Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

ISI NKE IRI NA OTU

N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?

N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?

Ọ̀ bụ Chineke kpatara nhụjuanya e nwere n’ụwa?

Ihe iseokwu ndị dị aṅaa bilitere n’ogige Iden?

Olee otú Chineke ga-esi dozie nsogbu ndị na-esite ná nhụjuanya ụmụ mmadụ?

MGBE a lụsịrị otu agha kpụ ọkụ n’ọnụ n’otu ala nke agha tisasịrị, e liri ọtụtụ puku ndị inyom na ụmụntakịrị na-abụghị ndị agha, bụ́ ndị e gburu n’agha ahụ, n’otu nnukwu ili a manyegasịrị obe gburugburu ya. N’obe nke ọ bụla, e dere ajụjụ bụ́: “Maka gịnị?” Mgbe ụfọdụ, nke ahụ bụ ajụjụ kasị agbawa obi ịjụ. Ndị mmadụ na-eji mwute ajụ ya mgbe agha, ọdachi, ọrịa, ma ọ bụ mpụ gburu ndị ha hụrụ n’anya, mgbe o bibiri ebe obibi ha, ma ọ bụ kpatara ha oké nhụjuanya n’ụzọ ndị ọzọ. Ha na-achọ ịmata ihe mere ọdachi ndị dị otú ahụ ji dakwasị ha.

2 N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị? Ọ bụrụ na Jehova Chineke bụ onye kachasị ihe nile ike, onye na-ahụ n’anya, onye nwere amamihe, nakwa onye na-ekpe ikpe ziri ezi, n’ihi gịnị ka ịkpọasị na ikpe na-ezighị ezi ji jupụta n’ụwa? Ì chetụwo echiche banyere ihe ndị a n’onwe gị?

3 Ọ̀ dị njọ ịjụ ihe mere Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị? Ụfọdụ na-eche na ịjụ ajụjụ dị otú ahụ ga-eme ka o yie ka ọ̀ bụ na ha enweghị okwukwe siri ike ma ọ bụ na ha adịghị akwanyere Chineke ùgwù. Otú ọ dị, mgbe ị na-agụ Bible, ị ga-achọpụta na ndị kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke, jụrụ ajụjụ ndị yiri ya. Dị ka ihe atụ, Habakọk onye amụma jụrụ Jehova, sị: “N’ihi gịnị ka Ị na-eme ka m hụ ajọ ihe? N’ihi gịnị ka Ị na-elegide mmegbu? ma ịpụnara mmadụ ihe ma ihe ike dị n’ihu m: ịlụ ọgụ wee dị, esemokwu na-ebulikwa onwe ya.”—Habakuk 1:3.

Jehova ga-akwụsị nhụjuanya nile

Olili ozu

4 Jehova ọ̀ baara onye amụma ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Habakọk, mba maka ịjụ ajụjụ dị otú ahụ? Ee e. Kama nke ahụ, Chineke tinyere okwu ahụ sitere n’obi, bụ́ nke Habakọk kwuru, n’ihe ndekọ Bible. Chineke nyekwaara ya aka ịghọtakwu ihe inwekwu okwukwe. Jehova chọrọ imere gị otu ihe ahụ. Cheta na Bible na-akụzi na ‘ọ na-eche banyere gị.’ (1 Pita 5:7) Chineke kpọrọ mmebi iwu na nhụjuanya nke mmebi iwu na-akpata asị karịa otú mmadụ ọ bụla kpọrọ ihe ndị ahụ asị. (Aịsaịa 55:8, 9) Gịnịzi mere e ji enwe oké nhụjuanya n’ụwa?

N’IHI GỊNỊ KA E JI ENWE OKÉ NHỤJUANYA?

