Ọ bụ ịhụnanya ga-eme ka ezinụlọ nwee obi ụtọ. Ndị Efesọs 5:33

Iwu Chineke nyere bụ na nwoke kwesịrị ịlụ naanị otu nwaanyị, nwaanyị alụọkwa naanị otu di..

Nwoke nke hụrụ nwunye ya n’anya na-eji obiọma emeso ya ihe, na-echebakwara ya echiche.

Nwunye kwesịrị ịna-enyere di ya aka.

Ụmụ kwesịrị ịna-erubere ndị mụrụ ha isi.

 Nwee obiọma. Ahapụkwala di gị ma ọ bụ nwunye gị chụwa nwoke ma ọ bụ nwaanyị ọzọ. Enwela obi ọjọọ, ahapụkwala ezinụlọ gị. Ndị Kọlọsi 3:5, 8-10

Okwu Chineke kwuru na di kwesịrị ịhụ nwunye ya n’anya dị ka ọ hụrụ onwe ya n’anya nakwa na nwunye kwesịrị ịna-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.

Ọ dịghị mma ka mmadụ na onye na-abụghị di ya ma ọ bụ nwunye ya nwee mmekọahụ. Ịlụ karịa otu di ma ọ bụ nwunye bụkwa ihe ọjọọ.

Okwu Jehova na-akụziri ezinụlọ otú ha ga-esi nwee obi ụtọ.