Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 40

Jizọs Akụzie Gbasara Ịgbaghara Mmehie

Jizọs Akụzie Gbasara Ịgbaghara Mmehie

LUK 7:36-50

  • OTU NWAANYỊ A MA DỊ KA ONYE MMEHIE ETEE JIZỌS MMANỤ N’ỤKWỤ

  • JIZỌS EJIRI IHE ATỤ NKE ONYE JI ỤGWỌ KỤZIE BANYERE ỊGBAGHARA MMEHIE

Ihe ndị mmadụ na-eme mgbe ha nụrụ ihe Jizọs na-akụzi ma ọ bụ hụ ihe ndị ọ na-eme dịcha iche iche. Ọ bụ otú obi onye ọ bụla dị na-ekpebi ihe ọ na-eme. Ihe gosiri na ihe a bụ eziokwu bụ otu ihe mere mgbe Jizọs gara n’ụlọ otu nwoke na Galili. Nwoke ahụ bụ onye Farisii aha ya bụ Saịmọn. Ọ kpọrọ Jizọs ka ọ bịa rie ihe n’ụlọ ya. O nwere ike ịbụ na ihe mere o ji kpọọ ya n’ụlọ ya bụ ka ya lerugodị onye a na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube anya. Jizọs nabatara òkù ahụ ọ kpọrọ ya otú ahụ o sikwa nabata nke ndị ọnaụtụ na ndị mmehie kpọrọ ya. Ọ ga-abụ na o lere ya anya ka ohere o nwere ike iji kwusaara ndị bịara ebe ahụ ozi ọma.

Ma, mgbe Jizọs ruru ebe ahụ, a nabataghị ya otú ndị Juu si anabata ndị ọbịa. Okporo ụzọ Palestaịn dị uzuzu uzuzu. Ụkwụ na-ekporo onye si na ya gaa ije ọkụ, na-adịkwa uzuzu uzuzu. N’ihi ya, ọ bụ omenala ndị Juu ibu ụzọ jiri mmiri oyi saa onye ọbịa ụkwụ. O so n’otú ha na-esi eleta ndị ọbịa. Ihe ọzọ ha na-emekarịkwa iji nabata onye ọbịa bụ isutụ ya ọnụ. Ma, a saghị Jizọs ụkwụ, o nweghịkwa onye sutụrụ ya ọnụ. Ihe ọma ọzọ a na-emere onye ọbịa bụ ite ya mmanụ n’isi. Ma, emekwaraghị Jizọs otú ahụ. Oleezi otú e si nabata ya?

Ndị niile a kpọrọ òkù nọdụrụ n’oche, nri amalite. Ka ha nọ na-eri nri, otu nwaanyị na-esoghị ná ndị a kpọrọ oriri ahụ ji nwayọọ bata ebe ahụ. Ọ bụ nwaanyị “a maara n’obodo ahụ na ọ bụ onye mmehie.” (Luk 7:37) Mmadụ niile bụ ndị mmehie, mana nwaanyị a na-ebi ndụ rụrụ arụ. Ọ ga-abụ na ọ bụ onye akwụna. O nwere ike ịbụ na nwaanyị a anụla ihe ndị Jizọs kụzirila, nụkwa òkù ahụ Jizọs kpọrọ ka ‘ndị niile e boro ibu dị arọ bịakwute ya iji nweta ume.’ (Matiu 11:28, 29) Ọ ga-abụ na ihe ndị Jizọs kụziri nwaanyị a nụrụ, nakwa ihe ndị ọ hụrụ Jizọs mere, mere o ji chọwa Jizọs, chọtazie ya ugbu a.

