Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE ASATỌ

Ọ Tachiri Obi n’Agbanyeghị na Ihe Agaghị Otú Ọ Tụrụ Anya Ya

Ọ Tachiri Obi n’Agbanyeghị na Ihe Agaghị Otú Ọ Tụrụ Anya Ya

1. Gịnị mere ọtụtụ ndị ji na-eru uju na Shaịlo?

UJU a na-eru na Shaịlo wutere Samuel. Ọtụtụ ndị bi n’obodo ahụ na-ebe ákwá. Ònye makwanụ ụlọ ole ọ ga-abụ mmadụ gaa, ya aghara ịhụ ụmụ nwaanyị na ụmụaka ndị na-ebe ákwà maka na ha anụla na di ha, nna ha, ụmụ ha ndị nwoke ma ọ bụ ụmụnne ha ndị nwoke agaghịzi alọta? Ihe anyị ma bụ na ndị Filistia emeriela ndị agha Izrel ma gbuo puku mmadụ iri atọ n’ime ha. Obere oge tupu mgbe ahụ, ndị agha Filistia gburu puku ndị agha Izrel anọ n’agha ha na ha lụrụ.—1 Sam. 4:1, 2, 10.

2, 3. Olee ọdachi ndị mere ka ihe gharazie ịdị otú ọ dịbu na Shaịlo?

2 Nke ahụ bụ naanị otu n’ime ọtụtụ ọdachi dakwasịrị ndị Izrel. Họfnaị na Finihas, bụ́ ụmụ Ilaị, si na Shaịlo bupụta igbe ọgbụgba ndụ Chineke. A na-edebe igbe ahụ n’ebe dị nsọ n’ụlọikwuu nzute. Ụlọikwuu nzute bụ ụlọ nsọ yiri ụlọikwuu. Ụmụ Izrel ejighị igbe ọgbụgba ndụ ahụ egwuri egwu n’ihi na ọ bụ ihe na-egosi na Chineke nọ n’etiti ha. Ndị Izrel buziiri igbe ahụ gawa agha. Ha chere na igbe ahụ bụ ọtụmọkpọ nke ga-eme ka ha merie n’agha. Ihe a ha mere bụ iberiibe. Ndị Filistia buuru igbe ahụ ma gbuo Họfnaị na Finihas.—1 Sam. 4:3-11.

3 Ọ bụ n’ụlọikwuu ahụ dị na Shaịlo ka igbe ahụ dị kemgbe ọtụtụ narị afọ. Ugbu a, ọ dịkwaghị. Mgbe Ilaị nụrụ ihe merenụ, ọ dalara azụ n’oche ya ma nwụọ. Ọ dị afọ iri itoolu na asatọ mgbe ahụ. Nwunye nwa ya, bụ́ onye di ya nwụrụ n’ụbọchị ahụ, nwụkwara mgbe ọ na-amụ nwa. Tupu ya ekubie ume, ọ sịrị: “Ebube esiwo n’Izrel pụọ gaa ná mba ọzọ.” N’eziokwu, ihe emekataghị dị otú ọ dịbu na Shaịlo.—1 Sam. 4:12-22.

4. Olee ihe anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

4 Olee ihe Samuel ga-emezi ugbu a ihe ndị ọ na-atụghị anya ha mere? Okwukwe ya ọ̀ ga-emeli ka o nyere ụmụ Izrel aka bụ́ ndị Jehova gbakụtarala azụ? Mgbe ụfọdụ, ihe isi ike na ihe ndị anyị na-atụghị anya ha na-abịara anyị niile, ọ bụrụkwa na anyị akpachaghị  anya, ha nwere ike ime ka okwukwe anyị ghara isikwa ike. Ọ bụ ya mere o ji dị mma ka anyị leba anya n’ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Samuel.

O ‘Mezuru Ezi Omume’

5, 6. Gịnị ka Baịbụl kọrọ mgbe ọ kwụsịtụrụ ịkọ banyere Samuel, gịnịkwa ka Samuel rụrụ n’ime afọ iri abụọ ahụ?

