Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 NKEBI NKE 2

Ònye Bụ Ezi Chineke?

Ònye Bụ Ezi Chineke?

E nwere naanị otu ezi Chineke. Aha ya bụ Jehova. (Abụ Ọma 83:18) Ọ bụ Mmụọ; anyị enweghị ike ịhụ ya anya. Ọ hụrụ anyị n’anya, chọọkwa ka anyị hụ ya n’anya. Ọ chọkwara ka anyị hụ ndị ọzọ n’anya. (Matiu 22:35-40) Ọ bụ Onye Kacha Ike, ọ bụkwa ya kere ihe niile.

Onye mbụ Chineke kere bụ mmụọ dị ike. Mgbe ọ bịara n’ụwa, a kpọrọ ya Jizọs Kraịst. Jehova kekwara ndị mmụọ ozi.

Jehova kere ihe niile dị n’eluigwe . . . ọ bụkwa Jehova kere ihe niile dị n’ụwa. Mkpughe 4:11

 Jehova Chineke kere kpakpando, ụwa na ihe niile dị n’ime ya.​—Jenesis 1:1.

O ji ájá si n’ala kpụọ mmadụ mbụ bụ́ Adam.​—Jenesis 2:7.