Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 42

Jizọs Abaara Ndị Farisii Mba

Jizọs Abaara Ndị Farisii Mba

MATIU 12:33-50 MAK 3:31-35 LUK 8:19-21

  • JIZỌS EKWUO BANYERE “IHE ỊRỊBA AMA NKE JONA”

  • JIZỌS NA NDỊ NA-ESO ỤZỌ YA DỊ NÁ MMA KARỊA KA YA NA NDỊ EZINỤLỌ YA DỊ

Ihe ahụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii kwuru na ọ bụghị n’ike Chineke ka Jizọs na-achụpụ mmụọ ọjọọ bụ ụdị okwu na-eme ka mmadụ kwuluo mmụọ nsọ. Ugbu a, olee onye ha ga-adịnyere, ọ̀ bụ Chineke ka ọ̀ bụ Setan? Jizọs sịrị ha: “Ma ọ́ bụghị ma unu mere ka osisi dị mma nakwa ka mkpụrụ ya dị mma, unu emee ka osisi ree ure nakwa ka mkpụrụ ya ree ure; n’ihi na a na-amata osisi site ná mkpụrụ ya.”—Matiu 12:33.

Ọ bụ ihe nzuzu mmadụ ikwu na ihe mere Jizọs ji nwee ike ịmị ezi mkpụrụ, ya bụ, ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ n’ahụ́ ndị ha ji, bụ n’ihi na ọ na-ejere Setan ozi. Dị ka Jizọs kwuru n’ozizi elu ugwu ya, ọ bụrụ na mkpụrụ osisi mịrị dị mma, ọ pụtara na osisi ahụ n’onwe ya dịkwa mma, o reghị ure. N’ihi ya, gịnị ka mkpụrụ ndị Farisii na-amị, ya bụ, ebubo na-erijughị afọ ha na-ebo Jizọs, na-egosi? O gosiri na ha rere ure. Jizọs sịrị ha: “Ụmụ ajụala, olee otú unu pụrụ isi kwuo ihe ọma, ebe unu bụ ndị ajọ omume? N’ihi na ọ bụ ihe jupụtara mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.”—Matiu 7:16, 17; 12:34.

N’eziokwu, ihe si anyị n’ọnụ apụta na-egosi otú obi anyị dị, ọ bụkwa na ya ka a ga-esi kpee anyị ikpe. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo, sị: “Ana m asị unu na okwu ọ bụla na-abaghị uru nke ụmụ mmadụ na-ekwu, ha ga-aza ajụjụ banyere ya n’Ụbọchị Ikpe; n’ihi na a ga-esite n’okwu gị kpọọ gị onye ezi omume, a ga-esitekwa n’okwu gị maa gị ikpe.”—Matiu 12:36, 37.

N’agbanyeghị ọrụ ebube ndị Jizọs na-arụ, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii chọkwuru ihe ama Jizọs ga-enye ha. Ha sịrị: “Onye Ozizi, anyị chọrọ ka i gosi anyị ihe ịrịba ama.” Ma onye ọ bụla n’ime ha ọ̀ hụla ka Jizọs na-arụ ọrụ ebube ma ọ bụ na ọ hụbeghị, e nweela ọtụtụ ndị ji anya ha hụ ọrụ ndị Jizọs na-arụ, kọọkwa gbasara ha. N’ihi ya, Jizọs gwara ndị ndú okpukpe ndị Juu ahụ, sị: “Ọgbọ ọjọọ nke na-akwa iko na-achọ ihe ịrịba ama, ma ọ dịghị ihe ịrịba ama a ga-enye ya ma ọ́ bụghị ihe ịrịba ama nke Jona onye amụma.”—Matiu 12:38, 39.