5 Baịbụl hapụtụgodịrị akụkọ Samuel kọwazie banyere igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Ọ kọọrọ anyị otú ndị Filistia si taa ahụhụ maka igbe ahụ ha buuru na otú ha si bughachi ya n’ike. Mgbe ọzọ Baịbụl kọọrọ anyị banyere Samuel, ihe dị ka afọ iri abụọ agafeela. (1 Sam. 7:2) Olee ihe ọ nọ na-eme n’afọ ndị ahụ? Anyị ekwesịghị ichewe ya echewe.

Olee otú Samuel si kasie ndị Izrel obi ka ha die nsogbu ndị bịaara ha?

6 Anyị mụtara na tupu Baịbụl akwụsịtụ ịkọ banyere Samuel, ‘okwu Samuel nọ na-eru Izrel dum ntị.’ (1 Sam. 4:1) Mgbe afọ iri abụọ ahụ gachara, Baịbụl kwuru na Samuel na-aga ekpe ikpe ma na-edozi esemokwu n’obodo atọ n’Izrel. Ọ na-agazu ha n’afọ ọ bụla. Ọ gachaa, ya alọta n’obodo ya bụ́ Rema. (1 Sam. 7:15-17) O doro anya na o nweghị mgbe Samuel nọ nkịtị. Ọ rụkwara ọtụtụ ọrụ n’ime afọ iri abụọ ahụ.

Ọ bụ eziokwu na e nwere afọ iri abụọ Baịbụl na-ekwughị ihe ọ bụla banyere Samuel, o doro anyị anya na o ji oge ahụ na-ejere Jehova ozi

7, 8. (a) Olee ozi Samuel ziri ụmụ Izrel mgbe o nyechaara ha aka ruo afọ iri abụọ? (b) Olee ihe ha mere mgbe Samuel mechara ka obi sie ha ike?

7 Omume ọjọọ ụmụ Ilaị nọ na-eme mere ka okwukwe ụmụ Izrel ghara isikwa ike. Ọ ga-abụ na ọtụtụ n’ime ha maliteziri ife arụsị. Ma, mgbe Samuel nyechaara ndị Izrel aka ruo afọ iri abụọ, o ziri ha ozi a: “Ọ bụrụ na unu ji obi unu niile na-alọghachikwute Jehova, wepụnụ chi ndị mba ọzọ ndị dị n’etiti unu nakwa ihe oyiyi Ashtọret, meekwanụ ka obi unu dum dịrị n’ebe Jehova nọ, jeekwaranụ naanị ya ozi, ọ ga-anapụtakwa unu n’aka ndị Filistia.”—1 Sam. 7:3.

8 N’oge ahụ, “ndị Filistia” na-emesi ndị Izrel ike. Ebe ọ bụ na ha emeriela ndị agha Izrel, ha chere na ha ga na-emezi ndị Izrel ihe ọ bụla sọrọ ha. Ma Samuel mere ka obi sie ndị Izrel ike. Ọ gwara ha na ọ bụrụ na ha alọghachikwute Jehova, ihe ga-adịrị ha ná mma. Ma hà ga-achọnụ ịlọghachikwute Jehova? Obi tọrọ Samuel ụtọ na ha tufusịrị arụsị ha ma “malite ijere naanị Jehova ozi.” Samuel kpọkọtara ndị Izrel n’obodo Mizpa. Obodo a bụ ugwu ugwu. Ọ dị n’ebe ugwu Jeruselem. Ha zukọtara, buo ọnụ, chegharịa ma kwụsị ikpere arụsị.—Gụọ 1 Samuel 7:4-6.

Mgbe ndị Izrel zukọtara ka ha fee Jehova, ndị Filistia chere na ha ahụla ohere ha ga-eji mesie ha ike

9. Olee ihe ndị Filistia mere mgbe ha hụrụ na ndị Izrel zukọtara na Mizpa, oleekwa ihe ndị Izrel mere mgbe ahụ?

 9 Ma, ndị Filistia nụrụ na ụmụ Izrel zukọtara na Mizpa, ha echee na ha enwetala ohere ha ga-eji mesie ha ike. Ha zigara ndị agha ha ka ha gbuo ụmụ Izrel. Mgbe ndị Izrel nụrụ na ndị Filistia na-abịa ibuso ha agha, ụjọ jidere ha, ha arịọ Samuel ka o kpeere ha ekpere. Samuel kpeere ha ekpere ma chụọrọ Jehova àjà. Mgbe ndị Izrel ka nọ na Mizpa na-efe Jehova, ndị agha Filistia busoro ha agha. Jehova zaziri ekpere Samuel ma weso ndị Filistia iwe. Baịbụl sịrị: O “wee mee ka égbè eluigwe nke dara oké ụda gbaa n’ụbọchị ahụ, o wee tinye ndị Filistia n’ọgba aghara.”—1 Sam. 7:7-10.

