Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi

 NKEBI NKE 13

Gịnị Ka Anyị Ga-eme Ka Obi Na-atọ Chineke Ụtọ?

Gịnị Ka Anyị Ga-eme Ka Obi Na-atọ Chineke Ụtọ?

Emela ihe ọjọọ. 1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10

Ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova n’anya, anyị agaghị eme ihe ndị ọ kpọrọ asị.

Jehova achọghị ka anyị zuo ohi, ọ chọghị ka anyị ṅubiga mmanya oké, ma ọ bụ ṅụọ ọgwụ ọjọọ.

Chineke kpọrọ igbu mmadụ, ite ime, nwoke idina nwoke na nwaanyị idina nwaanyị ibe ya asị. Ọ chọghịkwa ka anyị nwee anyaukwu ma ọ bụ lụọ ọgụ.

Anyị ekwesịghị ikpere arụsị ma ọ bụ na-eme mgbaasị.

Mgbe ụwa ga-aghọ Paradaịs, ndị na-eme ihe ọjọọ agaghị ebi na ya.

 Na-eme ihe ọma. Matiu 7:12

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ, anyị kwesịrị ịdị na-eme ka ya.

Gosi na ị hụrụ ndị ọzọ n’anya. Otú ị ga-esị gosi ya bụ imere ha ihe ọma na inye ha onyinye.

Na-ekwu eziokwu.

Na-emere ndị mmadụ ebere, na-agbagharakwa ndị mere gị ihe ọjọọ.

Na-akọrọ ndị ọzọ banyere Jehova na ihe ndị ọ chọrọ ka anyị mee.—Aịzaya 43:10.