Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

ISI NKE IRI NA ISE

Ofufe Chineke Na-anakwere

Ofufe Chineke Na-anakwere

Ọ̀ bụ okpukpe nile na-amasị Chineke?

Olee otú anyị pụrụ isi mata ezi okpukpe ahụ?

Ole ndị na-efe Chineke ezi ofufe n’ụwa taa?

JEHOVA CHINEKE na-eche nnọọ banyere anyị, ọ chọkwara ka anyị na-erite uru ná nduzi ịhụnanya ya. Ọ bụrụ na anyị efee ya n’ụzọ ziri ezi, anyị ga-enwe obi ụtọ ma zere ọtụtụ nsogbu ndị a na-enwe ná ndụ. Ọ ga-agọzikwa anyị ma nyere anyị aka. (Aịsaịa 48:17) Otú ọ dị, e nwere ọtụtụ narị okpukpe ndị na-azọrọ na ha na-akụzi eziokwu banyere Chineke. Ma ha na-akụzi ihe dịgasị iche iche banyere onye Chineke bụ na ihe ọ na-atụ anya ya n’aka anyị.

2 Olee otú ị ga-esi mara ụzọ ziri ezi isi fee Jehova? Ọ dịghị mkpa ka ị mụọ banyere ozizi nke okpukpe nile ma jiri ozizi nke otu okpukpe tụnyere ibe ya. Nanị ihe dị mkpa ka i mee bụ ịmụ ihe Bible na-akụzi n’ezie banyere ezi ofufe. Iji maa atụ: N’ọtụtụ ala, a na-enwe ego kanta. Ọ bụrụ na e nye gị ọrụ ịchọpụta ego ọjọọ ndị dị otú ahụ, olee otú ị ga-esi rụọ ya? Ọ̀ ga-abụ site n’iburu ọdịdị nke ụdị ego kanta ọ bụla n’isi? Ee e. Ọ ga-aka aba uru ma ọ bụrụ na ị mụọ banyere ezigbo ego. Mgbe ị matasịrị otú ezigbo ego na-adị, ị ga-enwezi ike ịkọta ego kanta. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị achọpụta otú e si amata ezi okpukpe, anyị ga-enwe ike ịmata ndị nke bụ́ okpukpe ụgha.

3 Ọ dị mkpa ka anyị fee Jehova n’ụzọ ọ na-anakwere. Ọtụtụ ndị kweere na okpukpe nile na-amasị Chineke, ma Bible adịghị akụzi nke ahụ. Mmadụ ịzọrọ na ya bụ Onye Kraịst abụghịdị ebe okwu biri. Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-aba n’alaeze nke eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme uche Nna m nke nọ n’eluigwe ga-aba.” N’ihi ya, iji bụrụ ndị Chineke na-anakwere, anyị aghaghị ịmata ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme ma na-eme ya. Jizọs kpọrọ ndị na-adịghị eme uche Chineke “ndị ọrụ mmebi iwu.” (Matiu 7:21-23) Okpukpe ụgha abaghị uru ọ bụla otú ahụ ego kanta na-abaghị uru ọ bụla. Nke kadị njọ bụ na okpukpe dị otú ahụ na-ebibi ihe n’ezie.

4 Jehova na-enye onye ọ bụla nọ n’ụwa ohere nke ịdị ndụ ebighị ebi. Otú ọ dị, iji dị ndụ ebighị ebi na Paradaịs, anyị aghaghị ife Chineke n’ụzọ kwesịrị ekwesị ma na-ebi ndụ ugbu a n’ụzọ ọ na-anakwere. Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị adịghị eme otú ahụ. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo, sị: “Sinụ n’ọnụ ụzọ ámá dị warara banye; n’ihi na okporo ụzọ nke na-eduba ná mbibi sara mbara ma dị obosara, ndị na-esikwa na ya abanye dị ọtụtụ; ma ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ dị warara, okporo ụzọ ya dịkwa mkpagide, ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.” (Matiu 7:13, 14) Ezi okpukpe na-eduba ná ndụ ebighị ebi. Okpukpe ụgha na-eduba ná mbibi. Jehova achọghị ka e bibie mmadụ ọ bụla, ọ bụkwa ya mere o ji na-enye ndị mmadụ n’ebe nile ohere ka ha mata banyere Ya. (2 Pita 3:9) Ya mere, otú anyị si efe Chineke pụrụ iwetara anyị ndụ ma ọ bụ ọnwụ.

