Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE ASAA

O “Wee Na-eto n’Ebe Jehova Nọ”

O “Wee Na-eto n’Ebe Jehova Nọ”

1, 2. Gịnị mere ụmụ Izrel ji zukọta ka Samuel gwa ha okwu, gịnịkwa mere o ji dị mkpa ka o nyere ha aka ka ha chegharịa?

SAMUEL lere ndị obodo ya anya n’ihu. Ha gbakọtara na Gilgal. Ọ bụ nwoke a nwere okwukwe nke bụ́ onye amụma na onyeikpe kemgbe ọtụtụ iri afọ kpọkọtara ha ebe a. Oge ahụ bụ oge ọkọchị. O nwere ike ịbụ n’ọnwa Mee ma ọ bụ Jun na kalenda nke oge a. Ọka wit ndị dị n’ubi n’ógbè ahụ achaala. Ndị niile ahụ gbakọtaranụ nọọrọ jụụ. Ma gịnị ga-eme ka ihe Samuel chọrọ ịgwa ha ruo ha n’obi?

2 Ha aghọtaghị otú ọnọdụ ha dịruru ná njọ. Ha siri ọnwụ ka e nye ha eze ga na-achị ha. Ha aghọtaghị na ihe a ha mere bụ ileda Chineke ha, bụ́ Jehova, na onye amụma ya, anya. Ọnwụ a ha na-esi ka e nye ha eze pụtara na ha achọkwaghị ka Jehova bụrụ Eze ha. Olee otú Samuel ga-esi eme ka ha chegharịa?

Ihe ndị mere mgbe Samuel bụ nwata na-akụziri anyị na anyị kwesịrị inwe okwukwe na Jehova a sịgodị na ndị anyị na ha nọ na-eme ihe na-adịghị mma

3, 4. (a) Gịnị mere Samuel ji kwuo banyere mgbe ọ bụ nwata? (b) Olee otú o si bụrụ na okwukwe Samuel baara anyị uru taa?

3 Samuel gwara ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Mụ onwe m emewo agadi ma chaa isi awọ́.” Isi awọ́ ya ga-eme ka ha gee ya ntị nke ọma. Ọ gwaziri ha, sị: “Mụ onwe m ejewokwa ije n’ihu unu malite mgbe m bụ nwata ruo taa.” (1 Sam. 11:14, 15; 12:2) Ọ bụ eziokwu na Samuel emeela agadi, o chefubeghị oge ọ bụ nwata. Ọ ka na-echeta ihe ndị mere n’oge ahụ. Ihe ndị o mere n’oge ọ bụ nwata mere ka o nwee okwukwe na Chineke ya, bụ́ Jehova, ma jiri ndụ ya fee ya.

4 Samuel gbara mbọ ka okwukwe ya na-esikwu ike n’agbanyeghị  na e nwere ọtụtụ ugboro ndị Izrel ibe ya mere ihe gosiri na ha enweghị okwukwe na Jehova. Taa, ọ na-esikwara ndị mmadụ ike inwe okwukwe na Chineke n’ihi na anyị bi n’ụwa rụrụ arụ nke ọtụtụ ndị bi na ya na-enweghị okwukwe. (Gụọ Luk 18:8.) Ka anyị hụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Samuel malite mgbe ọ bụ nwata.

Ọ “Nọ Na-eje Ozi n’Ihu Jehova Mgbe Ọ Bụ Nwa Okoro”

5, 6. Gịnị mere ndụ Samuel ji pụọ iche mgbe ọ bụ nwata, ma gịnị mere obi ji sie nne na nna ya ike na a ga-elekọta ya nke ọma?

5 Ndụ Samuel pụrụ iche mgbe ọ bụ nwata. Obere oge a napụchara ya ara, mgbe ọ dị ihe dị ka afọ atọ ma ọ bụ anọ, ọ malitere ije ozi n’ụlọikwuu Jehova dị nsọ nke dị na Shaịlo. Isi n’ụlọ Samuel ha dị na Rema ruo Shaịlo dị ihe karịrị kilomita iri atọ. Nne na nna ya, bụ́ Hana na Elkena, nyefere Jehova nwa ha nwoke a ka o jewere ya ozi pụrụ iche. Ha si otú ahụ mee ka ọ ghọọ onye Naziraịt ná ndụ ya niile. * Nke a ọ̀ pụtara na nne na nna Samuel jụrụ ya ajụ, na ha ahụghị ya n’anya?

