Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE IRI NA ISE

Ọ Gbachiteere Ndị Chineke

Ọ Gbachiteere Ndị Chineke

1-3. (a) Gịnị mere ụjọ ji tụọ Esta ịgakwuru di ya? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya, bụ́ ndị gbasara Esta?

MGBE Esta na-abanye n’ebe eze na-anọ n’obí ya dị na Shushan, o kuuru ume kuda. O nweghị onye batara otú a o si bata nke obi na-agaghị na-akụ kpum kpum. Obí eze a mara mma dị egwu. Otú e si chọọ ya mma ga-egosi onye ọ bụla batara na ya na nwoke a Esta na-aga ịhụ abụghị obere mmadụ. Dị ka ihe atụ, e ji brik ndị na-egbuke egbuke tụọ ọdụm na ndị na-agba ụta nakwa oké ehi ndị nwere nku n’ahụ́ ụlọ ahụ. A chọkwara ogidi ụlọ ahụ mma. Obí eze a dị n’akụkụ otu ugwu a na-akpọ Ugwu Zagros. Snoo na-ekpuchikarị elu ugwu a. Obí a chekwara ihu n’otu osimiri nke a na-akpọ osimiri Koaspis. Nwoke a Esta na-aga ịhụ kpọrọ onwe ya “eze ukwu,” ọ bụkwa di Esta.

2 Aha nwoke a bụ Ahazuirọs. Ma, ọ bụtụdịghị ụdị onye a ka nwaanyị ọ bụla bụ́ onye Juu ga-echewe echiche ịlụ. * Àgwà ya adịghị ka nke Ebreham, bụ́ nwoke dị umeala n’obi nke gere nwunye ya bụ́ Sera ntị otú Chineke sịrị ya mee. (Jen. 21:12) Eze ahụ amachaghị Jehova, bụ́ Chineke Esta, ma ọ bụkwanụ Iwu Ya, ma ọ bụrụ na o nwedịrị nke ọ ma ama. Ma, ọ ma iwu ndị Peshia nke ọma, ọ makwa na e nwere iwu kwuru na Esta ekwesịghị ime ihe a ọ chọrọ ime. Gịnị ka iwu ahụ kwuru? O kwuru na a ga-egbu onye ọ bụla bịara n’ihu eze Peshia ma ọ bụrụ na ọ bụghị eze kpọrọ ya. Eze akpọghị Esta, ma Esta na-aga ịhụ ya. Mgbe Esta rutewere nso n’ebe eze nwere ike ịnọ n’ocheeze ya hụ ya, o nwere ike ịdị Esta ka ò ji anya ya na-ahụ ọnwụ ya.—Gụọ Esta 4:11; 5:1.

3 Gịnị mere Esta ji mewe ihe a nwere ike ịta isi ya? Gịnịkwa ka anyị nwere ike ịmụta n’okwukwe nwaanyị ọma a? Ka anyị burugodị ụzọ chọpụta otú Esta si ghọọ nwunye eze Peshia.

Mgbe Esta Bụ Nwata

4. Olee ihe ndị mere mgbe Esta bụ nwata, oleekwa otú ya na nwa nwanne nna ya bụ́ Mọdekaị si biwe?

4 Nne na nna Esta anwụọla. Baịbụl ekwughị ọtụtụ ihe banyere ha. Ọ bụ ha gụrụ ya Hadasa. Hadasa bụ okwu Hibru. Okwu a pụtara osisi metụl. Osisi a na-ama ifuru mara mma, nke na-acha ọcha. Nne na nna Esta nwụrụ mgbe ọ dị obere. N’ihi ya, nwa nwanne nna Esta aha ya bụ Mọdekaị kpọọrọ ya laa n’ụlọ ya, werezie ya ka nwa ya. Mọdekaị bụ nwoke obiọma.—Esta 2:5-7, 15.

Mọdekaị nwere ezigbo ihe mere ọ ga-eji jiri nwa agbọghọ a o ji mere nwa na-eme ọnụ

5, 6. (a) Olee otú Mọdekaị si zụọ Esta? (b) Olee otú ihe dịịrị Esta na Mọdekaị mgbe ha bi na Shushan?

