Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

ISI NKE ISE

Ihe Mgbapụta Ahụ—Onyinye Kasịnụ Chineke Nyere

Ihe Mgbapụta Ahụ—Onyinye Kasịnụ Chineke Nyere

Gịnị bụ ihe mgbapụta ahụ?

Olee otú e si nye ya?

Olee otú ọ pụrụ isi baara gị uru?

Olee otú ị pụrụ isi gosi na i nwere ekele maka ya?

GỊNỊ bụ onyinye kasịnụ e nyetụworo gị? Ọ bụghị iwu na onyinye ga-ada ọnụ tupu ya abụrụ nke bara uru. A sị ka e kwuwe, e jighị ego ole a zụrụ onyinye amata uru ọ bara. Kama nke ahụ, mgbe onyinye wetaara gị obi ụtọ ma ọ bụ gbooro gị mkpa, ọ baara gị uru nke ukwuu.

2 N’ime ọtụtụ onyinye ndị ị pụrụ ịtụ anya inweta, e nwere otu nke kasị pụọ iche. Ọ bụ onyinye Chineke nyere ihe a kpọrọ mmadụ. Jehova enyewo anyị ọtụtụ ihe, ma onyinye kasịnụ o nyetụworo anyị bụ àjà mgbapụta nke Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst. (Matiu 20:28) Dị ka anyị ga-ahụ n’isi akwụkwọ a, ihe mgbapụta ahụ bụ onyinye kasị baa uru ị pụrụ inweta, n’ihi na ọ pụrụ iwetara gị obi ụtọ dị ukwuu, ọ pụkwara igboro gị mkpa ndị kasịnụ. Ihe mgbapụta ahụ bụ n’ezie ngosipụta kasịnụ nke ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ị nọ.

GỊNỊ BỤ IHE MGBAPỤTA AHỤ?

3 N’igbu ya nkenke, ihe mgbapụta ahụ bụ ndokwa Jehova mere iji napụta ihe a kpọrọ mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ. (Ndị Efesọs 1:7) Iji ghọta ihe ozizi a dị na Bible pụtara, ọ dị mkpa ka anyị chee echiche laa azụ n’ihe mere n’ogige Iden. Ọ bụ nanị mgbe anyị ghọtara ihe Adam tụfuru mgbe o mehiere ka anyị ga-enwe ike ịmata ihe mere ihe mgbapụta ahụ ji bụrụ onyinye baara anyị uru nke ukwuu.

4 Mgbe Jehova kere Adam, o nyere ya ihe dị oké ọnụ ahịa n’ezie—ndụ mmadụ nke zuru okè. Tụlee uru nke ahụ baara Adam. Ebe ọ bụ na o nwere ahụ́ na uche zuru okè mgbe e kere ya, ọ dịghị mgbe ọ ga-ada ọrịa, kaa nká, ma ọ bụ nwụọ anwụ. Dị ka mmadụ zuru okè, ya na Jehova nwere mmekọrịta pụrụ iche. Bible na-ekwu na Adam bụ “nwa Chineke.” (Luk 3:38) N’ihi ya, Adam sooro Jehova Chineke nwee mmekọrịta chiri anya, ụdị ahụ nwatakịrị na nna ya nke hụrụ ya n’anya na-enwe. Jehova so Adam, bụ́ nwa ya nọ n’ụwa kwurịta okwu, o nyere ya ọrụ na-enye afọ ojuju, meekwa ka ọ ghọta ihe ndị a na-atụ anya ha n’aka ya.—Jenesis 1:28-30; 2:16, 17.

