Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE IRI NA ANỌ

Ọ Mụtara Ime Ebere

Ọ Mụtara Ime Ebere

1. Olee otú Jona ga-esi aga ebe e dunyere ya, oleekwa otú obi dị ya maka ebe ahụ?

JONA ga-enwe oge buru ibu ọ ga-eji chee echiche. Ebe e dunyere ya ka ọ gaa karịrị narị kilomita asatọ. Ọ ga-aga ije otu ọnwa ma ọ bụ karịa tupu ya eruo ebe ahụ. Ma, ọ ga-ebugodị ụzọ kpebie ma ọ̀ ga-esi ụzọ ka nso, ka ọ̀ ga-esi nke ka anya bụ́ nke ọ na-agaghị enwecha nsogbu na ya. Nke ọ bụla o kpebiri isi, ọ ga-eji nwayọọ nwayọọ na-aga, ọ ga-agafekwa ọtụtụ ndagwurugwu na ọtụtụ ugwu. O nwekwara ike ịbụ na ọ ga-aga nnukwu Ọzara Siria akụkụ akụkụ, rufee osimiri ndị dị ka nnukwu osimiri Yufretis. Ọ ga-ehikwa n’obodo ndị dị na Siria, Mesopotemia, na Asiria. Ebe niile a bụ obodo ndị mba ọzọ. Ka ọ na-aga, ọ nọ na-eche banyere obodo Ninive ahụ na-atụ ya ụjọ.

2. Olee otú Jona si mara na ya agaghị agbata ozi ahụ e dunyere ya n’ọsọ?

2 Ma, otu ihe doro Jona anya bụ na ya agaghị agbata ozi ahụ e dunyere ya n’ọsọ. O meela ya mbụ, ma hụ na ya emekataghị hapụ ozi ahụ. Isiokwu bu nke a ụzọ gosiri na Jehova nweere Jona ndidi ma jiri ebili mmiri na ọrụ ebube ọ rụrụ ka nnukwu azụ̀ loo ya kụziere ya ihe. Mgbe ụbọchị atọ gafere, azụ̀ ahụ gbọpụtara ya n’ikpere mmiri n’enweghị ihe mere ya. Ihe niile ahụ merenụ tụrụ Jona n’anya, ya adịkwuo umeala n’obi ma mụta irube isi.—Jona, isi nke 1, 2.

3. Olee ihe ọma Jehova meere Jona, oleekwa ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ?

3 Mgbe Jehova nyere Jona iwu ka ọ gaa Ninive nke ugboro abụọ, onye amụma ahụ rubere isi, tinye isi n’ebe ọwụwa anyanwụ ma gawa ogologo njem ahụ. (Gụọ Jona 3: 1-3.) Ma, ugbu a Jehova dọrọla ya aka ná ntị, ọ̀ gbanwechaala àgwà ọjọọ ya? Dị ka ihe atụ, Jehova emeerela ya ebere, mee ka mmiri ghara iri ya, hapụ ịta ya ahụhụ maka isi o nupụụrụ ya, nyekwa ya ohere ọzọ ka ọ gaa ozi ahụ o dunyere ya. Ugbu a ihe niile a mechara, Jona ọ̀ mụtala imere ndị ọzọ ebere? Ọ na-esikarịrị ụmụ mmadụ na-ezughị okè ike ịmụta imere ndị ọzọ ebere. Ka anyị hụ ihe anyị ga-amụta n’aka Jona ka ọ na-agba mbọ ka ọ mụta ime ebere.

Ozi Kpụ Ọkụ n’Ọnụ na Ihe Dị Ịtụnanya Ndị Ninive Mere

4, 5. Gịnị mere Jehova ji kpọọ Ninive “obodo ukwu,” gịnịkwa ka nke ahụ na-akụziri anyị banyere Jehova?

4 Jona ewereghị obodo Ninive otú Jehova si were ya. Baịbụl gwara anyị na “Ninive bụ obodo dị nnọọ ukwuu n’anya Chineke.” (Jona 3:3) N’akwụkwọ Jona, Jehova kwuru ugboro atọ na ‘Ninive bụ obodo ukwu.’ (Jona 1:2; 3:2; 4:11) Olee ihe mere obodo a ji bụrụ obodo ukwu ma ọ bụ obodo dị mkpa n’anya Jehova?