5 Mọdekaị na Esta bi n’isi obodo alaeze Peshia. Ha so ná ndị Juu a dọọrọ n’agha. O yiri ka ihe adịcharaghị Mọdekaị na Esta mfe n’ebe a ha bi n’ihi na ndị obodo ahụ enweghị mmasị n’ebe ha nọ maka na ha na-efe Chineke ma na-edebe Iwu ndị Juu. Ma, o doro anya na Esta bịara hụkwuo Mọdekaị n’anya n’ihi na ọ na-akụziri ya banyere Jehova, bụ́ Chineke ebere, onye napụtarala ndị ya ná nsogbu ọtụtụ ugboro n’oge gara aga, onye ka ga-anapụtakwa ha. (Lev. 26:44, 45) N’eziokwu, Esta na Mọdekaị bịara hụ ibe ha n’anya, na-emekwa ka nna na nwa.

6 O yiri ka Mọdekaị ọ̀ na-arụ ọrụ n’ụlọ eze dị na Shushan. Ya na ndị ọzọ na-ejere eze ozi na-anọkarị n’ọnụ ụzọ ámá ụlọ ahụ. (Esta 2:19, 21; 3:3) Anyị amaghị ihe Esta na-arụ n’oge ọ na-eto, ma o nwere ike ịbụ na ọ na-ejere Mọdekaị ozi ma na-elekọta ụlọ ya. Ọ ga-abụ na ha bi n’ebe ndị ogbenye bi n’obodo ahụ, bụ́ nke dị ma a gafee osimiri ahụ chere ihu n’obí eze. O nwekwara ike ịbụ na obi na-atọ ya ụtọ ịga ahịa e nwere na Shushan, bụ́ ebe ndị na-eji ọlaedo na ọlaọcha akpụ ihe na ndị ahịa ndị ọzọ na-akpọsa ngwá ahịa ha. Esta agaghị echetụdị n’echiche na otu ụbọchị, ihe ọma ndị ahụ ọ na-ahụ ga-eru ya aka. Ọ maghị na ihe ga-emecha dịrị ya mma.

Ọ ‘Mara Mma Ile Anya’

7. Gịnị mere e ji wepụ Vashtaị ka ọ ghara ịbụkwa nwunye eze, gịnịkwa mechaziri mee?

7 Otu ụbọchị, nsogbu e nwere n’ụlọ eze ghọọrọ ndị bi na Shushan ihe akụkọ.  N’ụbọchị ahụ, Ahazuirọs meere ndị ikom ọnụ na-eru n’okwu n’obodo ya oriri. Vashtaị, bụ́ nwunye ya, na ụmụ nwaanyị ibe ya nọkwa nke ha na-eri oriri. Ahazuirọs kpọrọ ọmarịcha nwunye ya ahụ òkù ka ọ bịa, ma o kweghị abịa. Ihe a were eze iwe ma menye ya ihere, n’ihi ya, ọ jụrụ ndị ndụmọdụ ya ihe a ga-eme Vashtaị. Olee ihe e mechara mee Vashtaị? E wepụrụ ya ka ọ ghara ịbụkwa nwunye eze. Ndị na-ejere eze ozi malitere ịchọgharị ọmarịcha ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke n’ebe niile ọ na-achị. Eze ga-ahọrọ otu onye n’ime ha ka ọ bụrụzie nwunye ya.—Esta 1:1–2:4.

8. (a) Gịnị nwere ike ịna-enye Mọdekaị nsogbu n’obi mgbe Esta na-eto? (b) Olee otú i chere anyị nwere ike isi mee ihe Baịbụl kwuru banyere mma elu ahụ́? (Gụọkwa Ilu 31:30.)