OTÚ E SI AMATA EZI OKPUKPE AHỤ

5 Olee otú a pụrụ isi chọta ‘ụzọ na-eduba ná ndụ’? Jizọs kwuru na ezi okpukpe ga-apụta ìhè ná ndụ nke ndị na-ekpe ya. “Unu ga-amata ha site ná mkpụrụ ha,” ka o kwuru. “Osisi ọma ọ bụla na-amị ezi mkpụrụ.” (Matiu 7:16, 17) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, a ga-amata ndị na-ekpe ezi okpukpe site na nkwenkwe nakwa n’àgwà ha. Ọ bụ ezie na ha ezughị okè ma na-emehie ihe, dị ka otu ìgwè, ndị na-efe ezi ofufe na-agbalị ime uche Chineke. Ka anyị tụlee ihe isii e ji amata ndị na-ekpe ezi okpukpe.

NDỊ NA-EFE EZI CHINEKE AHỤ

  • na-ezi ihe ndị sitere na Bible
  • na-efe nanị Jehova, na-emekwa ka a mara aha ya
  • na-enwe ezi ịhụnanya n’ebe ibe ha nọ
  • na-anakwere Jizọs dị ka onye Chineke ji azọpụta anyị
  • abụghị akụkụ nke ụwa
  • na-ekwusa Alaeze Chineke dị ka nanị olileanya dịịrị ụmụ mmadụ
Ndị mmadụ si n’agbụrụ dị iche iche na-efe Chineke ofufe

6Ozizi ndị ohu Chineke na-adabere na Bible. Bible n’onwe ya na-ekwu, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie, maka inye ọzụzụ n’ezi omume, ka onye nke Chineke wee ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu maka ezi ọrụ ọ bụla.” (2 Timoti 3:16, 17) Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ, sị: “Mgbe unu natara okwu Chineke, bụ́ nke unu nụrụ n’ọnụ anyị, unu nakweere ya, ọ bụghị dị ka okwu ụmụ mmadụ, kama, dị nnọọ ka ọ bụ n’eziokwu, dị ka okwu Chineke.” (1 Ndị Tesalonaịka 2:13) N’ihi ya, nkwenkwe na ihe omume nke ezi okpukpe adịghị adabere n’echiche ma ọ bụ n’omenala mmadụ. Ha na-adabere n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible.

7 Jizọs Kraịst setịpụrụ ezi ihe nlereanya site n’ime ka ozizi ya dabere n’Okwu Chineke. Mgbe ọ na-ekpegara Nna ya nke eluigwe ekpere, ọ sịrị: “Okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Jizọs kwere n’Okwu Chineke, ihe nile ọ kụziri kwekọkwara n’Akwụkwọ Nsọ. Jizọs na-ekwukarị, sị: “E dere, sị.” (Matiu 4:4, 7, 10) Jizọs kwusịa nke ahụ ya ehota otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ. N’otu aka ahụ, ndị Chineke taa adịghị akụzi echiche nke onwe ha. Ha kweere na Bible bụ Okwu Chineke, ha na-emekwa ka ozizi ha na-adabere nnọọ n’ihe o kwuru.

8Ndị na-ekpe ezi okpukpe ahụ na-efe nanị Jehova, ha na-emekwa ka a mara aha ya. Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa nanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.” (Matiu 4:10) N’ihi ya, ọ dịghị onye ọzọ ndị ohu Chineke na-efe ma ọ bụghị Jehova. Ofufe a na-agụnye ime ka ndị mmadụ mara aha ezi Chineke ahụ nakwa ụdị onye ọ bụ. Abụ Ọma 83:18 na-ekwu, sị: “Gị onwe gị, Onye aha Gị bụ Jehova, nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya n’inyere ndị ọzọ aka ịmata Chineke, dị ka o kwuru n’ekpere, sị: “Emewo m ka aha gị pụta ìhè nye ndị i sitere n’ụwa nye m.” (Jọn 17:6) N’otu aka ahụ, ndị na-efe ezi ofufe taa na-akụziri ndị ọzọ banyere aha Chineke, nzube ya, na àgwà ya.

