Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi

 NKEBI NKE 7

Ònye Bụ Jizọs?

Ònye Bụ Jizọs?

Jehova zitere Jizọs n’ụwa. 1 Jọn 4:9

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị Jehova mma, e nwere onye ọzọ dị mkpa anyị kwesịrị ige ntị. Ọtụtụ afọ tupu Jehova ekee Adam, o kere otu onye dị ike, bụ́ mmụọ, n’eluigwe.

Jehova mechara zite ya n’ụwa ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, onye aha ya bụ Meri, mụọ ya na Betlehem. Aha a gụrụ nwa ahụ Meri mụrụ bụ Jizọs.—Jọn 6:38.

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o ṅomiri àgwà Chineke nke ọma. O nwere obiọma, hụkwa ndị mmadụ n’anya. Ọ dịkwaara ndị mmadụ mfe ịbịakwute ya. Ọ kụziiri ndị ọzọ eziokwu banyere Jehova n’atụghị egwu..

 Jizọs mere ihe ọma, ma ndị mmadụ kpọrọ ya asị. 1 Pita 2:21-24

Jizọs gwọrọ ndị ọrịa, kpọlitekwa ụfọdụ ndị nwụrụ anwụ.

Ndị ndú okpukpe kpọrọ Jizọs asị n’ihi na ọ gbara ozizi ụgha ha na omume ọjọọ ha n’anwụ.

Ndị ndú okpukpe gwara ndị Rom okwu ụgha banyere Jizọs. N’ihi ya, ndị ọchịchị Rom tiri Jizọs ihe ma gbuo ya.

GỤKWUO GBASARA YA

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Ònye Bụ Jizọs Kraịst?

Gụọ banyere ihe mere Jizọs ji nwụọ, ihe àjà mgbapụta pụtara, na ihe Jizọs na-eme ugbu a.