5 Ninive bụ obodo ochie. O so n’obodo ndị mbụ Nimrọd  wuru mgbe Iju Mmiri gachara. Ọ bụ nnukwu obodo mepere emepe. Ọ ga-abụkwa na e nwere obodo ndị ọzọ dị n’ime ya. Ninive ga-ewe mmadụ abalị atọ isi n’otu nsọtụ ya ruo na nsọtụ ya nke ọzọ. (Jen. 10:11; Jona 3:3) O doro anya na Ninive buru ibu, nwee ọtụtụ ụlọ arụsị, mgbidi ndị dị elu, na nnukwu ụlọ ndị ọzọ mara mma. Ma, o nweghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a mere ka Ninive bụrụ obodo dị mkpa n’anya Jehova Chineke. Ihe dị Chineke mkpa bụ ndị bi n’obodo ahụ. Ndị bi na Ninive dị ọtụtụ ma e jiri ha tụnyere ndị bi n’obodo ndị ọzọ dị n’oge ahụ. N’agbanyeghị ihe ọjọọ niile ha na-eme, Jehova na-echebara ha echiche. O ji ndụ ụmụ mmadụ kpọrọ ihe, marakwa na onye ọ bụla chọrọnụ nwere ike ichegharị ma mụta ime ihe ọma.

Jona hụrụ na Ninive bụ nnukwu obodo nke ihe ọjọọ juru na ya

6. (a) Olee ihe mere ụjọ nwere ike iji tụọ Jona mgbe ọ banyere Ninive? (Gụọ ihe e dere n’ala ala.) (b) Olee ihe otú Jona si zie ndị Ninive ozi e dunyere ya na-akụziri anyị banyere Jona?

6 Mgbe Jona mechara banye Ninive, ọ ga-abụ na otú ndị mmadụ si ju n’obodo ahụ mere ka ụjọ tụkwuo ya. Ihe karịrị otu narị puku mmadụ na puku iri abụọ bi n’obodo ahụ. * Ọ gara ije otu ụbọchị, na-abami n’ime obodo ahụ ndị mmadụ juru. O nwere ike ịbụ na ọ nọ na-achọ ebe dị mma ọ ga-anọ malite izi ndị mmadụ ozi o ji bịa. Olee otú ọ ga-esi zie ndị obodo ahụ ozi ahụ? Ọ̀ ma asụsụ ndị Asiria? Ka Jehova ọ̀ rụụrụ ya ọrụ ebube, ya amụta asụsụ ahụ? Anyị amaghị. O nwere ike ịbụ na Jona ziri ndị Ninive ozi ahụ n’asụsụ ya bụ́ Hibru, onye nsụgharị agwazie ha ya n’asụsụ ha. Nke ọ bụla ọ bụ, ozi ya doro anya, o yikwaghị ka ọ̀ ga-amasị ndị obodo ahụ. Ọ sịrị ha: “Naanị ụbọchị iri anọ fọrọ ka a kwatuo Ninive.” (Jona 3:4) O kwuru ya n’atụghị egwu, kwuokwa ya ọtụtụ ugboro. Ihe a o mere gosiri na o nwere obi ike na okwukwe. Àgwà ndị a dị Ndị Kraịst ezigbo mkpa taa karịa mgbe ọ bụla ọzọ.

Ozi Jona doro anya, o yikwaghị ka ọ̀ ga-amasị ndị Ninive

7, 8. (a) Gịnị ka ndị Ninive mere mgbe ha nụrụ ozi Jona? (b) Gịnịkwa ka eze ndị Ninive mere mgbe ọ nụrụ ozi Jona?

7 Ndị Ninive nụrụ ozi Jona. O doro anya na o jikeere ejikere maka na o chere na ndị obodo ahụ ga-emesi ya ike. Kama imesi ya ike, ihe dị ịtụnanya mere. Ha gere ya ntị. Ozi ya gbasara n’obodo ahụ ngwa ngwa. N’oge na-adịghị anya, ndị niile nọ  n’obodo ahụ kwuwere banyere amụma ahụ Jona na-ebu, nke bụ́ na a ga-ebibi Ninive. (Gụọ Jona 3:5.) Mmadụ niile malitere ichegharị, ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye, ma ndị ahụ́ siri ike ma ndị ahụ́ na-esighị ike, ma ụmụntakịrị ma ndị agadi. O nweghị onye n’ime ha riri nri. N’oge na-adịghị anya, akụkọ ruru eze ha ntị na ndị ọ na-achị echegharịwala.