5 Ndị nọ n’okpukpe dị iche iche agakwuruwo ndị ndú okpukpe na ndị ụkọchukwu ha iji jụọ ihe mere e ji enwe oké nhụjuanya. Ihe a na-agwakarị ha bụ na ọ bụ uche Chineke ka mmadụ na-ata ahụhụ nakwa na ọ dịwo anya o kpebiri ihe nile ga-emenụ, gụnyere ọdachi. A na-agwa ọtụtụ ndị na ụzọ ndị Chineke si eme ihe dị omimi ma ọ bụ na Chineke na-egbu ndị mmadụ—ọbụna ụmụaka—ka ha na ya wee nwee ike ịnọrọ n’eluigwe. Otú ọ dị, dị ka ị hụworo, Jehova Chineke adịghị akpata ihe ọjọọ. Bible na-ekwu, sị: “Ya bụrụ Chineke ihe arụ, bụ́ imebi iwu; ya bụrụkwa Onye pụrụ ime ihe nile ihe arụ, bụ́ ime ajọ omume!”—Job 34:10.

6 Ị̀ ma ihe mere ndị mmadụ ji ehie ụzọ n’ịta Chineke ụta maka nhụjuanya nile e nwere n’ụwa? N’ọtụtụ ọnọdụ, ha na-ata Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile ụta n’ihi na ha chere na ọ bụ ya na-achị ụwa a n’ezie. Ha amaghị otu eziokwu dị mfe, nke dịkwa mkpa, bụ́ nke Bible na-akụzi. Ị mụtara eziokwu ahụ n’Isi nke 3 nke akwụkwọ a. Onye na-achị ụwa a n’ezie bụ Setan Ekwensu.

7 Bible na-ekwu n’ụzọ doro anya, sị: “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Mgbe i chebaara nke a echiche, ọ́ daghị ka ihe ezi uche dị na ya? Ụwa a na-egosipụta àgwà nke onye bụ́ mmụọ a na-adịghị ahụ anya, bụ́ onye “na-eduhie ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) Setan bụ onye mkpọrọmasị, onye aghụghọ, na onye obi ọjọọ. N’ihi ya, ụwa nke ọ na-achịkwa jupụtara n’ịkpọasị, n’aghụghọ, nakwa n’obi ọjọọ. Nke ahụ bụ otu ihe mere e ji enwe oké nhụjuanya.

8 Ihe nke abụọ mere e ji enwe oké nhụjuanya bụ na, dị ka e kwuru n’Isi nke 3 n’akwụkwọ a, ihe a kpọrọ mmadụ anọwo na-abụ ndị na-ezughị okè na ndị mmehie kemgbe ahụ e nupụrụ isi n’ogige Iden. Ụmụ mmadụ, bụ́ ndị na-emehie emehie, na-azọkarị onye ga-achị ibe ya, nke a na-akpatakwa agha, mmegbu, na nhụjuanya. (Eklisiastis 4:1; 8:9) Ihe nke atọ mere e ji enwe nhụjuanya bụ “mgbe na ihe ndapụta.” (Eklisiastis 9:11) N’ụwa nke a nke ọ na-abụghị Jehova na-achị, ndị mmadụ pụrụ ịhụju anya n’ihi ịnọ n’ebe na-ekwesịghị ekwesị n’oge na-ekwesịghị ekwesị.

9 Ọ bụ ihe na-akasi obi anyị ịmata na Chineke adịghị akpata nhụjuanya. Ọ bụghị ya na-akpata agha, mpụ, mmegbu, ma ọ bụ ọbụna ọdachi ndị na-emere onwe ha, bụ́ ndị na-eme ka ndị mmadụ hụjuo anya. Ma, anyị ga-achọ ịmata, N’ihi gịnị ka Jehova ji kwere ka nhụjuanya a nile dịrị? Ọ bụrụ na ọ bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, o nwere ike nke ịkwụsị ya. Gịnịzi mere na o mebeghị otú ahụ? Ọ ghaghị ịbụ na Chineke nke na-ahụ n’anya, bụ́ onye anyị maara, nwere ezi ihe mere o ji o mebeghị otú ahụ.—1 Jọn 4:8.

