ihe ya ji amasị ọtụtụ n’ime ha bụ na ha weere ya ka onye ma otú e si akọ akụkọ ya atọọ ụtọ, nakwa onye na-arụ ọrụ ebube. Ha ewereghị ya ka Onyenwe ha ha kwesịrị ige ntị, nakwa onye ha kwesịrị isowe n’eleghị anya n’azụ. (Luk 6:46, 47) Ha achọghị onye ga-agwa ha na otú ha si ele ihe anya ma ọ bụ otú ha si ebi ndụ adịghị mma. Ha achọghị ka ihe a na-akụziri ha baa ha n’obi.

Jizọs zara ndị na-eso ụzọ ya ihe ahụ ha jụrụ ya. Ọ sịrị ha: “Ọ bụ ya mere m ji eji ihe atụ agwa ha okwu, n’ihi na n’ile anya, ha na-ele n’efu, n’ịnụ ihe, ha na-anụ n’efu, ha adịghịkwa aghọta ihe ọ pụtara; amụma Aịzaya na-emezu n’ebe ha nọ, nke sịrị: ‘. . . Obi ndị a adịkwaghị anabata ihe.’”—Matiu 13:13-15; Aịzaya 6:9, 10.

Mana, ọ bụghị ndị niile gere Jizọs ntị ka ihe a mezuru n’isi ha. Jizọs sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị anya unu n’ihi na ha na-ahụ ụzọ, na ntị unu n’ihi na ha na-anụ ihe. N’ihi na n’ezie, ana m asị unu, Ọtụtụ ndị amụma na ndị ezi omume chọrọ ịhụ ihe ndị unu na-ahụ ma ha ahụghị ha, nakwa ịnụ ihe ndị unu na-anụ, ma ha anụghị ha.”—Matiu 13:16, 17.

 Ndịozi iri na abụọ Jizọs na ndị ọzọ na-eso ụzọ ya nwere obi na-anabata ihe. Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ha, sị: “Ọ bụ unu ka e nyere ikike ịghọta ihe nzuzo ndị dị nsọ nke alaeze eluigwe, ma e nyeghị ndị ahụ ikike ya.” (Matiu 13:11) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ihe atụ ahụ o mere banyere ọgha mkpụrụ pụtara n’ihi na ha ji ezi obi chọọ ịghọta ya.

Jizọs gwara ha, sị: “Mkpụrụ ahụ bụ okwu Chineke.” (Luk 8:11) Ala ndị ahụ ọ dara na ha bụkwa obi. Ọ bụ ihe a ga-enyere mmadụ aka ịghọta ihe atụ ahụ.

Jizọs kọwakwuru ihe banyere mkpụrụ ahụ dara n’akụkụ ụzọ. Ọ sịrị: “Ekwensu wee bịa wepụ okwu ahụ n’obi ha ka ha wee ghara ikwere, e wee zọpụta ha.” (Luk 8:12) O kwukwara ihe mkpụrụ ahụ a ghara n’ala okwute pụtara. O kwuru na ọ pụtara obi ndị ji obi ụtọ nabata okwu Chineke ọ kụziiri ha mana okwu ahụ agbanyeghị mgbọrọgwụ n’obi ha. Ọ sịrị na “mgbe ahụhụ ma ọ bụ mkpagbu bilitere n’ihi okwu ahụ,” ha na-asụ ngọngọ. Nke a pụtara na mgbe o ruru “n’oge ule,” ikekwe mmegide si n’aka ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị ọzọ, ha adapụ n’okwukwe.—Matiu 13:21; Luk 8:13.

Gịnịkwanụ banyere mkpụrụ ahụ dara n’etiti ogwu? Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ọ pụtara ndị nụrụ okwu ahụ, mana “nchegbu nke usoro ihe a na ike dị aghụghọ nke akụnụba” ekweghị ha mee nke ọma. (Matiu 13:22) Okwu ahụ dị ha n’obi, mana o nwere ihe ndị kpagburu ya, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ.

Ala nke ikpeazụ Jizọs kwuru okwu ya bụ ala dị mma. Ala a bụ ndị nụrụ okwu ahụ, obi ha anabata ya, ha aghọtakwa ya nke ọma. Gịnị ka ha meziri? Ha ‘mịrị mkpụrụ.’ N’ihi otú ihe si dịrị ha, dị ka afọ ndụ ha, ma ọ bụ ahụ́ ike ha, ha niile amịghị mkpụrụ há nhata. Otu mịrị okpukpu otu  narị, nke ọzọ amịa iri isii, nke ọzọkwa amịa iri atọ. N’eziokwu, ndị na-enweta ngọzi a na-enye ndị na-ejere Chineke ozi bụ “ndị na-ejigide okwu ahụ mgbe ha ji ezi obi nke dị mma nụ ya wee jiri ntachi obi na-amị mkpụrụ.”—Luk 8:15.

