Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 44

Jizọs Emee Ka Ebili Mmiri Dajụọ

Jizọs Emee Ka Ebili Mmiri Dajụọ

MATIU 8:18, 23-27 MAK 4:35-41 LUK 8:22-25

  • JIZỌS EMEE KA EBILI MMIRI KWỤSỊ N’OKÉ OSIMIRI GALILI

Ike gwụchara Jizọs n’ihi ọrụ niile ọ rụrụla kemgbe taa. Ná mgbede, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ka anyị gafee n’ikpere mmiri nke ọzọ,” bụ́ nke dị n’ofe nke ọzọ nke osimiri ahụ.—Mak 4:35.

Obodo Geresa dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Oké Osimiri Galili. Aha ọzọ a na-akpọ obodo a bụ Dikapọlis. N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị Juu bi na Dikapọlis, ọ bụ omenala ndị Grik juru ebe ahụ.

Ọtụtụ ndị ma mgbe Jizọs si Kapaniọm pụwa. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ na e nwere ụgbọ mmiri ndị ọzọ si ná mmiri ahụ gawa n’ofe ya nke ọzọ. (Mak 4:36) Isi n’otu ofe osimiri ahụ gafere n’ofe ya nke ọzọ adịchaghị anya. Oké Osimiri Galili dị ka ọdọ mmiri dị ihe dị ka kilomita iri abụọ n’ogologo, dịrịkwa ihe dị ka kilomita iri na abụọ n’obosara. Mana, ọ dị omimi.

Ọ bụ eziokwu na Jizọs zuru okè, ike gwụrụ ya mgbe ọ kụzichaara ndị mmadụ ihe. N’ihi ya, mgbe ha kwọọrọ ụgbọ pụwa, o dinara ala n’azụ azụ ụgbọ ahụ, dewe isi n’ohiri isi, ụra eburu ya.

Ọtụtụ n’ime ndịozi ya bụ aka ochie n’ịkwọ ụgbọ mmiri, mana nke taa agaghị adịrị ha mfe. E nwere ugwu ndị gbara Oké Osimiri Galili ahụ gburugburu, elu osimiri ahụ na-adịkarịkwa ṅara ṅara. Mgbe ụfọdụ, ikuku jụrụ oyi na-esi n’ugwu ahụ na-efekwasị n’osimiri ahụ dị ṅara ṅara, ma mee ka e nwee oké ebili mmiri n’osimiri ahụ. Ọ bụ ụdị ihe a na-eme ugbu a. O gbughị oge, ebili mmiri ahụ amalite ịkụ n’ụgbọ ahụ. “Mmiri malitekwara iju n’ebe ha nọ, ha wee nọrọ n’ihe ize ndụ.” (Luk 8:23) Ma, Jizọs ka nọ n’ụra.

Ndị ahụ na-akwọ ụgbọ ahụ bụ aka ochie n’ịkwọ ụgbọ. Ha mere ihe niile ha ma ha na-eme ma e nwee ebili mmiri ka ha nwee ike ịkwọrọ ụgbọ ahụ na-aga. Mana nke taa dị iche. Ụjọ jidere ha na ha nwere ike ịnwụ, nke mere ha ji kpọtee Jizọs. Ha ji ụjọ gwa ya, sị: “Onyenwe anyị, zọpụta anyị, anyị na-aga ịla n’iyi!” (Matiu 8:25) Ezigbo ụjọ ji ndị na-eso ụzọ Jizọs na mmiri na-aga iri ha.

Mgbe Jizọs tetara, ọ sịrị ndị na-eso ụz ya: “Gịnị mere obi ji na-amapụ unu, unu ndị okwukwe nta?” (Matiu 8:26) Jizọs baziiri ifufe na oké osimiri ahụ mba, sị: “Shịị! Daa jụụ!” (Mak 4:39) Ifufe ahụ na-efesi ike kwụsịrị, osimiri ahụ adajụọkwa. (Otú Mak na Luk si kọọ ihe a dị egwu merenụ bụ na ha bu ụzọ kwuo otú Jizọs si mee ka oké ifufe ahụ kwụsị, tupu ha akọzie otú o si gwa ha na ha enweghị okwukwe.)

Chegodị otú ihe a si metụ ndị na-eso ụzọ ya n’ahụ́. Ha ejirila anya ha hụ otú oké ebili mmiri na-amali n’ike si nnọọ dajụọ ozugbo. Ụdị ụjọ tụrụ ha ụbọchị ahụ atụtụbeghị ha mbụ. Ha jụwara ibe ha, sị: “Ònye n’ezie ka onye a bụ, n’ihi na ọbụna ifufe na oké osimiri na-erubere ya isi?” Ha garutere n’ofe ọzọ nke oké osimiri ahụ n’udo. (Mak 4:41–5:1) O nwekwara ike ya abụrụ na ụgbọ ndị ọzọ ahụ gawara n’ofe nke ọzọ nke osimiri ahụ garukwara n’udo.

Ịmara na Ọkpara Chineke nwere ikike karịrị nke ifufe na ebili mmiri na-eme ka obi sie anyị ike. Mgbe ọ ga-achịwa ụwa n’oge ọchịchị Alaeze ya, ahụ́ ga-eru mmadụ niile ala n’ihi na ọdachi ndị na-emere onwe ha agaghịkwa adị.

GỤKWUO GBASARA YA

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Onye bụ Eze Alaeze Chineke, gịnị ka Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ?