Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

 ISI NKE ATỌ

“Nna nke Ndị Niile Nwere Okwukwe”

“Nna nke Ndị Niile Nwere Okwukwe”

1, 2. Olee otú ụwa sirila gbanwee kemgbe oge Noa, oleekwa otú obi dị Ebram?

WEREGODỊ ya na ị na-ahụ Ebram ka o si ebe ọ gara na-ala n’ụlọ ya. O leliri anya elu hụ nnukwu ụlọ arụsị a rụrụ n’obodo ya bụ́ Ọọ. * Mkpọtụ na-eme n’ebe ahụ, anwụrụ ọkụ na-akwụlikwa elu. Ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ arụsị ahụ achụwakwala àjà ọzọ. Ọ bụ chi ọnwa ha na-efe ka ha na-achụrụ ya. Ebram wepụrụ ihu ya n’ebe ahụ ma fufee isi. Onye hụrụ otú ihu dị ya ga-ama na obi adịghị ya mma. Ka o si n’okporo ụzọ ahụ na-ekwo ekwo na-ala, ọ ga-abụ na ihe ọ nọ na-eche bụ otú onye ukwu na onye nta si efe arụsị n’obodo ha a. Kemgbe e nwechara iju mmiri n’oge Noa, ndị mmadụ ji nke nta nke nta fewe arụsị n’ebe niile n’ụwa.

2 Noa nwụrụ mgbe ọ fọrọ naanị afọ abụọ ka a mụọ Ebram. Mgbe oké iju mmiri ahụ tachara, Noa na ezinụlọ ya si n’ụgbọ ahụ pụta ma chụọrọ Jehova Chineke àjà. Jehova mere ka eke na egwurugwu pụta n’ígwé ojii. (Jen. 8:20; 9:12-14) N’oge ahụ, mmadụ niile nọ n’ụwa na-efe naanị Jehova. Ma malite n’oge Noa ruo n’oge Ebram, e nweela ọgbọ iri, ndị mmadụ agbasawakwala n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ndị na-efe Jehova dịzi ole na ole. Ndị mmadụ na-efezi chi dị iche iche. Nna Ebram bụ́ Tira na-efekwa arụsị, ọ ga-abụkwa na ọ na-akpụ arụsị dị iche iche.—Jọsh. 24:2.

Olee ihe mere Ebram ji bụrụ onye e ji okwukwe ya ama atụ?

3. Olee ihe mere Ebram ji dị iche ná ndị ọzọ, oleekwa ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ya?

3 Ma Ebram adịghị ka ndị ọzọ n’ihi na okwukwe o nwere na Chineke mere ka ndụ ya dị iche. Pọl onyeozi mechara si n’ike mmụọ nsọ kwuo na Ebram bụ “nna nke ndị niile nwere okwukwe.” (Gụọ Ndị Rom 4:11.) Ka anyị leba anya n’ihe mere Ebram ji nwee okwukwe otú ahụ.  Anyị ga-amụtakwa otú anyị nwere ike isi mee ka okwukwe anyị sie ike.

Ife Jehova Mgbe Iju Mmiri Gachara

4, 5. Ọ̀ ga-abụ n’aka onye ka Ebram si mata Jehova, gịnịkwa mere anyị ga-eji kwuo otú ahụ?

4 Olee otú Ebram si mụta banyere Jehova Chineke? Anyị ma na e nwere ndị na-efe Jehova n’ụwa n’oge ahụ. Shem bụ otu n’ime ha. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị ya bụ dịọkpara Noa, ma a na-ebukarị ụzọ akpọ ya aha tupu a kpọọ ụmụnne ya abụọ ndị ọzọ. Ọ ga-abụ na ihe kpatara ya bụ na Shem nwere ezigbo okwukwe na Chineke. * Obere oge e nwechara iju mmiri ahụ, Noa kpọrọ Jehova “Chineke Shem.” (Jen. 9:26) Shem kwanyeere Jehova ùgwù, jirikwa ofufe Chineke kpọrọ ihe.

