Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE IRI ABỤỌ

“Ekwerewo M”

“Ekwerewo M”

1. Gịnị na-eme Mata, gịnịkwa kpatara ya?

MATA ji uche ya na-ahụ ili nwanne ya nwoke. Ili ahụ bụ ọgba, e jikwa nkume mechie ọnụ ya. Mata nọ na-eru oké uju. O siiri ya ike ikweta na nwanne ya nwoke ọ hụrụ n’anya, bụ́ Lazarọs, anwụọla. Kemgbe abalị anọ nwanne ya a kubiri ume, ọtụtụ ndị abịarala ya mgbaru.

2, 3. (a) Olee otú i chere obi dị Mata mgbe ọ hụrụ Jizọs? (b) Gịnị ka otu ihe dị mkpa Mata kwuru na-akụziri anyị banyere Mata?

2 Ugbu a kwa, ezigbo enyi Lazarọs guzo n’ihu Mata. O nwere ike ịbụ na Mata maliteghachiri iru uju ugbu a ọ hụrụ Jizọs n’ihi na ọ bụ naanị ya bụ onye gaara eme ka nwanne ya nwoke ghara ịnwụ. N’agbanyeghị nke ahụ, obi rutụrụ Mata ala ka ya na Jizọs guzo n’ebe a e si abata Betani. Betani bụ obere obodo dị n’ugwu. Obere oge a ya na Jizọs nọ akasitụla ya obi n’ihi otú Jizọs si dị obiọma ma nwee ọmịiko. Jizọs jụrụ ya ajụjụ ndị mere ka o chebara okwukwe ya echiche nakwa ihe o kweere banyere mbilite n’ọnwụ. Ụka ya na Jizọs kparịtara mere ka o kwuo otu n’ime okwu ndị kacha mkpa ọ ga-ekwu ná ndụ ya, nke bụ́: “Ekwerewo m na ị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke, bụ́ Onye ahụ ga-abịa n’ụwa.”—Jọn 11:27.

3 Ihe a Mata kwuru gosiri na o nwere ezigbo okwukwe. Ihe ole na ole Baịbụl kọọrọ anyị gbasara ya na-akụziri anyị ihe ndị nwere ike ime ka okwukwe anyị sikwuo ike. N’ihi ya, ka anyị lebagodị anya n’ihe mbụ Baịbụl kwuru gbasara Mata.

“Ị Na-echegbu Onwe Gị, Na-esogbukwa Onwe Gị”

4. Olee ndị ha na Mata bi, oleekwa ihe jikọrọ ha na Jizọs?

4 Ihe a mere ọnwa ole na ole tupu Lazarọs anwụọ. N’oge ahụ, ọ dịbeghị ọkọ kọrọ Lazarọs. Nnukwu mmadụ na-aga ịbịa n’ụlọ ya na Betani. Aha nnukwu mmadụ ahụ bụ Jizọs Kraịst. Ọ ga-abụ na Lazarọs na ụmụnne ya bụ́ Mata na Meri bi. Ha atọ etochaala. Ọ na-esi ike ịhụ ebe ụmụnne atọ torola eto bi n’otu ụlọ. Ụfọdụ ndị na-eme nchọpụta kwuru na ọ ga-abụ Mata tọchara ha. Ihe mere ha  ji kwuo ya bụ na ọ dị ka ọ̀ na-eme ka nwaanyị nwe ụlọ. Mgbe ụfọdụ, ọ bụkwa ya ka a na-ebu ụzọ akpọ aha ma a kpọwa aha ha atọ. (Jọn 11:5) Baịbụl ekwughị ma Lazarọs ò mechara lụọ nwaanyị ma ọ bụkwanụ ma Meri na Mata hà mechara lụọ di. Ma hà lụrụ ma ọ bụ na ha alụghị, ha bụ ezigbo ndị enyi Jizọs. Ọ bụ n’ụlọ ha ka Jizọs na-anọ ma o kwusawa ozi ọma na Judia. N’oge ahụ, ndị mmadụ na-akpagbu Jizọs mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ. N’ihi ya, o doro anya na obi tọrọ Jizọs ụtọ na ndị enyi a na-enyere ya aka, ahụ́ na-erukwa ya ala n’ụlọ ha.

5, 6. (a) Gịnị ka Mata na-eme ugbu a Jizọs bịara n’ụlọ ha? (b) Gịnị ka Meri ji ohere ọma a dapụtaara ya mee?