9Ndị Chineke na-egosipụta ezi ịhụnanya sitere n’obi n’ebe ibe ha nọ. Jizọs kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Ndị Kraịst oge mbụ nwere ịhụnanya dị otú ahụ n’ebe ibe ha nọ. Ndịrịta iche nke agbụrụ, ọkwá, na mba, adịghị egbochi ụdị ịhụnanya Chineke na-achọ, ọ na-emekwa ka ụmụ mmadụ ghọọ ezi òtù ụmụnna a na-apụghị ikewa ekewa. (Ndị Kọlọsi 3:14) Ndị na-ekpe okpukpe ụgha enweghị òtù ụmụnna dị otú ahụ na-ahụ n’anya. Olee otú anyị si mara? Ha na-egburịta ibe ha n’ihi esemokwu mba na mba ma ọ bụ nke agbụrụ na agbụrụ. Ezi Ndị Kraịst adịghị ebuli ngwá agha igbu ụmụnna ha ma ọ bụ ndị ọ bụla ọzọ. Bible na-ekwu, sị: “Ụmụ Chineke na ụmụ Ekwensu pụtara ìhè site n’eziokwu a: Onye ọ bụla nke na-adịghị anọgide na-eme ezi omume esiteghị na Chineke, otú ahụ ka ọ dịkwa onye na-adịghị ahụ nwanna ya n’anya…. Anyị kwesịrị inwe ịhụnanya maka ibe anyị; ọ bụghị dị ka Ken, onye sitere n’ajọ onye ahụ ma gbuo nwanne ya.”—1 Jọn 3:10-12; 4:20, 21.

10 N’ezie, inwe ezi ịhụnanya apụtaghị nanị ịghara igbu mmadụ. Ezi Ndị Kraịst na-eji ezi obi etinye oge ha, ume ha, na ego ha n’inyere ibe ha aka nakwa n’ịgba ha ume. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ha na-enyerịtara ibe ha aka n’oge nsogbu, ha na-akwụwakwa aka ha ọtọ mgbe ha na ndị ọzọ na-emekọ ihe. N’eziokwu, ha na-erube isi na ndụmọdụ Bible bụ́ ‘ime ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ.’—Ndị Galeshia 6:10.

11Ezi Ndị Kraịst na-anakwere Jizọs Kraịst dị ka onye Chineke na-esi n’aka ya azọpụta anyị. Bible na-ekwu, sị: “Nzọpụta adịghị n’onye ọ bụla ọzọ, n’ihi na aha ọzọ adịghị n’okpuru eluigwe nke e nyeworo n’etiti ụmụ mmadụ bụ́ nke a na-aghaghị isi na ya zọpụta anyị.” (Ọrụ 4:12) Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke 5 n’akwụkwọ a, Jizọs nyere ndụ ya dị ka ihe mgbapụta maka ụmụ mmadụ na-erube isi. (Matiu 20:28) Ọzọkwa, Jizọs bụ Eze Chineke họpụtara n’Alaeze eluigwe nke ga-achị ụwa dum. Chineke chọkwara ka anyị na-erubere Jizọs isi ma na-etinye ihe ndị ọ kụziri n’ọrụ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ndụ ebighị ebi. Ọ bụ ya mere Bible ji na-ekwu, sị: “Onye na-egosipụta okwukwe n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi; onye na-enupụrụ Ọkpara ahụ isi agaghị ahụ ndụ.”—Jọn 3:36.

12Ndị na-efe ezi ofufe abụghị akụkụ nke ụwa. Mgbe a na-ekpe ya ikpe n’ihu onye ọchịchị Rom bụ́ Paịlet, Jizọs kwuru, sị: “Alaeze m abụghị akụkụ nke ụwa a.” (Jọn 18:36) N’agbanyeghị mba ha bi na ya, ezi ụmụazụ Jizọs bụ ndị Alaeze eluigwe na-achị, n’ihi ya kwa, ha adịghị etinye aka n’ụzọ ọ bụla na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa. Ha adịghị esonye n’esemokwu ya. Otú ọ dị, ndị na-efe Jehova adịghị egbochi ndị ọzọ ime ihe ha chọrọ ime n’ihe banyere iso n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ịzọ ọkwá ọchịchị, ma ọ bụ ịtụ vootu. N’agbanyeghị na ezi ndị na-efe Chineke ofufe na-anọpụ iche n’ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ha na-erube isi n’iwu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Okwu Chineke nyere ha iwu ka ha ‘doo onwe ha n’okpuru’ “ikike ndị ka elu” nke ọchịchị. (Ndị Rom 13:1) Ọ bụrụ na ihe ọchịchị chọrọ emegide ihe Chineke chọrọ, ndị na-efe ezi ofufe na-agbaso ihe nlereanya nke ndịozi, bụ́ ndị sịrị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29; Mak 12:17.

13Ezi ụmụazụ Jizọs na-ekwusa na Alaeze Chineke bụ nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ. Jizọs buru amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Ezi ụmụazụ Jizọs Kraịst na-akpọsa Alaeze eluigwe Chineke dị ka nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ kama ịgba ndị mmadụ ume ilegara ndị ọchịchị bụ́ mmadụ anya maka igbo mkpa ha. (Abụ Ọma 146:3) Jizọs kụziiri anyị ikpe ekpere maka ọchịchị ahụ zuru okè mgbe ọ sịrị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) Okwu Chineke buru amụma na Alaeze eluigwe a “ga-etipịa alaeze ndị a nile [dị ugbu a] mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.