5 Ebram ọ̀ ma Shem? O nwere ike ịbụ na ọ ma ya. Weregodị ya na ị na-ahụ Ebram mgbe ọ bụ nwata. Obi ga-atọ ya ezigbo ụtọ ịnụ na e nwere otu n’ime ndị nna nna ya ka dị ndụ nke nọrọla ihe karịrị narị afọ anọ. Shem nọ ndụ hụ ihe ọjọọ niile mere tupu oké iju mmiri ahụ, hụkwa oké iju mmiri ahụ e ji kpochapụ ndị ajọ omume na otú ndị mmadụ si malitekwa ịmụba n’ụwa. Ọ hụkwara otú Nimrọd na ndị òtù ya si nupụrụ Chineke isi ma na-ewu nnukwu ụlọ elu na Bebel. Ebe Shem bụ onye ezi omume, o soghị ha nupụrụ Chineke isi. Ọ bụ ya mere na mgbe Jehova ghagburu asụsụ ndị na-ewu ụlọ elu ahụ, Shem na ezinụlọ ya ka nọ na-asụ asụsụ ha, ya bụ, asụsụ mbụ e nwere n’ụwa, nke Noa sụkwara. Ebram sokwa ná ndị sụrụ asụsụ ahụ. N’ihi ya, o doro anya na Ebram ejighị Shem egwu egwu. Ihe ọzọkwa bụ na Shem na Ebram dịkọrọ ndụ ọtụtụ afọ tupu Shem anwụọ. N’ihi ya, ọ ga-abụ na Ebram si n’aka Shem mata banyere Jehova.

Ebram efeghị arụsị n’agbanyeghị na onye ukwu na onye nta na-efe arụsị n’obodo ya

6. (a) Olee otú Ebram si gosi na ihe mere n’oge iju mmiri kụziiri ya ihe? (b) Olee ihe Ebram na Seraị ji ndụ ha na-eme?

6 Ma Ebram ò si n’aka Shem mata banyere Jehova ma ò si n’aka onye ọzọ, ihe mere n’oge iju mmiri kụziiri ya ihe. Ọ gbalịrị iso Chineke jee ije otú Noa mere. Ọ bụ ya mere o ji jụ iso ndị bi n’obodo Ọọ na-efe arụsị n’agbanyeghị na o nwekwara ike ịbụ na nne na nna ya na ụmụnne ya na-efekwa arụsị n’oge ahụ. Ma ọ lụtara ezigbo nwaanyị. Aha nwaanyị ahụ bụ Seraị. * Ọ bụ asampete. Ma nke ka nke bụ na Seraị  nwere ezigbo okwukwe na Jehova. Ọ bụ eziokwu na Ebram na Seraị amụtabeghị nwa, o doro anya na obi na-atọ ha ụtọ na ha abụọ na-efe Jehova. Ha kpọọrọ Lọt bụ́ nwa nwanne Ebram ka ha na ya biri. N’oge ahụ, nne na nna Lọt anwụọla.

7. Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị isi ṅomie Ebram?

7 O nweghị mgbe Ebram hapụrụ Jehova gaa fewe chi ọzọ n’obodo Ọọ. Ya na Seraị ji obi ha niile kpebie na ha agaghị eso ndị obodo ha na-efe arụsị. Ọ bụrụ na anyị chọkwara inwe ezigbo okwukwe, anyị kwesịrị iji obi anyị niile mee ka ha. Anyị kwesịrị iji obi anyị kpebie na anyị ga-adị iche n’ebe ndị ọzọ nọ. Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya “abụghị nke ụwa” nakwa na nke a ga-eme ka ụwa kpọọ ha asị. (Gụọ Jọn 15:19.) Ọ bụrụ na ndị ezinụlọ unu ma ọ bụ ndị obodo unu ajụ gị maka na i kpebiri ife Jehova, cheta na o nweekwala ndị ọ dị ka ọ dị gị. Ihe ọ pụtara bụ na gị na Chineke so na-eje ije otú Ebram na Seraị mere.

‘Si n’Ala Gị Kwapụ’

8, 9. (a) Gịnị ka Ebram hụrụ otu ụbọchị nke ọ na-agaghị echefu echefu? (b) Gịnị bụ ozi Jehova ziri ya?

8 O nwere ihe mere otu ụbọchị nke Ebram na-agaghị echefu echefu. Jehova Chineke ziri ya ozi. Baịbụl agwachaghị anyị otú Ebram si nata ozi ahụ, ma ọ gwara anyị na “Chineke nke ebube” pụtara ìhè n’ihu ya. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 7:2, 3.) O nwere ike ịbụ mmụọ ozi ka Chineke si n’aka ya mee ka Ebram hụpere ebube Chineke bụ́ Ọkaakaa eluigwe na ụwa. N’eziokwu, obi tọrọ Ebram ezigbo ụtọ mgbe ọ hụrụ na e nwere ezigbo ọdịiche dị n’etiti Chineke dị ndụ na arụsị dị iche iche ndị oge ya na-efe.