Jizọs ahapụghị ha ka ha chewe ihe ihe a o kwuru pụtara. Ọ kọwaara ha ya. Ọ sịrị: “Dị nnọọ ka Jona nọrọ n’afọ nnukwu azụ̀ ụbọchị atọ, ehihie na abalị, otú ahụ ka Nwa nke mmadụ ga-anọ n’ime ala ụbọchị atọ, ehihie na abalị.” Otu nnukwu azụ̀ loro Jona, ya emechaa si n’afọ azụ̀ ahụ pụta dị ka à ga-asị na o si n’ọnwụ bilie. Jizọs si otú a na-ekwu na ya ga-anwụ ma bilite n’ụbọchị nke atọ. Mgbe ihe a mechara mezuo, ndị ndú ndị Juu jụrụ “ihe ịrịba ama nke Jona.” Ha jụrụ ichegharị ma gbanwee omume ọjọọ ha. (Matiu 27:63-66; 28:12-15) Ihe ndị Ninive mere dị nnọọ iche n’ihe ndị ndú ndị Juu a mere. “Ndị ikom Ninive” chegharịrị ná mmehie ha mgbe Jona kwusachaara ha ozi ọma. Ọ bụ ya mere ndị Ninive ga-eji ama ọgbọ ahụ dịrị ndụ n’oge Jizọs ikpe. Jizọs kwukwara na n’ihi ihe eze nwaanyị Shiba mere  n’oge Sọlọmọn, ọ ga-amakwa ndị Juu ahụ ikpe. Eze nwaanyị Shiba chọsiri ike ịnụrụ amamihe Sọlọmọn. Ihe ndị ọ nụkwara n’ọnụ Sọlọmọn jukwara ya anya. Jizọs kwuziri, sị: “Ma, lee! e nwere onye ka Sọlọmọn n’ebe a.”—Matiu 12:40-42.

Jizọs ji ọnọdụ ọgbọ ọjọọ a nọ na ya tụnyere otu nwoke e si n’ahụ́ ya chụpụ mmụọ na-adịghị ọcha. (Matiu 12:45) Ebe nwoke ahụ na-ejighị ihe ọma dochie ebe mmụọ ahụ na-adịghị ọcha si pụọ, mmụọ ọjọọ ahụ kpọọrọ mmụọ asaa ọzọ ka yanwa njọ lọghachi ma bịa biri n’ahụ́ nwoke ahụ. Mba Izrel yiri nwoke ahụ. E mere ka ha dị ọcha, wepụsịakwa ihe ndị na-adịghị ọcha dị n’ime ha, dịkwa ka e mere nwoke ahụ e si n’ahụ́ ya chụpụ mmụọ ahụ na-adịghị ọcha. Ma, mba ahụ jụrụ ịnabata ndị amụma Chineke na-ezitere ha. Ha mechadịrị jụ Jizọs, onye o doro anya na o nwere mmụọ Chineke. Ihe a gosiri na ọnọdụ mba Izrel akala njọ karịa otú ọ dị ná mmalite.

Ka Jizọs nọ na-ekwu okwu, nne ya na ụmụnne ya bịara guzoro ná mpụga ebe ìgwè mmadụ ahụ nọ. Ụfọdụ ndị nọ Jizọs nso sịrị ya: “Nne gị na ụmụnne gị ndị ikom guzo n’èzí na-achọ ịhụ gị.” Jizọs gosiziri otú ya na ndị na-eso ụzọ ya si dị n’ezigbo mma. O weere ha ka nne, ụmụnne ndị nwoke, na ụmụnne ndị nwaanyị. Ọ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya aka ma kwuo, sị: “Nne m na ụmụnne m ndị ikom bụ ndị a na-anụ okwu Chineke ma na-eme ya.” (Luk 8:20, 21) Jizọs si otú a gosi na ihe ọ sọkwara ya bụrụ ya jikọrọ ya na ndị ikwu ya, adịm ná mma ya na ndị na-eso ụzọ ya ka ya mkpa. Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ anyị na ụmụnna anyị ịdịkwa ná mma otú ahụ, karịchaa ma ọ bụrụ na ndị ọzọ ana-enyo anyị enyo, ma ọ bụkwanụ na-akatọ anyị n’ọrụ ọma anyị na-arụ.