Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ṅomie Okwukwe Ha

Olee otú ịmụ gbasara ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị nwere okwukwe a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl nwere ike isi baara anyị uru?

Afọ Ihe Ndị A Kọrọ Akụkọ Ha Mere

Map ndị a na afọ ihe ndị a kọrọ akụkọ ha n’akwụkwọ a mere ga-enyere gị aka ịghọta mgbe ndị a nwere okwukwe a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl dịrị ndụ nakwa ebe ndị ha biri.

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Òtù Na-achị Isi na-agba onye ọ bụla ume ka ọ gụọ akwụkwọ a ma mụọ ya nakwa ka ya na ndị ezinụlọ mee otú ya gụọ.

Okwu Mmalite

Baịbụl kọrọ akụkọ ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nwere okwukwe. Olee otú ihe anyị ga-amụta n’aka ha ga-esi baara anyị uru?

EBEL

‘Ọ Na-ekwu Okwu, Ọ Bụ Ezie na Ọ Nwụrụ Anwụ’

Olee ihe anyị nwere ike ịmụta banyere Ebel na okwukwe ya ebe ọ bụ na Baịbụl ekwughị ọtụtụ ihe banyere ya?

NOA

O “So Ezi Chineke Jee Ije”

Gịnị mere na ọ dịrịghị Noa na nwunye ya mfe mgbe ha na-azụlite ụmụ ha? Olee otú ụgbọ ahụ ha wuru si gosi na ha nwere okwukwe?

EBREHAM

“Nna nke Ndị Niile Nwere Okwukwe”

Olee otú Ebreham si gosi na o nwere okwukwe? Olee ụzọ ndị ị chọrọ isi ṅomie okwukwe Ebreham?

RUT

“Ebe Ị Gara Ka M Ga-aga”

Gịnị mere Rut ji hapụ ndị ezinụlọ ya nakwa obodo ya? Olee àgwà ndị o nwere bụ́ ndị mere ka Jehova hụ ya n’anya?

RUT

“Ezigbo Nwaanyị”

Olee ihe mere ọlụlụ Rut na Boaz lụrụ ji pụọ iche? Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Rut na Neomi banyere ezinụlọ?

HANA

Ọ Gwara Chineke Obi Ya n’Ekpere

Okwukwe Hana nwere na Jehova nyeere ya aka idi nsogbu yiri ihe ọ na-agaghị edili.

SAMUEL

O “Wee Na-eto n’Ebe Jehova Nọ”

Gịnị mere ndụ Samuel ji pụọ iche mgbe ọ bụ nwata? Gịnị mere ka okwukwe ya sie ike mgbe ọ nọ n’ụlọikwuu?

SAMUEL

Ọ Tachiri Obi n’Agbanyeghị na Ihe Agaghị Otú Ọ Tụrụ Anya Ya

Ihe na-esiri anyị niile ike mgbe ụfọdụ, ihe ndị anyị na-atụghị anya ha na-abịara anyị nwekwara ime ka okwukwe anyị daa mba. Gịnị ka anyị ga-amụta n’otú Samuel si tachie obi?

ABIGEL

Ọ Kpara Àgwà Onye Nwere Ezi Uche

Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe Abigel mere n’agbanyeghị na di ọ lụrụ bụ onye ọjọọ?

ỊLAỊJA

Ọ Gbachiteere Ofufe Chineke

Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Ịlaịja mgbe anyị na ndị na-ekweghị n’ihe Baịbụl kwuru na-ekwurịta okwu?

ỊLAỊJA

O Cheere Jehova

Olee otú Ịlaịja onye amụma si gosi na ọ na-ekpe ekpere mgbe niile mgbe ọ na-eche ka Jehova mezuo nkwa ya?

ỊLAỊJA

Chineke Ya Kasiri Ya Obi

Olee ihe ndị mere ka ike ụwa gwụ Ịlaịja nke na ọ rịọrọ Chineke ka ya nwụọ?

JONA

Ọ Mụtara Ihe n’Ihe Ndị O Mejọrọ

Ò nwetụla mgbe e nyere gị ọrụ ya adị gị ka ị gaghị arụli ya otú ahụ ọ dị Jona? Akụkọ Jona na-akụziri anyị ezigbo ihe gbasara otú Jehova si enwere anyị ndidi ma na-emere anyị ebere.

JONA

Ọ Mụtara Ime Ebere

Olee otú akụkọ Jona nwere ike isi nyere anyị aka ka anyị chebara onwe anyị echiche?

ESTA

Ọ Gbachiteere Ndị Chineke

Ọ bụ inwe okwukwe na ịkata obi ga-eme ka ọ hụ onye ọzọ n’anya nke na o nwere ike ịnwụchitere onye ahụ.

ESTA

Nwaanyị Obi Kara, nke Na-achọghịkwa Ihe Ga-abara Naanị Ya Uru

Olee ihe Esta mere nke gosiri na ọ chọrọ ihe ga-adị ma Jehova ma ndị na-efe Jehova mma?

MERI

“Lee! Abụ M Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”

Olee otú ihe Meri gwara mmụọ ozi Gebriel si gosi na o nwere okwukwe? Olee àgwà ndị ọzọ Meri kpara?

MERI

Ọ Nọ Na-eche ‘Ihe Ihe Ndị ahụ Pụtara’

Ihe ndị mere mgbe Meri gara Betlehem mere ka okwukwe ya sie ike na Jehova ga-emezu nkwa ndị o kwere.

JOSEF

O Chebere Ezinụlọ Ya, Gbooro Ha Mkpa Ha ma Rubere Chineke Isi Ruo Ọnwụ

Olee otú Josef si chebe ndị ezinụlọ ya? Gịnị mere o ji kpọrọ Meri na Jizọs gaa Ijipt?

MATA

“Ekwerewo M”

Olee otú Mata si gosi na o nwere ezigbo okwukwe n’oge ya na nwanna ya na-eru uju?

PITA

O Kweghị Ka Ụjọ na Obi Abụọ Mee Ka Ọ Kwụsị Iso Kraịst

Obi abụọ nwere ike imebiri mmadụ ihe. Pita kwụsịrị inwe obi abụọ ma ọ̀ ga-abụlikwa onye na-eso ụzọ Jizọs.

PITA

Ọ Kwụsiri Ike Mgbe Ọnwụnwa Bịaara Ya

Olee otú okwukwe Pita na otú o si kwụsie ike n’ebe Jizọs nọ si nyere ya aka ịnabata ndụmọdụ Jizọs nyere ya?

PITA

Jizọs Kụziiri Ya Ihe Bụ́ Ịgbaghara Mmadụ Mmehie

Gịnị ka Jizọs kụziiri Pita gbasara ịgbaghara mmadụ mmehie? Olee otú Jizọs si gosi na ọ gbagharala Pita?

Okwu Mmechi

Olee otú ị ga-esi eme ka okwukwe gị na-esi ike, meekwa ka i nwee olileanya?