8 O nwere ike ịbụ na Mọdekaị na-ele Esta anya mgbe ụfọdụ kwee n’isi, kwuo n’obi ya na nwa nwanne nna ya a etojuola agbọghọ, maakwa mma dị egwu. Ma, nke a ga na-enye ya nsogbu n’obi mgbe ụfọdụ n’ihi na mma Esta nwere ike buwe ya isi. Baịbụl kwuru, sị: “Nwa agbọghọ ahụ makwara mma n’ahụ́, dịkwa mma ile anya.” Ọ bụghị ihe ọjọọ ma mmadụ maa mma. Ma, Baịbụl gosiri na onye mara mma kwesịrị ịdị umeala n’obi ma mara ihe. Ma ọ́ bụghị ya, mma ya nwere ike ime ka o mewe ihe ọjọọ ma ọ bụ mee ka isi buwe ya. (Gụọ Ilu 11:22.) Ị̀ hụtụla onye ụdị ihe ahụ mere? Ma, mma a Esta mara ọ̀ ga-abara ya uru ka ọ̀ ga-eme ka isi buwe ya? E mechaa, anyị ga-ama.

9. (a) Gịnị mere mgbe ndị ozi eze hụrụ Esta, gịnịkwa mere mkpọpụ a kpọpụrụ Esta ga-eji ewute ma Esta ma Mọdekaị? (b) Gịnị mere Mọdekaị ji kwe ka Esta lụọ onye na-anaghị efe Chineke? (Jiri ihe e dere n’igbe zaa ajụjụ a.)

9 Ndị na-ejere eze ozi hụrụ na Esta mara mma. Ha kpọnaara ya Mọdekaị kpọga ya ná nnukwu obí eze ahụ, ya na ụmụ agbọghọ ndị ọzọ ha chọtara. (Esta 2:8) O doro anya na nke a wutere Esta, wutekwa Mọdekaị n’ihi na ha abụọ dị ka nna na nwa. Mọdekaị agaghị achọ ka Esta lụọ onye na-anaghị efe Jehova, ọ sọgodị onye ahụ ya bụrụ eze. Ma, o nweghị ihe ọ ga-emeli n’okwu a. * Ọ ga-abụ na Esta tọrọ ntị n’ala nụrụ ndụmọdụ niile Mọdekaị nyere ya tupu ha akpọrọ ya pụọ. E nwere ọtụtụ ajụjụ na-agbata ya n’obi mgbe ahụ a kpọ ya na-aga Shushan bụ́ obí eze. Oleezi otú ụwa ya ga-adị?

Ihe Ya “Na-amasị Onye Ọ Bụla Hụrụ Ya”

10, 11. (a) Olee ihe ebe a a kpọtara ụmụ agbọghọ ahụ nwere ike ime ka Esta mewe? (b) Olee otú Mọdekaị si gosi na ihe banyere Esta na-echu ya ụra?

10 Esta anọtụbeghị n’ụdị ebe a a kpọtara ya. O so ‘n’ọtụtụ  ụmụ agbọghọ’ ndị e si n’ebe dị iche iche alaeze Peshia na-achị kpọta. Ọ ga-abụ na otú e si zụọ ụmụ agbọghọ ahụ, asụsụ ha, na àgwà ha abụghị otu. Onye na-elekọta ha bụ otu onye na-arụrụ eze ọrụ nke aha ya bụ Hegaị. A ga-eji otu afọ zuru ezu chọọ ụmụ agbọghọ ahụ mma ma jiri mmanụ otite na-esi ísì ọma hịa ha aka n’ahụ́. (Esta 2:8, 12) O yiri ka ebe a a kpọtara ha ọ̀ ga-eme ka mma elu ahụ́ chuwezie ụmụ agbọghọ ahụ ụra, meekwa ka isi buwe ụfọdụ n’ime ha, nakwa ka onye ọ bụla chọwa otú ọ ga-esi aka ibe ya mma. Oleekwanụ maka Esta?

11 O nweghị onye ihe gbasara Esta na-echu ụra karịa Mọdekaị. Baịbụl gwara anyị na kwa ụbọchị, ọ na-agaru nso n’ụlọ ebe ụmụ agbọghọ ahụ nọ ma na-agbalị ka ọ mata otú Esta mere. (Esta 2:11) Obi ga na-atọ ya ezigbo ụtọ mgbe ọ bụla ụfọdụ ndị na-eje ozi n’ebe ahụ kọtụụrụ ya otú ihe si aga. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

12, 13. (a) Olee otú ihe Esta dị ndị mmadụ? (b) Olee otú obi dị Mọdekaị mgbe ọ matara na Esta agwabeghị ndị mmadụ na ọ bụ onye Juu?