9 Gịnị bụ ozi Jehova ziri Ebram? Jehova gwara ya, sị: “Si n’ala gị, n’etiti ndị ikwu gị, kwapụ gaa n’ala m ga-egosi gị.” Jehova akpọrọghị ya ala ọ bụ aha. Naanị ihe o kwuru bụ na ya ga-egosi ya ala ahụ. Ma, Ebram ga-ebugodị ụzọ hapụ obodo ya, hapụkwa ndị ikwu ya. N’obodo Ọọ na obodo ndị gbara ya gburugburu, ndị mmadụ anaghị eji ndị ezinụlọ ha egwuri egwu. A na-ewere onye hapụrụ ndị ikwu ya kwaga n’ebe dị anya ka onye ihe ọjọọ mere. Ụfọdụ na-ewere ya na ọ kaara ha mma ịnwụ anwụ kama ime otú ahụ.

10. Gịnị mere na ọ dịrịghị Ebram na Seraị mfe ịhapụ obodo ha bụ́ Ọọ?

10 Ọ dịrịghị Ebram mfe ịhapụ obodo ya. Ọọ bụ nnukwu obodo nke ọtụtụ ndị bi na ya bara ọgaranya. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ  “Obodo Ebram na Seraị Hapụrụ.”) Ihe ndị e gwupụtara n’ala na-egosi na e nwere ụlọ ndị mara ezigbo mma n’obodo Ọọ oge ochie. Ụfọdụ ụlọ ndị ahụ nwere ọnụ ụlọ iri na abụọ ma ọ bụ karịa bụ́ ebe ezinụlọ na ndị ohu ha na-ehi ụra. Ọnụ ụlọ ndị ahụ gbara mbara èzí ha gburugburu. E jikwa ihe dị ka ụrọ tee mbara èzí ndị ahụ. Ihe ndị e gwupụtara  n’ala gosikwara na e nwegasịrị ebe e si agbata mmiri ọṅụṅụ n’obodo ahụ, nweekwa ụlọ mposi dị iche iche, nakwa ihe dị ka ọwa mmiri bụ́ ebe mmiri na-adịghị ọcha na-esi asọpụ n’obodo. Chetakwa na Ebram na Seraị akatala ahụ́. Ebram akarịala afọ iri asaa, nwunye ya akarịakwala afọ iri isii. O doro anya na Ebram chọrọ ilekọta nwunye ya nke ọma, ọ chọghịkwa ka nwunye ya taa ahụhụ otú nwoke ọ bụla hụrụ nwunye ya n’anya na-agaghị achọ ka nwunye ya taa ahụhụ. Weregodị ya na ị na-ahụ ka ha nọ na-ekwurịta gbasara ihe ahụ Chineke gwara Ebram nakwa ihe ndị na-agbata ha n’obi na ihe ndị na-enye ha nsogbu n’obi banyere njem ahụ. O doro anya na obi tọrọ Ebram ezigbo ụtọ na Seraị kwetara ka ha gawa. O ji obi ya kweta ịhapụ ihe ọma niile e nwere n’obodo Ọọ ma soro di ya gawa ebe Chineke ga-agwa ha.

11, 12. (a) Olee ihe ụfọdụ ọ ga-abụ na Ebram na Seraị kpebiri tupu ha ahapụ Ọọ, oleekwa otú ha si kwadebe ọpụpụ ha? (b) Olee otú i nwere ike isi kọwaa ihe ndị mere n’ụbọchị ha hapụrụ Ọọ?

11 Ugbu a Ebram na Seraị kpebiri ịhapụ Ọọ, ọrụ ga-ezu ha ahụ́. Ha ga-akwakọta ngwongwo ndị ha ga-ebu apụ. Ma olee ihe ndị ha ga-eburu, oleekwanụ ndị nke ha ga-ahapụ, ebe ha na-amaghị ebe ha na-aga? Ma ihe kacha enye ha nsogbu ugbu a bụ ihe ha ga-eme ndị ezinụlọ ha. Olee ihe ha ga-eme Tira, ebe ọ bụ na o meela agadi? Ha kpebiri na ha ga-akpọrọ ya lekọtawa ruo mgbe ọ ga-anwụ. Ọ ga-abụkwa na Tira ji obi ya kweta iso ha gaa n’ihi na Baịbụl kọrọ na ọ bụ ya kpọ ezinụlọ ya si Ọọ pụọ. Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụ ya bụ onyeisi ezinụlọ ya. O doro anya na Tira akwụsịla ife arụsị mgbe ahụ. Lọt ga-esokwa ha aga.—Jen. 11:31.