5 E kere Adam “n’onyinyo Chineke.” (Jenesis 1:27) Nke ahụ apụtaghị na Adam yiri Chineke n’ọdịdị. Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke 1 nke akwụkwọ a, Jehova bụ mmụọ a na-adịghị ahụ anya. (Jọn 4:24) N’ihi ya, Jehova enweghị anụ ahụ́ nkịtị na ọbara. Ịbụ onye e kere n’onyinyo Chineke pụtara na e kenyere Adam àgwà ndị yiri nke Chineke, ndị gụnyere ịhụnanya, amamihe, ikpe ziri ezi, na ike. Adam yiri Nna ya n’ụzọ ọzọ dị mkpa nke bụ́ na o nweere onwe ya ime nhọrọ. N’ihi ya, Adam adịghị ka ígwè ọrụ nke pụrụ ịrụ nanị ihe e mere ya ịrụ. Kama nke ahụ, ọ pụrụ ikpebiri onwe ya ihe, ọ pụkwara ịhọrọ ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ. A sị na ọ họọrọ irubere Chineke isi, ọ gaara adị ndụ ebighị ebi na Paradaịs n’elu ala.

6 Ya mere, n’ụzọ doro anya, mgbe Adam nupụụrụ Chineke isi, a maakwa ya ikpe ọnwụ, o furu ya nnukwu ihe. Mmehie ya mere ka ndụ mmadụ nke zuru okè nakwa ngọzi ndị ọ na-eweta funahụ ya. (Jenesis 3:17-19) N’ụzọ dị mwute, Adam tụfuuru ma onwe ya ma ụmụ ndị ọ gaje ịmụta, ndụ a nke magburu onwe ya. Okwu Chineke na-asị: “Mmehie sitere n’otu mmadụ [Adam] bata n’ụwa, ọnwụ esitekwa ná mmehie, ọnwụ ewee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ nile n’ihi na ha nile emehiewo.” (Ndị Rom 5:12) Ee, anyị nile eketawo mmehie site n’aka Adam. N’ihi ya, Bible na-ekwu na o ‘rere’ onwe ya na ụmụ ya ịbụ ohu nke mmehie na ọnwụ. (Ndị Rom 7:14) Ọ dịghị olileanya ọ bụla dịịrị ma Adam ma Iv ebe ọ bụ na ha kpachaara anya họrọ inupụrụ Chineke isi. Ma gịnị banyere ụmụ ha nakwa anyị onwe anyị?

7 Jehova gbataara ihe a kpọrọ mmadụ ọsọ enyemaka site n’inye ihe mgbapụta ahụ. Gịnị bụ ihe mgbapụta? Ihe mgbapụta pụtara ihe abụọ n’ụzọ bụ́ isi. Nke mbụ, ihe mgbapụta bụ ego a na-akwụ iji gbapụta ihe ma ọ bụ iji zụtaghachi ihe. A pụrụ iji ya tụnyere ego a na-akwụ iji gbapụta onye a nwụdere n’agha. Nke abụọ, ihe mgbapụta bụ ego e ji akwụ ụgwọ ihe. Ya na ego a na-akwụ onye e mebiri ihe ya bụ otu ihe. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ akpata ihe ọghọm, ọ ghaghị ịkwụ ego nke ya na ihe e mebiri hà nhata.

8 Olee otú ọ pụrụ isi kwe omume ịkwụ ụgwọ mfu dị ukwuu Adam kpataara anyị nile nakwa ịgbapụta anyị n’ịbụ ohu nke mmehie na ọnwụ? Ka anyị tụlee ihe mgbapụta ahụ Jehova nyere nakwa uru ọ pụrụ ịbara anyị.

OTÚ JEHOVA SI NYE IHE MGBAPỤTA AHỤ

9 Ebe ọ bụ na ihe a tụfuru bụ ndụ mmadụ zuru okè, a pụghị iji ndụ mmadụ na-ezughị okè zụtaghachi ya. (Abụ Ọma 49:7, 8) Ihe a chọrọ bụ ihe mgbapụta nke ya na ihe a tụfuru hà nhata. Nke a kwekọrọ n’ụkpụrụ nke ikpe ziri ezi a na-achọta n’Okwu Chineke, bụ́ nke na-ekwu, sị: “Ndụ laara ndụ.” (Deuterọnọmi 19:21) N’ihi ya, gịnị ka a ga-eji kwụọ ụgwọ ndụ mmadụ zuru okè nke Adam tụfuru? Ndụ mmadụ ọzọ zuru okè bụ “ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ” a chọrọ.—1 Timoti 2:6.