O doro anya na okwu ndị a tọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ezigbo ụtọ, bụ́ ndị chọọrọ ya bịa ka ọ kọwaara ha ihe ihe ndị ahụ ọ kụziri pụtara. Ugbu a ka ha ghọtara ihe ihe atụ ndị ahụ pụtara. Jizọs chọrọ ka ha ghọta ihe atụ ndị ahụ o mere ka ha nwee ike ịkụziri ndị ọzọ eziokwu. Jizọs jụrụ ha, sị: “A dịghị ebute oriọna ka e wee dọba ya n’okpuru nkata ma ọ bụ n’okpuru ihe ndina, ka à na-eme otú ahụ? A na-ebute ya ka a dọba ya n’elu ihe ndọba oriọna, ọ́ bụghị ya?” N’ihi ya, Jizọs gwara ha, sị: “Onye ọ bụla nwere ntị ige ntị, ya gee ntị.”—Mak 4:21-23.

JIZỌS AKỤZIKWUORO HA IHE

Mgbe Jizọs kọwachaara ndị na-eso ụzọ ya ihe atụ ọgha mkpụrụ ahụ, ha chọkwara ịghọta ihe atụ ndị ọzọ o mere. Ha sịrị ya: “Kọwaara anyị ihe atụ nke ata ahụ dị n’ubi.”—Matiu 13:36.

Ihe a ha rịọrọ Jizọs gosiri na ha dị nnọọ iche ná ndị ọzọ so ha gee Jizọs ntị mgbe ahụ ọ nọ n’akụkụ mmiri na-akụzi ihe. O doro anya na ndị ahụ nụrụ ihe ọ kụziri, mana ọ gụghị ha agụụ ịmata ihe ihe atụ ndị ahụ o mere pụtara na otú o si gbasa ha. Naanị ihe bụ́ mkpa ha bụ otú akụkọ ndị ahụ si tọọ ụtọ. Jizọs gosiri na ndị ahụ gere ya ntị n’akụkụ mmiri ahụ adịghị ka ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị chọọrọ ya bịa n’ihi na ọ gụrụ ha agụụ ịmata ihe ihe atụ ndị ahụ pụtara. Ọ sịrị:

“Geenụ ntị n’ihe unu na-anụ. Ihe unu ji atụ̀ ihe ka a ga-eji tụọrọ unu, ee, a ga-atụkwasịkwara unu ihe.” (Mak 4:24) Ndị na-eso ụzọ Jizọs na-echebara ihe ndị ha nụrụ n’ọnụ ya echiche. Otú ha si tụọ ihe bụ na ha chọsiri ike ịmụtakwu ihe n’aka Jizọs, chebakwara ihe ndị ha nụrụ echiche. Otú Jizọs sikwanụ nyeghachi ha bụ na ọ kụzikwuuru ha ihe. Ọ bụ ya mere na mgbe Jizọs na-aza ha ihe ha jụrụ banyere ihe atụ ata na ọka ahụ, ọ kọwaara ha, sị:

“Onye ghara ezi mkpụrụ ahụ bụ Nwa nke mmadụ; ubi ahụ bụ ụwa; ma ezi mkpụrụ ahụ bụ ụmụ nke alaeze; ma ata ahụ bụ ụmụ ajọ onye ahụ, onye iro nke kụrụ ha bụ Ekwensu. Owuwe ihe ubi ahụ bụ ọgwụgwụ nke usoro ihe a, ndị ahụ na-ewe ihe ubi bụ ndị mmụọ ozi.”—Matiu 13:37-39.

Mgbe Jizọs kọwachara ihe ihe nke ọ bụla o kwuru okwu ya n’ihe atụ ahụ pụtara, o kwuru ihe ga-emecha mee. Ọ sịrị na n’ọgwụgwụ ụwa ochie a, ndị na-ewe ihe ubi, ya bụ, ndị mmụọ ozi ga-ekewapụ Ndị Kraịst adịgboroja, bụ́ ndị yiri ata, n’ebe ezigbo “ụmụ nke alaeze” nọ. A ga-achịkọta “ndị ezi omume,” ha ga-emechakwa nwuo gbaa ka anyanwụ “n’alaeze nke Nna ha.” Gịnịkwanụ banyere “ụmụ ajọ onye ahụ”? A ga-ebibi ha nke ga-eme ka ‘ha kwaa ákwá ma taa ikikere ezé.’—Matiu 13:41-43.