OTU IHE ISEOKWU DỊ MKPA EBILITE

10 Iji chọpụta ihe mere Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị, ọ dị mkpa ka anyị chee echiche laa azụ mgbe nhụjuanya malitere. Mgbe Setan dubara Adam na Iv n’inupụrụ Jehova isi, otu ihe iseokwu dị mkpa bilitere. Setan arụghị ụka na Jehova nwere ike. Ọbụna Setan maara na a kparaghị ike Jehova ókè. Kama nke ahụ, Setan rụrụ ụka ma ò ruuru Jehova ịchị achị. Site n’ịkpọ Chineke onye ụgha nke na-egbochi ihe ọma ịbịara ndị ọ na-achị, Setan boro Jehova ebubo na ọ maghị achị. (Jenesis 3:2-5) Setan nyere echiche na ihe ga-adịrị ihe a kpọrọ mmadụ mma ma ọ bụrụ na ha anọghị n’okpuru ọchịchị Chineke. Nke a bụ ịma ọbụbụeze Jehova, bụ́ oruru o ruuru ya ịchị achị, aka.

11 Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ha kwuru, sị: “Anyị achọghị ka Jehova chịwa anyị. Anyị pụrụ ikpebiri onwe anyị ihe ọma na ihe ọjọọ.” Olee otú Jehova pụrụ isi dozie ihe iseokwu ahụ? Olee otú ọ pụrụ isi gosi ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi na ihe ndị nnupụisi ahụ mere ezighị ezi nakwa na ụzọ ya kasị mma n’ezie? Mmadụ pụrụ ikwu na Chineke gaara ebibi ndị nnupụisi ahụ ma bido n’isi. Ma Jehova ekwupụtawo nzube ya nke bụ́ ime ka ụmụ Adam na Iv jupụta ụwa, ọ chọkwara ka ha biri na paradaịs elu ala. (Jenesis 1:28) Jehova na-emezu nzube ya mgbe nile. (Aịsaịa 55:10, 11) E wezụga nke ahụ, igbu ndị nnupụisi ahụ n’Iden agaraghị aza ajụjụ ahụ e welitere bụ́ ma ò ruuru Jehova ịchị achị.

Onye nkuzi na nwa akwụkwọ ya

Nwa akwụkwọ a ọ̀ maara ihe karịa onye nkụzi ya?

12 Ka anyị tụlee otu ihe atụ. Ka e were ya na otu onye nkụzi na-agwa ụmụ akwụkwọ ya otú e si arụ ọ́gụ́. Otu nwa akwụkwọ nke ụbụrụ na-aghọ nkọ, nke na-enupụ isi, ekwuo na otú onye nkụzi ha si rụọ ọ́gụ́ ahụ abụghị otú e si arụ ya. N’inye echiche bụ́ na onye nkụzi ha amaghị akụzi ihe, nwa nnupụisi a esie ọnwụ na ya maara ụzọ ka mma isi rụta ya. Ụfọdụ ụmụ akwụkwọ echee na ihe o kwuru bụ eziokwu, ha amalitekwa inupụ isi. Gịnị ka onye nkụzi ahụ kwesịrị ime? Ọ bụrụ na ọ chụpụ ndị nnupụisi ahụ na klas, gịnị ka ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ ga-eche? Ọ̀ bụ na ha agaghị ekwere na ihe nwa akwụkwọ ibe ha ahụ na ndị sonyeere ya kwuru bụ eziokwu? Ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ nile nọ na klas ahụ nwere ike gharazie ịdị na-akwanyere onye nkụzi ahụ ùgwù, na-eche na ụjọ na-atụ ya na a ga-anwapụta na ọ maghị arụ ọ́gụ́. Ma, ka e were ya na onye nkụzi ahụ kwere ka onye nnupụisi ahụ gosi klas otú ga-esi rụọ ọ́gụ́ ahụ.

13 Jehova emewo ihe yiri ihe onye nkụzi ahụ mere. Cheta na ọ bụghị nanị ndị nnupụisi ahụ nọ n’Iden ka ihe iseokwu ahụ gbasara. Ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi nọ na-ekiri ihe na-emenụ. (Job 38:7; Daniel 7:10) Ihe Jehova ga-eme banyere nnupụisi ahụ ga-emetụta ndị mmụọ ahụ nile nakwa n’ikpeazụ ndị nile e kere eke nwere ọgụgụ isi. N’ihi ya, gịnị ka Jehova meworo? O kwewo ka Setan gosi otú ọ ga-esi chịa ihe a kpọrọ mmadụ. Chineke ekwewokwa ka ụmụ mmadụ chịwa onwe ha n’okpuru nduzi nke Setan.