6 Mbanụ! Ha ma na a ga-elekọta nwa ha nwoke anya na Shaịlo. O doro anya na nnukwu onye nchụàjà bụ́ Ilaị hụrụ na e lekọtara Samuel nke ọma n’ihi na ya na ya na-arụkọ ọrụ. E nwekwara ọtụtụ ndị inyom ndị na-enye aka n’ọrụ ụfọdụ a na-arụ n’ụlọikwuu ahụ. O dokwara anya na a haziri ọrụ ha ahazi.—Ọpụ. 38:8; Ikpe 11:34-40.

7, 8. (a) Olee ihe nne na nna Samuel na-emere ya kwa afọ bụ́ nke gbara ya ume? (b) Gịnị ka ndị nne na nna taa nwere ike ịmụta n’ihe nne na nna Samuel mere?

7 Ihe ọzọkwa bụ na Hana na Elkena echefughị na ọ bụ maka na Chineke zara ekpere ha mere ha ji mụta Samuel a ha hụrụ n’anya, bụ́ nwa mbụ ha. Hana rịọrọ Chineke ka o nye ya nwa nwoke, kwekwa nkwa na ya ga-enyefe Chineke nwata ahụ ka o jiri ndụ ya niile jeere Chineke ozi dị nsọ. Mgbe Hana na-aga ileta Samuel kwa afọ, ọ na-ewetara ya obere uwe elu ọhụrụ na-enweghị aka ọ kwaara ya ka o jiri ya na-eje ozi n’ụlọikwuu. O doro anya na obi na-atọ Samuel ụtọ mgbe ọ bụla nne ya bịara ileta ya. Otú nne na nna ya si na-agba ya ume ma na-akụziri ya ihe mere ka obi na-atọ ya ụtọ, meekwa ka ọ ghọta na o nweghị ihe ọma dị ka ịnọ n’ebe ahụ na-ejere Jehova ozi.

8 Ndị nne na nna taa nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’aka Hana na Elkena. Ihe na-aka ọtụtụ ndị nne na nna mkpa bụ igboro ụmụ ha mkpa ha kama inyere ha aka ka ha na Jehova dịrị ná mma. Ma ihe kacha nne na nna Samuel mkpa bụ ife Chineke. Ọ bụkwa ya nyeere Samuel ezigbo aka iji ofufe Chineke kpọrọ ihe mgbe o toro.—Gụọ Ilu 22:6.

9, 10. (a) Kọwaa otú ụlọikwuu ahụ dị nakwa otú obi dị Samuel na ọ na-arụ ọrụ n’ebe ahụ dị nsọ. (Gụọ ihe e dere n’ala ala.) (b) Olee ọrụ ụfọdụ Samuel na-arụ n’ụlọikwuu ahụ, oleekwa otú i chere ndị na-eto eto taa nwere ike isi na-eme ka Samuel?

 9 Were ya na ị na-ahụ Samuel ka ọ na-eto ma na-aga n’ugwu ndị dị gburugburu Shaịlo. Ka ọ na-eledata anya ma hụ obodo ahụ na ndagwurugwu dị n’otu akụkụ ya, ọ ga-abụ na obi tọrọ ya ụtọ mgbe ọ hụrụ ụlọikwuu Jehova. Ụlọikwuu ahụ bụ ebe dị nsọ n’eziokwu. * Ọ bụ Mozis haziri ụmụ Izrel mgbe ha rụrụ ụlọikwuu ahụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ anọ tupu mgbe ahụ. Mgbe a rụchara ya, ọ ghọrọ ebe a na-anọ efe Jehova n’ụwa niile.