5 Mata na-agbasi mbọ ike ka ahụ́ ruo onye ọ bụla nọ n’ụlọ ha ala nakwa ka ha lee onye ọ bụla bịara n’ụlọ ha ọbịa nke ọma. Ebe ọ bụ na Mata abụghị onye umengwụ, o yiri ka ọ̀ na-arụ ọrụ mgbe niile. Ọ bụkwa ihe na-eme ugbu a Jizọs bịara n’ụlọ ha. Mgbe a na-amatala ihe na-emenụ, o bidola ịkwadebere Jizọs ọtụtụ ihe ọ ga-eri nakwa ihe ndị ya na ha so ga-eri, ma ọ bụrụ na e nwere ndị so ya. N’oge ahụ, e jighị ile ọbịa egwuri egwu. Mgbe onye ọbịa rutere, a na-esusu ya ọnụ, yipụ ya akpụkpọ ụkwụ, saa ya ụkwụ, a na-etekwa ya mmanụ na-esi ísì ụtọ n’isi. (Gụọ Luk 7:44-47.) A na-edoziri ya ụlọ nke ọma ma siere ya ezigbo nri.

6 Mata na Meri nwere ọtụtụ ihe ha nọ na-akwadebere Jizọs tupu ya erute. O doro anya na Meri nyeere nwanne ya nwaanyị aka n’oge ahụ. Ọtụtụ ndị chere na Meri na-achọkarị ịmụta ihe karịa nwanne ya nwaanyị. Ọ bụ ya mere na mgbe Jizọs rutere, ihe gbanwere. Jizọs bidoro ịkụzi ihe n’oge ahụ. Ọ dịghị ka ndị isi okpukpe e nwere n’oge ya n’ihi na ọ kwanyeere ụmụ nwaanyị ùgwù ma kụziere ha banyere Alaeze Chineke, bụ́ isiokwu nke ozi ọma o kwusaara ndị mmadụ. Obi tọrọ Meri ụtọ na ya enweela ohere ọma ọ ga-eji mụta ihe. N’ihi ya, ọ gara nọdụ ala n’akụkụ ụkwụ Jizọs ma na-ege ntị n’ihe niile ọ na-ekwu.

7, 8. Gịnị mere ahụ́ ji gbakasịwa Mata, gịnịkwa ka o mechara gwa Jizọs?

7 Weregodị ya na ị na-ahụ ka ahụ́ bidoro gbakasịwa Mata. O bidoro chegbuwe onwe ya n’ihi nri niile ọ chọrọ isiri ndị ọbịa ya na ihe niile o bu n’obi imere ha. Ka ọ nọ na-agbakeri ala ma hụ ka nwanne ya nwaanyị nọ ọdụ n’akụkụ ụkwụ Jizọs kama ịbịa nyere ya aka, o nwere ike ịbụ na iwe jidere ya, ya amaa ọsụ ma ọ bụ gbarụọ ihu. O nweghị otú naanị ya ga-esi rụọ ọrụ niile ahụ.

8 Mata ejitelizighị onwe ya. Ọ naara Jizọs okwu n’ọnụ, jiri iwe kwuo, sị: “Onyenwe anyị, ọ́ bụghịrị gị ihe ọ bụla na nwanne m nwaanyị hapụụrụ naanị m ihe niile ka m mewe? Ya mere, gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.” (Luk 10:40) Mata ejighị ya n’egwuregwu.  Ọtụtụ Baịbụl si otú a sụgharịa ajụjụ ya: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ na o metụghị gị n’obi na . . . ?” Mata gwaziri Jizọs ka ọ gwa Meri ka ọ bịaghachi nyewere ya aka.

9, 10. (a) Olee ihe Jizọs zara Mata? (b) Olee otú anyị si mara na ihe Jizọs na-ekwu abụghị na mbọ niile Mata na-agba abaghị uru?

9 O nwere ike ịbụ na ihe Jizọs zara Mata juru Mata anya, otú ọ na-eju ọtụtụ ndị na-agụ Baịbụl. Jizọs ji olu ọma gwa ya, sị: “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị, na-esogbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe. Ma, ihe dị mkpa bụ ihe ole na ole ma ọ bụ naanị otu ihe. Ma Meri họọrọ òkè dị mma, a gaghịkwa anapụ ya nke ahụ.” (Luk 10:41, 42) Gịnị ka ihe a Jizọs kwuru pụtara? Ihe ọ na-ekwu ọ̀ bụ na Mata hụrụ ihe nke ụwa n’anya karịa Chineke? Ọ̀ na-ekwu na mbọ a Mata na-agba ka o siere ha ezigbo nri abaghị uru?