12 Ụbọchị ha ga-apụ mechara ruo. Weregodị ya na ị na-ahụ ka ha niile si n’obodo Ọọ ahụ mgbidi gbara gburugburu na-apụtasị n’ihu obodo ha. Ma kamel ha ma ịnyịnya ibu ha bucha ibu. Ha chịpụtakwara anụ ụlọ ha. Ndị ohu ha pụtachakwara. Ha niile ejikerela ịpụ. * Ọ ga-abụ na mmadụ niile na-ele Ebram anya n’ọnụ ka ọ gwa ha na oge eruola ka ha gawa. N’ikpeazụ, Ebram gwara ha ka ha pụwa, ha niile apụọ. Otú a ka ha si hapụ Ọọ kpamkpam.

13. Olee otú ọtụtụ ndị ohu Jehova taa si eme ụdị ihe ahụ Ebram na Seraị mere?

13 Taa, e nwere ọtụtụ ndị ohu Jehova ndị na-aga n’ebe a chọrọ ọtụtụ ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. E nwekwara ndị na-amụ asụsụ ọhụrụ ka ha nwee ike ikwusakwuru ọtụtụ ndị ozi ọma. Ha nwekwara ike ime ihe ụfọdụ na-agaghị adịrị ha mfe omume ka ha nwee ike kwusaara ọtụtụ ndị ozi ọma. Ndị na-eme ụdị ihe a nwekwara ọtụtụ ihe ha na-ahapụ. E kwesịrị ịja ha mma na ha mere ka Ebram na Seraị. Ọ bụrụ na anyị emee ụdị ihe a, Jehova ga-akwụghachi anyị karịadị ihe anyị mefuru ma ọ bụ ihe ndị anyị hapụrụ. Ọ naghị agbawa ndị  nwere okwukwe aka. (Hib. 6:10; 11:6) Ma, Jehova ọ̀ kwụrụ Ebram ụgwọ ọrụ?

Ha Gafere Osimiri Yufretis

14, 15. Olee otú isi obodo Ọọ gaa Heran dị, ọ̀ ga-abụkwa gịnị mere Ebram hà ji biri na Heran ruo oge ụfọdụ?

14 Ka oge na-aga, nkwagharị nkwagharị bịara mara Ebram na ndị ya na ha so ahụ́. Weregodị ya na ị na-ahụ Ebram na Seraị ka ha na-aga. Ha jiri ụkwụ gatụ, ha agbatụ ịnyịnya ibu ma ọ bụ kamel. Ka ha na-akọrị akụkọ na-aga, ha na-anụkwa ụda mgbịrịgba ndị ha kenyere n’ahụ́ anụmanụ ha. Ndị a ime njem na-edobughị anya ji nke nta nke nta mụta ịma ụlọikwuu n’ebe ọ bụla ha chọrọ ịkwụsịtụ n’ụzọ, mụtakwa ịkwali mgbe ọ bụla ha chọrọ ịpụ. Ikugoro Tira n’elu kamel ma ọ bụ n’elu ịnyịnya ibu na ikuda ya bịakwara mara ha ahụ́. Ha chere ihu n’ebe ugwu ma soro akụkụ Osimiri Yufretis na-aga. Ha gara ije ọtụtụ izu ruo mgbe ha gatere aka.

15 Mgbe ha gara ihe karịrị narị kilomita itoolu na iri isii, ha rutere obodo Heran. Ndị bi na Heran bara ọgaranya, ha nwekwara ụlọ ndị e ji ájá rụọ elu ha okirikiri. Ndị ahịa ndị na-aga n’ebe ọwụwa anyanwụ ma ọ bụ n’ebe ọdịda anyanwụ na-esi na Heran agafe. Ọ bụ n’ebe a ka Ebram na ezinụlọ ya kwụsịrị, ha bikwara ebe a ruo oge ụfọdụ. O nwere ike ịbụ na ike adịkwaghị Tira iso ha gatụkwuo.