10 Obere nwa a bụ́ Samuel bịara nwee mmasị n’ụlọikwuu ahụ. Samuel mechara kwuo banyere onwe ya n’akwụkwọ o dere. Ọ sịrị: “Samuel nọ na-eje ozi n’ihu Jehova mgbe ọ bụ nwa okoro. Ọ na-eyi efọd e ji ákwà linin mee.” (1 Sam. 2:18) Uwe elu ahụ na-enweghị aka Samuel na-eyi gosiri na ọ na-enyere ndị nchụàjà aka n’ụlọikwuu ahụ. Ọ bụ eziokwu na Samuel abụghị onye nchụàjà, ihe ụfọdụ ọ na-arụ bụ imepe ọnụ ụzọ ndị e si abanye n’ogige ụlọikwuu ahụ n’ụtụtụ nakwa ijere Ilaị merela agadi ozi. N’agbanyeghị otú ọrụ ndị ahụ ọ na-arụ si na-atọ ya ụtọ, ka oge na-aga, ọ malitere ịhụ ihe nyewere ya nsogbu n’obi. E nwere ndị nọ n’ụlọ Jehova na-eme ihe ọjọọ.

Ọ Nọ Na-eme Ezi Ihe Mgbe Ndị Ọzọ Na-eme Omume Rụrụ Arụ

11, 12. (a) Gịnị mere Họfnaị na Finihas ji mewe ihe ọjọọ? (b) Olee ụdị ihe ọjọọ ha na-eme n’ụlọikwuu? (Gụọ ihe e dere n’ala ala.)

11 Mgbe Samuel dị obere, ọ hụrụ àgwà ọjọọ ndị ọzọ na-akpa. Ilaị nwere ụmụ nwoke abụọ. Aha ha bụ Họfnaị na Finihas. Akwụkwọ Samuel kọrọ, sị: “Ụmụ Ilaị bụ ndị ikom na-abaghị n’ihe; ha amaghị Jehova.” (1 Sam. 2:12) Ihe abụọ a e kwuru n’amaokwu a bụcha eziokwu. Họfnaị na Finihas bụ “ndị ikom na-abaghị n’ihe.” Otú e si kwuo ya n’asụsụ Hibru bụ na ha bụ “ụmụ na-enweghị isi na ọdụ.” Ihe mere ha ji bụrụ ndị ikom na-abaghị n’ihe bụ maka na o nweghị ihe ha ji Jehova na iwu ya kpọrọ. Ebe ọ dị otú ahụ, ha meweziri mmehie ndị ọzọ.

12 Iwu Chineke kwuru hoo haa ọrụ ndị nchụàjà ga na-arụ na otú  ha ga-esi na-achụ àjà n’ụlọikwuu ya. E nwere ezigbo ihe mere Jehova ji kwuo hoo haa otú ha ga-esi na-achụ àjà. Àjà ndị ahụ nọchiri anya ihe niile Chineke mere ka o nwee ike na-agbaghara ndị mmadụ mmehie ha, ka ha wee dị ọcha n’anya ya, ka o wee gọzie ha ma na-eduzi ha. Ma Họfnaị na Finihas mere ka ndị nchụàjà ibe ha na-elelị àjà a na-achụrụ Chineke. *

13, 14. (a) Olee otú obi dị ndị na-atụ egwu Chineke n’ihi ihe ọjọọ ndị a na-eme n’ụlọikwuu? (b) Olee otú o si bụrụ na Ilaị arụtaghị ọrụ abụọ o kwesịrị ịrụ?

13 Were ya na ị na-ahụ ka obere nwa bụ́ Samuel nọ na-ahụ arụrụala niile a na-arụ n’ebe ahụ, ma o nweghị onye chọrọ ịkwụsị ya. Ọ na-ahụ ọtụtụ ndị, ma ndị ogbenye a na-emegbu emegbu, ka ha na-abịa n’ụlọikwuu ahụ dị nsọ, na-enwe olileanya na a ga-akasi ha obi ma mee ka ha na Chineke dịkwuo ná mma. Kama nke ahụ, ha na-eji obi mgbawa ma ọ bụ ihere laa. Oleekwa otú obi dị ya mgbe ọ matara na Họfnaị na Finihas na-elelịkwa iwu Jehova nyere banyere mmekọahụ, ya bụ, na ha na-edina ụfọdụ n’ime ndị inyom na-eje ozi n’ụlọikwuu ahụ? (1 Sam. 2:22) O nwere ike ịbụ na ọ tụrụ anya na Ilaị ga-eme ka ihe ọjọọ ndị ahụ a na-eme kwụsị.