Jizọs nwụrụ iji gbapụta anyị

Jehova nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya dị ka ihe mgbapụta n’ihi anyị

10 Olee otú Jehova si nye ihe mgbapụta ahụ? O zitere otu n’ime ụmụ ya ndị bụ́ mmụọ zuru okè, n’ụwa. Ma, Jehova eziteghị mmụọ e kere eke ọ bụla ọ hụrụ. O zitere nke ọ hụrụ n’anya karịsịa, bụ́ Ọkpara ọ mụrụ nanị ya. (1 Jọn 4:9, 10) Ọkpara a ji ọchịchọ obi hapụ ebe obibi ya dị n’eluigwe. (Ndị Filipaị 2:7) Dị ka anyị hụrụ n’isiakwụkwọ bu nke a ụzọ, Jehova rụrụ ọrụ ebube mgbe o bufere ndụ nke Ọkpara a n’akpa nwa Meri. Site n’ike mmụọ nsọ Chineke, a mụrụ Jizọs dị ka mmadụ zuru okè, ọ nọghịkwa n’okpuru ọmụma ikpe nke mmehie.—Luk 1:35.

11 Olee otú otu onye pụrụ isi bụrụ ihe mgbapụta maka ọtụtụ ndị, n’ezie, ọtụtụ nde mmadụ? Olee otú ọtụtụ nde mmadụ sidị ghọọ ndị mmehie? Cheta na site n’ime mmehie, Adam tụfuru ndụ mmadụ zuru okè nke dị oké ọnụ ahịa o nwere. N’ihi ya, ọ pụghị inyefe ya ụmụ ya. Kama nke ahụ, ọ pụrụ ibufe nanị mmehie na ọnwụ. Jizọs, bụ́ onye Bible na-akpọ “Adam ikpeazụ,” nwere ndụ mmadụ zuru okè, ọ dịghịkwa mgbe o mehiere. (1 Ndị Kọrint 15:45) Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, e jiri Jizọs dochie anya Adam iji zọpụta anyị. Site n’ịchụ ndụ ya zuru okè n’àjà ná nrubeisi zuru ezu nye Chineke, Jizọs kwụrụ ụgwọ ahụ maka mmehie Adam. Jizọs si otú a mee ka ụmụ Adam nwee olileanya.—Ndị Rom 5:19; 1 Ndị Kọrint 15:21, 22.

12 Bible na-enye nkọwa zuru ezu banyere ahụhụ Jizọs tara tupu ya anwụọ. A pịakasịrị ya ahụ́, jiri obi ịta mmiri kpọgide ya n’elu osisi, ya anwụọkwa ọnwụ ahụhụ n’elu osisi ịta ahụhụ. (Jọn 19:1, 16-18, 30; Ihe Odide Ntụkwasị) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka Jizọs taa ahụhụ dị ukwuu otú ahụ? N’otu n’ime isiakwụkwọ ndị dị n’ihu, anyị ga-ahụ na Setan kwuru na ọ dịghị ohu Jehova ọ bụla bụ́ mmadụ nke ga-anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi n’ọnwụnwa. Site n’iji ikwesị ntụkwasị obi tachie obi n’agbanyeghị nhụjuanya, Jizọs nyere azịza banyere ịma aka Setan n’ụzọ kasị mma. Jizọs gosipụtara na mmadụ zuru okè nke nweere onwe ya ime nhọrọ pụrụ ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe n’ụzọ zuru okè nye Chineke n’agbanyeghị ihe ọ bụla Ekwensu ga-eme. Ọ ghaghị ịbụ na Jehova ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu n’ihi ikwesị ntụkwasị obi nke Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya!—Ilu 27:11.