Ọ bụ eziokwu na Mata ‘na-echegbu onwe ya ma na-esogbu onwe ya,’ o ji obi umeala nabata ndụmọdụ Jizọs nyere ya

10 Mba. O doro anya na Jizọs ma na Mata ebughị ihe ọjọọ n’obi nakwa na ọrụ niile ahụ ọ na-arụ bụ maka na ọ hụrụ ha n’anya. Ihe Jizọs na-ekwu abụghịkwa na ilekọta onye ọbịa nke ọma dị njọ. O nweedịla mgbe Jizọs gara “oké oriri” Matiu meere ya. (Luk 5:29) Ihe bụ́ nsogbu n’ebe a abụghị nri a Mata na-esi. Kama, Mata tinyere obi ya niile n’ọtụtụ nri ahụ ọ na-esi nke na o chefuru ihe kacha mkpa ná ndụ. Gịnị ka ọ bụ?

Obi tọrọ Jizọs ụtọ na Mata lere ya ọbịa nke ọma, ọ makwa na Mata ebughị ihe ọjọọ n’obi

11, 12. Olee otú Jizọs si jiri obiọma mee ka Mata ghọta ihe o kwesịrị ime?

11 Jizọs, bụ́ Ọkpara Jehova Chineke mụrụ naanị ya, bịara n’ụlọ Mata ịkụziri ha ihe. Ọ dịghị ihe dị mkpa karịa ihe a mere o ji bịa, ma nri ahụ Mata kwọrọ aka na-esi ma ihe ndị ọzọ ọ na-akwadebe. O doro anya na o wutere Jizọs na Mata hapụrụ ohere ọma a ọ gaara eji eme ka okwukwe ya sikwuo ike gaa na-eme ihe ọzọ. Ma Jizọs hapụrụ ya ka o jiri aka ya họrọ ihe ka ya mkpa. * Ihe Jizọs na-agakwanụghị eme bụ ime ihe ahụ Mata chọrọ, ya bụ, ka ọ gwa Meri ka ọ kwụsị ige ya ntị ma gaa siwe nri.

12 N’ihi ya, Jizọs ji olu ọma mee ka Mata ghọta ihe o kwesịrị ime. O ji nwayọọ kpọọ Mata aha ka obi nwee ike iru ya ala. O mekwara ka o doo Mata anya na o kwesịghị ‘ichegbuwe onwe ya ma na-esogbu onwe ya banyere ọtụtụ ihe.’ Otu nri ma ọ bụ nri abụọ na-agaghị egbu oge isi ezuola, nke ka nke, mgbe a chọrọ ịmụ gbasara Chineke. N’ihi ya, o nweghị otú Jizọs ga-esi  napụ Meri “òkè dị mma” Meri họọrọ, nke bụ́ ịmụta ihe n’ọnụ Jizọs.

13. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú Jizọs si mee ka Mata ghọta ihe o kwesịrị ime?

13 E nwere ọtụtụ ihe ndị na-eso ụzọ Kraịst taa ga-amụta n’obere ihe a mere n’ụlọ Mata ha. Anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla mee ka anyị ghara igbo “mkpa ime mmụọ” anyị. (Mat. 5:3) Ọ bụ eziokwu na anyị kwesịrị ịna-emesapụ aka ma na-arụsi ọrụ ike ka Mata, anyị ekwesịghị ‘ichegbu onwe anyị ma na-esogbu onwe anyị’ n’ihi ihe ụfọdụ na-adịchaghị mkpa, dị ka ile ndị mmadụ ọbịa. Anyị ekwesịghịkwa ikwe ka nke a mee ka ihe ndị kacha mkpa kwaa anyị. Ihe mere anyị na ụmụnna anyị ji anọkọ abụghị naanị  ka anyị nye ha nri anyị kwọrọ aka sie ma ọ bụ ka anyị rie nke ha siri, kama ọ bụ ka anyị gbarịta ibe anyị ume ma kwurịta gbasara Chineke. (Gụọ Ndị Rom 1:11, 12.) Ọ bụrụgodị na o nweghị oké ihe anyị nyere ụmụnna anyị, anyị na ha ka nwere ike ịgba ibe anyị ume.