O doro anya na ihe ọjọọ ụmụ Ilaị na-eme nyere Samuel nsogbu n’obi

14 Ọ bụ Ilaị ka ọ dị n’aka ịkwụsị nsogbu ahụ. Ebe ọ bụ nnukwu onye nchụàjà, ọ bụ ya na-ahụ maka ihe niile a na-eme n’ụlọikwuu ahụ. Ebe ọ bụ nna, ọ bụ ya kwesịrị ịgbazi ụmụ ya. A sị ka e kwuwe, ihe ha na-eme na-akpatara ma ha ma ndị Izrel ndị ọzọ nsogbu. Ma, o nweghị nke Ilaị rụtara n’ọrụ abụọ a o kwesịrị ịrụ. Naanị ihe o mere bụ na ọ batụụrụ ụmụ ya mba. (Gụọ 1 Samuel 2:23-25.) Ma ihe e kwesịrị ime ụmụ ya abụghị naanị ịbatụrụ ha mba. E kwesịrị ịta ha ezigbo ahụhụ n’ihi na ha na-eme mmehie kwesịrị ọnwụ.

15. Olee ozi kpụ ọkụ n’ọnụ Jehova zigaara Ilaị, oleekwa ihe ezinụlọ Ilaị mere mgbe ha nụrụ ozi ahụ?

15 Nsogbu ahụ bịara ka njọ nke na Jehova dunyere “otu onye nke Chineke,” bụ́ onye amụma a na-akpọghị aha, ka ọ gaa zie Ilaị ozi kpụ ọkụ n’ọnụ. Jehova gwara Ilaị, sị: “I wee na-asọpụrụ ụmụ gị karịa mụ onwe m.” N’ihi ya, Chineke kwuru na ụmụ ọjọọ Ilaị ga-anwụ n’otu ụbọchị, nakwa na ezinụlọ Ilaị ga-ata nnukwu ahụhụ. O kwukwara na ndị ezinụlọ Ilaị agazighị abụ ndị nchụàjà. Ozi a kpụ ọkụ n’ọnụ ò mere ka ezinụlọ ahụ gbanwee? Baịbụl gosiri na ha agbanweghị.—1 Sam. 2:27–3:1.

16. (a) Olee akụkọ ọma Baịbụl kọrọ banyere obere nwa bụ́ Samuel? (b) Ihe Baịbụl kọrọ banyere Samuel ọ̀ na-eme gị obi ụtọ? Kọwaa.

 16 Obere nwa bụ́ Samuel ò so ụmụ Ilaị na-eme ihe ọjọọ? N’oge niile ahụ, a nọ na-anụ akụkọ ọma banyere otú Samuel si na-eto ma na-eme ihe dị Jehova mma. Cheta na 1 Samuel 2:18 kwuru na Samuel ji obi ya niile “na-eje ozi n’ihu Jehova mgbe ọ bụ nwa okoro.” N’oge ahụ Samuel bụ nwata, o ji ndụ ya niile na-ejere Chineke ozi. E kwudịrị ihe ga-akadị eme anyị obi ụtọ na 1 Samuel 2:21. Ebe ahụ sịrị: “Nwa okoro ahụ bụ́ Samuel wee na-eto n’ebe Jehova nọ.” Ka ọ na-eto, ya na Nna ya nke eluigwe bịara dịkwuo ná mma. Ọ bụ mmadụ na Jehova ịdị n’ezigbo mma ga-akacha eme ka onye ahụ ghara ime ihe ọjọọ.

17, 18. (a) Olee otú Ndị Kraịst na-eto eto nwere ike isi mee ka Samuel mgbe ndị ha na ha nọ na-eme ihe ọjọọ? (b) Olee ihe gosiri na ihe Samuel na-eme dị mma?

