Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

IHE ODIDE NTụKWASị

“Mkpụrụ Obi” na “Mmụọ”—Gịnị n’Ezie Ka Okwu Ndị A Pụtara?

“Mkpụrụ Obi” na “Mmụọ”—Gịnị n’Ezie Ka Okwu Ndị A Pụtara?

MGBE ị nụrụ okwu bụ́ “mkpụrụ obi” nakwa “mmụọ,” gịnị na-agbata gị n’uche? Ọtụtụ ndị kweere na okwu ndị a na-egosi ihe a na-adịghị ahụ anya nakwa nke na-adịghị anwụ anwụ nke na-adị n’ime anyị. Ha na-eche na ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, akụkụ ahụ́ a, nke a na-adịghị ahụ anya, na-esi n’ahụ́ pụọ ma dịrị ndụ na-aga. Ebe ọ bụ na nkwenkwe a zuru nnọọ ebe nile, ọ na-eju ọtụtụ ndị anya ịchọpụta na ọ bụtụghị ihe Bible na-akụzi. Ya mere, gịnị bụ mkpụrụ obi? Gịnịkwa bụ ihe ahụ Okwu Chineke kpọrọ mmụọ?

“MKPỤRỤ OBI” DỊ KA E SI JIRI YA MEE IHE N’IME BIBLE

Nke mbụ, tụlee banyere mkpụrụ obi. Ị pụrụ icheta na asụsụ ndị mbụ bụ́ isi e ji dee Bible bụ Hibru na Grik. Mgbe ndị dere Bible na-ede banyere mkpụrụ obi, ha jiri okwu Hibru bụ́ ne′phesh ma ọ bụ okwu Grik bụ́ psy·khe′ mee ihe. Okwu abụọ ndị a pụtara ihe karịrị ugboro 800 n’Akwụkwọ Nsọ, n’ebe nile ha pụtakwara, New World Translation sụgharịrị ha ịbụ “mkpụrụ obi.” Ọ bụrụ na i nyochaa otú e si jiri “mkpụrụ obi” mee ihe n’ime Bible, ọ ga-edo gị anya na okwu a na-ezo aka n’ụzọ bụ́ isi (1) n’ebe ndị mmadụ nọ, (2) n’ebe ụmụ anụmanụ nọ, ma ọ bụ (3) n’ebe ndụ mmadụ ma ọ bụ nke anụmanụ dị. Ka anyị tụlee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ ndị na-enye echiche atọ ndị a.

Ndị mmadụ. ‘N’ụbọchị Noa, e buuru mmadụ ole na ole, ya bụ, mkpụrụ obi asatọ, gabiga na mmiri ahụ n’enweghị mmerụ ahụ́.’ (1 Pita 3:20) N’ebe a, o doro anya na okwu bụ́ “mkpụrụ obi” na-anọchi anya ndị mmadụ—Noa, nwunye ya, ụmụ ya ndị ikom atọ, na ndị nwunye ha. Ilu 14:25 kwuru banyere ịnapụta mkpụrụ obi. Ọ na-ekwu sị: “Onye na-anapụta mkpụrụ obi dị iche iche ka onye àmà nke na-ekwu eziokwu bụ.” N’ebe a, mkpụrụ obi dị iche iche na-ezo aka n’ebe ndị mmadụ nọ. Ụfọdụ ebe ndị ọzọ Bible jiri “mkpụrụ obi” mee ihe maka mmadụ ma ọ bụ ndị mmadụ bụ Jenesis 46:18; Ilu 27:7; Ọrụ 27:37; na Ndị Rom 13:1.

Ụmụ anụmanụ. Mgbe ndị Izrel bọsịrị ọ́bọ̀ n’ahụ́ ndị Midia, Jehova gwara Mozis banyere ịtụ ụtụ, sị: “Unu ga-anarakwa n’aka ndị agha ahụ, bụ́ ndị na-apụkwuru usuu ndị agha ahụ, ụtụ ibuliri Jehova: otu mkpụrụ obi n’ime mkpụrụ obi [narị ise], n’ime mmadụ, na n’ime ìgwè ehi, na n’ime ịnyịnya ibu, na n’ime ìgwè ewu na atụrụ.” (Ọnụ Ọgụgụ 31:28) N’akụkụ Akwụkwọ Nsọ a, e zoro aka n’ebe ụmụ anụmanụ nọ dị ka “mkpụrụ obi.”