10, 11. (a) Gịnị mere o ji bụrụ na égbè eluigwe ahụ Jehova mere ka ọ gbaa n’ihu ndị agha Filistia pụrụ iche? (b) Olee uru agha ahụ bidoro na Mizpa baara ndị Izrel?

10 Ànyị kwesịrị iche na ndị agha Filistia yiri ụmụaka ndị na-agbara aga ezo n’azụ nne ha ma égbè eluigwe gbaa? Mbanụ! Ha bụ ndị dike ịlụ agha doro anya. Ọ ga-abụ na ụdị égbè eluigwe a gbaranụ agbatụbeghị n’ihu ha. Ọ̀ bụ n’ihi otú o si daa “oké ụda”? Ò si n’eluigwe gbaa mgbe ọ na-enweghị mmiri rurunụ, ka ọ̀ bụ n’ugwu ka o si gbaa? N’agbanyeghị ebe o si, ụjọ tụrụ ndị Filistia. Ha amakwaghị ihe ha ga-eme eme, ndị Izrel ha na-achụbu chụwaziri ha. Ndị ikom Izrel si na Mizpa nupụta, merie ha, chụrụ ha ruo ọtụtụ kilomita. Ha chụụrụ ha ruo na ndịda ebe ọdịda anyanwụ Jeruselem.—1 Sam. 7:11.

11 Agha ahụ gbanwere ihe niile. Ndị Izrel nọ na-emeri ndị Filistia n’oge niile Samuel na-ekpe Izrel ikpe. Ndị Chineke ji nwayọọ nwayọọ nwetaghachi obodo niile ndị Filistia naara ha.—1 Sam. 7:13, 14.

12. Mgbe Baịbụl kwuru na Samuel ‘mezuru ezi omume,’ gịnị ka ọ pụtara, gịnịkwa nyeere Samuel aka ịnọgide na-eme ihe ziri ezi?

12 Mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, Pọl onyeozi kpọrọ Samuel aha mgbe ọ na-ekwu banyere ndị ikpe na ndị amụma bụ́ ndị ‘mezuru ezi omume.’ (Hib. 11:32, 33) N’eziokwu, Samuel nyeere ndị Izrel aka ka ha mee ihe dị mma n’anya Chineke. Ọ nọ na-eme ihe ziri ezi n’ihi na o nwere ndidi ma chere Jehova. Ọ kwụsịghị ijere Jehova ozi n’agbanyeghị na e nwere ihe ndị ọ na-atụghị anya ha merenụ. O kelekwara Chineke maka ihe ndị o meere ha. Mgbe ha merichara ndị iro ha na Mizpa, Samuel mere ka e gwunye otu nkume a ga-eji na-echeta aka Jehova nyeere ha.—1 Sam. 7:12.

13. (a) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ka Samuel, olee àgwà ndị anyị kwesịrị inwe? (b) Olee mgbe ọ kacha mma ka anyị mụta àgwà ndị ahụ?

 13 Gịnwakwanụ? Ị̀ chọrọ ‘imezu ezi omume’? Ya bụrụ otú ahụ, ọ ga-adị mma ka ị mụta inwe ndidi na ịdị umeala n’obi ka Samuel, mụtakwa ikele Chineke. (Gụọ 1 Pita 5:6.) Ò nwere onye n’ime anyị na-ekwesịghị inwe àgwà ndị ahụ? Ọ dị mma na Samuel mụtara àgwà ndị ahụ mgbe ọ bụ nwata n’ihi na ihe ndị ka njọ ọ na-atụghị anya ha bịaara ya mgbe o mere agadi.

“Ụmụ Gị Adịghị Eje Ije n’Ụzọ I Jere”

14, 15. (a) Olee ihe Samuel na-atụghị anya ya merenụ mgbe o “mere agadi”? (b) Samuel ọ̀ dị ka Ilaị? Kọwaa.