14 Onye nkụzi ahụ e kwuru banyere ya n’ihe atụ anyị ji mee ihe maara na ihe onye nnupụisi ahụ na ndị òtù ya kwuru abụghị eziokwu. Ma, ọ makwa na ọ ga-abara klas ahụ dum uru ma ọ bụrụ na e nye ndị nnupụisi ahụ ohere inwa igosi ma ihe ha na-ekwu ọ̀ bụ eziokwu. Mgbe ndị nnupụisi ahụ na-emelighị ya, ụmụ akwụkwọ nile, bụ́ ndị nwere ezi obi, ga-ahụ na ọ bụ nanị onye nkụzi ahụ ruru eru ịkụziri klas ahụ ihe. Mgbe nke ahụ gasịrị, ha ga-aghọta ihe mere onye nkụzi ahụ ga-eji chụpụ onye ọ bụla nupụrụ isi na klas. N’otu aka ahụ, Jehova maara na mmadụ nile na ndị mmụọ ozi nile nwere obi eziokwu ga-erite uru site n’ịhụ na Setan na ndị so ya nupụ isi akụwo afọ n’ala nakwa na ụmụ mmadụ apụghị ịchị onwe ha. Dị ka Jeremaịa oge ochie, ha ga-amụta eziokwu a dị mkpa: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.”—Jeremaịa 10:23

N’IHI GỊNỊ KA O JIWORO DỊTEE AKA?

15 Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka Jehova ji kwere ka nhụjuanya dịgide ruo ogologo oge? N’ihi gịnịkwa ka ọ na-ejighị egbochi ihe ọjọọ ime? Ọ dị mma, tụlee ihe abụọ ndị onye nkụzi ahụ e kwuru okwu ya n’ihe atụ ahụ anyị ji mee ihe na-agaghị eme. Nke mbụ, ọ gaghị akwụsị nwa akwụkwọ nnupụisi ahụ ịrụ ọ́gụ́ ahụ. Nke abụọ, onye nkụzi ahụ agaghị enyere onye nnupụisi ahụ aka. N’otu aka ahụ, tụlee ihe abụọ Jehova kpebisiworo ike ịghara ime. Nke mbụ, ọ kwụsịbeghị Setan na ndị òtù ya ịnwa igosi na ihe ha kwuru ziri ezi. N’ihi ya, ọ dịwo mkpa ka e chere ka oge gafee. N’ime ọtụtụ puku afọ mmadụ dịwara adị, ihe a kpọrọ mmadụ anwalewo ụzọ dị iche iche nke isi chịa onwe ha. Ihe a kpọrọ mmadụ enwewo ọganihu na nkà mmụta sayensị nakwa n’ihe ndị ọzọ, ma ikpe na-ezighị ezi, mpụ, na agha akawo njọ. O dowo nnọọ anya na ọchịchị ụmụ mmadụ akụwo afọ n’ala.

16 Nke abụọ, Jehova enyebereghị Setan aka ịchị ụwa a. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na Chineke egbochie ajọ mpụ, ọ́ gaghị egosi na ọ na-akwado ndị nnupụisi ahụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya? Nke ahụ ọ́ bụghị Chineke ime ka ndị mmadụ chewa na ikekwe mmadụ pụrụ ịchị onwe ya n’enweghị nsogbu ndị dị njọ? Ọ bụrụ na Jehova emee otú ahụ, ọ ga-apụta na ọ na-akwado ụgha. Otú ọ dị, ‘Chineke apụghị ịgha ụgha.’—Ndị Hibru 6:18.

