Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

 ISI NKE 39

Ahụhụ Ga-adịrị Ọgbọ Na-anaghị Anabata Ozi Ọma

Ahụhụ Ga-adịrị Ọgbọ Na-anaghị Anabata Ozi Ọma

MATIU 11:16-30 LUK 7:31-35

  • JIZỌS AKATỌỌ OBODO ỤFỌDỤ

  • Ọ NA-EME KA NDỊ MMADỤ NWERE ONWE HA, NA-EMEKWA KA HA NWETA UME

Jizọs ejighị Jọn Onye Na-eme Baptizim egwu egwu. Ma, olee otú ọtụtụ ndị si were Jọn? Jizọs sịrị: “Ọgbọ a dị ka ụmụntakịrị nọ ọdụ n’ọma ahịa, ndị na-etiku ndị ha na ha na-egwurikọ egwu, sị, ‘Anyị gbuuru unu ọjà, ma unu agbaghị egwú; anyị tiri mkpu arịrị, ma unu etighị aka n’obi n’iru uju.’”—Matiu 11:16, 17.

Olee ihe Jizọs na-ekwu ebe a? O mere ka ihe a o kwuru doo anya. Ọ sịrị: “Jọn bịara, ọ naghị eri ihe, ọ naghịkwa aṅụ ihe ọṅụṅụ, ma ndị mmadụ sịrị, ‘O nwere mmụọ ọjọọ’; Nwa nke mmadụ bịara na-eri ihe, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, ma ndị mmadụ na-asị, ‘Lee! Ọ bụ onye oké nri, nke na-aṅụkwa oké mmanya, enyi ndị ọnaụtụ na ndị mmehie.’” (Matiu 11:18, 19) Jọn bịara bie ndụ dị mfe dị ka onye Naziraịt, ọ ṅụghịdị mmanya, ma ndị mmadụ sịrị na o nwere mmụọ ọjọọ. (Ọnụ Ọgụgụ 6:2, 3; Luk 1:15) Jizọs bịara nke ya bie ndụ otú ndị ọ bụla ọzọ si ebi. O riri ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ otú kwesịrị ekwesị, mana ndị mmadụ sịrị na ọ bụ onye oké nri na onye na-aṅụ oké mmanya. O yiri ka e nweghị ihe e mere ya adị ndị ọgbọ ahụ mma.

Jizọs ji ọgbọ ahụ tụnyere ụmụntakịrị nọ n’ọma ahịa, ndị na-ekweghị agba egwú mgbe ụmụntakịrị ndị ọzọ gbuuru ha ọjà ma ọ bụ ndị na-ekweghị eru uju mgbe ndị ọzọ tiri mkpu arịrị. Ma, Jizọs sịrị: “Ka o sina dị, a na-egosi na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya.” (Matiu 11:16, 19) “Ọrụ” ha, ya bụ, ọrụ ndị Jizọs na Jọn rụrụ, gosiri na ebubo ndị mmadụ na-ebo ha abụghị eziokwu.

Mgbe Jizọs kwuchara na ọgbọ e nwere n’oge ya anabataghị ya, ọ kpọrọ obodo ụfọdụ aha ma katọọ ha. Obodo ndị ahụ bụ Korezin, Betseida, na Kapaniọm, bụ́ ebe ndị ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube. Jizọs sịrị na ọ bụrụ na ọ bụ n’obodo Taya na Saịdọn ka ya rụrụ ọrụ ndị ya rụrụ n’obodo ndị ahụ ọ katọrọ, Taya na Saịdọn gaara echegharị. Ọ kpọkwara Kapaniọm aha, bụ́ obodo o biri ruo oge ụfọdụ. Ọtụtụ ndị egeghịdị ya ntị n’obodo ahụ. Jizọs kwuru gbasara obodo ahụ, sị: “Ọ ga-adịrị ala Sọdọm mfe n’Ụbọchị Ikpe karịa gị.”—Matiu 11:24.

Jizọs toziri Nna ya, onye zochiiri “ndị amamihe na ndị nwere ọgụgụ isi” eziokwu ndị a dị oké ọnụ ahịa ma kpugheere ya ndị dị umeala n’obi, ndị dị ka ụmụntakịrị. (Matiu 11:25) Ọ kpọrọ ụdị ndị a dị umeala n’obi òkù, sị: “Bịakwutenụ m, unu niile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, m ga-emekwa ka unu nweta ume. Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi, mkpụrụ obi unu ga-enweta ume. N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”—Matiu 11:28-30.

Olee otú Jizọs si eme ka mmadụ nweta ume? Ndị ndú okpukpe ejirila omenala ndị na-eme ka ndị mmadụ dịrị ka ndị ohu bo ndị mmadụ ibu arọ. Dị ka ihe atụ, ha mere ka iwu Ụbọchị Izu Ike bụrụ nke na-anaghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́. Ma, Jizọs mere ka ndị mmadụ nweta ume. Otú o si mee ya bụ ịkụziri ha eziokwu nke okwu Chineke nke a na-ejighị omenala gwagbuo. Jizọs gosikwara ndị ndị ọchịchị na-achịgbu na ndị na-enwe mwute n’ihi mmehie ha otú ha ga-esi nwere onwe ha. Jizọs gwara ha otú a ga-esi gbaghara ha mmehie ha nakwa otú ha na Chineke ga-esi dịrị ná mma.

Ndị niile na-anyara yok Jizọs nwere ike inyefe Chineke onwe ha ma na-ejere Nna anyị nke eluigwe, onye nwere ọmịiko na obi ebere, ozi. Ijere Jehova ozi abụghị ibu arọ n’ihi na ihe Chineke nyere n’iwu adịtụdịghị arọ.—1 Jọn 5:3.

GỤKWUO GBASARA YA

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ịna-edebe Ụbọchị Izu Ike?

Ọ bụrụ na iwu ejighị ha, gịnịzi mere Baịbụl ji kpọọ Ụbọchị Izu Ike ọgbụgba ndụ ebighị ebi?

ỤLỌ NCHE

“Olee nke Bụ́ nke Mbụ n’Ime Ihe Niile E Nyere n’Iwu?”

E nwere ike ikwu na naanị ihe Chineke chọrọ anyị n’aka bụ ịhụnanya.