Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi

 NKEBI NKE 14

Olee Otú Ị Ga-esi Gosi na Ị Na-erubere Jehova Isi?

Olee Otú Ị Ga-esi Gosi na Ị Na-erubere Jehova Isi?

Na-akwado Chineke. 1 Pita 5:6-9

Emela omenala ndị Baịbụl na-akwadoghị. Iji zere ime omenala ndị ahụ, ị ga-enwe obi ike.

Etinyela aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị obodo; ọ dịghị akwado Jehova na Alaeze ya.

 Mee mkpebi ga-akacha abara gị uru, ya bụ, gee Chineke ntị. Matiu 7:24, 25

Gị na Ndịàmà Jehova na-akpa; ha ga-enyere gị aka ịbịaru Chineke nso.

Nọgide na-amụ banyere Chineke. Jisiekwa ike na-edebe iwu ya.

Ọ bụrụ na okwukwe gị sie ike, i kwesịrị inyefe Jehova onwe gị, e meekwa gị baptizim.—Matiu 28:19.

Gee Chineke ntị. Na-agụ Baịbụl, and gwakwa Ndịàmà Jehova ka ha nyere gị aka ka ị ghọta Baịbụl. Na-emekwa ihe ị na-amụta. Ọ bụrụ na i mee ihe ndị ị mụtara, ị ga-adị ndụ ebighị ebi.​—Abụ Ọma 37:29.

GỤKWUO GBASARA YA

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Gịnị Ga-eme Okpukpe Ndị E Nwere n’Ụwa A?

È nwere mgbe mmadụ niile ga na-efe Chineke?