12 Àgwà ọma Esta na-akpa mere ka Hegaị nwee mmasị n’ebe ọ nọ nke na ọ kpọnyere Esta ụmụ agbọghọ asaa na-eje ozi, kpọfeekwa ya n’ebe kacha mma n’ụlọ ndị inyom ahụ. Baịbụl kwudịrị, sị: “N’oge ahụ niile ihe Esta na-amasị onye ọ bụla hụrụ ya.” (Esta 2:9, 15) Ọ̀ bụ naanị mma ya mere ihe ya ji amasị onye ọ bụla? Mba. E nwere ihe ndị ọzọ.

Esta maara na ịdị umeala n’obi na amamihe bara ezigbo uru karịa mma elu ahụ́

13 Dị ka ihe atụ, Baịbụl sịrị: “Esta emeghị ka a mata obodo o si ma ọ bụ ndị bụ́ ndị ikwu ya, n’ihi na Mọdekaị nyere ya iwu ka ọ ghara ikwu ya.” (Esta 2:10) Mọdekaị gwara Esta ka ọ ghara ịkọrọ ndị mmadụ na ọ bụ onye Juu. O doro anya na Mọdekaị ahụla na ụfọdụ ndị nọ n’obí eze kpọrọ ndị Juu asị. Obi dị ya ụtọ ịmata ugbu a na n’agbanyeghị na ya na Esta ebizighị, Esta ka na-erubere ya isi otú ọ na-eme, na-egosikwa na ọ ka ma ihe.

14. Olee otú ụmụ okoro na agbọghọ nwere ike isi ṅomie Esta n’oge a?

 14 Taa, ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ nwekwara ike ime ka obi na-atọ ndị mụrụ ha ma ọ bụ ndị na-elekọta ha ụtọ. Mgbe ha na ndị mụrụ ha na-anọghị, ya bụrụgodị na ndị ha na ha nọ na-eme omume rụrụ arụ ma ọ bụ na-eme ihe ọjọọ ndị ọzọ, ha nwere ike ịna-eme ihe dị mma ma ghara ikwe ka e mebie omume ọma ha. Ha mee otú ahụ, ha ga-eme ka obi Nna ha nke eluigwe ṅụrịa otú Esta mere.—Gụọ Ilu 27:11.

15, 16. (a) Gịnị mere eze ji hụ Esta n’anya? (b) Gịnị mere na ọ dịrịghị Esta mfe ugbu a ihe gbanwere ná ndụ ya?

15 Mgbe oge ruru ka a kpọga Esta n’ihu eze, a gwara ya ka o were ihe ọ bụla o chere dị ya mkpa. O nwere ike ịbụ na ihe ahụ a gwara ya were bụ ihe ọ ga-eji chọkwuo onwe ya mma. Ma, ebe ọ bụ na Esta abụghị onye oké ọchịchọ, ọ rịọghị ka e nyekwuo ya ihe ndị ọzọ ma e wezụga ndị nke Hegaị gwara ya were. (Esta 2:15) Ọ ga-abụ na ọ ghọtara na ihe ga-eme ka eze nwee mmasị n’ebe ọ nọ abụghị naanị mma ya. Ọ ma na ihe ga-aka amasị eze bụ ịdị umeala n’obi ya. Nke a ọ̀ bụ eziokwu?