17 Ọ gaara adịrị Samuel mfe iche na ebe ọ bụ na nnukwu onye nchụàjà na ụmụ ya na-eme ihe ọjọọ, na yanwa nwekwara ike ime ihe ọ bụla masịrị ya. Ma, anyị ekwesịghị ime ihe ọjọọ n’ihi na ndị nọ n’isi na ndị ọzọ na-eme ya. Taa, ọtụtụ Ndị Kraịst na-eto eto na-eme ka Samuel ma “na-eto n’ebe Jehova nọ,” ọ sọgodị ya ya bụrụ na ụfọdụ ndị ha na ha nọ na-eme ihe ọjọọ.

18 Olee uru Samuel ritere na o rubeere Jehova isi? Baịbụl sịrị: “N’oge ahụ niile, nwa okoro ahụ bụ́ Samuel nọ na-eto, ihe ya wee na-adịwanye ma Jehova ma mmadụ mma.” (1 Sam. 2:26) Nke a na-egosi na, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, o nwere ndị ihe Samuel na-eme dị mma. Jehova hụrụ nwata a n’anya n’ihi na ọ na-erubere ya isi. O doro Samuel anya na Chineke ga-akwụsị ihe ọjọọ niile a na-eme na Shaịlo. Ma ọ ga-abụ na ọ nọ na-eche,  sị, Oleekwanụ mgbe ọ ga-abụ? Otu abalị, o nwetara azịza ajụjụ ahụ.

“Kwuwe, n’Ihi na Ohu Gị Na-ege Ntị”

19, 20. (a) Kọọ ihe mere n’otu abalị mgbe Samuel na-ehi ụra n’ụlọikwuu. (b) Olee otú o si kpaso Ilaị àgwà? (ch) Olee otú Samuel si mata onye na-akpọ ya?

19 Chi abọwala mgbe ahụ, ma ebe niile ka gbara ọchịchịrị. Ọkụ nnukwu oriọna dị n’ụlọikwuu ahụ anyụwala. N’oge ahụ, ebe niile dara jụụ. Samuel nụrụ otu olu kpọrọ aha ya. O chere na ọ bụ Ilaị na-akpọ ya. Mgbe ahụ, Ilaị emeela ezigbo agadi, ọ naghị ahụchakwa ụzọ. Samuel biliri ma “gbakwuru” agadi nwoke ahụ. Weregodị ya na ị na-ahụ ka nwa okoro ahụ gba ụkwụ ọtọ ma jiri ọsọ na-aga ịhụ Ilaị ka ọ mata ihe ọ chọrọ. Ọ dị mma ịmara na Samuel kwanyeere Ilaị ùgwù ma kpaso ya àgwà ọma. N’agbanyeghị mmehie niile Ilaị mere, ọ ka bụ nnukwu onye nchụàjà Jehova.—1 Sam. 3:2-5.

20 Samuel kpọtere Ilaị, sị ya: “Lee m, n’ihi na ị kpọrọ m.” Ma Ilaị gwara ya na ya akpọghị ya, gwakwa ya ka ọ gaghachi dinara ala. Otu ihe ahụ mere ugboro abụọ ọzọ. Ilaị mechara ghọta ihe na-emenụ. N’oge ahụ, Jehova anaghị emekarị ka ndị ya hụ ọhụụ ma ọ bụ zie ha ozi, anyị makwanụ ihe kpatara ya. Ma Ilaị aghọtala na Jehova amalitekwala ịgwa ndị ya okwu. Ugbu a o sizi n’ọnụ obere nwa a bụ́ Samuel na-agwa ha okwu. Ilaị gwara Samuel ka ọ gaghachi dinara ala ma gwa ya ihe ọ ga-aza ma a kpọọ ya ọzọ. Samuel mere ihe ọ gwara ya. Obere oge, ọ nụrụ olu ahụ ọzọ. Olu ahụ kpọrọ ya, “Samuel, Samuel!” Nwa okoro ahụ zara, sị: “Kwuwe, n’ihi na ohu gị na-ege ntị.”—1 Sam. 3:1, 5-10.