Ndụ Mmadụ. Mgbe ụfọdụ, okwu bụ́ “mkpụrụ obi” na-apụta ndụ mmadụ. Devid gwara Jehova, sị: “Bịaruo mkpụrụ obi m nso, gbapụta ya: n’ihi ndị iro m gbapụta m.” (Abụ Ọma 69:18) Gịnị ka Devid gwara Jehova ka ọ gbapụta? Ọ gwara Jehova ka ọ gbapụta ndụ ya. Tupu mgbe ahụ, ka Rechel na-amụ nwa ya nwoke, bụ́ Benjamin, ‘mkpụrụ obi ya pụrụ (n’ihi na ọ nwụrụ).’ (Jenesis 35:16-19) N’oge ahụ, Rechel tụfuru ndụ ya. Tụleekwa ihe Jizọs kwuru: “Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma; onye ọzụzụ atụrụ ọma ahụ na-atọgbọ mkpụrụ obi ya maka atụrụ.” (Jọn 10:11) Jizọs nyere mkpụrụ obi ya, ma ọ bụ ndụ ya, n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ. N’akụkụ ndị a nke Bible, o doro anya na okwu bụ́ “mkpụrụ obi” na-ezo aka ná ndụ mmadụ. Ị ga-achọtakwu ihe atụ nke ebe ndị e zoro aka ná “mkpụrụ obi” dị ka ndụ mmadụ ná 1 Ndị Eze 17:17-23; Matiu 10:39; Jọn 15:13; na Ọrụ 20:10.

Ịmụkwu Okwu Chineke ga-egosi gị na ọ dịghị ebe ọ bụla n’ime Bible nke e ji okwu ndị bụ́ “na-adịghị anwụ anwụ” ma ọ bụ “na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi” kọwaa okwu bụ́ “mkpụrụ obi.” Kama nke ahụ, Akwụkwọ Nsọ na-ekwu na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ.—Ezikiel 18:4, 20.

A MATA IHE “MMỤỌ” AHỤ BỤ

Ugbu a, ka anyị tụlee otú Bible si jiri okwu ahụ bụ́ “mmụọ” mee ihe. Ụfọdụ ndị na-eche nnọọ na “mmụọ” bụ okwu ọzọ e ji eme ihe maka “mkpụrụ obi.” Otú ọ dị, nke ahụ abụghị eziokwu. Bible na-eme ka o doo anya na “mmụọ” na “mkpụrụ obi” na-ezo aka n’ihe abụọ dị iche. Olee ihe dị iche na ha abụọ?

Ndị dere Bible jiri okwu Hibru bụ́ ru′ach ma ọ bụ okwu Grik bụ́ pneu′ma mee ihe mgbe ha na-ede banyere “mmụọ.” Akwụkwọ Nsọ n’onwe ya na-egosi ihe okwu ndị ahụ pụtara. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 104:29 na-ekwu, sị: “Ị [Jehova] na-achịkọta mmụọ [ru′ach] ha, ha ekubie ume, wee laghachi n’ájá ha.” Jems 2:26 kwa na-ekwu na “ahụ́ nke na-enweghị mmụọ [ pneu′ma] bụ nke nwụrụ anwụ.” Ya mere, n’amaokwu ndị a, “mmụọ” na-ezo aka n’ihe nke na-enye ahụ́ ndụ. Ọ bụrụ na ahụ́ enweghị mmụọ, ọ nwụrụ anwụ. N’ihi ya, n’ime Bible, ọ bụghị nanị “mmụọ” ka e ji sụgharịa okwu ahụ bụ́ ru′ach kama e jikwa “ike” ma ọ bụ ike ndụ sụgharịa ya. Dị ka ihe atụ, Chineke kwuru banyere Iju Mmiri nke ụbọchị Noa, sị: “Ana m eme ka iju mmiri bịakwasị ụwa, ibibi anụ ahụ́ nile, nke ume [ru′ach] nke ndụ dị n’ime ya, ka ọ pụọ n’okpuru eluigwe.” (Jenesis 6:17; 7:15, 22) N’ihi ya, “mmụọ” na-ezo aka n’ike a na-adịghị ahụ anya (ihe ji ndụ) nke na-eme ka ihe nile e kere eke, bụ́ ndị dị ndụ, na-arụ ọrụ.