16 Baịbụl kwuru, sị: “Eze wee hụ Esta n’anya karịa ndị inyom ndị ọzọ niile, nke mere ka o nweta ihu ọma ya na obiọma ya karịa ụmụ agbọghọ niile ndị ọzọ na-amaghị nwoke. O wee kee ya ákwà isi a na-eke nwunye eze ma mee ya nwunye eze n’ọnọdụ Vashtaị.” (Esta 2:17) O doro anya na ọ dịrịghị nwa agbọghọ a ọ na-enweghị ka ọ hà ya, bụ́ onye Juu, mfe ịgbanwe otú o si ebi ndụ. Ọ bụ ya bụ nwunye eze ugbu a. Eze a kacha eze niile e nwere n’ụwa n’oge ahụ. Ma, nke a ò mere ka isi buwe Esta, ya adịzie mpako? Mbanụ!

17. (a) Olee ihe ndị gosiri na Esta akwụsịghị irubere Mọdekaị isi mgbe ọ ghọchara nwunye eze? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị iṅomi Esta n’oge a?

17 Esta ka nọ na-erubere Mọdekaị isi. O nweghị onye ọ gwara na ya bụ onye Juu. Ihe ọzọkwa bụ na mgbe Mọdekaị chọpụtara na o nwere ndị chọrọ igbu Ahazuirọs, ọ gwara Esta, Esta agaa kọọrọ eze, aka akparazie ndị ọjọọ ahụ. (Esta 2:20-23) Esta gosikwara na ya nwere okwukwe na Chineke ya n’ihi na ọ nọgidere na-adị umeala n’obi ma na-erube isi. N’eziokwu, anyị kwesịrị inwe àgwà ndị ahụ Esta nwere n’oge a ọtụtụ ndị na-enupụ isi. Ma, ndị nwere ezigbo okwukwe otú Esta nwere anaghị eji nrubeisi egwuri egwu.

Mgbe A Ga-amata ma Okwukwe Esta Ò Siri Ike

18. (a) Olee ihe o nwere ike ịbụ ya mere ka Mọdekaị jụ ịkpọrọ Heman isiala? (Gụọ ihe e dere n’ala ala.) (b) Olee otú ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị taa si eṅomi okwukwe Mọdekaị?

18 Otu nwoke a na-akpọ Heman bịara ghọọ onye a ma ama  n’obí eze. Ahazuirọs mere ya osote ya, jirikwa ya mere onye ndụmọdụ ya na onye nke abụọ n’alaeze ahụ. Eze nyedịrị iwu ka onye ọ bụla hụrụ Heman hulata kpọọrọ ya isiala. (Esta 3:1-4) Ma, iwu ahụ adịghị Mọdekaị mma. Ọ ma na ya kwesịrị irubere eze isi, ma ọ bụghịzi nke ime ihe eze kwuru ma nupụrụ Chineke isi. Otu ihe dị mkpa kpatara ya bụ na Heman si n’agbụrụ Egag. Nke a pụtara na o nwere ike ịbụ onye ezinụlọ Egag, bụ́ eze ndị Amalek, onye Samuel onye amụma Chineke gburu. (1 Sam. 15:33) Ndị Amalek bụ ndị ọjọọ. Ihe ọjọọ ha na-eme karịrị akarị nke na ha ghọrọ ndị iro Jehova na ndị iro ụmụ Izrel. Chineke mara ndị Amalek niile ikpe. * (Diut. 25:19) Oleezi otú onye Juu nke na-ejighị ife Chineke egwu egwu ga-esi akpọrọ onye Amalek ahụ isiala? Mọdekaị ekweghị eme otú ahụ. Ọ jụwapụrụ isi. Ruokwa taa, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ndị nwere okwukwe ekpebisiela ike na ha ga-erubere Chineke isi n’agbanyeghị na e nwere ike igbu ha. Ha na-eme ka ndịozi Jizọs bụ́ ndị sịrị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.