Chineke ga-enyere gị aka ịtachi obi n’ahụhụ

Nwaanyị Okwu Chineke na-akasi obi

17 Otú ọ dị, gịnị banyere ihe ndị e mebiworo n’ime ogologo oge a a nọworo na-enupụrụ Chineke isi? Anyị kwesịrị icheta na Jehova bụ onye pụrụ ime ihe nile. N’ihi ya, ọ ga-edozili nsogbu ndị na-esite ná nhụjuanya nke ihe a kpọrọ mmadụ, ọ ga-emekwa otú ahụ. Dị ka anyị mụwororị, a ga-emezi ihe ndị e mebiri na mbara ụwa anyị a site n’ime ka ụwa ghọọ Paradaịs. N’ihi okwukwe e nwere n’àjà mgbapụta nke Jizọs, a ga-edozi nsogbu ndị mmehie na-akpata, a ga-ejikwa mbilite n’ọnwụ dozie nsogbu ndị ọnwụ na-akpata. N’ụzọ dị otú a, Chineke ga-eji Jizọs mee ihe “iji tipịasịa ọrụ Ekwensu.” (1 Jọn 3:8) Jehova ga-emezu ihe ndị a nile kpọmkwem n’oge kwesịrị ekwesị. Obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ na Chineke emebeghị ihe tupu ugbu a, n’ihi na ntachi obi ya enyewo anyị ohere ịmụta eziokwu na ijere ya ozi. (2 Pita 3:9, 10) Ka ọ dịgodị, Chineke anọwo na-achọ nnọọ ndị ga-eji obi eziokwu fee ya, ọ nọwokwa na-enyere ha aka ịtachi obi ná nhụjuanya ọ bụla ha pụrụ inwe n’ụwa a nọ ná nsogbu.—Jọn 4:23; 1 Ndị Kọrint 10:13.

18 Ụfọdụ pụrụ iche, sị, À gaara ezere nhụjuanya a nile ma a sị na Chineke kere Adam na Iv n’ụzọ ga-eme ka ha ghara inupụrụ ya isi? Iji zaa ajụjụ ahụ, ọ dị mkpa ka i cheta otu onyinye dị oké ọnụ ahịa Jehova nyeworo gị.

OLEE OTÚ Ị GA-ESI JIRI ONYINYE SITERE N’AKA CHINEKE MEE IHE?

19 Dị ka e kwuru n’Isi nke 5 n’akwụkwọ a, e kere ụmụ mmadụ ka ha nwere onwe ha ime nhọrọ. Ị̀ ghọtara na nke ahụ bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa? Chineke ekewo ọtụtụ anụmanụ, ọ bụkwa amamihe ebumpụta ụwa na-achịkwa ha. (Ilu 30:24) Ụmụ mmadụ emepụtawo ígwè ọrụ robot ndị a pụrụ ime ka ha na-eme ihe ọ bụla a chọrọ ka ha mee. Obi ọ̀ ga-adị anyị ụtọ ma a sị na Chineke kere anyị otú ahụ? Ee e, obi dị anyị ụtọ inwere onwe anyị ime nhọrọ n’ihe banyere ụdị mmadụ anyị ga-abụ, ụdị ndụ anyị ga-ebi, ụdị ndị anyị ga-emeta enyi, na ihe ndị ọzọ. Ọ na-amasị anyị inwere onwe anyị ime ihe ụfọdụ, ọ bụkwa otú ahụ ka Chineke chọrọ ka ọ dịrị anyị.

20 Ozi e jere ná mmanye adịghị amasị Jehova. (2 Ndị Kọrint 9:7) Iji maa atụ: Olee ihe ga-aka amasị nne ma ọ bụ nna ka nwatakịrị mee mgbe e nyere ya ihe—ọ̀ bụ iji obi ya sị “I meela,” ka ọ̀ bụ ikwu otú ahụ mgbe a gwara ya agwa? Ajụjụ abụrụzie, Olee otú ga-esi jiri nnwere onwe ime nhọrọ nke Jehova nyeworo gị mee ihe? Setan, Adam, na Iv zọtọrọ nnwere onwe ime nhọrọ nke e nyere ha n’ala. Ha lelịrị Jehova Chineke. Olee ihe gị onwe gị ga-eme?