Jona nwere obi ike na okwukwe, ọ bụ ya mere o ji nwee ike izi ndị Ninive ozi e dunyere ya

8 Eze ahụ malitekwara ịtụ egwu Chineke. O biliri n’ocheeze ya, yipụ uwe eze ya, yiri nkịrịka ákwà ndị obodo ya yi ma “nọdụ ala ná ntụ.” Ya na “ndị ukwu” ya nyere iwu ka mmadụ niile buwezie ọnụ ahụ ndị mmadụ malitere ibu n’onwe ha. O nyere iwu ka mmadụ niile, ma anụ ụlọ, yiri ákwà iru uju. * O wedara onwe ya ala ma kweta na ndị ya bụ ndị mmehie na ndị na-eme ihe ike. Eze ahụ kwuru na ya nwere olileanya na iwe Chineke ga-ajụrụ mgbe ọ hụrụ na ha echegharịala. Ọ sịrị: “Chineke . . . ga-alaghachi azụ ma gbanwee obi ya wee mee ka iwe ya dị ọkụ dajụọ, anyị ewee ghara ịla n’iyi.”—Jona 3:6-9.

9. Gịnị ka ụfọdụ ndị kwuru banyere otú ndị Ninive si chegharịa, ma olee otú anyị si mara na ihe ahụ ha kwuru abụghị eziokwu?

9 Ụfọdụ ndị ekwetaghị na ndị Ninive ga-agbanweli obi ha ọsọ ọsọ otú ahụ. Ma, ndị ọkà mmụta Baịbụl kwuru na otú ahụ ha si chegharịa bụ otú ndị bi n’oge ahụ si eme n’ihi ihe dị iche iche ha kweere nakwa n’ihi na ihe na-emetụkarị ha n’ahụ́ ngwa ngwa. Ihe ọzọ gosiri na ndị Ninive chegharịrị n’eziokwu bụ na Jizọs Kraịst mechara kwuo ya. (Gụọ Matiu 12:41.) Ihe Jizọs kwuru doro ya anya n’ihi na ọ nọ n’eluigwe mgbe ahụ ma hụ ka ihe niile ahụ na-eme. (Jọn 8:57, 58) Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị ekwesịghị iche na ndị mmadụ emekataghị chegharịa n’agbanyeghị otú ha bụruru ndị ọjọọ n’anya anyị. Ọ bụ naanị Jehova nwere ike ịhụ ihe dị mmadụ n’obi.

Chineke Na-eme Ebere ma Ụmụ Mmadụ Na-esi Ọnwụ Na-enweghị Isi

10, 11. (a) Olee ihe Jehova mere mgbe ọ hụrụ na ndị Ninive echegharịala? (b) Nke a ọ̀ pụtara na ihe Jehova kpebiri ime ndị Ninive ezighị ezi?

10 Olee ihe Jehova mere mgbe ọ hụrụ na ndị Ninive echegharịala? Jona mechara dee, sị: “Ezi Chineke wee hụ ọrụ ha, na  ha ahapụwo ụzọ ọjọọ ha; ezi Chineke wee gbanwee obi ya banyere ọdachi o kwuru na ya ga-ewetara ha; o wetaghịzi ya.”—Jona 3:10.

11 Nke a ọ̀ pụtara na Jehova chọpụtara na ihe ya kpebiri ime ndị Ninive ezighị ezi? Mba. Baịbụl kwuru na Jehova zuru okè nakwa na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. (Gụọ Diuterọnọmi 32:4.) Naanị ihe merenụ bụ na iwe kwesịrị ekwesị Jehova wesoro ndị Ninive dajụrụ. Ọ hụrụ na ndị ahụ echegharịala ma chọpụta na ahụhụ ahụ ọ chọburu ịta ha ekwesịzighị ekwesị. Ihe Chineke ga-eme ugbu a bụ imere ha ebere.

12, 13. (a) Olee ihe Jehova mechara mee nke gosiri na ọ dị obi ebere ma na-echebara ndị mmadụ echiche? (b) Amụma Jona buru ọ̀ bụ amụma ụgha?