Nwanne Ha Nwoke Ha Hụrụ n’Anya Nwụrụ, A Kpọlite Ya

14. Olee otú anyị si mara na Mata nabatara ndụmọdụ Jizọs nyere ya, gịnịkwa mere anyị ji kwesị iṅomi ya?

14 Mata ọ̀ nabatara ihe ahụ Jizọs medara obi gwa ya ma mụta ihe na ya? Ọ nabatara ya. Mgbe Jọn onyeozi chọrọ ịkọ banyere nwanne Mata bụ́ Lazarọs, ọ sịrị: “Jizọs hụrụ Mata na nwanne ya nwaanyị na Lazarọs n’anya.” (Jọn 11:5) Ọnwa ole na ole agafeela kemgbe ahụ Jizọs gara na nke ha na Betani. O doro anya na Mata eburughị Jizọs iwe n’obi ma ọ bụ chee na Jizọs ekwesịghị inye ya ndụmọdụ ahụ. O ji obi ya niile nabata ihe Jizọs kwuru. Ihe a o mere gosiri na o nwere okwukwe, anyị kwesịkwara iṅomi ya n’ihi na o nweghị onye n’ime anyị a na-ekwesịghị inye ndụmọdụ mgbe ụfọdụ.

15, 16. (a) Olee ihe ọ ga-abụ na Mata mere mgbe nwanne ya nwoke dara ọrịa? (b) Gịnị mere na ihe Mata na Meri tụrụ anya ya enweghị isi?

15 Mgbe nwanne Mata dara ọrịa, Mata nọ na-agbakeri ala ka o lekọta ya. O mere ihe niile o nwere ike ime ka nwanne ya gbakee. N’agbanyeghị nke ahụ, ọrịa ahụ nọ na-aka njọ. Ụmụnne ya nwaanyị nọ ya n’akụkụ na-elekọta ya, ma n’ehihie ma n’abalị. Ònye ma ugboro ole Mata lere nwanne ya nwoke a ọrịa ji aka ọjọọ anya n’ihu, cheta ọtụtụ afọ ha bikọrọla ọnụ, ma oge ihe dịịrị ha ná mma ma oge ha nwere nsogbu?

16 Mgbe o yiri ka ọrịa Lazarọs ọ̀ karịala Mata na Meri, ha zigaara Jizọs ozi. Ọ ga-ewe mmadụ abalị abụọ isi n’ebe Jizọs nọ na-ekwusa ozi ọma n’oge ahụ gawa na nke Mata ha. Ozi ha ziri ya dị mkpirikpi. Ha sịrị ya: “Onyenwe anyị, lee! onye ahụ ị hụrụ n’anya nke ukwuu na-arịa ọrịa.” (Jọn 11:1, 3) Ha ma na Jizọs hụrụ nwanne ha nwoke n’anya, obi sikwara ha ike na ọ ga-eme ihe niile o nwere ike ime iji nyere enyi ya nwoke aka. Hà nọ na-atụ anya na Jizọs ga-erute tupu ihe emebie? Ya bụrụ otú ahụ, ihe ha tụrụ anya ya enweghị isi. Lazarọs nwụrụ.

17. Olee ihe gbagwojuru Mata anya, oleekwa ihe o mere mgbe ọ nụrụ na Jizọs erutewela obodo ha?

17 Mata na Meri nọ na-eruru nwanne ha nwoke uju, na-agbakeri ala ka ha lie ya ma na-anabata ndị si Betani na obodo ndị ọzọ bịara ha mgbaru. Ma, ọ dịbeghị ihe ha nụrụ banyere Jizọs. O nwere ike ịbụ na ka oge na-aga, ihe niile a gbagwojukwuru Mata anya.  Ma abalị anọ Lazarọs nwụchara, Mata nụrụ na Jizọs erutewela obodo ha. Ebe Mata bụ nwaanyị dị uchu, o biliri ozugbo n’agwaghị Meri ma gbara gawa izute Jizọs n’agbanyeghị na ọ na-eru uju.—Gụọ Jọn 11:18-20.

18, 19. Olee olileanya Mata nwere, oleekwa ihe mere okwukwe ya ji bụrụ nke e ji ama atụ?

18 Mgbe Mata hụrụ Jizọs, o kwupụtara ihe nọ na-enye ya na Meri nsogbu n’obi kemgbe. Ọ gwara Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.” Ma, Mata ka nwere okwukwe na Jizọs ka nwere ike inyere ha aka. O kwukwara, sị: “Ma amaara m ugbu a na ihe niile ị ga-arịọ Chineke, Chineke ga-enye gị ha.” Jizọs kwuziri okwu mere ka Mata nwekwuo okwukwe. Ọ sịrị: “Nwanne gị nwoke ga-ebili.”—Jọn 11:21-23.