Redio

Mkpụrụ obi na mmụọ abụghị otu ihe. Mmụọ dị ahụ́ mkpa dịkwa ka eletrik dị redio mkpa—iji na-arụ ọrụ. N’ịgakwu n’ihu n’ihe atụ a, cheedị banyere obere redio. Ọ bụrụ na i tinye batrị n’ime obere redio ma gbanye ya, ikike eletrik dị na batrị ahụ ga-eme ka redio ahụ malite ịrụ ọrụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na batrị adịghị na redio, redio ahụ agaghị arụ ọrụ. Otú ahụkwa ka ụdị redio ọzọ na-akwụsị ịrụ ọrụ mgbe a kwụpụrụ ya n’ọkụ eletrik. N’otu aka ahụ, mmụọ bụ ike nke na-eme ka ahụ́ anyị na-arụ ọrụ. Ọzọkwa, dị ka eletrik, mmụọ adịghị enwe mmetụta, ọ pụghịkwa iche echiche. Ọ bụ ikike na-abụghị onye. Ma, ọ bụrụ na ahụ́ anyị enweghị mmụọ ahụ, ma ọ bụ ike ndụ, ọ ‘ga-anwụ, wee laghachi n’ájá,’ dị ka ọbụ abụ ahụ kwuru.

Banyere ọnwụ mmadụ, Eklisiastis 12:7 na-ekwu, sị: “Ájá [nke ahụ́ ya] ewee laghachi n’ala dị ka o si dịrị, mmụọ alaghachikwurukwa Chineke Onye nyere ya.” Mgbe mmụọ, ma ọ bụ ike ndụ, si n’ahụ́ pụọ, ahụ́ na-anwụ ma laghachi n’ebe o sitere—ala. N’ụzọ yiri nke ahụ, ike ndụ na-alaghachikwuru onye o sitere n’aka ya—Chineke. (Job 34:14, 15; Abụ Ọma 36:9) Nke a apụtaghị na ike ndụ na-aga eluigwe. Kama, ihe ọ pụtara bụ na olileanya nke onye nwụrụ anwụ nwere ịdị ndụ n’ọdịnihu dabeere n’ebe Jehova Chineke nọ. Ndụ ya dị n’aka Chineke, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ọ bụ nanị site n’ike Chineke ka a pụrụ inyeghachi mmadụ mmụọ, ma ọ bụ ike ndụ, ka o wee nwee ike ịdị ndụ ọzọ.

Lee nnọọ ihe nkasi obi ọ bụ ịmata na nke a bụ kpọmkwem ihe Chineke ga-emere ndị nile na-ezu ike “n’ili ncheta”! (Jọn 5:28, 29) N’oge a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, Jehova ga-emere onye nọ n’ụra ọnwụ ahụ́ ọhụrụ, ma mee ka ahụ́ ahụ dị ndụ site n’itinye mmụọ, ma ọ bụ ike ndụ n’ime ya. Nke ahụ ga-abụ nnọọ oge obi ụtọ!

Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmụtakwu banyere otú e si jiri okwu bụ́ “mkpụrụ obi” na “mmụọ” mee ihe n’ime Bible, ị ga-achọta ihe ọmụma bara oké uru na broshuọ bụ́ Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ? nakwa n’Ụlọ Nche nke April 1, 1999, peeji nke 14-17, ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtachara ha.

← Gụọ isiokwu