12 Jehova adịghị aka ike, ọ bụghịkwa Chineke obi ọjọọ otú ndị ndú okpukpe na-ekwukarị. Kama nke ahụ, ọ dị obi ebere, na-echebakwara ndị mmadụ echiche. O nwekwara ike ịgbanwe ihe ọ chọrọ ime mgbe ọ dị mkpa ka o mee otú ahụ. O kpebie ịta ndị ajọ omume ahụhụ, ọ na-ebu ụzọ edunye ndị na-anọchite anya ya n’ụwa ka ha dọọ ha aka ná ntị. Ihe kpatara ya bụ na ọ na-achọ ka ndị ajọ omume mee ihe ahụ ndị Ninive mere, ya bụ, ka ha chegharịa ma gbanwee àgwà ha. (Ezik. 33:11) Jehova gwara onye amụma ya bụ́ Jeremaya, sị: “Mgbe ọ bụla m kwuru okwu banyere mba ọ bụla, kwuokwa okwu banyere alaeze ọ bụla, na m ga-efopụ ya, kwatuokwa ya ma bibie ya, mba ahụ wee hapụ ihe ọjọọ ya nke m kwuru na ọ dịghị mma, m ga-agbanwe obi m n’ọdachi ahụ m bu n’obi ime ka ọ dakwasị ya.”—Jere. 18:7, 8.

Chineke chọrọ ka ndị ajọ omume mee ihe ahụ ndị Ninive mere, ya bụ, ka ha chegharịa ma gbanwee àgwà ha

13 Ma nke a ọ̀ pụtara na amụma Jona buru bụ amụma ụgha? Ee e. Amụma ya mezuru ihe mere e ji buo ya, ya bụ, ka a dọọ ndị Ninive aka ná ntị. Ihe mere e ji dọọ ha aka ná ntị bụ n’ihi àgwà ọjọọ ha na-akpa, bụ́ nke ha mechara kwụsị. Ma, ọ bụrụ na ndị Ninive emechaa kpawa àgwà ọjọọ ahụ ha na-akpabu, Chineke ga-eme ha ihe ahụ ọ chọburu ime ha. Ọ bụkwa ihe mechara mee.—Zef. 2:13-15.

14. Olee ihe Jona mere mgbe Jehova meere ndị Ninive ebere?

14 Olee ihe Jona mere mgbe a na-ebibighị Ninive n’oge ọ tụrụ anya ya? Baịbụl gwara anyị, sị: “Ma nke ahụ wutere Jona nke ukwuu, iwe ya wee dị ọkụ.” (Jona 4:1) Ihe Jona kwuru n’ekpere o kpere yidịrị ka ọ̀ bụ mba ka ọ na-abara Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Jona kwuru na ya gaara anọrọ ụwa ya n’obodo ya. Ọ sịrị na ya mabu na Jehova agaghị ebibi Ninive nakwa na ọ bụ ya mere ya ji gbagawa Tashish. Ọ rịọziri Jehova ka o mee ka ya nwụọ, na ọnwụ kaara ya mma.—Gụọ Jona 4:2, 3.

15. (a) Olee ihe ndị ọ ga-abụ ha mere ka obi jọọ Jona njọ? (b) Olee ihe Jehova mere n’oge ahụ iwe na-ewe Jona?

 15 Olee ihe bụ́ nsogbu Jona? Anyị enweghị ike ịmata ihe niile ọ nọ na-eche. Ma, anyị ma na Jona agwala mmadụ niile nọ na Ninive na a ga-ebibi ha. Ha kwetakwara ihe o kwuru. Ma ugbu a, e bibighị Ninive. Ọ̀ ga-abụ na o chere na a ga-akwawa ya emo ma ọ bụ kpọọ ya onye amụma ụgha? N’agbanyeghị ihe ọ nọ na-eche, obi adịghị ya ụtọ na ndị Ninive chegharịrị, Jehova emeere ha ebere. Kama inwe obi ụtọ, o yiri ka obi ọ̀ nọ na-ajọkwu ya njọ, ya ana-emetere onwe ya ebere, na-echekwa na e mechuola ya ihu. Ma, o doro anya na Chineke Jona, bụ́ onye na-eme ebere, ka hụrụ na Jona a iwe na-ewe nwere àgwà ọma ụfọdụ. Kama ịta Jona ahụhụ maka na ọ sọpụrụghị ya, naanị ihe Jehova mere bụ ịjụ ya otu ajụjụ ga-eme ka o chee echiche. Ọ jụrụ ya: “Iwe dị ọkụ ị na-ewe ò ziri ezi?” (Jona 4:4) Jona ọ̀ zara Jehova ajụjụ a? Baịbụl agwaghị anyị.

16. Gịnị ka ụfọdụ ndị na-eche bụ́ nke dị iche n’ihe Chineke na-eche, gịnịkwa ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe mere Jona?