16, 17. (a) Olee ọgbụgba ndụ Ebram na Chineke gbara nke mere Ebram obi ụtọ? (b) Olee otú Jehova si gọzie Ebram n’oge ọ nọ na Heran?

 16 Tira mechara nwụọ mgbe ọ gbara narị afọ abụọ na ise. (Jen. 11:32) N’oge ahụ Ebram na-eru uju ọnwụ nna ya, Jehova gwara Ebram okwu ọzọ. Ihe Jehova gwara ya kasikwara ya obi. Jehova gwaghachiri ya ihe ọ gwara ya mgbe ọ nọ n’obodo Ọọ ma kwekwuo ya nkwa n’elu nke o kwere ya. Ọ gwara Ebram na ọ ga-aghọ “mba ukwu,” nakwa na a ga-agọzi ezinụlọ niile dị n’ụwa n’ihi ya. (Gụọ Jenesis 12:2, 3.) Ọgbụgba ndụ a ya na Chineke gbara mere ya obi ụtọ, ya amata na oge ọ ga-eji akwapụ na Heran eruola.

17 Ma, na nke ugbu a ha na-akwapụ, ngwongwo ha ga-akwakọrọ ebukwuola ibu n’ihi na Jehova gọziri Ebram n’oge ahụ ha nọ na Heran. Baịbụl kwuru na ha buuru “akụ̀ niile ha kpatara, durukwa mkpụrụ obi ha nwetara na Heran.” (Jen. 12:5) Ọ bụrụ na Ebram ga-aghọ mba, ọ ga-enwe akụnụba, nweekwa ọtụtụ ndị ozi, ya bụ, ọ ga-enwe nnukwu ezinụlọ. Ọ bụghị mgbe niile ka Jehova na-eme ka ndị ohu ya baa ọgaranya, ma ọ na-enye ha ihe niile ga-enyere ha aka ka ha nwee ike ife ya. Ebram duuru ha gawa n’agbanyeghị na ọ maghị ebe ọ na-aga.

Ọ dịrịghị Ebram na Seraị mfe ịhapụ Ọọ bụ́ obodo e nwere ọtụtụ ihe ọma na ya

18. (a) Olee mgbe Ebram mere otu ihe dị mkpa nke gbasara ndị Chineke? (b) Olee ihe ndị ọzọ dị mkpa mechara mee n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan mgbe ọtụtụ afọ gafere? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ụbọchị Dị Mkpa n’Akụkọ Baịbụl.”)

18 Mgbe ha si Heran gaa njem abalị ole na ole, ha rutere Kakemish. Ọ bụ n’obodo Kakemish ka ndị njem na-esikarị agafe Osimiri Yufretis. Ọ ga-abụ n’ebe a ka Ebram mere otu ihe dị mkpa nke gbasara ndị Chineke. Ọ kpọ ndị ya na ha so gafee Osimiri Yufretis. Ụbọchị ọ gafere osimiri ahụ bụ abalị iri na anọ n’ọnwa e mechara kpọwa ọnwa Naịsan n’afọ 1943 Tupu Oge Ndị Kraịst. (Ọpụ. 12:40-43) Ala ahụ Jehova kwere nkwa inye Ebram malitere n’ebe ndịda Kakemish gbadawa. Ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka ọgbụgba ndụ Chineke na Ebram gbara malitere.

19. Gịnị ka Jehova kwuru mgbe ọ na-ekwe Ebram nkwa, gịnịkwa ka nke ahụ nwere ike ichetara Ebram?

19 Ebram na ndị so ya si n’ebe ahụ gbadawa n’ebe ndịda, ha kwụsịkwara n’ebe dị nso n’osisi ukwu nke More. Ebe a dị nso na  Shikem. Jehova gwara Ebram okwu ọzọ n’ebe a. Na nke ugbu a, Chineke gwara Ebram na ọ bụ mkpụrụ ya, ma ọ bụ nwa ya, ga-enweta ala ahụ. Mgbe Chineke gwara Ebram ihe a, Ebram ò chetara amụma Jehova buru n’Iden nke bụ́ na e nwere “mkpụrụ” nke ga-anapụta ụmụ mmadụ otu ụbọchị? (Jen. 3:15; 12:7) O nwere ike ịbụ na o chetara ya. Ọ ga-abụkwa na o bidoro mgbe ahụ ghọtatụwa na ya ga-eso ná ndị ga-emezu ihe ahụ Jehova kwuru.