13 Olee otú e si kwụọ ihe mgbapụta ahụ? N’ụbọchị nke 14 nke ọnwa ndị Juu, bụ́ Naịsan, n’afọ 33 O.A., Jehova kwere ka e gbuo Ọkpara ya zuru okè, nke na-emeghị mmehie ọ bụla. N’ụzọ dị otú a, Jizọs jiri ndụ mmadụ ya chụọ àjà “nanị otu ugboro.” (Ndị Hibru 10:10) N’ụbọchị nke atọ Jizọs nwụsịrị, Jehova kpọlitere ya ịghọ mmụọ. N’eluigwe, Jizọs chere n’ihu Chineke uru nke ndụ mmadụ ya zuru okè nke o ji chụọ àjà dị ka ihe mgbapụta iji zụtaghachi ụmụ Adam. (Ndị Hibru 9:24) Jehova naara uru nke àjà Jizọs dị ka ihe mgbapụta a chọrọ iji napụta ihe a kpọrọ mmadụ n’ịbụ ohu nke mmehie na ọnwụ.—Ndị Rom 3:23, 24.

OTÚ IHE MGBAPỤTA AHỤ PỤRỤ ISI BAARA GỊ URU

14 N’agbanyeghị na anyị bụ ndị mmehie, anyị pụrụ inweta ngọzi na-enweghị atụ n’ihi ihe mgbapụta ahụ. Ka anyị tụlee uru ụfọdụ onyinye a kasịnụ Chineke nyere ga-aba ugbu a nakwa n’ọdịnihu.

15Mgbaghara mmehie. N’ihi ezughị okè e ketara eketa, ọ na-esiri anyị ike ime ihe ziri ezi. Anyị nile na-emehie n’okwu ọnụ ma ọ bụ n’omume. Ma, site n’àjà mgbapụta Jizọs Kraịst, anyị pụrụ inweta “mgbaghara nke mmehie anyị.” (Ndị Kọlọsi 1:13, 14) Otú ọ dị, iji nweta mgbaghara dị otú ahụ, anyị aghaghị inwe nchegharị n’ezie. Anyị aghaghịkwa iji ịdị umeala n’obi rịọ Jehova, na-arịọ ka ọ gbaghara anyị ná ndabere nke okwukwe anyị nwere n’àjà mgbapụta nke Ọkpara ya.—1 Jọn 1:8, 9.

16Inwe akọ na uche dị ọcha n’ebe Chineke nọ. Obi amamikpe pụrụ n’ụzọ dị mfe ịkpata enweghị olileanya ma mee ka anyị chee na anyị abaghị uru. Otú ọ dị, site ná mgbaghara mmehie nke a pụrụ inweta n’ihi ihe mgbapụta ahụ, Jehova ji obiọma na-enyere anyị aka iji akọ na uche dị ọcha na-efe ya n’agbanyeghị ezughị okè anyị. (Ndị Hibru 9:13, 14) Nke a na-eme ka o kwe anyị omume inwe nkwuwa okwu n’ebe Jehova nọ. N’ihi ya, anyị pụrụ ịgakwuru ya n’ekpere mgbe ọ bụla anyị chọrọ. (Ndị Hibru 4:14-16) Ịnọgide na-enwe akọ na uche dị ọcha na-eme ka e nwee udo nke uche, na-akwalite ùgwù onwe onye, na-esokwa eme ka e nwee obi ụtọ.

17Olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. Ndị Rom 6:23 na-ekwu, sị: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ.” Otu amaokwu ahụ na-agbakwụnye, sị: “Ma onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site na Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” N’isi nke 3 nke akwụkwọ a, anyị tụlere ngọzi ndị Paradaịs elu ala ahụ na-abịanụ ga-eweta. (Mkpughe 21:3, 4) Ngọzi ndị ahụ nile a ga-enweta n’ọdịnihu, gụnyere ndụ ebighị ebi n’ahụ́ ike zuru okè, ga-ekwe omume n’ihi ọnwụ Jizọs nwụrụ maka anyị. Iji nweta ngọzi ndị ahụ, ọ dị anyị mkpa igosi na anyị nwere ekele maka ihe mgbapụta ahụ e nyere.