16 Mmadụ nwere ike ikwu ngwa ngwa na Jona abụghị ezigbo mmadụ. Ma anyị kwesịrị icheta na ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, ihe anyị na-achọ mgbe ụfọdụ ka Chineke mee abụghị ihe ọ na-eme. Mgbe e nwere ọdachi, ụfọdụ na-eche na Jehova kwesịrị ime ka ọdachi ahụ ghara ime. Ụfọdụ na-echekwa na Jehova gaara ebibila ndị ajọ omume ma ọ bụkwanụ na o kwesịla ibibi ụwa ọjọọ a kemgbe. Ihe mere Jona na-egosi anyị na mgbe ọ bụla echiche anyị dị iche na nke Jehova Chineke, ọ bụ anyị kwesịrị ịgbanwe echiche anyị, ọ bụghị Chineke.

Otú Jehova Si Kụziere Jona Ihe

17, 18. (a) Gịnị ka Jona mere mgbe ọ hapụrụ Ninive? (b) Olee otú obi dị Jona mgbe Jehova mere ka osisi ogiri ụgba pulite, oleekwa otú obi dị ya mgbe osisi ahụ nwụrụ?

17 Jona a obi na-adịghị mma hapụrụ Ninive, ma ọ lawaghị n’obodo ya. Kama ọ gawara n’ebe ọwụwa anyanwụ bụ́ ebe e nwere ugwu ụfọdụ o nwere ike ịnọ n’elu ha na-ahụ Ninive. O wuuru onwe ya ụlọ ndò ma nọrọ na ya na-ele ihe ga-eme Ninive. O nwere ike ịbụ na ọ ka chere na a ga-ebibi Ninive. Olee otú Jehova ga-esi mee ka nwoke a na-anaghị eme ebere mụta ime ebere?

18 N’abalị, Jehova mere ka osisi ogiri ụgba pulite n’ebe ahụ. Mgbe Jona tetara, ọ hụrụ osisi ahụ akwụkwọ ya sara mbara, hụkwa na osisi ahụ mere ka ụlọ ahụ nwee ezigbo ndò karịa otú ọ dịbu mgbe o wuru ya. Obi tọrọ ya ezigbo ụtọ. “Jona wee malite ịṅụrị ọṅụ nke ukwuu” n’ihi osisi ahụ. O nwere ike ịbụ na  o chere na Chineke ji ya gọzie ya ma gosi ya na ihe ya dị ya mma. Ma, ihe Jehova chọrọ imere Jona abụghị naanị ime ka anwụ ghara ịcha ya na ime ka ọ kwụsị iwe na-enweghị isi ọ na-ewe. Kama ọ chọrọ inweta obi Jona. N’ihi ya, Chineke rụrụ ọrụ ebube ọzọ. O mere ka ọtị tagbuo osisi ahụ. Mgbe osisi ahụ nwụrụ, o mere ka “ifufe dị ọkụ nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ fee” ruo mgbe Jona ‘malitere ịtụbọ’ n’ihi okpomọkụ. Obi malitekwara ịjọ Jona njọ, ya arịọ Chineke ka ya nwụọ.—Jona 4:6-8.

19, 20. Olee otú Jehova si jiri osisi ogiri ụgba mee ka Jona chee echiche?

19 Jehova jụrụ Jona ajụjụ ọzọ. Na nke ugbu a, ọ jụrụ ya ma iwe ọ na-ewe maka osisi ogiri ụgba ahụ ò ziri ezi. Kama ichegharị, Jona ji iwe kwuo na iwe ya na-ewe kwesịrị ekwesị. Ọ sịrị: “Iwe dị ọkụ m na-ewe nke na m chọrọ ịnwụ ziri ezi.” Oge eruola ka Jehova mee ka Jona ghọta ihe ọ chọrọ ịkụziri ya.—Jona 4:9.

Chineke ji osisi ogiri ụgba kụziere Jona ka ọ na-emere ndị ọzọ ebere

20 Chineke gwara Jona okwu mere ka Jona chee echiche. Ọ sịrị Jona na o meteere osisi nkịtị toro n’abalị ebere, bụ́ osisi ọ na-akụghị, nke ọ na-amakwanụghị otú o si too. Chineke jụziri ya: “Ọ̀ bụ na mụ onwe m ekwesịghị imere Ninive bụ́ obodo  ukwu ebere, bụ́ ebe e nwere ihe karịrị otu narị puku mmadụ na puku iri abụọ, bụ́ ndị na-amaghị ma ọlị ihe dị iche n’aka nri ha na aka ekpe ha, n’agụnyeghị ọtụtụ anụ ụlọ?”—Jona 4:10, 11. *

21. (a) Gịnị ka Jehova ji osisi ahụ kụziere Jona? (b) Gịnị ka akụkọ Jona kwesịrị ime ka anyị mee?