21. Olee otú anyị nwere ike isi na-ege Jehova ntị taa, oleekwa ihe mere anyị ji kwesị ime otú ahụ?

21 Jehova emechaala nweta onye ga na-ejere ya ozi ma na-ege ya ntị na Shaịlo. Samuel gere Jehova ntị ná ndụ ya niile. Gịnwakwanụ? Ị̀ na-ege Jehova ntị mgbe niile? Anyị ekwesịghị ịtụwa anya ka Chineke si n’eluigwe gwa anyị okwu n’abalị. Ma n’oge a, anyị nwere ike ịnụ olu Chineke mgbe ọ bụla anyị gụrụ Baịbụl. Ihe niile ọ chọrọ ịgwa anyị dị n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl. Okwukwe anyị ga na-esikwu ike ma ọ bụrụ na anyị ana-ege Chineke ntị. Ọ bụ otú ahụ ka Samuel mere.

Samuel katara obi zie Ilaị ozi Jehova ziri ya n’agbanyeghị na ọ tụrụ ụjọ ná mmalite

22, 23. (a) Olee otú ozi ahụ Samuel tụrụ ụjọ izi Ilaị si mezuo? (b) Gịnị mere ka ndị mmadụ mata na Samuel bụ ezigbo onye amụma?

22 N’abalị ahụ, ndụ Samuel gbanwere n’ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka ọ ghọrọ onye amụma Chineke na ọnụ na-ekwuru ya. Ná mmalite, ụjọ tụrụ Samuel izi Ilaị ozi Jehova ziri ya n’ihi na ozi a bụ ozi ikpeazụ kpụ ọkụ n’ọnụ Chineke ziri banyere ihe ọ ga-eme ezinụlọ ya n’oge na-adịghị anya. Ma Samuel katara obi zie Ilaị ozi a. Ilaị wedara onwe ya ala ma nabata ozi a Chineke ziri ya. Ihe niile Jehova kwuru mere n’oge na-adịghị anya. Mgbe ndị Izrel gara ibuso ndị Filistia agha,  e gburu Họfnaị na Finihas n’otu ụbọchị. Ilaị nwụkwara mgbe ọ nụrụ na e burula Igbe nsọ Jehova.—1 Sam. 3:10-18; 4:1-18.

23 Ma, ndị mmadụ bịara matakwuo na Samuel bụ ezigbo onye amụma. Baịbụl kwuru na “Jehova nọnyekwaara ya,” kwuokwa na Jehova mere ka amụma niile Samuel buru mezuo.—Gụọ 1 Samuel 3:19.

“Samuel Wee Kpọkuo Jehova”

24. Olee ihe ndị Izrel mechara kwuo ka Samuel meere ha, oleekwa ihe mere ihe a ha kwuru ji jọgbuo onwe ya?

24 Ma, nke ahụ ọ̀ pụtara na ụmụ Izrel rubeere Chineke isi ma jiri ofufe ya kpọrọ ihe otú Samuel mere? Mba. Ka oge na-aga, ha kwuru na ha achọkwaghị ka onye amụma nkịtị na-ekpe ha ikpe. Ha chọrọ ịdị ka mba ndị ọzọ ma nwee eze ga na-achị ha. Jehova gwara Samuel ka o meere ha ihe ha chọrọ, Samuel ekweta. Ma Samuel chọrọ ime ka ndị Izrel mara na mmehie ha jọgburu onwe ya n’ihi na ihe ihe a ha rịọrọ pụtara bụ na ha ajụla Jehova. Ọ bụ ya mere Samuel ji kpọkọta ndị Izrel na Gilgal.

Samuel kpere ekpere ma nwee okwukwe na Jehova ga-aza ya, Jehova zakwara ya ma mee ka égbè eluigwe gbaa, mmiri ezookwa

25, 26. Olee otú Samuel si mee ka ndị Izrel ghọta na mmehie ha jọgburu onwe ya?

25 Mgbe ahụ ha niile zukọtara na Gilgal, Samuel a merela agadi malitere ịgwa ha okwu. O chetaara ndị Izrel otú o si jiri ndụ ya niile jeere Jehova ozi. Baịbụl kwuziri, sị: “Samuel wee kpọkuo Jehova.” Ọ rịọrọ Jehova ka o mee ka égbè eluigwe gbaa nakwa ka mmiri zoo.—1 Sam. 12:17, 18.