14 N’ihi ihe ndị anyị tụleworo ugbu a, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee okpukpe nke ozizi ya nile sitere na Bible, nke na-emekwa ka a mara aha Jehova? Olee òtù nke na-egosipụta ụdị ịhụnanya Jehova chọrọ, nke nwere okwukwe na Jizọs, nke na-abụghị akụkụ nke ụwa, na nke na-ekwusa na Alaeze Chineke bụ nanị ezi olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ? N’ime òtù okpukpe nile dị n’ụwa, olee nke na-eme ihe ndị a nile?’ Ihe ndị mere eme na-egosi n’ụzọ doro anya na ọ bụ Ndịàmà Jehova.—Aịsaịa 43:10-12.

Site n’iso ndị Jehova na-efe ya, ị ga-enweta ihe karịrị ihe ọ bụla pụrụ ifunahụ gị

Ndị enyi si n’agbụrụ dị iche iche

GỊNỊ KA Ị GA-EME?

15 Nanị ikwere na Chineke apụtaghị na mmadụ na-eme ihe Chineke na-achọ. E kwuwerịị, Bible na-ekwu na ọbụna ndị mmụọ ọjọọ kweere na Chineke dị. (Jems 2:19) N’ezie, o doro anya na ha adịghị eme uche Chineke nakwa na ha abụghị ndị ọ na-anakwere. Iji bụrụ ndị Chineke na-anakwere, ọ bụghị nanị na anyị ga-ekwere na ọ dị adị kamakwa anyị aghaghị ime uche ya. Anyị aghaghịkwa ikewapụ onwe anyị n’okpukpe ụgha ma nakwere ezi ofufe.

16 Pọl onyeozi gosiri na anyị ekwesịghị ikere òkè n’ofufe ụgha. O dere, sị: “ ‘Ya mere sinụ n’etiti ha pụọ, kewapụkwanụ onwe unu,’ ka Jehova na-asị, ‘kwụsịkwanụ ibitụ ihe na-adịghị ọcha aka’; ‘m ga-anabatakwa unu.’ ” (2 Ndị Kọrint 6:17; Aịsaịa 52:11) Ya mere, ezi Ndị Kraịst na-ezere ihe ọ bụla metụtara ofufe ụgha.

17 Bible na-egosi na ụdị okpukpe ụgha nile bụ akụkụ nke “Babilọn Ukwu ahụ.”* (Mkpughe 17:5) Aha ahụ na-echetara anyị obodo ochie bụ́ Babilọn, bụ́ ebe okpukpe ụgha malitere mgbe Iju Mmiri nke ụbọchị Noa gasịrị. Ọtụtụ ozizi nke okpukpe ụgha nakwa ememe ndị ha na-emekarị ugbu a malitere ogologo oge gara aga na Babilọn. Dị ka ihe atụ, ndị Babilọn fere chi atọ n’ime otu. Taa, ozizi bụ́ isi nke ọtụtụ okpukpe bụ Atọ n’Ime Otu. Ma Bible na-akụzi n’ụzọ doro anya na e nwere nanị otu ezi Chineke, bụ́ Jehova, nakwa na Jizọs Kraịst bụ Ọkpara ya. (Jọn 17:3) Ndị Babilọn kwekwaara na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ, bụ́ nke na-adịgide ndụ mgbe mmadụ nwụsịrị, nke pụkwara ịta ahụhụ n’ebe a na-emekpa mmadụ ahụ́. Taa, ihe ka n’ọtụtụ okpukpe na-akụzi nkwenkwe bụ́ na a pụrụ imekpa mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ, ma ọ bụ mmụọ, ahụ́ n’ọkụ ala mmụọ.

18 Ebe ọ bụ na ofufe Babilọn oge ochie gbasaruru ụwa nile, ọ dabara adaba ịkpọ Babilọn Ukwu nke oge a alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Chineke ebuwokwa amụma na alaeze ụwa nke okpukpe ụgha a ga-abịa ná njedebe na mberede. (Mkpughe 18:8) Ị̀ hụwo ihe mere o ji dị oké mkpa ka i kewapụ onwe gị n’akụkụ ọ bụla nke Babilọn Ukwu ahụ? Jehova Chineke chọrọ ka i mee ngwa ‘si na ya pụta’ ugbu a oge ka dị.—Mkpughe 18:4.