 Jizọs meere ndị na-eso ụzọ ya ihe atụ atọ ọzọ. Na nke mbụ, ọ sịrị: “Alaeze eluigwe dị ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nke e zoro n’ala, nke otu nwoke hụrụ wee zoo ya; n’ihi ọṅụ o nwere, ọ gara ree ihe ndị o nwere wee zụọ ala ahụ.”—Matiu 13:44.

N’ihe atụ nke abụọ, ọ sịrị: “Alaeze eluigwe dị ka onye ahịa nke na-achọ nkume pel ọma. Mgbe ọ hụrụ otu nkume pel dị nnọọ oké ọnụ ahịa, ọ lara ma ree ihe niile o nwere ozugbo wee zụọ ya.”—Matiu 13:45, 46.

N’ihe atụ abụọ a, Jizọs gosiri otú mmadụ si adị njikere ịhapụ ihe ụfọdụ n’ihi ihe ndị ka mkpa. Onye ahịa ahụ rere “ihe niile o nwere” ozugbo iji nweta otu nkume pel dị oké ọnụ ahịa. Ndị na-eso ụzọ Jizọs ghọtara ihe atụ ahụ o ji nkume pel dị oké ọnụ ahịa mee. Nwoke nke chọtara akụ̀ ahụ e zoro n’ala ‘rere ihe niile o nwere’ iji nweta ya. N’ihe atụ abụọ ahụ, e nwere ihe dị oké ọnụ ahịa e kwesịrị inweta ma jiri ya kpọrọ ihe. E nwere ike iji ihe a a na-ekwu tụnyere mbọ niile mmadụ na-agba iji gboo mkpa ime mmụọ ya. (Matiu 5:3) Ụfọdụ ndị nụrụ ihe atụ ndị a Jizọs mere adịla mbụ gosi na ha dị njikere ime ihe ọ bụla dị mkpa ka ha mee iji gboo mkpa ime mmụọ ha ma bụrụ ezigbo ndị na-eso ụzọ ya.—Matiu 4:19, 20; 19:27.

N’ikpeazụ, Jizọs ji Alaeze eluigwe tụnyere ụgbụ nke jidere ụdị azụ̀ dị iche iche. (Matiu 13:47) Mgbe e wepụtachara azụ̀ ndị ahụ, a chịkọtara ndị dị mma ma kpofuo ndị na-adịghị mma. Jizọs sịrị na ọ bụ otu ihe ahụ ga-eme n’ọgwụgwụ ụwa ochie a. Ndị mmụọ ozi ga-ekewapụ ndị ajọ omume n’ebe ndị ezi omume nọ.

Jizọs n’onwe ya nọ na-akụta ndị mmadụ ka azụ̀ mgbe ọ kpọrọ ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịa bụrụ “ndị na-akụta mmadụ.” (Mak 1:17) Ma, o kwuru na ihe atụ ahụ o ji ụgbụ mee ka ga-emezu n’ọdịnihu, “n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a.” (Matiu 13:49) Ihe o kwuru mere ka ndịozi ya na ndị ọzọ na-eso ụzọ ya ghọta na ihe ndị dị egwu ka ga-eme n’ọdịnihu.

Ndị nụrụ ihe atụ ndị ahụ ọ nọ n’ụgbọ mee ritekwukwara uru. Jizọs gosiri na ya dị njikere ‘ịkọwara ndị na-eso ụzọ ya ihe niile mgbe naanị ha nọ.’ (Mak 4:34) Ọ dị ka “nwoke bụ́ onyeisi ezinụlọ, onye na-esi n’ụlọ akụ̀ ya ewepụta ihe ndị dị ọhụrụ na ndị mere ochie.” (Matiu 13:52) Ihe Jizọs kwo mee ihe atụ ndị a abụghị ka ya gosi na ya kacha akụzi ihe. Kama, ọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya eziokwu ndị yiri akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. N’eziokwu, ọ bụ aka ochie ‘n’izi ihe n’ihu ọha.’

GỤKWUO GBASARA YA

“Lee! M Nọnyeere Unu Ụbọchị Niile”

Ilu ọka wit na ata na-ekwu banyere oge ịkụ mkpụrụ, mgbe mkpụrụ na-eto, na oge owuwe ihe ubi. Gịnị ka anyị ghọtara ugbu a banyere oge owuwe ihe ubi?