19 Ma, Mata chere na Jizọs na-ekwu banyere mbilite n’ọnwụ a ga-enwe n’ọdịnihu, n’ihi ya, ọ gwara ya, sị: “Amaara m na ọ ga-ebili n’oge mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” (Jọn 11:24) Mata  kwetasiri ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ndị Sadusii, bụ́ ndị so ná ndị isi okpukpe ndị Juu, ekweghị na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, n’agbanyeghị na Akwụkwọ Nsọ e ji ike mmụọ nsọ dee kwuru hoo haa na a ga-akpọlite ha. (Dan. 12:13; Mak 12:18) Mata ma na Jizọs na-akụziri ndị mmadụ na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, marakwa na o nweela ndị Jizọs kpọlitere n’ọnwụ n’agbanyeghị na o nweghị onye n’ime ha nọruru abalị anọ Lazarọs nọrọla kemgbe ọ nwụrụ. Ma, Mata amaghị ihe na-aga ime.

20. Gịnị ka ihe Jizọs na Mata kwuru, bụ́ nke e dere na Jọn 11:25-27, pụtara?

20 Jizọs kwuziri ihe anyị na-agaghị echefu echefu. Ọ sịrị: “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ.” N’eziokwu, Jehova Chineke enyela Ọkpara ya ikike ọ ga-eji akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ n’ụwa niile n’ọdịnihu. Jizọs jụrụ Mata, sị: “Ì kwere nke a?” Ihe Mata zara ya bụ ihe ahụ e kwuru ná mmalite isiokwu a. O kweere na Jizọs bụ Kraịst, ma ọ bụ Mesaya ahụ, kwerekwa na ọ bụ Ọkpara Jehova Chineke nakwa na ndị amụma eburula ụzọ kwuo na ọ ga-abịa n’ụwa.—Jọn 5:28, 29; gụọ Jọn 11:25-27.

21, 22. (a) Olee otú Jizọs si gosi otú obi na-adị ya mgbe ọ hụrụ ka ndị mmadụ nwụnahụrụ na-eru uju? (b) Kọwaa otú Jizọs si kpọlite Lazarọs.

21 Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, hà ji ụdị okwukwe Mata nwere kpọrọ ihe? Ihe ndị mezirinụ n’ihu Mata zara ajụjụ a nke ọma. Mata gbaara ọsọ gawa ịkpọ nwanne ya nwaanyị. Mgbe Jizọs na-agwa Meri na ọtụtụ ndị so ya na-eru uju okwu, Mata chọpụtara na ọnwụ Lazarọs na-ewute Jizọs nke ukwuu. Ọ hụrụ ka anya mmiri gbara Jizọs. Nke a gosiri na ọnwụ ụmụ mmadụ na-anwụ na-ewute ya. Ọ nụziri mgbe Jizọs nyere iwu ka a kwapụ nkume e ji dọchie ọnụ ili nwanne ya nwoke.—Jọn 11:28-39.

22 Ebe ọ bụ na Mata na-ekwu ihe otú ọ dị, o kwuru na ọ ga-abụ na ozu nwanne ya esiwela ísì n’ihi na o meela ụbọchị anọ ọ nwụrụ. Jizọs chetaara ya ihe ọ gwaburu ya. Ọ sịrị ya: “Ọ̀ kwa m gwara gị na ọ bụrụ na i kwere, ị ga-ahụ ebube Chineke?” Mata kweere, ọ hụkwara ebube Jehova Chineke. Ozugbo ahụ, Jehova nyere Ọkpara ya ikike ka ọ kpọlite Lazarọs n’ọnwụ. Chegodị ihe ndị mere n’ụbọchị ahụ. Mata agaghị echefu ha echefu. Jizọs ji oké olu kpọọ òkù, sị, “Lazarọs, pụta!” A nụrụ obere mkpọtụ n’ọgba ahụ ka Lazarọs na-ebili ma buru ákwà e kere ya, jiri nwayọọ nwayọọ na-apụta. Jizọs nyeziri iwu, sị, “Tọpụnụ ya ákwà ma hapụ ya ka ọ laa.” Mata agaghịkwa echefu otú obi si tọọ ya na Meri ezigbo ụtọ, ha agaa makụọ nwanne ha nwoke. (Gụọ Jọn 11:40-44.) Mata kwụsịziri iru uju.