14 Oge ọzọ Baịbụl kọrọ banyere Samuel bụ mgbe o “mere agadi.” Ụmụ nwoke abụọ Samuel mụrụ etoola n’oge ahụ. Aha ha bụ Joel na Abaịja. Ha sokwa Samuel na-ekpe ndị Izrel ikpe. Ma, ọ dị mwute na ha mechuru ya ihu. N’agbanyeghị na Samuel na-akwụwa aka ọtọ ma bụrụ onye ezi omume, ụmụ ya ji ọrụ ha na-achọ ihe ga-abara naanị ha uru. Ha na-ekpe ikpe na-ezighị ezi ma na-eri ngarị.—1 Sam. 8:1-3.

15 Otu ụbọchị, ndị okenye Izrel bịakwutere onye amụma a merela agadi ma kọọrọ ya ihe ụmụ ya na-eme. Ha kwuru, sị: “Ụmụ gị  adịghị eje ije n’ụzọ i jere.” (1 Sam. 8:4, 5) Samuel ọ̀ ma ihe a ụmụ ya na-eme? Baịbụl ekwughị. Ma Samuel adịghị ka Ilaị. O doro anya na ọ bụ ezigbo nna. Jehova baara Ilaị mba ma taa ya ahụhụ maka na ọ hapụrụ ụmụ ya ka ha mewe ihe ọjọọ, na-asọpụrụ ha karịa Chineke. (1 Sam. 2:27-29) O nweghị mgbe Jehova hụrụ ebe Samuel mere ụdị ihe ahụ.

Olee otú Samuel si die ihu ụmụ ya mechuru ya n’ihi àgwà ọjọọ ha?

16. Olee otú obi na-adị ndị nne na nna ụmụ ha na-akpa àgwà ọjọọ, oleekwa otú ihe mere Samuel nwere ike isi kasie ha obi ma mee ka ha mara ihe ha ga-eme?

16 Baịbụl ekwughị otú ihere si mee Samuel, otú o si chegbuo onwe ya ma ọ bụ nwee mwute ozugbo ọ nụrụ ihe ọjọọ ụmụ ya na-eme. Ma, ọtụtụ ndị nne na nna ga-aghọta otú obi dị ya mgbe ahụ. N’oge ọjọọ a, ọtụtụ ụmụaka anaghị erubere ndị mụrụ ha isi. (Gụọ 2 Timoti 3:1-5.) Ndị nne na nna nwere ụdị nsogbu a nwere ike ịmụta ihe ha ga-eme nakwa ihe ga-akasi ha obi n’aka Samuel. Ọ dịghị mgbe Samuel kwere ka àgwà ọjọọ ụmụ ya na-akpa mee ka ọ kwụsị ife Chineke. Cheta na ọ bụrụgodị na ụmụaka egeghị ntị n’ihe a na-agwa ha ma ọ bụ na ha agbanweghị n’agbanyeghị na a dọọla ha aka ná ntị, àgwà ọma ndị mụrụ ha na-akpa nwere ike inyere ha aka. Ndị nne na nna kwesịkwara ịna-eme ka obi na-atọ Nna ha, bụ́ Jehova Chineke, ụtọ otú Samuel mere.

“Họpụtara Anyị Eze”

17. Olee ihe ndị okenye Izrel gwara Samuel ka o meere ha, oleekwa otú ihe a ha kwuru dị Samuel?

17 Ụmụ Samuel amaghị na anyaukwu ha na ịchọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru ga-akpata nsogbu buru ibu. Ndị okenye Izrel gwaziri Samuel, sị: “Họpụtara anyị eze ga na-ekpe anyị ikpe dị ka mba niile ọzọ.” Ihe a ha kwuru ò mere ka Samuel chee na ha ajụla ya? A sị ka e kwuwe, o kpeela ndị Izrel ikpe n’aha Jehova ruo ọtụtụ iri afọ. Ugbu a, ha chọrọ eze ga na-ekpe ha ikpe, ọ bụghị onye amụma nkịtị dị ka Samuel. Mba ndị ha na ha gba nwere ndị eze, ndị Izrel chọkwara inwe eze nke ha. Olee ihe Samuel mere? Baịbụl kwuru na “ihe ahụ dị njọ n’anya Samuel.”—1 Sam. 8:5, 6.