19. Olee ihe Heman chọrọ ime, oleekwa ihe ọ gwara eze ka o nwee ike mezuo ihe o bu n’obi?

19 Ihe a Mọdekaị na-ekweghị eme were Heman iwe. Ma, ihe Heman chọrọ ime abụghị naanị igbu Mọdekaị, ọ chọkwara igbu ndị niile bụ́ ndị obodo Mọdekaị. Heman gara kọọrọ eze na ndị Juu bụ ndị ọjọọ. Kama ịkpọ ha aha n’ihu eze, o ji akọ gwa eze na ndị ahụ bụ ndị na-abaraghị eze uru, nakwa na ha ‘gbasara ebe niile ma bụrụ ndị nọpụrụ iche n’etiti ndị niile.’ Nke ka njọ bụ na o kwuru na ndị ahụ anaghị erubere iwu eze isi, n’ihi ya, na e kwesịghị inwe ha n’obodo. Ọ gwara eze na ya ga-etinyere ya ego buru ibu n’ebe eze na-edebe akụ̀ iji kwụọ ụgwọ ihe a ga-emefu n’igbu ndị Juu niile nọ n’alaeze ahụ. * Ahazuirọs nyere Heman mgbaaka ya ka o were ya bịanye aka n’iwu ọ bụla ọ chọrọ inye ka o nwee ike mezuo ihe o bu n’obi.—Esta 3:5-10.

20, 21. (a) Olee otú obi dị Mọdekaị na ndị Juu nọ n’ebe niile alaeze Peshia na-achị mgbe ha nụrụ ozi ahụ Heman mere ka e zie? (b) Olee ihe Mọdekaị rịọrọ Esta ka o mee?

20 N’oge na-adịghị anya, ndị ozi malitere iji ịnyịnya  na-agbaga n’ebe dị iche iche n’alaeze ahụ, na-ekwu na a ga-ala ndị Juu n’iyi. Chegodị otú obi ga-adị ndị Juu bi na Jeruselem mgbe ha nụrụ ozi ahụ. Ọ dịbeghị oké anya ha si n’ebe a dọọrọ ha n’agha na Babịlọn laghachi Jeruselem, ha na-agbalịkwa ka ha wughachi Jeruselem. Jeruselem enwebeghịkwa mgbidi ọ bụla nke ga-echebe ndị bi na ya. O nwere ike ịbụ na Mọdekaị chetara ha, chetakwa ndị enyi ya na ndị ikwu ya bi na Shushan mgbe ọ nụrụ ozi ọjọọ ahụ. O wutere ya nke ukwuu nke na ọ dọwara uwe ya, yiri ákwà iru uju ma kpokwasị ntụ n’isi ma nọrọ n’etiti obodo ahụ na-ebe ákwá. Ma Heman na eze nọdụrụ ala na-aṅụ mmanya. Obi ọjọọ ahụ Heman kpataara ndị Juu na ndị enyi ha bi na Shushan emetụdịghị ya n’ahụ́.—Gụọ Esta 3:124:1.

21 Mọdekaị ma na ya ekwesịghị ịgba nkịtị. Ma, oleekwanụ ihe ọ ga-eme? Esta nụrụ na ọ nọ na-eru uju ma chịgara ya uwe. Ma Mọdekaị ekweghị ka a kasie ya obi. O nwere ike ịbụ na ọ dịla anya o chewere ihe mere Chineke ya, bụ́ Jehova, ji kwe ka a kpọnara ya Esta ọ hụrụ n’anya, kwekwa ka Esta ghọọ nwunye eze na-efe arụsị. O yiri ka ọ̀ ghọtawala ihe kpatara ya. Mọdekaị zigaara Esta bụ́ nwunye eze ozi, rịọ ya ka ọ gaa rịọ Eze arịrịọ “maka ndị ya.”—Esta 4:4-8.