20. Olee otú Ebram si gosi na obi dị ya ụtọ maka ihe ọma ndị Jehova kwere ya ná nkwa?

20 Obi tọrọ Ebram ụtọ maka ihe ndị Jehova kwere ya ná nkwa. Ka Ebram na-agagharị n’ala ahụ, ọ kwụsịrị wuoro Jehova ebe ịchụàjà. O wuru nke mbụ n’ebe dị nso n’osisi ukwu nke More, wuo nke abụọ n’ebe dị nso na Betel. Ọ ga-abụ na o ji akọ na-agagharị n’ala ahụ n’ihi na o doro anya na ndị Kenan ka bi na ya mgbe ahụ. Ebram kpọkukwara aha Jehova. Ọ ga-abụ na ihe nke a pụtara bụ na o ji obi ya niile kelee Jehova mgbe ọ na-eche echiche banyere ihe Chineke ga-emere mkpụrụ ya n’ọdịnihu. O nwekwara ike ịbụ na ọ kọọrọ ndị Kenan bi ya nso banyere Jehova. (Gụọ Jenesis 12:7, 8.) Ma a ka nwere ọtụtụ nsogbu ndị ga-abịara Ebram. Nke bụ́ eziokwu bụ na Ebram ewepụla obi ya n’ihe niile ọ hapụrụ n’obodo Ọọ. Obi ya dịzi n’ihe ndị Jehova kwere ya ná nkwa. Ndị Hibru 11:10 kwuru banyere Ebram, sị: “Ọ nọ na-echere obodo ahụ nke nwere ezi ntọala, bụ́ obodo nke ọ bụ Chineke bụ onye wuru ma mee ya.”

21. Olee ihe ndị anyị ma banyere Alaeze Chineke bụ́ ndị Ebram na-amaghị, gịnịkwa ka i kpebiri ime?

21 Anyị ndị na-efe Jehova taa ma ọtụtụ ihe banyere obodo ahụ Ebram nọ na-echere karịa Ebram. Anyị ma na obodo ahụ bụ Alaeze Chineke, marakwa na Alaeze ahụ na-achị achị n’eluigwe, nakwa na ọ ga-ebibi ụwa ajọ omume a. Anyị makwa na Mkpụrụ Ebram ahụ e kwere ná nkwa kemgbe bụ Jizọs Kraịst, onye na-achị ugbu a n’Alaeze ahụ. Ọ ga-abụrụ anyị ihe obi ụtọ ịhụ mgbe a ga-akpọlite Ebreham n’ọnwụ. N’oge ahụ, Ebreham ga-ahụ otú Jehova si mezuchaa uche ya bụ́ ndị ọ na-aghọtachaghị n’oge ọ nọ ndụ. Ị̀ ga-achọ ịhụ mgbe Jehova ga-emezu ihe niile o kwere ná nkwa? Ya bụrụ otú ahụ, na-eme ka Ebram. Na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị ihe ọ bụla ọ ga-efu gị. Na-erubere ya isi ma na-ekele ya n’ekpere maka ọrụ ndị o nyere gị ná nzukọ ya. Ọ bụrụ na i ṅomie okwukwe Ebram, ọ ga-aghọkwa nna gị n’ihi na ọ bụ “nna nke ndị niile nwere okwukwe.”

^ para. 1 Chineke mechara gụgharịa Ebram aha, aha ya abụrụzie Ebreham. Ebreham pụtara “Nna Ìgwè Mmadụ.”—Jen. 17:5.

^ para. 4 Otú ahụ ka ọ dịkwa Ebram. A na-ebukarị ụzọ akpọ ya aha tupu a kpọọ ụmụnne ya ndị nwoke ndị ọzọ n’agbanyeghị na ọ bụghị ya bụ diọkpara.

^ para. 6 Chineke mechara gụgharịa Seraị aha. Aha ọ kpọziri ya bụ Sera, nke pụtara “Nne Ndị Eze.”—Jen. 17:15.

^ para. 12 Ụfọdụ ndị ọkà mmụta ekwetaghị na kamel so n’anụ ndị mmadụ na-akpa n’oge Ebram. Ma ihe ndị ha kwuru mere na ha ekwetaghị erijughị afọ. Ọtụtụ ebe na Baịbụl kwuru na kamel so n’anụmanụ Ebram nwere.—Jen. 12:16; 24:35.