21 I nwere ohere iji nnwere onwe ime nhọrọ, nke magburu onwe ya, bụ́ nke e nyere gị, mee ihe n’ụzọ kasị baa uru. Ị pụrụ isonyere ọtụtụ nde mmadụ, bụ́ ndị dịnyeere Jehova. Ha na-eme ka obi Chineke ṅụrịa n’ihi na ha na-ekere òkè dị ukwuu n’igosipụta na Setan bụ onye ụgha nakwa na ọchịchị edotụdịghị ya anya. (Ilu 27:11) Gị onwe gị kwa pụrụ ime otú ahụ site n’ịhọrọ ụzọ ndụ ziri ezi. A ga-akọwa nke a n’isiakwụkwọ na-esonụ.

IHE BIBLE NA-AKỤZI

  • Ọ bụghị Chineke na-akpata ọnọdụ ọjọọ ndị a na-enwe n’ụwa taa.—Job 34:10.
  • Site n’ịkpọ Chineke onye ụgha nakwa ikwu na Ọ na-egbochi ihe ọma ịbịara ndị Ọ na-achị, Setan nyere echiche bụ́ na o rughịrị Jehova ịchị achị.—Jenesis 3:2-5.
  • Jehova ga-eji Ọkpara ya, bụ́ Onye ọchịchị nke Alaeze Mezaịa ahụ, mee ihe iji kwụsị nhụjuanya nile nke ụmụ mmadụ nakwa iji dozie nsogbu ndị nhụjuanya na-akpata.—1 Jọn 3:8.

Ajụjụ nke Paragraf Ndị A Na-Amụ Amụ

1, 2. Ụdị nhụjuanya dị aṅaa ka ndị mmadụ na-enwe taa, oleekwa ajụjụ ndị ọ na-akpali ọtụtụ ndị ịjụ?

3, 4. (a) Gịnị na-egosi na ọ dịghị njọ ịjụ ihe mere Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị? (b) Olee otú mmebi iwu na nhụjuanya na-adị Jehova?

5. Gịnị ka a na-ekwu mgbe ụfọdụ na ọ bụ ya mere ndị mmadụ ji ahụju anya, ma gịnị ka Bible na-akụzi?

6. N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị ji ehie ụzọ n’ịta Chineke ụta maka nhụjuanya dị n’ụwa?

7, 8. (a) Olee otú ụwa si egosipụta àgwà nke onye na-achị ya? (b) Olee otú ezughị okè mmadụ nakwa “mgbe na ihe ndapụta” siworo soro na-akpata nhụjuanya?

9. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Jehova nwere ezi ihe mere o ji kwere ka nhụjuanya dịgide?

10. Gịnị ka Setan rụrụ ụka banyere ya, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?

11. Gịnị mere Jehova egbughị ndị nnupụisi ahụ ozugbo ahụ n’Iden?

12, 13. Nye ihe atụ nke ihe mere Jehova jiworo kwe ka Setan chịwa ụwa a na ihe mere Chineke jiworo kwere ka ụmụ mmadụ na-achị onwe ha.

14. Uru dị aṅaa ka mkpebi Jehova mere ikwe ka ụmụ mmadụ chịwa onwe ha ga-aba?

15, 16. (a) N’ihi gịnị ka Jehova jiworo kwere ka nhụjuanya dịgide ruo ogologo oge? (b) N’ihi gịnị ka Jehova na-ejighị gbochie ihe ndị dị ka mpụ ndị jọgburu onwe ha?

17, 18. Gịnị ka Jehova ga-eme banyere ihe ọjọọ nile sitere n’ọchịchị ụmụ mmadụ nakwa n’aka ọrụ Setan?

19. Onyinye dị aṅaa dị oké ọnụ ahịa ka Jehova nyeworo anyị, n’ihi gịnịkwa ka anyị ji kwesị iji ya kpọrọ ihe?

20, 21. Olee otú anyị pụrụ isi jiri nnwere onwe ime nhọrọ nke e nyeworo anyị mee ihe n’ụzọ kasị baa uru, n’ihi gịnịkwa ka anyị ji kwesị ime otú ahụ?

GỤKWUO GBASARA YA

Gwa Anyị Ka Anyị na Gị Mụwa Baịbụl

Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?

Baịbụl na-enyere ọtụtụ ndị aka ịmata azịza ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa. Ị̀ ga-achọ ka Baịbụl nyere gị aka?