21 Ị̀ ghọtara ihe dị mkpa Jehova ji osisi ahụ kụziere Jona? Jona arụghị ọrụ ọ bụla iji lekọta osisi ahụ. Ma, ọ bụ Jehova nyere ndị Ninive ahụ ndụ, ọ bụkwa ya ji ha ndụ otú o ji ndụ ihe niile ọzọ dị n’ụwa. Gịnị mere otu osisi ga-eji dị Jona mkpa karịa ndụ otu narị puku mmadụ na puku iri abụọ, n’agụnyedịghị anụ ụlọ ha niile? Nke a ọ́ pụtaghị na Jona nọ na-eche ihe ga-abara naanị ya uru? A sị ka e kwuwe, ihe mere o ji metere osisi ahụ ebere bụ na ọ baara ya uru. Ihe mere o ji na-ewe iwe na e bibighị Ninive ọ́ bụghị maka na ọ chọghị ka ihere mee ya ma ọ bụ ka a sị na ihe o kwuru emezughị? Akụkọ Jona nwere ike ime ka anyị chebara onwe anyị echiche. Ò nwere onye n’ime anyị na-enweghị mgbe ọ na-achọ ihe ga-abara naanị ya uru? Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịna-ekele Jehova maka otú o si jiri ndidi na-akụziri anyị ka anyị kwụsị ịchọ ihe ga-abara naanị onwe anyị uru, ka anyị na-enwere ndị ọzọ ọmịiko ma na-emekwuru ha ebere otú yanwa na-eme.

22. (a) Olee ihe gosiri na Jona mụtara ihe n’ihe Jehova gwara ya banyere ime ebere? (b) Olee ihe anyị niile kwesịrị ịmụta n’akụkọ a?

22 Ajụjụ bụzi: Jona ọ̀ mụtara ihe n’ihe ahụ a kụziiri ya? Akwụkwọ Jona kwụsịrị n’ajụjụ ahụ Jehova jụrụ Jona. Ụfọdụ ndị nwere ike ikwu na Jona emechaghị zaa ajụjụ ahụ. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na Jona zara ya. Azịza ya bụ akwụkwọ ahụ o dere. E nwere ihe ndị na-egosi na ọ bụ Jona dere akwụkwọ Jona. Weregodị ya na ị na-ahụ onye amụma a mgbe ọ larurula n’obodo ya n’udo ma bido ide akwụkwọ ahụ. Ọ ga-abụ na o mekwuola agadi, marakwuo ihe, dịkwuo umeala n’obi. Ọ ga-abụkwa na ọ na-efufe isi ya ka ọ na-ede ihe ndị o mejọrọ, ya bụ, otú o si nupụ isi na otú o si jụwaa isi imere ndị Ninive ebere. O doro anya na Jona mụtara ihe n’ihe Jehova gwara ya. Jona mụtara ime ebere. Ànyị ga-amụta ime ebere?—Gụọ Matiu 5:7.

^ para. 6 E kwuru na ndị bi na Sameria n’oge Jona dị ihe dị ka puku mmadụ iri abụọ ma ọ bụ karịa, ma ọ bụdị ruo puku mmadụ iri atọ. Nke a pụtara na ndị bi na Sameria eruchaghị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị bi na Ninive. N’oge Ninive na-ewu ewu, o nwere ike ịbụ obodo kacha ukwuu e nwere n’ụwa.

^ para. 8 Ihe a e kwuru banyere anụ ụlọ ha nwere ike iyi ihe na-emeghị eme. Ma, o nweela mgbe ụdị ihe ahụ mere tupu ya emee na Ninive. Hirọdọtọs, bụ́ onye Gris na-akọ akụkọ ihe mere eme, kwuru na mgbe ndị Peshia na-eruru otu ọchịagha ha nwụrụ anwụ uju, ha mere ka anụ ụlọ ha soro ha ruo uju ahụ.

^ para. 20 Mgbe Chineke kwuru na ndị Ninive amaghị ihe dị iche n’aka nri ha na aka ekpe ha, ihe ọ na-ekwu bụ na ha amaghị iwu ya.