26 Oleekwanụ nke bụ́ égbè eluigwe na mmiri ozuzo n’oge ọkọchị? Ụdị ihe a emetụbeghị. Ọ bụrụgodị na ndị Izrel na-enwetụ obi abụọ ma ọ bụ na-akwa Samuel emo, o teghị aka ha akwụsị ya. Ihu ígwé gbajiri na mberede. Ifufe fejisịrị ọka wit ndị dị n’ubi. Égbè eluigwe malitere ịgba, ụda ya ana-adachi ndị mmadụ ntị. Mmiri malitekwara izo. Olee ihe ndị Izrel mere mgbe ahụ? Baịbụl kwuru, sị: “Ndị Izrel niile wee tụọ Jehova na Samuel egwu nke ukwuu.” Ọ bụ mgbe ahụ ka ha ghọtara na mmehie ha jọgburu onwe ya.—1 Sam. 12:18, 19.

27. Gịnị ka Jehova na-emere ndị na-eṅomi okwukwe Samuel?

27 Ọ bụ Jehova Chineke mere ihe ruru ndị nnupụisi ahụ n’obi, ọ bụghị Samuel. Malite mgbe Samuel bụ nwata ruo mgbe o mere agadi, o nwere okwukwe na Chineke. Jehova gọzikwara ya. Jehova agbanwebeghị, ọ ka na-enyere ndị na-eṅomi okwukwe Samuel aka.

^ para. 5 Ọtụtụ ndị na-eji aka ha ekpebi na ha ga-abụ ndị Naziraịt ruo oge ụfọdụ. Ma e nwere mmadụ ole na ole bụ́ ndị Naziraịt n’oge ndụ ha niile, dị ka Samsịn, Samuel, na Jọn Onye Na-eme Baptizim. Ndị Naziraịt na-ekwe nkwa na ha agaghị aṅụ mmanya na-aba n’anya, na ha agaghị akpụ isi ha, ma ọ bụ mee ihe ndị yiri ha.

^ para. 9 Ụlọikwuu ahụ nwere akụkụ anọ, e jikwa ihe ndị kacha mma e ji arụ ụlọ n’oge ahụ rụọ ya. Ụfọdụ n’ime ha bụ akpụkpọ anụ sil, ákwà ndị a kpara ihe ndị mara mma na ha, na osisi ndị dị oké ọnụ ahịa e ji ọlaọcha na ọlaedo machie. A gbara ebe ụlọikwuu ahụ dị ogige. E nwekwara otu nnukwu ebe ịchụàjà n’ime ogige ahụ. O doro anya na ka oge na-aga, a rụnyere ọnụ ụlọ ndị ọzọ n’akụkụ ụlọikwuu ahụ maka ndị nchụàjà. O yiri ka ọ̀ bụ n’otu n’ime ọnụ ụlọ ndị ahụ ka Samuel na-ehi.

^ para. 12 Baịbụl kwuru otú ha si lelịa àjà a na-achụrụ Chineke. Nke mbụ bụ na iwu Chineke nyere ndị Izrel kwuru ebe ndị nchụàjà ga-ewere n’anụ ndị e ji chụọ àjà. (Diut. 18:3) Ma, ndị nchụàjà ọjọọ ahụ bịaziri na-eme ihe dị iche n’ụlọikwuu ahụ. Ha na-edunye ndị na-ejere ha ozi ka ha dụnye nnukwu ndụdụ n’ite mgbe a ka na-esi anụ esi, na-ewere anụ ọ bụla dị mma ndụdụ ahụ dụtara. Nke abụọ bụ na mgbe ndị mmadụ wetara àjà ka a chụọrọ ha n’ebe ịchụàjà, ndị nchụàjà ọjọọ ahụ na-edunye onye na-ejere ha ozi ka ọ majaa onye a ga-achụrụ àjà ahụ ma gwa ya ka o nye ya anụ ndụ tupu a chụọrọ Jehova abụba anụ ahụ n’àjà.—Lev. 3:3-5; 1 Sam. 2:13-17.