Okwukwe Mata nwere na Jizọs baara ya uru mgbe a kpọlitere nwanne ya nwoke n’ihu ya na Meri

23. Gịnị ka Jehova na Jizọs chọrọ imere gị, gịnịkwa ka i kwesịrị ime?

23 Akụkọ a gosiri na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.  O so n’ihe ndị Baịbụl na-akụzi nke na-eme anyị obi ụtọ. (Job 14:14, 15) Jehova na Ọkpara ya na-agọzi ndị nwere okwukwe otú ahụ ha gọziri Mata, Meri, na Lazarọs. Ha ga-agọzikwa gị ma ọ bụrụ na i mee ka okwukwe gị sie ike.

“Mata Nọkwa Na-eje Ozi”

24. Olee ihe ikpeazụ Baịbụl kwuru banyere Mata?

24 Ọ bụ naanị otu ebe ọzọ ka Baịbụl kpọrọ Mata aha. Ọ bụ ná mmalite izu ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa. Ebe Jizọs ma na nsogbu ga-abịara ya n’izu ahụ, ọ gara nọrọ n’ụlọ ndị enyi ya na Betani, bụ́ ebe ahụ́ ga-eru ya ala. Ọ ga na-esi ebe ahụ aga Jeruselem. Isi ebe ahụ aga Jeruselem dị kilomita atọ. Ka Jizọs nọ na Betani, ya na Lazarọs gara oriri n’ụlọ Saịmọn onye ekpenta. Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka Baịbụl kwuru ihe ikpeazụ o kwuru banyere Mata. Ọ sịrị: “Mata nọkwa na-eje ozi.”—Jọn 12:2.

25. Olee uru ụmụ nwaanyị ndị dị ka Mata e nwere n’ọgbakọ Ndị Kraịst taa baara anyị?

25 Ihe a Baịbụl kwuru bụ ihe e ji mara Mata n’ihi na ọ bụ nwaanyị dị ike ọrụ. Mgbe mbụ a kọọrọ anyị banyere ya na Baịbụl, ọ nọ na-arụ ọrụ. Mgbe ikpeazụ a kọkwaara anyị banyere ya, ọ ka nọ na-arụ ọrụ, na-eme ihe niile o nwere ike ime ka o lekọta ndị ya na ha nọ. E nwere ụmụ nwaanyị ndị dị ka Mata n’ọgbakọ Ndị Kraịst taa. Ha nwere obi ike ma na-emesapụ aka. Ha na-egosikwa na ha nwere okwukwe. Otú ha si eme ya bụ na ha na-ewepụta onwe ha na-ejere ndị ọzọ ozi. Mata ọ̀ kwụsịrị ijere ndị ọzọ ozi? Ọ dịghị ka ọ̀ kwụsịrị. Ya bụrụ otú ahụ, ọ kpara àgwà onye ma ihe n’ihi na nke ahụ ga-enyere ya aka idi nsogbu ndị ka ga-abịara ya.

26. Gịnị ka okwukwe Mata nyeere ya aka ime?

26 Mgbe abalị ole na ole gachara, Mata diri ọnwụ Nna ya ukwu, bụ́ Jizọs, bụ́ onye e gburu n’ike. Ndị ihu abụọ gburu Jizọs kpebisikwara ike na ha ga-egbu Lazarọs ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị bịaziri na-enwe okwukwe na Jizọs kemgbe ahụ Jizọs kpọlitechara ya n’ọnwụ. (Gụọ Jọn 12:9-11.) O doro anya na ọnwụ mechara kewaa Mata na ụmụnne ya ọ hụrụ n’anya. Anyị amaghị otú nke a si mee ma ọ bụ mgbe o mere. Ma otu ihe doro anyị anya bụ na okwukwe siri ike Mata nwere nyeere ya aka idi nsogbu niile bịaara ya ruo mgbe ọ nwụrụ. Ọ bụ ya mere Ndị Kraịst taa ji kwesị iṅomi okwukwe Mata.

^ para. 11 N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ndị Juu anaghị ekwe ka ụmụ nwaanyị gaa akwụkwọ. Ihe a na-akụziri ha bụ otú ha ga-esi na-arụ ọrụ ndị e nwere n’ụlọ. N’ihi ya, ọ ga-abụ na ọ gbara Mata gharịị mgbe ọ hụrụ ka nwanne ya nọ n’akụkụ ụkwụ Jizọs na-ege ya ntị.