OLEE OTÚ Ị PỤRỤ ISI GOSIPỤTA EKELE?

18 N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee ekele miri emi n’ebe Jehova nọ maka ihe mgbapụta ahụ? Onyinye na-abụ nke e ji akpọrọ ihe karịsịa mgbe mmadụ tinyere oge, mgbalị, ma ọ bụ mefuo ihe iji nye ya. Ọ na-emetụ anyị n’ahụ́ mgbe anyị chọpụtara na onyinye e nyere anyị na-egosi ezi ịhụnanya nke onye nyere ya nwere n’ebe anyị nọ. Ihe mgbapụta ahụ bụ onyinye kasị oké ọnụ ahịa e nyetụworo, ebe ọ bụ na Chineke chụrụ àjà kasịnụ iji nye ya. Jọn 3:16 na-ekwu, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya.” Ihe mgbapụta ahụ bụ ihe àmà kasị pụta ìhè nke ịhụnanya Jehova nwere n’ebe anyị nọ. Ọ bụkwa ihe àmà na-egosi ịhụnanya Jizọs, n’ihi na o jiri ọchịchọ obi nye ndụ ya n’ihi anyị. (Jọn 15:13) N’ihi ya, ihe mgbapụta ahụ e nyere kwesịrị ime ka anyị kwenye na Jehova na Ọkpara ya hụrụ anyị n’anya n’otu n’otu.—Ndị Galeshia 2:20.

19 Oleezi otú ị pụrụ isi gosi na i nwere ekele maka ihe mgbapụta ahụ Chineke nyere? Nke mbụ, matakwuo banyere Onye Ukwu Na-enye Ihe, bụ́ Jehova. (Jọn 17:3) Iji akwụkwọ a na-amụ Bible ga-enyere gị aka ime nke ahụ. Ka ị na-enwekwu ihe ọmụma banyere Jehova, ịhụnanya i nwere n’ebe ọ nọ ga-emikwu emi. Ịhụnanya ahụ ga-emezi ka ị chọọ ime ihe na-amasị ya.—1 Jọn 5:3.

Nwaanyị na-agụ Bible

Ịmatakwu banyere Jehova bụ otu ụzọ ị ga-esi gosi na i nwere ekele maka ihe mgbapụta ahụ o nyere

20Gosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs. Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “Onye na-egosipụta okwukwe n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:36) Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta okwukwe n’ebe Jizọs nọ? A dịghị egosipụta okwukwe dị otú ahụ nanị n’okwu ọnụ. Jems 2:26 na-ekwu, sị: “Okwukwe nke na-enweghị ọrụ bụ nke nwụrụ anwụ.” Ee, e ji “ọrụ,” ya bụ, omume anyị, egosipụta ezi okwukwe. Otu ụzọ isi gosi na anyị nwere okwukwe n’ebe Jizọs nọ bụ site n’ime ike anyị nile iji ṅomie ya, ọ bụghị nanị n’ihe anyị na-ekwu, kamakwa n’ihe anyị na-eme.—Jọn 13:15.

21Na-anọ ya n’Oge Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị a na-eme kwa afọ. N’anyasị Naịsan 14, 33 O.A., Jizọs malitere otu ihe omume pụrụ iche nke Bible na-akpọ “nri anyasị nke Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 11:20; Matiu 26:26-28) A na-akpọkwa ihe omume a Ncheta nke ọnwụ Kraịst. Jizọs malitere ya iji nyere ndịozi ya na ezi Ndị Kraịst nile ga-esochi ha aka ịnọgide na-echeta na ya nyere ndụ ya dị ka ihe mgbapụta site n’ọnwụ nke ọ nwụrụ dị ka mmadụ zuru okè. Banyere ihe omume a, Jizọs nyere iwu, sị: “Nọgidenụ na-eme nke a iji na-echeta m.” (Luk 22:19) Ịnọ ya n’oge Ncheta nke ọnwụ Jizọs na-echetara anyị ịhụnanya dị ukwuu nke ma Jehova ma Jizọs gosiri n’ihe banyere ihe mgbapụta ahụ. Anyị pụrụ igosi ekele maka ihe mgbapụta ahụ site n’ịnọ ya n’oge Ncheta nke ọnwụ Jizọs a na-eme kwa afọ.*