18. Olee ihe Jehova kwuru nke kasiri Samuel obi ma gosi na ụmụ Izrel emehiela Chineke?

18 Lee ihe Jehova gwara Samuel mgbe Samuel gwara ya ihe ahụ n’ekpere: “Gee ntị n’olu ha n’ihe niile ha na-agwa gị; n’ihi na ọ bụghị gị ka ha jụrụ, kama ọ bụ m ka ha jụrụ ịbụ eze ha.” Ihe a Jehova kwuru kasiri Samuel obi, ma o gosikwara na ndị Izrel ledara Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile anya. Jehova gwara Samuel ka ọ gwa ha nsogbu ha ga-enwe ma ọ bụrụ na ha enwee eze. Mgbe Samuel gwara ha ihe Chineke kwuru, ha siri ọnwụ, sị: “Ee e, kama ọ bụ eze ga-achị anyị.” Ebe Samuel na-erubere Chineke isi mgbe  niile, ọ gara tee eze Jehova họpụtaara ha mmanụ.—1 Sam. 8:7-19.

19, 20. (a) Olee otú Samuel si rubere Jehova isi mgbe ọ gwara ya ka o tee Sọl mmanụ ka ọ bụrụ eze Izrel? (b) Oleekwa otú Samuel si nọgide na-enyere ndị Izrel aka?

19 Ma, olee otú Samuel si mee ihe Jehova gwara ya? Ò ji iwe mee ya, ka ò mere ya ka a sị na o mezuola iwu? Ò kwere ka ihe ahụ ọ na-atụghị anya ya ụmụ Izrel mere mee ka obi jọwazie ya njọ? Ọtụtụ ndị nwere ike ime otú ahụ, ma Samuel emeghị ya. O tere Sọl mmanụ ma jiri obi ya kweta na ọ bụ ya ka Jehova họọrọ. O susuru Sọl ọnụ. Nke a na-egosi na ya kwetara ka eze ọhụrụ a chịwa ha nakwa na ya ga-erubere ya isi. Ọ gwaziri ndị Izrel, sị: “Ùnu ahụwo onye Jehova họọrọ, na ọ dịghị onye dị ka ya n’etiti mmadụ niile?”—1 Sam. 10:1, 24.

20 Samuel agaghị lewe anya n’ebe onye a Jehova họọrọ na-anaghị eme nke ọma, kama o lekwasịrị anya n’ebe ọ na-eme nke ọma. Samuel lekwasịkwara anya n’ozi yanwa ji obi ya niile na-ejere Chineke, ọ bụghị ka ya mee ihe ga-atọ ụmụ Izrel, bụ́ ndị na-anaghị akwụ otu ebe, ụtọ. (1 Sam. 12:1-4) O jikwa obi ya niile rụọ ọrụ ya. Ọ kọọrọ ndị Izrel ihe ndị nwere ike ime ka ha na Jehova ghara ịdịkwa ná mma ma gbaa ha ume ka ha na-erubere Jehova isi. Ihe a Samuel gwara ha ruru ha n’obi, ha arịọkwa ya ka o kpeere ha ekpere. Mgbe ndị Izrel rịọrọ ya ka o kpeere ha ekpere, lee ihe dị mma ọ gwara ha: “Tụfịakwa! Mụ onwe m agaghị emehie Jehova site n’ịkwụsị ikpe ekpere maka unu; m ga-ezikwa unu ụzọ dị mma, nke ziri ezi.”—1 Sam. 12:21-24.

Ihe Samuel mere na-akụziri anyị na anyị ekwesịghị ikwe ka ekworo na obi ọjọọ gbaa mgbọrọgwụ n’obi anyị

21. Olee otú ihe Samuel mere nwere ike isi baara gị uru ma ọ bụrụ na e nye onye ọzọ ọrụ ị gaara achọ ka e nye gị?

21 Ò nwetụla mgbe obi jọrọ gị njọ n’ihi na e nyere onye ọzọ ọrụ n’ọgbakọ kama inye gị ya? Ihe Samuel mere na-akụziri anyị na anyị ekwesịghị ikwe ka ekworo na obi ọjọọ gbaa mgbọrọgwụ n’obi anyị. (Gụọ Ilu 14:30.) E nwere ọtụtụ ọrụ Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya na-arụrụ ya. Ọrụ ahụ niile bachara uru ma na-eme ka ndị na-arụ ha nwee obi ụtọ.