19 N’ihi mkpebi i mere isi n’okpukpe ụgha pụta, ụfọdụ ndị pụrụ ịkwụsị iso gị na-akpakọrịta. Otú ọ dị, site n’iso ndị Jehova na-ejere ya ozi, uru ndị ị ga-erita ga-akarị ihe ndị pụrụ ifunahụ gị. Dị ka ndị soro ụzọ Jizọs n’oge mbụ, bụ́ ndị hapụrụ ihe ndị ọzọ iji soro ya, ị ga-emesị nwee ọtụtụ ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị n’ụzọ ime mmụọ. Ị ga-abụ akụkụ nke ezinụlọ buru ibu, zuru ụwa ọnụ, nke ọtụtụ nde ezi Ndị Kraịst, bụ́ ndị nwere ezi ịhụnanya n’ebe ị nọ, mejupụtara. Ị ga-enwekwa olileanya magburu onwe ya nke ịdị ndụ ebighị ebi “n’usoro ihe na-abịanụ.” (Mak 10:28-30) Ikekwe, ka oge na-aga, ndị ahụ gbahapụrụ gị n’ihi nkwenkwe gị ga-eleba anya n’ihe Bible na-akụzi ma ghọọ ndị na-efe Jehova.

20 Bible na-akụzi na n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eweta ajọ usoro ihe a ná njedebe, ọ ga-ejikwa ụwa ọhụrụ nke ezi omume nke dị n’okpuru ọchịchị Alaeze ya dochie anya ya. (2 Pita 3:9, 13) Lee nnọọ ụwa magburu onwe ya nke ahụ ga-abụ! N’usoro ihe ọhụrụ ezi omume ahụ, a ga-enwe nanị otu okpukpe, otu ụdị ezi ofufe. Ọ́ bụghị ihe amamihe dị na ya bụ́ gị onwe gị ime ihe ndị kwesịrị ekwesị iji soro ndị na-efe ezi ofufe na-akpakọrịta ugbu a?

IHE BIBLE NA-AKỤZI

  • E nwere nanị otu ezi okpukpe.—Matiu 7:13, 14.
  • A na-amata ezi okpukpe ahụ site n’ozizi nakwa ihe ndị a na-eme na ya.—Matiu 7:16, 17.
  • Ndịàmà Jehova na-ekpe okpukpe Chineke na-anakwere.—Aịsaịa 43:10.

*  Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere otú Babilọn Ukwu ahụ si nọchie anya alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, lee Ihe Odide Ntụkwasị.


Ajụjụ nke Paragraf Ndị A Na-Amụ Amụ

1. Uru dị aṅaa ka anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị efee Chineke n’ụzọ ziri ezi?

2. Olee otú anyị ga-esi mata ụzọ ziri ezi isi fee Jehova, ihe atụ dịkwa aṅaa na-enyere anyị aka ịghọta nke a?

3. Dị ka Jizọs si kwuo, gịnị ka anyị na-aghaghị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ndị Chineke na-anakwere?

4. Gịnị ka ihe Jizọs kwuru banyere ụzọ abụọ ahụ pụtara, ebeekwa ka ụzọ nke ọ bụla na-eduga?

5. Olee otú anyị pụrụ isi mata ndị na-ekpe ezi okpukpe?

6, 7. Olee otú ndị na-efe Chineke si ele Bible anya, oleekwa otú Jizọs si setịpụ ihe nlereanya na nke a?

8. Ihe ndị dị aṅaa ka ife Jehova gụnyere?

9, 10. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Ndị Kraịst na-esi egosi ibe ha ịhụnanya?

11. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịnakwere Jizọs Kraịst dị ka onye Chineke na-esi n’aka ya azọpụta anyị?

12. Gịnị ka abụghị akụkụ nke ụwa gụnyere?

13. Olee otú ezi ụmụazụ Jizọs si ele Alaeze Chineke anya, n’ihi ya kwa, gịnị ka ha na-eme banyere ya?

14. Olee òtù okpukpe nke i chere na-emezu ihe ndị a chọrọ maka ezi ofufe?

15. Olee ihe ọzọ Chineke na-achọ, e wezụga ikwere na ọ dị?

16. Gịnị ka anyị kwesịrị ime n’ihe banyere ikere òkè n’okpukpe ụgha?

17, 18. Gịnị bụ “Babilọn Ukwu ahụ,” n’ihi gịnịkwa ka o ji dị oké mkpa ka i ‘si na ya pụta’?

19. Uru dị aṅaa ka ị ga-erite site n’ijere Jehova ozi?

20. Gịnị ka ọdịnihu ga-abụrụ ndị na-ekpe ezi okpukpe ahụ?