22 Ihe mgbapụta ahụ Jehova nyere bụ n’ezie onyinye bara oké uru. (2 Ndị Kọrint 9:14, 15) Onyinye a dị oké ọnụ ahịa pụrụ ịbara ọbụna ndị nwụworo anwụ uru. Isi nke 6 na nke 7 nke akwụkwọ a ga-akọwa otú ọ ga-esi mee.

IHE BIBLE NA-AKỤZI

  • Ihe mgbapụta ahụ bụ ndokwa Jehova mere iji napụta ihe a kpọrọ mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ.—Ndị Efesọs 1:7.
  • Jehova nyere ihe mgbapụta ahụ site n’izite Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’ụwa ka ọ nwụọ n’ihi anyị.—1 Jọn 4:9, 10.
  • Site n’ihe mgbapụta ahụ, anyị na-enweta mgbaghara mmehie, akọ na uche dị ọcha, na olileanya nke ndụ ebighị ebi.—1 Jọn 1:8, 9.
  • Anyị na-egosi na anyị nwere ekele maka ihe mgbapụta ahụ site n’ịmụtakwu banyere Jehova, site n’igosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs, nakwa site n’ịnọ ya n’oge Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị.—Jọn 3:16.

*  Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ihe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị pụtara, lee Ihe Odide Ntụkwasị.


Ajụjụ nke Paragraf Ndị A Na-Amụ Amụ

1, 2. (a) Olee mgbe onyinye na-abara gị uru nke ukwuu? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ihe mgbapụta ahụ bụ onyinye kasị baa uru ị pụrụ inweta?

3. Gịnị bụ ihe mgbapụta ahụ, gịnịkwa ka ọ dị anyị mkpa ịghọta iji mata ókè onyinye a baruru n’uru?

4. Uru dị aṅaa ka ndụ mmadụ nke zuru okè baara Adam?

5. Gịnị ka Bible na-ekwu mgbe ọ sịrị na e kere Adam “n’onyinyo Chineke”?

6. Mgbe Adam nupụụrụ Chineke isi, gịnị ka ọ tụfuru, oleekwa otú o si metụta ụmụ ya?

7, 8. Ihe abụọ dị aṅaa ka ihe mgbapụta pụtara n’ụzọ bụ́ isi?

9. Ụdị ihe mgbapụta dị aṅaa ka a chọrọ?

10. Olee otú Jehova si nye ihe mgbapụta ahụ?

11. Olee otú otu mmadụ pụrụ isi bụrụ ihe mgbapụta maka ọtụtụ nde mmadụ?

12. Gịnị ka ahụhụ Jizọs tara gosipụtara?

13. Olee otú e si kwụọ ihe mgbapụta ahụ?

14, 15. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji nweta “mgbaghara nke mmehie anyị”?

16. Gịnị na-enyere anyị aka iji akọ na uche dị ọcha na-efe Chineke, uru dịkwa aṅaa ka akọ na uche dị otú ahụ bara?

17. Ngọzi ndị dị aṅaa ka a pụrụ inweta n’ihi ọnwụ Jizọs nwụrụ maka anyị?

18. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee ekele n’ebe Jehova nọ maka ihe mgbapụta o nyere?

19, 20. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ị pụrụ isi gosi na i nwere ekele maka ihe mgbapụta ahụ Chineke nyere?

21, 22. (a) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-anọ ya n’oge Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị nke a na-eme kwa afọ? (b) Gịnị ka a ga-akọwa n’isiakwụkwọ na-esonụ?