“Ruo Ole Mgbe Ka Ị Ga Na-eruru Sọl Uju?”

22. Gịnị gosiri na ihe ahụ Samuel kwuru bụ eziokwu, ya bụ, na o nweghị onye dị ka Sọl?

22 Ihe Samuel kwuru mgbe ọ sịrị na o nweghị onye dị ka Sọl bụ eziokwu n’ihi na Sọl bụ nwoke pụrụ iche. O toro ogologo, gbaa  dimkpa, nwee obi ike, ụbụrụ na-aghọkwa ya nkọ. N’agbanyeghị ihe ndị a, ọ dị umeala n’obi mgbe ahụ. (1 Sam. 10:22, 23, 27) E nwekwara onyinye ọzọ magburu onwe ya Chineke nyere ya, ya bụ, ka o jiri aka ya na-ekpebi ihe ndị ọ ga-eme na ụdị ndụ ọ ga-ebi. (Diut. 30:19) Ò ji onyinye ahụ mee ihe bara uru?

23. Olee àgwà mbụ Sọl hapụrụ mgbe ọ ghọrọ eze, oleekwa otú o si gosi na ya dị mpako?

23 Ọ dị mwute na ọ na-abụ e nye mmadụ ọrụ ma ọ bụ mee ya onyeisi ma ọ bụkwanụ bulie ya n’ọkwá, ihe mbụ na-emekarị ma isi buwe onye ahụ bụ na ọ na-akwụsị ịdị umeala n’obi. Obere oge Sọl ghọrọ eze, ọ malitere ịdị mpako. O meghị ihe Jehova si n’ọnụ Samuel gwa ya. O nwere mgbe Sọl na-enweghị ndidi chere Samuel, ya agaa chụọ àjà Samuel kwesịrị ịchụ. Samuel baara ya ezigbo mba ma gwa ya na a gaghị esi n’ezinụlọ ya nweta ndị eze ga na-achị Izrel. Sọl ekweghị ka mba ahụ Samuel baara ya mee ka o chegharịa, kama o nupụkwuuru Chineke isi.—1 Sam. 13:8, 9, 13, 14.

24. (a) Olee otú Sọl si nupụrụ Jehova isi mgbe ọ gara ịlụso ndị Amalek agha? (b) Olee ihe Sọl mere mgbe a gwara ya na ihe o mere adịghị mma, oleekwa ihe Jehova kpebiri ime?

24 Jehova ziri Samuel ka ọ gwa Sọl ka ọ gaa lụso ndị Amalek agha. Otu n’ime iwu ndị Jehova nyere ya bụ ka o gbuo eze ọjọọ ha, bụ́ Egag. Ma, mgbe Sọl meriri ndị Amalek, ọ hapụrụ Egag na anụmanụ ndị kacha mma ndụ ma kpụrụ ha na Egag lọta. Mgbe Samuel bịara ịgwa ya na ihe o mere adịghị mma, Sọl mere ihe gosiri na àgwà ya akakwuola njọ. Kama iweda onwe ya ala ma kweta na ihe ya mere adịghị mma, ọ malitere ikwu na ihe ahụ adịchaghị njọ. Ọ hapụkwara ihe yanwa mere tawa ndị agha ya ụta. Mgbe Sọl na-agbalị ka o gosi na ihe ya mere adịghị njọ, o kwuru na ihe mere ha ji kpụta anụmanụ ndị ahụ bụ ka e were ha chụọrọ Jehova àjà. Samuel gwaziri ya okwu a ọtụtụ ndị ma: “Lee! Irube isi dị mma karịa àjà.” Samuel ji obi ike baara Sọl mba ma gwa ya ihe Jehova kpebiri ime. Ọ gwara Sọl na a ga-adọkapụ ọchịchị Izrel n’aka ya ma nye ya onye ka ya mma. *1 Sam. 15:1-33.

25, 26. (a) Gịnị mere Samuel ji ruoro Sọl uju, oleekwa otú Jehova si mee ka Samuel kwụsị iruru Sọl uju? (b) Olee ihe Jehova gwara Samuel mgbe ọ gara n’ụlọ Jesi?