22. Gịnị mere ịga n’ihu eze ji na-atụ Esta ụjọ? (Gụọ ihe e dere n’ala ala.)

 22 Ọ ga-abụ na ụjọ jidere Esta mgbe ọ nụrụ ozi ahụ. Ọ bụ ugbu a ka ọ ga-edo anya ma okwukwe ya ò siri ike ma ọ bụ na o sighị. Ozi o zighachiiri Mọdekaị gosiri na ụjọ ji ya. O chetaara Mọdekaị iwu eze nyere, nke bụ́ na a ga-egbu onye ọ bụla gara n’ihu eze ma ọ bụrụ na eze akpọghị ya. Naanị ihe ga-azọ onye ahụ bụ ma eze setịara ya mkpanaka ọlaedo ya. Esta ọ̀ ga-atụwa anya na e nwere ike imere ya ebere ma ọ gaa n’ihu eze, nke ka nke ma o cheta ihe e mere Vashtaị mgbe ọ jụrụ ịbịa zaa eze òkù eze kpọrọ ya? Ọ gwara Mọdekaị na eze akpọbeghị ya ka ya bịa n’ihu ya kemgbe ụbọchị iri atọ. Òkù a eze na-akpọbeghị Esta mere ka Esta chewe ma ọ̀ ga-abụ na ihe ya adịkwaghị eze a na-ewekarị iwe ọkụ mma. *Esta 4:9-11.

23. (a) Olee ihe Mọdekaị gwara Esta nke mere ka okwukwe Esta sikwuo ike? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị iṅomi Mọdekaị?

23 Mọdekaị zighachiiri Esta ozi nke mere ka okwukwe Esta sikwuo ike. Ọ gwara ya na ọ bụrụ na o nweghị ihe o mere, na a ga-esi n’ebe ọzọ zọpụta ndị Juu. Ma olee otú Esta ga-esi chee na a ga-ahapụ igbu ya ma e gbuwe ndị Juu? Ihe a Mọdekaị kwuru gosiri na o nwere okwukwe na Jehova. Ọ ma na Jehova agaghị ekwe ka e gbukpọọ ndị na-efe ya, nkwa ndị O kwere agharazie imezu. (Jọsh. 23:14) Mọdekaị jụziri Esta, sị: “Ònye ma ma ọ̀ bụ n’ihi oge dị otú a ka i ji ruo n’ọkwá ịbụ nwunye eze?” (Esta 4:12-14) Ọ̀ bụ na anyị enwesịghị iṅomi okwukwe Mọdekaị? Mọdekaị tụkwasịrị Chineke ya, bụ́ Jehova, obi ya niile. Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, Ànyị tụkwasịrị Jehova obi otú ahụ?—Ilu 3:5, 6.

Okwukwe Ya Siri Ike Karịa Ụjọ Ọnwụ

24. Olee otú Esta si gosi na obi siri ya ike nakwa na ya nwere okwukwe na Chineke?

24 Esta ma na oge ya kwesịrị ime ihe eruola. O ziri Mọdekaị ozi ka ọ gwa ndị Juu ibe ya ka ha soro ya buo ọnụ ụbọchị atọ. Okwu Esta ji pịachie ozi ahụ, bụ́ nke ọtụtụ ndị kwughachirila kemgbe ahụ, gosiri na o nwere okwukwe nakwa na obi siri ya ike. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na m ga-anwụ, ka m nwụọ.” (Esta 4:15-17) Ọ ga-abụ na o kpesiri ekpere ike n’ime ụbọchị atọ ahụ karịa otú o kpetụrụla ná ndụ ya niile. Ma, oge ọ ga-eji hụ eze eruola. O yiiri uwe ya kacha mma, chọọ onwe ya mma otú ga-eme ka eze nwee mmasị n’ebe ọ nọ. Ọ gawaziri.

Esta mere ihe nwere ike ịkpatara ya ọnwụ iji chebe ndị Chineke

25. Kọwaa ihe ndị mere mgbe Esta na-aga ịhụ di ya n’obí eze.

25 Dị ka e kwuru ná mbido isiokwu a, Esta banyere n’obí eze. Ọnụ agaghị akọli otú obi si na-akụ ya kpum kpum na otú o si na-ekpesi ekpere ike n’ime obi ya ka ọ na-aga. O ruru n’ebe Ahazuirọs nwere ike isi n’ocheeze ya hụ ya. O nwere ike ịbụ na Esta lere ya anya n’ihu iji mata otú obi dị ya. Ọ bụrụ na a sịrị Esta cheretụ n’ebe ahụ, ọ ga-adị ya ka ọ̀ dịla anya o guzo ebe ahụ. Ma n’oge na-adịghị anya, di ya hụrụ ya. O juru di ya anya, ma ihu ya gosiri na iwe ejighị ya. O setịịrị Esta mkpanaka ọlaedo ya.—Esta 5:1, 2.