Ọ bịara n’akụkụ Jizọs ma gbunye ikpere n’ala. Anya mmiri si nwaanyị ahụ n’anya na-atasa n’ụkwụ Jizọs, ya ewerekwa ntụtụ isi ya na-ehicha anya mmiri ahụ tasara Jizọs n’ụkwụ. O jikwa nwayọọ sutụ Jizọs ọnụ n’ụkwụ ma were mmanụ na-esi ísì ụtọ o ji bịa tee ya n’ụkwụ. Saịmọn nọ na-ele ihe nwaanyị a na-eme, ma obi adịghị ya mma. Ọ nọ na-ekwu n’ime obi ya, sị: “A sị na nwoke a bụ onye amụma, ọ gaara ama onye na-ebitụ ya aka, marakwa ụdị nwaanyị ọ bụ, na ọ bụ onye mmehie.”—Luk 7:39.

Jizọs matara ihe Saịmọn nọ na-eche n’obi ya. Ọ sịrị ya: “Saịmọn, enwere m ihe m ga-agwa gị.” Saịmọn zara ya, sị: “Onye Ozizi, kwuwe!” Jizọs sịrị ya: “Mmadụ abụọ ji otu onye na-agbazinye mmadụ ego ụgwọ; otu onye ji ụgwọ narị mkpụrụ ego dinarịọs ise, ma onye nke ọzọ ji iri ise. Mgbe ha na-enweghị ihe ọ bụla ha ga-eji kwụọ ụgwọ ha ji, ọ gbaghaara ha abụọ kpamkpam. Ònye n’ime ha ga-ahụ ya n’anya karị?” Saịmọn zara ajụjụ ahụ ka onye obi ya na-adịghị n’ihe ọ na-aza. Ọ sịrị: “Echere m na ọ bụ onye ahụ ọ gbaghaara ego ka ukwuu kpamkpam.”—Luk 7:40-43.

Jizọs kwetara ihe ọ zara. Jizọs lere nwaanyị ahụ anya ma gwa Saịmọn, sị: “Ị̀ hụrụ nwaanyị a? Abatara m n’ụlọ gị; i nyeghị m mmiri ka m saa ụkwụ. Ma nwaanyị a ji anya mmiri ya dee ụkwụ m, jirikwa ntutu isi ya hichaa ha. I susughị m ọnụ; ma malite n’oge awa m batara nwaanyị a ahapụghị iji nwayọọ susuo ụkwụ m ọnụ. I teghị isi m mmanụ; ma nwaanyị a tere ụkwụ m mmanụ na-esi ísì ụtọ.” Jizọs hụrụ na nwaanyị a ejirila obi ya niile chegharịa ná ndụ rụrụ arụ ọ na-ebi. N’ihi ya, Jizọs sịrị: “Ana m asị gị, a gbagharawo ya mmehie ya n’agbanyeghị na ha dị ọtụtụ, n’ihi na o gosiri ịhụnanya dị ukwuu; ma onye a gbaghaara ihe dị nta, na-egosi ịhụnanya dị nta.”—Luk 7:44-47.

Ọ bụghị na Jizọs na-anabata omume rụrụ arụ. Kama, Jizọs gosiri na ya ghọtara otú ọ na-adị ndị mere mmehie dị oké njọ, ha egosikwa na o wutere ha ma bịakwute Kraịst ka ha nwee ike inwere onwe ha. Chegodị otú ihe ọzọ Jizọs kwuru ga-esi mee ka obi zuo nwaanyị ahụ ike. Jizọs sịrị ya: “A gbagharawo gị mmehie gị. . . . Okwukwe gị azọpụtawo gị; lawa n’udo.”—Luk 7:48, 50.

GỤKWUO GBASARA YA

ỤLỌ NCHE

Chineke Ò Nwere Ike Ịgbaghara Anyị Mmehie Anyị?

Chineke ọ̀ na-agbaghara mmehie ndị dị oké njọ? Gịnị ka anyị ga-eme ka Chineke hụ anyị n’anya?

ỤLỌ NCHE

“Jehova Gbaghaara Unu Kpamkpam”

Chineke na-eji obi ya niile agbaghara ndị mmehie chegharịrịnụ. Oleezi otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ ihe. Gịnị mere o ji dị oké mkpa ka anyị na-agbaghara ndị ọzọ?