 25 Mmehie Sọl wutere Samuel nke ukwuu. O ji abalị ahụ dum besara Jehova ákwá banyere ihe ahụ merenụ. Ọ malitedịrị iruru Sọl uju. Samuel tụrụ anya na Sọl ga-abara ndị Izrel ezigbo uru ma chịa ha nke ọma, ma ugbu a, ihe niile ahụ ọ tụrụ anya ha enweghị nke merenụ. Sọl ọ mabu agbanweela. Ọ naghịzi akpa àgwà ọma ndị e ji mara ya, kama nke ahụ, ọ na-enupụziri Jehova isi. Samuel ekwekwaghị ahụ Sọl anya ọzọ. Ma, mgbe obere oge gafere, Jehova ji nwayọọ gwa Samuel ka ọ kwụsị iruru Sọl uju. Ọ sịrị ya: “Ruo ole mgbe ka ị ga na-eruru Sọl uju, ebe ọ bụ na mụ onwe m ajụwo ya ka ọ ghara ịbụkwa eze Izrel? Gbajuo mpi gị mmanụ gawa. M ga-edunye gị ka ị gakwuru Jesi onye Betlehem, n’ihi na esiwo m n’etiti ụmụ ya ndị ikom họtara onwe m eze.”—1 Sam. 15:34, 35; 16:1.

26 Jehova agaghị ahapụ imezu uche ya maka na ụmụ mmadụ na-ezughị okè anaghị eme ihe ziri ezi mgbe niile. Ọ bụrụ na onye Jehova chọrọ iji mezuo uche ya akwụsị irubere Jehova isi, Jehova ga-eji onye ọzọ mezuo ya. N’ihi ya, Samuel kwụsịrị iruru Sọl uju. Jehova gwara ya ka ọ gaa n’ụlọ Jesi nke dị na Betlehem. Mgbe ọ gara, ọ hụrụ ọmarịcha ụmụ nwoke Jesi mụrụ. Ma, malite n’onye nke mbụ, Jehova gwara Samuel ka ọ ghara ilewe anya n’otú ha dị n’anya. (Gụọ 1 Samuel 16:7.) Samuel mechara hụ Devid, bụ́ nwa nwoke ikpeazụ Jesi mụrụ. Ọ bụ ya ka Jehova họọrọ.

Samuel ghọtara na Jehova ga-enyere ndị na-efe ya aka mgbe ihe ha na-atụghị anya ya bịaara ha. Ọ ghọtakwara na Jehova nwedịrị ike ime ka ihe ahụ bịaara ha baara ha uru

27. (a) Gịnị mere ka okwukwe Samuel sikwuo ike? (b) Olee otú obi dị gị banyere otú Samuel si bie ndụ?

27 Mgbe ọnwụ Samuel ruwere, ọ bịara ghọtakwuo ihe mere Jehova ji jiri Devid dochie Sọl. Sọl malitere inwere Devid anyaụfụ nke na ọ chọrọ igbu ya. Sọl mechakwara kwụsị ife Jehova. Ma, Devid gosiri na ya nwere okwukwe na obi ike. O jikwa ofufe Chineke kpọrọ ihe. Okwukwe Samuel sikwuru ike mgbe ọ fọrọ obere ka ọ nwụọ. Ọ ghọtara na Jehova ga-enyere ndị na-efe ya aka mgbe ihe ha na-atụghị anya ya bịaara ha. Ọ ghọtakwara na Jehova nwedịrị ike ime ka ihe ahụ bịaara ha baara ha uru. Samuel mechara nwụọ. O ji ndụ ya niile jeere Jehova ozi ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị afọ. Ọ bụ ya mere Izrel dum ji ruoro ya uju. Onye ọ bụla na-efe Jehova taa kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘M̀ ga-eṅomi okwukwe Samuel?’

^ para. 24 Ọ bụ Samuel gburu Egag. E kwesịghị imere eze a obi tara mmiri na ndị ezinụlọ ya ebere. Ọ ga-abụ na “Heman onye agbụrụ Egag” si n’ezinụlọ eze Egag. Heman dịrị ndụ ọtụtụ narị afọ eze Egag dịchara ndụ. Ọ bụ Heman a kpara nkata ka e gbuchapụ ndị Izrel, bụ́ ndị na-efe Chineke.—Esta 8:3; gụọ Isi nke 15 na nke 16 n’akwụkwọ a.