26. Gịnị mere Ndị Kraịst ga-eji kata obi ka Esta, gịnịkwa mere o ji bụrụ na ọrụ Esta agwụbeghị?

26 Eze anabatala Esta, ma jikere ige ya ntị. Esta nwere okwukwe na Chineke ma mee ihe nwere ike ịkpatara ya ọnwụ iji chebe ndị Chineke. Ndị niile na-efe Chineke taa kwesịrị iṅomi okwukwe Esta. Ezigbo Ndị Kraịst taa ejighị ihe ahụ Esta mere egwuri egwu. Jizọs kwuru na ihe a ga-eji mata ezigbo ndị na-eso ụzọ ya bụ na ha ga-ahụ ibe ha n’anya ma dịrị njikere ịnwụchitere ibe ha ọnwụ. (Gụọ Jọn 13:34, 35.) Ihe ga-eme ka ndị na-eso ụzọ Jizọs nwee ụdị ịhụnanya ahụ bụ na ha ga-akata obi ka Esta. N’agbanyeghị na Esta gbachiteere ndị Juu, ihe ọ ka ga-eme agwụbeghị. Olee otú ọ ga-esi mee ka eze kweta na onye ndụmọdụ ya ọ kacha hụ n’anya, bụ́ Heman, bụ onye ọjọọ nke kpara nkata ka e gbuchapụ ndị Juu? Olee otú Esta ga-esi eme ka a ghara igbu ndị Juu ibe ya? Anyị ga-eleba anya n’ajụjụ ndị a n’isiokwu na-eso nke a.

^ para. 2 Ọtụtụ ndị na-ekwu na ọ bụ Ahazuirọs bụ Zaksis nke Mbụ, bụ́ onye malitere ịchị alaeze Peshia n’afọ 496 Tupu Oge Ndị Kraịst.

^ para. 9 Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ajụjụ Ndị A Jụrụla Banyere Esta.” Ọ dị n’Isi nke 16.

^ para. 18 O nwere ike ịbụ na Heman so ná ndị Amalek ikpeazụ fọrọ ndụ, ebe ọ bụ na e gburu “ndị fọdụrụ” n’ime ha n’oge Eze Hezekaya.—1 Ihe 4:43.

^ para. 19 Heman kwuru na ya ga-enye eze iri puku talent ọlaọcha, nke bụ́ ọtụtụ nde naịra n’oge a. Ọ bụrụ na Ahazuirọs bụ Zaksis nke Mbụ, ọ ga-abụ ego ole ahụ Heman kwuru na ya ga-enye ya mere o ji nwekwuo mmasị n’ihe ahụ Heman chọrọ ime. Zaksis mefuru ego buru ibu n’agha ọ lụsoro ndị Gris. Ndị Gris merikwara ya n’agha ahụ.

^ para. 22 E ji iwe iwe ọkụ mara Zaksis nke Mbụ. Onye Gris bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme, nke aha ya bụ Hirọdọtọs, kwuru ihe ụfọdụ gosiri na nke a bụ eziokwu. Mgbe ọ na-ede banyere agha Zaksis lụsoro ndị Gris, ọ sịrị na eze ahụ nyere iwu ka a rụọ àkwà mmiri nke dị ka ụgbọ bụ́ nke ha ga-eji gafee mmiri Helispọnt. Mgbe oké ifufe mebiri àkwà mmiri ahụ, Zaksis nyere iwu ka e gbupụ ndị rụrụ ya isi. Ọ gwakwara ndị agha ya ka ha pịawa mmiri ahụ ụtarị. Ha na-apịa ya ụtarị, a na-abụ ya ọnụ. Mgbe otu nwoke nke bara ọgaranya rịọrọ ka nwa ya nwoke ghara iso gaa agha ahụ, Zaksis nyere iwu ka a kpọwaa nwa ahụ abụọ ma dewe ozu ya n’ebe ndị mmadụ ga-ahụ ya iji dọọ ndị ọzọ aka ná ntị. E mekwara otú ahụ.